Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ụlọ Mgbe Ochie Egosipụta Aha Chineke

Ụlọ Mgbe Ochie Egosipụta Aha Chineke

Ụlọ Mgbe Ochie Egosipụta Aha Chineke

SITE N’AKA ONYE EDEMEDE TETA! NA SLOVENIA

Na narị afọ ndị gafeworonụ, a rụrụ ụlọ chọọchị nakwa ebe obibi ndị mọnk dị iche iche n’elu ugwu n’akụkụ nile nke Europe. Ụfọdụ n’ime ụlọ mgbe ochie ndị a yiri ndị a rụrụ na Rom Mgbe Ụwa Na-emepechabeghị Anya—ndị na-enwekarị mgbidi dị ikputu na ogidi rọrọ arọ—ndị ọzọ yiri ndị a rụrụ na narị afọ ndị sochirinụ bụ́ ndị e ji ihe osise na ihe ọkpụkpụ chọọ mma nke ukwuu. Ọ dị mma ị mara na a pụrụ ịhụ Tetragrammaton, bụ́ mkpụrụ akwụkwọ Hibru anọ ndị nọchitere aha Chineke, n’ime ọtụtụ ụlọ ndị a.

Dị ka ihe atụ, tụlee banyere ebe obibi ndị mọnk nke dị na Stična, bụ́ otu n’ime ebe obibi ndị mọnk Cistercian kasị mee ochie na Slovenia. A rụrụ ya n’afọ 1135, ihe dị ka nanị afọ 40 mgbe e hiwesịrị òtù ndị mọnk Cistercian na France. N’agbanyeghị na a rụgharịwo ya ọtụtụ ugboro, ọ ka dịkwa ka ụlọ ndị Rom, ihe e mere ugbu a bụ na e ji ihe osise na ihe ọkpụkpụ chọọ ya mma nke ukwuu. E ji ihe osise na ihe oyiyi dị iche iche chọọ ime ya mma. E ji tetragrammaton nke e dere ná mkpụrụ akwụkwọ ọlaedo gbara okpotokpo bụ́ nke e ji ọlaọcha gbaa okirikiri, chọọ otu akụkụ nke ọlta ya mma.

Ebe mbụ e kwuru banyere obodo Slovenj Gradec bụ n’ihe ndekọ e dere laa azụ na narị afọ nke iri. A rụrụ otu ụlọ e ji mere chọọchị na ụlọ ọgwụ n’ebe ahụ n’afọ 1419. Otu akụkụ nke mgbidi ime ụlọ ahụ bu ihe osise 27 ndị na-egosi ihe ndị mere na Bible, bụ́ ndị e sere na narị afọ nke 15. Ihe osise ndị ahụ malitere na nke mbilite n’ọnwụ Lazarọs ma kwụsị na nke Pentikọst. N’akụkụ ọzọ nke otu ụlọ ahụ, e ji mkpụrụ akwụkwọ ojii dee aha Chineke n’asụsụ Hibru n’ebe na-acha ọlaedo ọlaedo.

Obodo Radovljica dị n’ógbè ebe ugwu ọdịda anyanwụ nke mba ahụ. N’afọ ndị 1400, e ji mgbidi na ekpe gbaa obodo nta ahụ okirikiri, o nwekwara nnukwu ụlọ chọọchị na ụdị ụlọ ndị ọzọ. Tetragrammaton dị n’otu ihe ncheta e ji ọlaedo mee bụ́ nke dị n’otu n’ime ọlta ndị dị na chọọchị ahụ.

Na nso obodo nta bụ́ Podčetrtek, e nwere otu ebe obibi ndị mọnk ochie, bụ́ nke a rụrụ na narị afọ nke 17. N’ime ụlọ ahụ, onye anya na-eru ala ga-ahụ ebe a kanyere aha Chineke n’ahụ ájá.

A pụrụ ịhụ Tetragrammaton n’ọtụtụ ụlọ mgbe ochie ndị ọzọ dị na Slovenia. N’ihi ya, ka ndị na-eme njem nleta na-ekiri nkà na ihe osise ochie ndị a, ha pụrụ ịmata na ndị mgbe ochie maara aha Chineke.

[Foto dị na peeji nke 31]

Otu akụkụ ọlta dị n’ebe obibi ndị mọnk dị na Stična

[Foto dị na peeji nke 31]

N’ime ụlọ chọọchị Sveti Duh nke dị na Slovenj Gradec

[Ebe E Si Nweta Foto]

Slovenj Gradec - Cerkev Sv. Duha, Slovenija