Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Tomato Ihe E Ji Esi Ọtụtụ Ihe

Tomato Ihe E Ji Esi Ọtụtụ Ihe

 Tomato Ihe E Ji Esi Ọtụtụ Ihe

SITE N’AKA ONYE EDEMEDE TETA! NA BRITAIN

“GỊNỊ ka m gaara eme ma a sị na tomato adịghị!” ka otu nwanyị a na-alụ alụ n’Ịtali ji oké olu kwuo. Otu ihe a ka ọtụtụ ndị ọzọ na-esi nri gburugburu ụwa na-ekwu. N’ezie, ọtụtụ mba ji tomato esi nri. Ndị nwere ubi n’akụkụ ụlọ ha na-aka akụ ya karịa mkpụrụ ákụ́kụ́ ndị ọzọ. Ma, tomato ọ̀ bụ mkpụrụ osisi ka ọ̀ bụ gịnị?

Ndị na-amụ banyere mkpụrụ osisi weere tomato dị ka mkpụrụ osisi n’ihi na o nwere mkpụrụ n’ime ya. Otú ọ dị, ihe ka ọtụtụ ná ndị mmadụ na-ele ya anya otú ha si ele akwụkwọ nri, ebe ọ bụ na a na-ebenyekarị ya ná nri. Otú mkpụrụ a na-atọ ụtọ si malite na-akpali mmasị.

Mmalite Na-akpali Mmasị

Na Mexico, ndị Aztec na-akụ tomato maka oriri. Ná mmalite afọ ndị 1500, mgbe ndị Spen merisịrị Mexico n’agha, ha ji ya lọta Spen. Ha kpọrọ ya tomate, bụ́ nke ha si n’okwu Nahuatl bụ́ tomatl nweta. N’oge na-adịghị anya, ndị Spen bi n’Ịtali, Ebe Ugwu Africa, nakwa n’Ebe Ọwụwa Anyanwụ Ụwa malitere iri mkpụrụ ọhụrụ a na-atọ ezigbo ụtọ.

N’ihe dị ka afọ 1550, tomato rutere n’ebe ugwu Europe. Na mbụ, e chere na ọ na-egbu mmadụ, e jikwa ya mere fụlawa. Ọ bụ ezie na o so n’ákụ́kụ́ ndị Bekee na-akpọ nightshade, akwụkwọ ya na-esi ísì, okporo ya na-egbukwa mmadụ, ma mkpụrụ ya adịtụghị egbu mmadụ.

O yiri ka tomato mbụ batara Europe ọ̀ na-acha odo odo, ebe ọ bụ na ndị Ịtali kpọrọ ya pomodoro (apụl na-acha odo odo). Ndị England kpọrọ ya tomate, mesịakwa kpọọ ya tomato, ma ọtụtụ n’ime ha bịakwara kpọwazie ya “apụl ịhụnanya.” E si Europe wega tomato n’Ebe Ugwu America, bụ́ ebe o mesịrị ghọọ oké nri n’afọ ndị 1800.

Ọ Dị Nnọọ n’Ụdị n’Ụdị Ma Bụrụ Ihe A Ma Ama

Ị jụọ mmadụ otú tomato na-acha, o yikarịrị ka ọ̀ ga-aza na ọ na-acha “ọbara ọbara.” Ma, ị̀ ma na e nwere ndị nke na-acha odo odo, oroma oroma, pinki pinki, nchara nchara, ọcha ọcha, ma ọ bụ akwụkwọ ndụ akwụkwọ ndụ? E nwedịrị ndị nke tụrụ àgwà. Ọ bụghị ha nile na-adị gburugburu. Ụfọdụ na-adị mbadamba ma ọ bụ na-adị ka ube. Ha pụrụ ipe mpe ka ahụekere ma ọ bụ buo ibu ka aka a kwụkwụchiri akwụkwụchi.

A na-akụ mkpụrụ a a ma ama ná mba Iceland, bụ́ nke dị n’ebe mgbago mgbago ụwa, na-akụkwa ya na New Zealand, bụ́ nke dị n’ebe ndịda ndịda ụwa. United States na mba ndị dị n’ebe ndịda Europe kasị akọ tomato n’ụwa nile. N’ala ndị na-ajụ nnọọ oyi, a na-akụkarị ya n’ime ụlọ e ji ugegbe rụọ. N’ala okpomọkụ, a na-akụ ya n’ihe e tinyere nri ala a gwakọtara mmiri nke ájá na-adịghị na ya.

Ndị na-abụghị ndị ọrụ ugbo ka nọgidere na-enwe mmasị ịkọ tomato. Ịkọ tomato anaghị ara ahụ́. Nanị ole na ole a kụrụ pụrụ ịmị ihe ga na-ezuru obere ezinụlọ nri. Ọ bụrụ na i nweghị ala, chọọ ụdị tomato nke a na-akụ n’ite a wụnyere ájá.

