Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Obi Dị M Ụtọ Itinyekwu Mgbalị

Obi Dị M Ụtọ Itinyekwu Mgbalị

 Obi Dị M Ụtọ Itinyekwu Mgbalị

DỊ KA CLAIRE VAVY SI KỌỌ

AGWAETITI Madagascar dị kilomita 400 site na Mozambique, bụ́ nke dị n’ebe ọwụwa anyanwụ Africa. Agwaetiti a bụ ugwu ugwu, oké ọhịa jukwara na ya. A mụrụ m n’ebe ọwụwa anyanwụ nke agwaetiti a, n’obodo nta bụ́ Betoko II. N’afọ 1987, mgbe m dị afọ iri na ise, akwagara m Mahanoro, bụ́ obodo dị n’ụsọ oké osimiri, maka ịga akwụkwọ.

Onye mụ na ya bi na Mahanoro bụ Celestin, bụ́ nwanne m nwoke tọrọ m, nke ka malitere iso Ndịàmà Jehova na-amụ Bible n’oge ahụ. Afọ abụọ ka e mesịrị, aghọrọ m Onyeàmà. Ekpebisiri m ike ijere Jehova Chineke ozi ruo nnọọ otú m nwere ike.

Mgbalị Ndị M Mere Iji Ruo Ihe Mgbaru Ọsọ M

Otu n’ime ihe mgbaru ọsọ mbụ m setịpụrụ bụ inyere ndị ezinụlọ m nọ na Betoko II aka. Ekpegakwaara m Jehova ekpere mgbe nile banyere ọchịchọ a m nwere. Ma, nanị mgbe m ji enwe ike ịla obodo anyị bụ mgbe anyị mechiri akwụkwọ. Ọ bụ njem tara akpụ na-ewe otu narị kilomita. A pụrụ iji ụgbọala gaa kilomita iri anọ mbụ ya, ma jirizie ụkwụ si n’ụzọ ọhịa dị n’ugwu gaa kilomita iri isii fọdụzirinụ.

Ana m arị ọtụtụ ugwu ndị kpọliri elu. Akụkụ ụfọdụ nke ụzọ ọhịa ahụ nkume juru dị nnọọ warawara. Ọ bụrụ na m malite n’isi ụtụtụ gara ya ruo n’abalị, ihe m na-agakarị bụ ihe dị ka kilomita iri anọ. Ana m ebu ihe ịdị aro ya karịrị kilogram iri na ise—ana m ebu ụfọdụ n’ime ha n’isi, na-anya ụfọdụ n’azụ, na-ebu ụfọdụ n’aka. Ihe m na-ebukarị bụ akwụkwọ e ji amụ Bible, bụ́ nke m na-enye ndị ikwu m na ndị ọzọ nwere mmasị. A bịara mara m n’ụzọ ahụ dị ka “obu ngwongwo.”

Na mbụ, n’agbanyeghị ịnụ ọkụ n’obi m, ndị ezinụlọ m anaghị achọ ige m ntị ma m kọwara ha banyere ihe ọhụrụ ndị m kweere. Ma, n’oge na-adịghị anya, ha gbanwere ma malite ịjụ m ọtụtụ ajụjụ nke na mgbe ụfọdụ, ihe anyị ji alakpu ụra na-abụ elekere anya abụọ nke ndeeri.

Nlọta Kwesịrị Ncheta

Na December 24, 1990, alọtara m n’obodo anyị bụ́ Betoko II maka ezumike. Obi dị ndị ezinụlọ m  ụtọ ịhụ m, ha chere na m lọtara iso ha gbaa Krismas. Ma, mgbe m kọwaara ha ihe mere na agaghị m eso ha gbaa Krismas, obi jọrọ ha njọ. Ihere mere ha otú ha ga-esi akọrọ ndị ọzọ nọ n’obodo anyị ihe a, ebe ọ bụ na ndị obodo anyị na-emekọ ihe ọnụ ka ụmụnne. N’ihi ya, ahụrụ m mkpa ọ dị na m ga-eji ọnụ m gwa ndị ọzọ ihe ndị m kweere. Ma olee otú m ga-esi eme ya?

