Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ọgụ A Lụrụ Megide Aha Chineke

Ọgụ A Lụrụ Megide Aha Chineke

Ọgụ A Lụrụ Megide Aha Chineke

AHA ya bụ Hananiah ben Teradion. Ọ bụ onye Juu bụ́ ọkà mmụta na narị afọ nke abụọ O.A., a makwaara ya maka nzukọ ihu ọha ndị ọ na-ehiwe bụ́ ndị ọ nọ na ha kụziere ndị mmadụ Sefer Torah, bụ́ akwụkwọ mpịakọta nke ihe mejupụtara ya bụ akwụkwọ ise ndị mbụ nke Bible. A makwaara Ben Teradion maka iji aha Chineke eme ihe na ịkụziri ya ndị ọzọ. Ebe ọ bụ na akwụkwọ ise ndị mbụ nke Bible bu aha Chineke ihe karịrị ugboro 1,800, ò nwerenụ otú ọ ga-esi kụzie Torah n’akụzighị aha Chineke?

Otú ọ dị, oge Ben Teradion bụ oge dị ize ndụ nye ndị ọkà mmụta bụ́ ndị Juu. Dị ka ndị Juu na-akọ akụkọ ihe mere eme si kwuo, eze ukwu Rom mere ka ịkụzi ma ọ bụ ikpe okpukpe ndị Juu bụrụ ihe megidere iwu bụ́ nke a na-ama onye dara ya ikpe ọnwụ. N’ikpeazụ, ndị Rom jidere Ben Teradion. Mgbe e jidere ya, o ji akwụkwọ mpịakọta Sefer Torah. Mgbe ọ na-aza ndị na-ebo ya ebubo okwu, o ji obi ọcha kweta na n’ịkụzi Bible, ihe ya na-eme bụ nanị irube isi n’iwu Chineke. N’agbanyeghị nke ahụ, a mara ya ikpe ọnwụ.

N’ụbọchị e gburu Ben Teradion, e ji akwụkwọ mpịakọta Bible ahụ o ji mgbe e jidere ya kee ya n’ahụ́. A kpọzie ya ọkụ n’elu osisi. Akwụkwọ bụ́ Encyclopædia Judaica na-ekwu na “iji mee ka ọ nụ ụfụ ọnwụ ruo ogologo oge, a tụkwasịrị n’obi ya, ihe ndị e ji ajị anụ mee bụ́ ndị a banyere na mmiri, ka o wee ghara ịnwụ ngwa ngwa.” Dị ka ihe ndị so na ntaramahụhụ e nyere ya, e gbukwara nwunye ya ma renye nwa ya nwanyị n’ụlọ ndị akwụna.

Ọ bụ ezie na ọ bụ ndị Rom ji obi ịta mmiri gbuo Ben Teradion, Talmud * na-ekwu na “ntaramahụhụ nke ịkpọ ya ọkụ bịakwasịrị ya n’ihi na ọ kpọpụtaruru Aha ahụ n’isi.” Ee, nye ndị Juu, ịkpọpụta aha Chineke bụ n’ezie mmehie dị oké njọ.

Iwu nke Atọ Ahụ

Ihe àmà na-egosi na n’ime narị afọ nke mbụ na nke abụọ O.A., ndị Juu bịara nwee nkwenkwe ụgha banyere iji aha Chineke eme ihe. Mishnah (ndepụta nke nkọwa dị iche iche ndị rabaị nyere bụ́ nke a gbakwasịrị ụkwụ na ha wee dee Talmud) na-ekwu na “onye kpọpụtara aha Chineke otú e si asụpe ya” enweghị òkè na Paradaịs elu ala na-abịanụ nke Chineke kwere ná nkwa.