Aro Banyere Otú E Si Echekwa Ya na Ihe Ọ Na-enye n’Ahụ́

Idebe tomato n’ebe jụrụ oyi na-eme ka ụtọ ya ghara ịpụtacha, n’ihi ya, etinyela ya na friji. Ị chọọ ka ọ chaa ngwa ngwa, ị pụrụ ịwụsa ya n’isi windo n’ebe anwụ ga na-achasa ya ma ọ bụ ịwụnye ya n’ime efere ma tụkwasị otu tomato ma ọ bụ unere chara acha n’elu ya ma debe ya n’ime ụlọ. Ụzọ ọzọ ị pụrụ isi mee ya bụ ịwụnye ya n’ime akpa nchara e ji akwụkwọ mee ma hapụ ya ruo ụbọchị ole na ole.

Tomato na-adị mma n’ahụ́. Ihe ndị ha na-enye na-ahụ́ bụ ụdị vitamin nke A, nke C, na nke E, ha na-enyekwa potassium, calcium, na mineral salt. Ndị nchọpụta achọpụtawala na ha na-enye nnọọ lycopene, bụ́ nke ha na-ekwu na ọ na-eme ka mmadụ ghara ibute ụfọdụ ọrịa ndị dị ka ọrịa cancer na ọrịa obi, ngwa ngwa. Pasent iri itoolu na atọ ruo iri itoolu na ise nke ihe mejupụtara  tomato bụ mmiri. Obi ga-adịkwa ndị na-achọghị ibu ibu ụtọ ịmara na o nwechaghị calorie.

E Ji Ya Esi Nri Ụtọ Dị Iche Iche

Ị zụwa tomato, olee ụdị ị ga-azụ? Ụdị nke ahụ a ma ama, bụ́ nke na-acha ọbara ọbara, dị mma iji mee salad, iji sie ofe, na stuu. Ụdị nke ahụ na-epe mpe, bụ́ nke ụfọdụ n’ime ha na-acha ọbara ọbara, oroma oroma, ma ọ bụ odo odo, na-adị nnọọ mma ịracha ná ndụ n’ihi na ha na-atọ ezigbo ụtọ n’ihi nnukwu shuga na-adị na ha. Ọ bụrụ na ị na-esi nri a na-akpọ pizza ma ọ bụ supageti, ikekwe ụdị nke ahụ na-adị ka ube, bụ́ nke ahụ́ ya na-esi ike, ga-aka mma. Ụdị nke na-ebu ibu, ahụ́ ya bụ uru uru, na-adị nnọọ mma iji ghee ihe oghighe. Ụdị nke na-acha akwụkwọ ndụ akwụkwọ ndụ, bụ́ nke ụfọdụ n’ime ha na-atụ àgwà, na-amagbu onwe ya iji mee salad. N’ezie, ụtọ tomato na ụcha ya na-eme ka ụtọ nri dịgasị iche iche e ji akwụkwọ nri, àkwá, supageti, anụ, na azụ esi, pụtakwuo. Ọ bụrụ na ị hụghị tomato mkpụrụ ị ga-azụ, ihe ịrụ ụka adịghị ya na ị ga-ahụ tomato mkpọ n’ụlọ ahịa dị n’obodo unu.

Onye ọ bụla na-esi nri nwere ihe ndị o ji tomato esi, ma ihe ndị na-esonụ bụ nri ole na ole e kwuru na e jikwa tomato akwadebe bụ́ ndị ị pụrụ ịnwale.

1. Ị chọọ ịkwadebe nri na-ejide afọ, bee tomato ma tụkwasị ha n’elu cheese, tụkwasịkwa ibe ube Bekee n’elu ha. Fesa ha mmanụ oliv na ose ojii. Werezie akwụkwọ osisi a na-akpọ basil chọọ ya mma.

2. Ị chọọ ime salad ndị Gris, bee tomato, kukumba, ụdị cheese a na-akpọ feta, oliv ojii, na yabasị. Tinye ha nnu na ose, fesatụ ha mmanụ oliv na mmiri oroma lemon.

3. Ị chọọ isi stuu ndị Mexico, berisie tomato ndụ, yabasị, ose na-achaghị acha, na akwụkwọ coriander, gwakọta ha na obere mmiri oroma nkịrịsị.

4. Ị chọọ isi stuu tomato dị ụtọ nke na-agaghị ara ahụ́ osisi bụ́ nke ị ga-eji rie supageti, wụnye tomato e berisiri eberisi n’ime ite, tinye ya obere shuga, mmanụ oliv, galik e berisiri eberisi, akwụkwọ nri ụfọdụ dị ka akwụkwọ basil, akwụkwọ bay, ma ọ bụ akwụkwọ oregano, nakwa nnu na ose. Sinye ya n’ọkụ ma hapụ ya ka ọ gbọọ ruo ihe dị ka minit iri abụọ ruo mgbe stuu ahụ ga-arọ arọ. Kunye ya n’elu supageti ahụ i siri.

Tomato a bụ́ mkpụrụ e ji esi ọtụtụ ihe bụ nanị otu n’ime ihe dịgasị iche iche magburu onwe ha Chineke kere ka anyị na-eri.