Ebe m ka na-eto eto, amaghị m otú m ga-esi amalite. Abịara m chewe ma ọ̀ ga-adị mma ma m kọwaara ndị obodo anyị ihe m kweere mgbe ha nile gbakọtara na chọọchị n’echi ya. Ekpegaara m Jehova ogologo ekpere, na-arịọ maka nduzi ya. Mgbe m kpesịrị ekpere ahụ, ajụrụ m nwanne m nwoke Paul, bụ́ onye so ná ndị isi chọọchị obodo ahụ, sị, “Ì chere na ọ ga-adị mma ka m kọwaara ndị ga-abịa chọọchị echi ihe mere na anaghị m agba Krismas?” Ọ gara gwa ndị ọzọ, ha nile kwetakwara.

N’echi ya, mgbe chọọchị gbasara, ha kpọrọ m ka m bịa. Ka m kpegasịkwaara Jehova ekpere ọzọ, ebuuru m ọtụtụ akwụkwọ ndị e ji amụ Bible gawa. Ka m kọwachara onwe m, ekelere m ha nile n’otú ha si nyere m aka iji Bible kpọrọ ihe nke ukwuu. Akọwaara m ha na, ka m kwagasịrị obodo ọzọ, anọgidere m na-amụ Bible. Agwara m ha na achọpụtala m ọtụtụ eziokwu ndị dị na Bible bụ́ ndị a na-akụzighịrị anyị na mbụ.

Eji m ohere ahụ kọwaara ha banyere olileanya Bible nke ịdị ndụ ebighị ebi na paradaịs elu ala (Abụ Ọma 37:29; Mkpughe 21:3, 4), ihe mere o ji bụrụ nanị mmadụ ole na ole kwesịrị ntụkwasị obi n’ụwa ga-aga eluigwe (Jọn 14:2, 3; Mkpughe 5:9, 10; 14:1, 3), nakwa ozizi Bible bụ́ na ndị nwụrụ anwụ amaghị ihe ọ bụla, na ha nọ n’ụra ọnwụ, n’ihi ya, ha apụghịkwa ịnọ na-ata ahụhụ (Eklisiastis 9:5, 10; Jọn 11:11-14, 38-44). Egosikwara m ha na Ndị Kraịst oge mbụ emeghị ememe Krismas nakwa na ememe ahụ si n’aka ndị na-ekpere arụsị malite.

Ka m kwusịrị, ọtụtụ n’ime ha kwetara na ihe m kwuru bụ eziokwu. Ọbụna ụfọdụ jụrụ ajụjụ ndị ọzọ. Ka e mesịrị, m gosiri ha akwụkwọ ndị m ji bịa ma kọwaara ha na ha bụ akwụkwọ ndị e ji amụ Bible nke Ndịàmà Jehova bipụtara. M gwara ha na m dị njikere inyere onye ọ bụla ga-enwe mmasị ịmụ Bible aka. Ọtụtụ n’ime ha naara m akwụkwọ ndị ahụ e ji amụ Bible.

Nchọpụta Dị Ịtụnanya

Otu nwanyị m na-ahụtụbeghị bịakwutere m ma kwuo, sị, “Nwanne m nwanyị nke bi n’obodo nta ọzọ bụ onye òtù unu.” Ihe ahụ o kwuru tụrụ m n’anya, m wee jụọ ya, sị, “Ebee ka ọ nọ?”

“N’Andranomafana,” ka ọ zara m. Obodo nta ahụ dị ihe dị ka kilomita iri atọ site na Betoko II.