Gịnị kpatara mmachibido iwu dị otú ahụ? Ụfọdụ na-ekwu na ndị Juu weere aha Chineke dị ka ihe dị nnọọ nsọ nke na ụmụ mmadụ na-ezughị okè ekwesịghị ịkpọpụta ya. E mesịa, a bịaziri na-ala azụ idedị aha ahụ ede. Dị ka otu akwụkwọ si kwuo, a malitere ịtụ ụjọ ahụ n’ihi nchegbu a na-enwe na a pụrụ imesị tụnye akwụkwọ e dere aha ahụ n’ikpo ahịhịa, na-eme ka aha Chineke gharazie ịdị nsọ.

Akwụkwọ bụ́ Encyclopædia Judaica na-ekwu na “ihe mere e ji na-ezere ịkpọpụta aha ahụ bụ́ YHWH . . . bụ nghọtahie a ghọtahiere Iwu nke Atọ ahụ.” Nke atọ n’ime Iwu Iri ahụ Chineke nyere ụmụ Izrel na-ekwu, sị: “Gị eburula aha Jehova, bụ́ Chineke gị, ime ihe efu; n’ihi na Jehova agaghị agụ onye na-eburu aha Ya ime ihe efu n’onye ikpe na-amaghị.” (Ọpụpụ 20:7) N’ihi ya, a gbagọrọ iwu ahụ Chineke nyere megide iji aha ya eme ihe n’ụzọ na-ezighị ezi gaa na nkwenkwe ụgha.

N’ezie, taa, ọ dịghị onye na-ekwu na Chineke ga-eme ka a kpọọ mmadụ ọkụ n’elu osisi n’ihi ịkpọpụta aha Ya! Ma, nkwenkwe ụgha ndị Juu nwere banyere aha Chineke ka dịgidere. Ọtụtụ ndị ka na-ekwu na Tetragrammaton ahụ bụ “Aha A Na-apụghị Ịkpọpụta Akpọpụta.” N’ebe ụfọdụ, a na-ama ụma akpọhie aha Chineke iji zere imebi ọdịnala ahụ. Dị ka ihe atụ, a na-akpọ Jaa, ma ọ bụ Yaa, nke bụ́ mkpọbiri nke aha Chineke, ịbụ Kaa. A na-akpọ Haleluja, Haleluka. Ụfọdụ na-ezere ọbụna idepụtacha okwu e ji eme ihe maka “Chineke.”

Mgbalị Ndị Ọzọ E Mere Iji Zochie Aha Ahụ

Okpukpe ndị Juu abụghị nanị okpukpe na-ezere iji aha Chineke eme ihe. Tụlee ihe banyere Jerome, bụ́ ụkọchukwu Katọlik na odeakwụkwọ nke Popu Damasus nke Mbụ. N’afọ 405 O.A., Jerome sụgharịchara Bible dum gaa n’asụsụ Latin, bụ́ nke a maara dị ka nsụgharị Vulgate nke Latin. Jerome edenyeghị aha Chineke ná nsụgharị ya. Kama nke ahụ, n’ịgbaso ihe a na-eme n’oge ya, o ji okwu ndị bụ́ “Onyenwe Anyị” na “Chineke” dochie aha Chineke. Nsụgharị Vulgate nke Latin ghọrọ nsụgharị Bible mbụ chọọchị Katọlik kwadoro iji na-eme ihe, ọ bụkwa ebe e si wee sụgharịa ọtụtụ nsụgharị ndị ọzọ gaa n’asụsụ dịgasị iche iche.

Dị ka ihe atụ, nsụgharị Douay Version, bụ́ Bible Katọlik a sụgharịrị n’afọ 1610, bụ n’ụzọ bụ́ isi, Vulgate nke Latin a sụgharịrị gaa n’asụsụ Bekee. Ya mere, ọ bụghị ihe ijuanya na ọ dịtụghị ebe aha Chineke dị na Bible a. Otú ọ dị, Douay Version abụghị nnọọ nsụgharị Bible so ibe ya dịrị. Ọ ghọrọ nanị Bible a kwadoro ka ndị Katọlik na-asụ Bekee jiri na-eme ihe ruo n’afọ ndị 1940. Ee, ruo ọtụtụ narị afọ, e zochiiri ọtụtụ nde ndị Katọlik ji okpukpe kpọrọ ihe aha Chineke.

