Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

IHE BAỊBỤL KWURU

Ịbịa Ihe n’Oge

Ịbịa Ihe n’Oge

Ọtụtụ ndị na-anaghị abịa ihe n’oge maara na ịbịa ihe n’oge dị mma. E nwere ọtụtụ ihe Baịbụl kwuru ga-abara anyị uru gbasara ịbịa ihe n’oge.

Olee otú ịbịa ihe n’oge dịruru ná mkpa?

IHE MERE O JI DỊ MKPA

Ụfọdụ ndị achọpụtala na ịbịa ihe n’oge na-eme ka ahụ́ ruo mmadụ ala. Ọ na-emekwa ka mmadụ nwekwuo ùgwù. Gịnị mere anyị ji kwuo otú ahụ?

Ịbịa ihe n’oge na-egosi na mmadụ ma ihe ọ na-eme. Ọ bụrụ na mmadụ ana-abịa ihe n’oge, ọ na-egosi na onye ahụ na-ahazi onwe ya nke ọma, nakwa na ọ naghị ekwe ka ihe ọ bụla gbochie ya ime ihe ọ chọrọ ime.

Ịbịa ihe n’oge na-egosi na mmadụ bụ onye a ga-atụkwasịli obi. N’ụwa a ọtụtụ ndị na-anaghị emezu nkwa ha, ndị mmadụ hụ onye na-emezu nkwa ya, ha na-akwanyere ya ùgwù. Ọ bụrụ na mmadụ bụ onye a ga-atụkwasịli obi, ndị ezinụlọ ya na ndị enyi ya ga na-akwanyere ya ùgwù. Ndị isi ọrụ anaghị eji onye na-abịa ọrụ n’oge ma na-arụpụta ọrụ e nyere ya n’oge egwu egwu. A na-etinyere ụdị ndị a ego n’ụgwọ ọnwa ha, buliekwa ha n’ọkwá.

IHE BAỊBỤL KWURU

O nwere ebe ụfọdụ Baịbụl kwuru ihe ndị gbasara ịbịa ihe n’oge. Dị ka ihe atụ, Baịbụl kwuru, sị: “Ka e mee ihe niile n’ụzọ kwesịrị ekwesị nakwa n’usoro.” (1 Ndị Kọrịnt 14:40) Ọ bụrụ na mmadụ abụọ eyie agba, ha kwesịrị ịbịa n’oge. Baịbụl sịkwara na “e nwere oge a kara aka maka ihe ọ bụla, ihe ọ bụla a na-eme n’okpuru eluigwe nwekwara oge.” (Ekliziastis 3:1) Amaokwu na-esote ya sịkwara na e nwere “oge ịkụ ihe na oge ifopụ ihe a kụrụ.” (Ekliziastis 3:2) Ndị ọrụ ugbo na-akụ ihe n’ugbo ha n’oge kwesịrị ekwesị ka ihe ha kụrụ nwee ike ime nke ọma. Ihe ọ pụtara bụ na onye ọrụ ugbo kụọ ihe n’oge, ihe ọ kụrụ ga-eme nke ọma.

Baịbụl kwuru ihe kachanụ mere anyị kwesịrị iji na-abịa ihe n’oge. Ọ na-egosi na anyị na-akwanyere ndị ọzọ ùgwù nakwa na anyị anaghị emebisịrị ha oge ha. (Ndị Filipaị 2:3, 4) E nwekwara ike ikwu na onye na-emebisịrị ndị ọzọ oge ha, na-ezuru oge ha n’ohi.

“Na-elekwasị anya, ọ bụghị naanị n’ọdịmma onwe unu, kamakwa n’ọdịmma nke ndị ọzọ.”Ndị Filipaị 2:4.

Olee ihe ndị nwere ike inyere gị aka ịna-abịa ihe n’oge?

IHE BAỊBỤL KWURU

Baịbụl sịrị na anyị kwesịrị ịna-eme atụmatụ nke ọma tupu anyị emewe ihe. (Ilu 21:5) Ị chọpụta na ị naghị abịakarị ihe n’oge, leruo onwe gị anya, ọ ga-abụ na o nwere ọtụtụ ihe ị chọrọ ime otu mgbe. Lee ma ị̀ ga-agbalị hapụ ihe ndị na-adịchaghị mkpa. Gị na ndị mmadụ yiwe agba, hazie agba ndị ahụ otú oge ga-ezuru gị ịga nke ọ bụla n’ime ha n’oge. Ime ya otú a ga-abara gị uru, adịghị ama ama e nwee ihe dapụtaranụ, dị ka mmiri ozuzo.

Baịbụl gwakwara anyị ka anyị mara ebe ike anyị ruru. (Ilu 11:2) N’ihi ya, mgbe gị na mmadụ na-eyi agba ma ọ bụ mgbe ị na-ekweta ihe ị ga-eme, buru ụzọ chọpụta ma ị̀ ga-emeli ya. I kweta ime ihe ndị ị ma na ị gaghị emeli ga-akpatara ma gị ma ndị ọzọ nchegbu na obi ọjọọ.

Baịbụl gbakwara anyị ume iji oge anyị na-eme ihe bara uru. (Ndị Efesọs 5:15, 16) Na-ebu ụzọ eme ihe ndị kacha mkpa. (Ndị Filipaị 1:10) Dị ka ihe atụ, jiri oge ị nọ n’ụgbọala ma ọ bụ oge i ji na-eche mmadụ na-agụ akwụkwọ ma ọ bụ na-ahazi ihe ndị i nwere ime n’ụbọchị.

Atụmatụ onye dị uchu aghaghị iweta uru.”—Ilu 21:5.