Agwara m nwanyị ahụ na, ma eleghị anya, nwanne ya nwanyị bụ onye chọọchị ọzọ, ebe ọ bụ na Ndịàmà nile nọ n’ógbè ahụ maara onwe ha. Ma nwanyị ahụ kwesiri olu ike na-agwa m na nwanne ya nwanyị akụziworo ya ihe ndị ahụ m kọwaara ha na chọọchị. Ajụrụ m ya aha na ebe nwanne ya nwanyị ahụ bi, n’ihi na ọ dị m ọkụ n’obi ịga obodo nta ahụ ozugbo. Ma, mama m gwara m ka m cheretụ ihe dị ka otu ụbọchị ma ọ bụ karịa tupu mụ agawa, n’ihi na ọ ga-abụ njem tara akpụ, ọ bụkwa ụkwụ ka m ga-eji jee ya. Ka ụbọchị abụọ gasịrị, mụ na nwanne m nwoke bụ́ Charles gawara Andranomafana.

 Ozugbo anyị rutere ebe ahụ, anyị jụrụ ụfọdụ ndị obodo ahụ, sị, “È nwere Ndịàmà Jehova n’ebe a?” O wutere m mgbe ha zara, sị, “Ọ bụ nanị chọọchị Katọlik, nke Pentikọstal, na chọọchị Independent dị n’obodo nta a.”

Mgbe ahụ, otu nwanyị bịara kwuo, sị, “Ọ bụrụ Ndịàmà Jehova ka ị na-achọ, o yiri ka ọ̀ ga-abụ Marceline na ndị ezinụlọ ya.” Nke ahụ bụ kpọmkwem aha onye m na-achọ!

Otu onye gawara ịkpọ Marceline. Ọ dịghị anya ya abịa ma yie onye ụjọ na-atụ. Ndị obodo ahụ nile gbakọtara, n’ihi na ha chere na anyị nwere ike ịbụ ndị uwe ojii bịara ịgba ya ajụjụ ọnụ. Emesịrị m chọpụta na a kpagbuwo ya na ezinụlọ ya n’obodo ahụ n’ihi ‘okpukpe gbapụrụ iche’ ha na-ekpe.

Marceline duuru anyị pụọ n’ebe ìgwè mmadụ ahụ nọ, ebe anyị pụrụ ịnọ kwuo okwu. Mgbe m jụrụ ya ma ọ̀ bụ otu n’ime Ndịàmà Jehova, o kwuru na ya bụ. Mgbe ahụ, ọ gara weta Ezi-Okwu Ahu Nke Nedubà ná Ndu Ebigh-Ebi, bụ́ akwụkwọ Ndịàmà Jehova na-ejibu eduzi ọmụmụ Bible, nakwa Ụlọ Nche ndị merela ochie. Ha nile dị nkịrịka ma dọkasịchaa adọkasị. Ajụrụ m ya, sị, “Olee magazin unu mụrụ na Sunday gara aga?”

Ọ zara, sị, “Ọ bụ nanị magazin ndị a ka anyị nwere, anyị na-amụgharịkwa ha mgbe mgbe.” Ọ bụzi mgbe ahụ ka m gwara Marceline na mụ onwe m bụkwa Onyeàmà. Obi tọrọ ya ụtọ nke ukwuu! Mgbe m gwara ya na m chọrọ ịhụ nwoke na-eduzi nzukọ ha, ọ kọwara na nwoke ahụ bi n’ebe ọzọ tekwara nnọọ aka.

Nchọpụta Ọzọ nke Nyere M Obi Ụtọ

N’echi ya, mụ na Marceline gawara na nke nwoke ahụ. Mgbe anyị rutere, o juru ya nnọọ anya, ma o nwere obi ụtọ ịhụ anyị. Ọ bịara bụrụ n’ezie na ọ bụ Onyeàmà si n’obodo Toamasina nke dị n’ụsọ oké osimiri, bụ́ obodo dị ihe karịrị narị kilomita abụọ n’ebe ugwu ọwụwa anyanwụ. Ọtụtụ afọ gara aga mgbe a chụsịrị ya n’ọrụ na mberede, ọ dịghị ihe ọzọ ya na ezinụlọ ya pụrụ ime ma ọ́ bụghị ịlọghachi n’obodo ahụ. Mgbe ọ lọtara, ọ malitere izi ozi ọma, na-eduzi ọmụmụ Bible, na-eduzikwa nzukọ.