Tụleekwa nsụgharị King James Version. N’afọ 1604, eze England, bụ́ James nke Mbụ, nyere otu ìgwè ndị ọkà mmụta ọrụ ịsụgharị Bible gaa n’asụsụ Bekee. Ihe dị ka afọ asaa mgbe nke ahụ gasịrị, ha wepụtara King James Version, nke a makwaara dị ka Authorized Version.

Ná nsụgharị a kwa, ndị nsụgharị ahụ họọrọ izere aha Chineke, na-eji ya eme ihe nanị n’amaokwu ole na ole. N’ebe ka ọtụtụ, e ji okwu bụ́ “ONYENWE ANY” ma ọ bụ “CHINEKE” dochie aha Chineke. Nsụgharị a ghọrọ Bible bụ́ isi nke ọtụtụ nde mmadụ ji eme ihe. Akwụkwọ bụ́ World Book Encyclopedia na-ekwu na “ọ dịghị Bible Bekee ọzọ dị mkpa a sụgharịrị ruo ihe karịrị afọ 200 kemgbe e bipụtasịrị King James Version. N’oge ahụ, King James Version bụ nsụgharị ndị na-asụ asụsụ Bekee kasị jiri mee ihe.”

Nsụgharị ndị a e kwuru n’elu bụ nanị atọ n’ime ọtụtụ nsụgharị Bible ndị e bipụtara na narị afọ ndị gara aga bụ́ ndị na-ejighị aha Chineke mee ihe ma ọ bụ ndị na-emeghị ka ọ pụta ìhè nke ọma. Ka a sịkwa ihe mere na ihe ka nnọọ ọtụtụ ná ndị sị na ha bụ Ndị Kraịst taa adịghị eji aha Chineke eme ihe ma ọ bụkwanụ bụrụ ndị na-amaghịdị aha ya. N’ezie, n’ime afọ ndị gafeworonụ, ụfọdụ ndị nsụgharị Bible etinyewo aha Chineke ná nsụgharị ha. Otú ọ dị, e bipụtara ihe ka ọtụtụ n’ime ha na nso nso a, ha enwechaghịkwa mmetụta dị ukwuu n’ịgbanwe echiche a na-enwekarị banyere aha Chineke.

Omume nke Megidere Uche Chineke

Ojiji ọtụtụ mmadụ na-ejighị aha Chineke eme ihe dabeere nnọọ n’ọdịnala mmadụ, ọ bụghị n’ozizi Bible. “Ọ dịghị ihe e kwuru na Torah nke na-amachibido mmadụ ịkpọpụta Aha Chineke. N’ezie, o doro anya site n’Akwụkwọ Nsọ na e ji aha Chineke mee ihe mgbe nile,” ka onye Juu na-eme nchọpụta bụ́ Tracey R. Rich na-ekwu, bụ́ onye nwe ebe a na-edebe ihe ọmụma n’Intanet nke a na-akpọ Judaism 101. Ee, n’oge Bible, ndị na-efe Chineke ofufe ji aha ya mee ihe.

