Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

TETA! Nke 2 n'Afọ 2018 | Ihe Iri na Abụọ Na-eme Ka Ezinụlọ Na-enwe Obi Ụtọ

Ihe Iri na Abụọ Na-eme Ka Ezinụlọ Na-enwe Obi Ụtọ

Anyị na-anụkarị ọtụtụ ihe mere ọtụtụ ezinụlọ ji enwe nsogbu. Ma, oleekwanụ ihe mere ezinụlọ ụfọdụ ji enwe obi ụtọ?

  • N’Amerịka, n’agbata afọ 1990 na afọ 2015, otú ndị di na nwunye dị ihe karịrị afọ iri ise si na-agba alụkwaghịm ji okpukpu abụọ karịa otú ọ dịbu, ndị nke dị ihe karịrị afọ iri isii na ise ji okpukpu atọ karịa otú ọ dịbu.

  • Ndị nne na nna amaghịzi nke ha ga-eso eso n’ihi na ụfọdụ ndị ọkachamara sịrị na ọ kacha mma ịna-apa ụmụaka apa, ndị ọzọ ekwuo na ọ ka mma iji aka ike na-azụ ha.

  • Ụmụaka na-eto, ghọọ dimkpa n’enwetaghị ọzụzụ ga-enyere ha aka ná ndụ.

N’agbanyeghị ihe a niile, nke bụ́ eziokwu bụ na . . .

  • Di na nwunye nwere ike ịna-enwe obi ụtọ, gharakwa itisa.

  • Ndị nne na nna nwere ike ịmụta otú ha ga-esi eji ịhụnanya na-agbazi ụmụ ha.

  • Ụmụaka nwekwara ike ịmụta ihe ndị ga-enyere ha aka ibi ndụ dị mma ma ha too.

Olee otú ihe ndị a ga-esi kwe omume? Teta! a lebara anya n’ihe iri na abụọ ga-eme ka ezinụlọ na-enwe obi ụtọ.

 

1: Kpebie Na Ị Gaghị Ahapụ Di Gị ma Ọ Bụ Nwunye Gị

Ihe atọ nwere ike inyere di na nwunye aka ka ha ghara ịhapụ ibe ha.

2: Na-emekọnụ Ihe Ọnụ

Gị na di gị ma ọ bụ nwunye gị ùnu dị naanị ka mmadụ abụọ bi n’otu ọnụ ụlọ?

3: Na-akwanyerenụ Ibe Unu Ùgwù

Gụọ ihe a ka ị mụta otú ị ga-esi na-ekwu okwu ma ọ bụ ihe ndị ga-eme ka di gị ma ọ bụ nwunye gị mara na ị na-akwanyere ya ùgwù.

4: Na-agbagharanụ Ibe Unu

Gịnị ga-enyere gị aka ịna-eleghara mmejọ di gị ma ọ bụ nwunye gị anya?

5: Gị na Ụmụ Gị Na-ekwurịta Okwu

E nwere ihe atọ nwere ike inyere gị aka ịbịarukwu ụmụ gị nso, marakwa obi ha.

6: Na-agbazi Ụmụ Gị

Ịgbazi ụmụaka ọ̀ na-eme ka ha chewa na ha abaghị uru?

7: Kụziere Ụmụ Gị Ịna-akpa Àgwà Ọma

Olee ụdị àgwà i kwesịrị ịkụziri ụmụ gị ka ha na-akpa?

8: Na-eme Ihe Ị Na-akụziri Ụmụ Gị

Ọ bụrụ na ị chọrọ ka ụmụ gị na-eme ihe ị na-ekwu, i kwesịrị ịna-eme ihe ị na-akụziri ha eme.

9: Chọpụta Ụdị Onye Ị Bụ

Olee ihe ga-enyere ndị na-eto eto aka ịkwụsi ike n’ihe ndị ha kweere?

10: Ikwesị Ntụkwasị Obi

Ime ka ndị mụrụ gị na-atụkwasị gị obi ga-enyere gị ezigbo aka ịghọ dimkpa.

11: Na-arụsi Ọrụ Ike

Ọ bụrụ na ị mụta ịna-arụsi ọrụ ike mgbe ị ka na-eto eto, ọ ga-enyere gị aka n’ihe ọ bụla ị na-eme ná ndụ.

12: Nwee Ihe Ndị I Bu n’Obi Imezu ná Ndụ

I mezuo ihe i bu n’obi ime, obi ga-esikwu gị ike, gị na ndị enyi gị adịkwuo ná mma, gị ana-enwekwu obi ụtọ.

Ihe Ga-enyekwuru Ezinụlọ Aka

Ihe Baịbụl kwuru ga-enyeliri unu aka n’alụmdi na nwunye unu, meekwa ka unu na-enwe obi ụtọ n’ezinụlọ unu.