Obi dị nnọọ Onyeàmà ahụ na ndị ezinụlọ ya ụtọ ịhụ magazin Ụlọ Nche ndị ọhụrụ m ji bịa. Egosikwara m ha akwụkwọ bụ́ Ị Pụrụ Ịdị Ndụ Ebighị Ebi n’ime Paradaịs n’Elu  Ala, bụ́ akwụkwọ bụ́ isi anyị na-eji eduzi ọmụmụ Bible mgbe ahụ. Nke a bụ mbụ ha na-ahụ akwụkwọ ahụ. Na Sunday na-esonụ, alaghachiri m Andranomafana iji soro ha mụọ ihe. Agbara m ha ume ka ha kpọtụrụ alaka ụlọ ọrụ Ndịàmà dị n’isi obodo ahụ bụ́ Antananarivo, ebe ọ bụ na alaka ụlọ ọrụ ahụ amaghị na ìgwè a dị nta nọ n’obodo a.

Malite na January 1991, ana m esi Mahanoro aga Andranomafana ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ kwa ọnwa, na-ewegara ha Ụlọ Nche ndị ọhụrụ na akwụkwọ ndị ọzọ. Ana m aga ihe dị ka kilomita 130 nanị iji ruo ebe ahụ, ana m eji ụkwụ aga ihe karịrị kilomita iri itoolu n’ime ha—na-arịgo ma na-arịda ugwu ndị kpọdara akpọda, nkume juru na ha, na-agafekwa oké ọhịa. Ụbọchị mmiri zoro, ana m ada apịtị ndị na-achị achị.

Ngwongwo m na-ebu bịara buwanyekwuo ibu ka ndị chọrọ akwụkwọ na magazin bịara na-ehiwanye nne. Otú ọ dị, m gachaa lọta, ana m enwe afọ ojuju na obi ụtọ karịrị nnọọ ike gwụrụ m na ahụ́ mgbu m na-enwe. Lee ọṅụ ọ bụụrụ m ịhụ ka ìgwè ahụ si enwe obi ụtọ inweta akwụkwọ ọhụrụ ọ bụla nakwa ịhụ otú ha si anabata eziokwu Bible!

Ịbanye Ozi Oge Nile

Na September 1, 1992, a họpụtara m ịbụ onye ọsụ ụzọ, bụ́ ihe Ndịàmà na-akpọ ndị ozi oge nile ha. Ana m asụ ụzọ na Mahanoro ma anọgidere m na-edegara ndị ikwu m nọ na Betoko II akwụkwọ ozi. Ka oge na-aga, amalitere m iji akwụkwọ ozi na-amụrụ ha ihe, ha rịọkwara ka m lọta ụlọ iji nyere ha aka. Adị m njikere ime nke a, ma achọgodịrị m ijide n’aka na ha kpebisiri ike ịmụ Bible na inwe ọganihu ime mmụọ. N’ihi ya, anọgidere m na Mahanoro na-asụ ụzọ.

Ná ngwụsị afọ 1993, enwere m ihe ùgwù nke ije ụlọ akwụkwọ ndị ọsụ ụzọ were izu abụọ bụ́ nke e nwere n’Antananarivo. Ka e mesịrị, a gbara m ume itinye akwụkwọ maka ịbụ ọsụ ụzọ pụrụ iche, bụ́ nke pụrụ ime ka e kenye m ije ozi n’ebe ọ bụla ná mba ahụ. Ma, ekpebiri m na m gaghị eme nke a, ebe ọ bụ na m chọrọ inyere ndị ikwu m nọ na Betoko II aka, bụ́ ndị bi n’ebe dị nnọọ anya site n’ebe e nwere ọgbakọ kasị nso. N’ihi ya, alọghachiri m Mahanoro ma gaa n’ihu n’ọrụ ọsụ ụzọ m.