N’ụzọ doro anya, ịmara aha Chineke na iji ya eme ihe na-eme ka anyị na-efekwu ya ofufe n’ụzọ ọ kwadoro, ụzọ e si fee ya ofufe n’oge Bible. Nke a pụrụ ịbụ nzọụkwụ mbụ anyị n’iso ya na-enwe mmekọrịta, bụ́ nke dị nnọọ mma karịa nanị ịmara ihe bụ́ aha ya. Jehova Chineke na-akpọ anyị n’ezie iso ya nwee mmekọrịta dị otú ahụ. O ji ike mmụọ nsọ mee ka a kpọọ òkù a na-ekpo ọkụ: “Bịaruonụ Chineke nso, ọ ga-abịarukwa unu nso.” (Jems 4:8) Otú ọ dị, ị pụrụ ịjụ, sị, ‘Olee otú mmadụ na-anwụ anwụ pụrụ isi soro Chineke nke Pụrụ Ime Ihe Nile na-akpachi anya otú ahụ?’ Isiokwu na-esonụ na-akọwa otú ị pụrụ isi soro Jehova na-enwe mmekọrịta.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 5 Talmud bụ akwụkwọ e depụtara ọdịnala oge ochie nke ndị Juu, a na-ewerekwa ya dị ka otu n’ime akwụkwọ ndị kasị nsọ na ndị a kasị akwanyere ùgwù n’okpukpe ndị Juu.

[Igbe dị na peeji nke 20]

Haleluja

Gịnị na-agbata gị n’uche mgbe ị nụrụ “Haleluja”? Ikekwe ọ na-echetara gị abụ Handel nke isiokwu ya bụ “Mezaịa,” bụ́ ọmarịcha abụ a bụrụ malite n’afọ ndị 1700, nke a na-eji olu ụtọ ekwe Haleluja na ya. N’ezie, ị nụwo okwu ahụ bụ́ “Haleluja” n’otu ebe ma ọ bụ n’ebe ọzọ. Ikekwe, ị na-ekwudị ya site n’oge ruo n’oge. Ma ị̀ maara ihe ọ pụtara?

Haleluja—Nke a bụ ndegharị e ji mkpụrụ akwụkwọ Igbo degharịa okwu Hibru bụ́ ha·lelu-Yahʹ, nke pụtara “too Jaa,” ma ọ bụ “toonụ Jaa.”

Jaa—Nke a bụ ndebiri e ji eme ihe n’uri maka aha Chineke, bụ́ Jehova. Ọ pụtara na Bible ihe karịrị ugboro 50, mgbe mgbe dị ka akụkụ nke okwu bụ́ “Haleluja.”

[Igbe dị na peeji nke 21]

Aha Chineke Ọ̀ Dị n’Aha Gị?

Ọtụtụ mmadụ taa ka na-aza ọtụtụ aha ndị dị na Bible. Aha Chineke dị n’ihe ụfọdụ n’ime aha ndị ahụ pụtara n’asụsụ Hibru mbụ. Lee ihe atụ ole na ole nke aha ndị dị otú ahụ na ihe ha pụtara. Ikekwe aha gị so n’ime ha.

Joana—“Jehova Anọwo Na-eme Amara”

Joel—“Jehova Bụ Chineke”

Jonatan—“Jehova Enyewo”

Josef—“Ka Jaa Tinyekwuo” *

Jọn—“Jehova Egosiwo Ihu Ọma”

Jọshụa—“Jehova Bụ Nzọpụta”

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 33 “Jaa” bụ mkpọbiri nke aha bụ́ “Jehova.”

[Igbe dị na peeji nke 22]

Okwu Ndị E Ji Mee Ihe na Bible Maka Chineke

E ji ọtụtụ okwu Hibru mee ihe n’Akwụkwọ Nsọ maka Chineke, ndị dị ka Onye Pụrụ Ime Ihe Nile, Onye Okike, Nna, na Onyenwe Anyị. Ma, ebe ndị a kpọrọ ya aha ya karịrị nnọọ ebe nile a kpọrọ ya ihe ndị ọzọ ma a gụkọta ha ọnụ. N’ụzọ doro anya, ọ bụ uche Chineke ka anyị na-akpọ ya aha ya. Tụlee ndepụta nke okwu ndị na-esonụ dị ka ha si dị n’Akwụkwọ Nsọ Hibru. *

Jehova—ugboro 6,973

Chineke—ugboro 2,605

Onye Pụrụ Ime Ihe Nile—ugboro 48

Onyenwe Anyị—ugboro 40

Onye Mere—ugboro 25

Onye Okike—ugboro 7

Nna—ugboro 7

Onye Ochie—ugboro 3

Onye Nkụzi Ukwu—ugboro 2

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 40 Ugboro ole a na-eme atụmatụ na e ji ha mee ihe dị ka ha pụtara na New World Translation of the Holy Scriptures, nke Ndịàmà Jehova bipụtara.