Ka e mesịrị, mgbe onye nlekọta na-ejegharị ejegharị nke Ndịàmà Jehova bịara leta anyị, ajụrụ m ya banyere ịlakwuru ndị ikwu m iji nyere ha aka. Tupu mgbe ahụ, e nweela ọgbakọ n’Andranomafana. N’ihi ya, ọ tụụrụ m arọ ka m gaa ebe ahụ iji nwee ike ịnọ n’ọgbakọ ahụ ma na-eje ozi na Betoko II. Amalitere m ọrụ ebe ahụ na September 1, 1994. N’otu ọnwa ahụ kwa, nwanne m nwoke Paul, bụ́ onye bụ́bu onyeisi na chọọchị, sooro m gaa mgbakọ distrikti. N’oge na-adịghị anya, mmadụ iri atọ malitere ikwusa ozi ọma n’Andranomafana. N’ụbọchị Sunday kwa, a na-enwe ihe dị ka mmadụ iri isii na ise na-abịa nzukọ anyị.

Akwụsịghị M Ịga Ije

Oge na-adịghị anya m lọtasịrị na Betoko II, ụmụnne afọ m ndị nwoke na ndị nwanyị anọ bịara ruo eru iso Ndịàmà Jehova na-eje ozi, oge na-adịghịkwa anya ka e mesịrị, e mere ha baptizim. Ka m lọtasịrị Betoko II, ana m agakarị Anosibe An’ala ije bute akwụkwọ na magazin. Ana m eji ụkwụ aga kilomita iri ise, nanị iji ruo obodo ahụ. Ọ bụ ezie na ọ bụ njem na-agwụ ike, ọṅụ m na-enweta n’ịhụ ọganihu ime mmụọ a na-enwe n’ógbè ahụ mere ka mgbalị ahụ bụrụ ihe kwesịrị ekwesị.

Taa, e nwere otu ọgbakọ na-eme nke ọma na Betoko II, ihe dị ka mmadụ iri anọ na ise na-abịa nzukọ ha n’ụbọchị Sunday. Nne m na ụmụnne m nile bi n’ógbè ahụ bụchazi Ndịàmà, ọtụtụ n’ime ha bụkwa ndị ọsụ ụzọ oge nile. Otu nwanne m nwoke nke m tọrọ bụ ọsụ ụzọ pụrụ iche. Na November 1, 2001, a họpụtakwara m ịbụ ọsụ ụzọ pụrụ iche, e kenyekwara m ije ozi n’obodo nta bụ́ Antanambao-Manampotsy. Ma, eji m obi ụtọ hapụ Betoko II.

N’afọ 1987, bụ́ mgbe m malitere ịmụ eziokwu Bible, Ndịàmà nọ na Madagascar erughị puku atọ. Ugbu a, e nwere ihe karịrị puku Ndịàmà iri na anọ. Dị nnọọ ka ọtụtụ n’ime ha, enwere m ekele maka ihe ùgwù nke inwe ike itinyekwu mgbalị iji nyere ndị ọzọ aka. Ana m ekelekwa Jehova maka ịgọzi mgbalị m n’akụkụ a.

[Foto ndị dị na peeji nke 22, 23]

Ọtụtụ mgbe, m na-ebu akwụkwọ dị kilogram iri na ise gaa kilomita iri isii iji ruo obodo m

[Foto dị na peeji nke 23]

Nwanne m nwoke tọrọ m bụ́ Paul

[Foto dị na peeji nke 24]

Nwanne m nwoke bụ́ Charles

[Foto dị na peeji nke 24]

Mụ na ụfọdụ ndị òtù ezinụlọ m. Ndị a nile bụzi Ndịàmà Jehova