[Igbe dị na peeji nke 23]

Chineke nke Na-eme Ka Ihe Dịrị

Ndị ọkà mmụta enwechaghị nkwekọrịta banyere ihe aha Chineke, bụ́ Jehova, pụtara. Otú ọ dị, mgbe ọtụtụ n’ime ha mesịrị nnyocha sara mbara, ha bịara kwere na aha ahụ bụ ụdị nke ngwaa Hibru bụ́ ha·wahʹ (ghọọ), nke pụtara “Ọ Na-eme Ka Ọ Ghọọ.”

N’ihi ya, na New World Translation of the Holy Scriptures, * lee otú e si sụgharịa ihe ndekọ ahụ dị n’Ọpụpụ 3:14, bụ́ ebe Mozis jụrụ Chineke aha ya: “Chineke wee gwa Mozis, sị: ‘M ga-abụ ihe m chọrọ ịbụ.’ O kwukwara, sị: ‘Nke a bụ ihe ị ga-agwa ụmụ Izrel, “M ga-abụ ezitewo m ka m bịakwute unu.”’”

Nsụgharị ahụ dabara adaba n’ihi na Chineke nwere ikike ime ka ya onwe ya ghọọ ihe ọ bụla ọ dị mkpa ka ọ ghọọ. Ọ dịghị ihe pụrụ ịkwụsị ya ime ihe ọ bụla dị mkpa iji mezuo uche ya. Nzube ya na nkwa ya na-emezu mgbe nile. N’ụzọ dị ịrịba ama, Chineke gosipụtara na ya bụ Onye Okike, onye nwere ike a na-akparaghị ókè ime ka ihe dịrị. O mere ka eluigwe na ala a na-ahụ anya dịrị. O kekwara imerime ndị mmụọ. N’eziokwu, ọ bụ Chineke nke na-eme ka ihe dịrị!

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 55 Nke Ndịàmà Jehova bipụtara.

[Foto dị na peeji nke 19]

Ihe a tụrụ atụ nke na-egosi otú e si gbuo Hananiah ben Teradion

[Foto ndị dị na peeji nke 22, 23]

Ebe Ndị E Gosipụtara Aha Chineke n’Ụzọ Pụtara Ìhè

1. Otu chọọchị dị na Lomborg, Denmark, narị afọ nke 17

2. Windo nwere ugegbe tụrụ àgwà, katidral nke Bern, Switzerland

3. Akwụkwọ Mpịakọta Osimiri Nwụrụ Anwụ, n’ihe odide Hibru oge ochie, Izrel, ihe dị ka 30-50 O.A.

[Ebe E Si Nweta Foto]

Shrine of the Book, Israel Museum, Jerusalem

4. Mkpụrụ ego ndị Sweden, 1600

[Ebe E Si Nweta Foto]

Kungl. Myntkabinettet, Sveriges Ekonomiska Museum

5. Akwụkwọ ekpere ndị Germany, 1770

[Ebe E Si Nweta Foto]

Site n’akwụkwọ bụ́ Die Lust der Heiligen an Jehova. Oder: Gebaet-Buch, 1770

6. Ihe e dere na nkume, Bavaria, Germany

7. Nkume Moab, Paris, France, 830 T.O.A.

[Ebe E Si Nweta Foto]

Musée du Louvre, Paris

8. Ihe e sere n’elu ụlọ chọọchị, Olten, Switzerland