Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Chineke Nwere Aha!

Chineke Nwere Aha!

 Chineke Nwere Aha!

Gịnị bụ aha Chineke? Ụmụ mmadụ nwechara aha. Leenụ, ọtụtụ mmadụ gụrụ ọbụna anụ ha ji mere enyi aha! Ọ́ gaghị abụ ihe ezi uche dị na ya Chineke inwe aha? Inwe aha na iji ha eme ihe bụ n’ezie ihe dị oké mkpa ma a bịa ná mmekọrịta nke ụmụ mmadụ. Ò kwesịrị ịdị iche ma a bịa ná mmekọrịta nke anyị na Chineke? N’ụzọ dị iche, ọtụtụ nde mmadụ bụ́ ndị na-ekwu na ha kweere na Chineke nke Bible adịghị eji aha ya eme ihe. Ma, a mawo aha Chineke eri ọtụtụ narị afọ. Ka ị na-agụ usoro isiokwu ndị a, chọpụta oge ndị ọtụtụ mmadụ ji aha Chineke mee ihe. Nke ka mkpa, chọpụta ihe Bible na-ekwu banyere ịmara aha Chineke.

KA Ọ na-erule narị afọ nke 17, ọtụtụ mba Europe nọ na-akpụ ego ndị e dere aha Chineke na ha. Ego ndị Germany a kpụpụtara n’afọ 1634, bu aha ahụ bụ́ Jehova n’ụzọ pụtara ìhè. A bịara mara mkpụrụ ego ndị dị otú ahụ dị ka mkpụrụ ego Jehova, e jikwa ha mee ihe ruo ọtụtụ iri afọ.

Jehova * bụ nsụgharị nke aha Chineke, bụ́ nke e jiworo mee ihe eri ọtụtụ narị afọ. Na Hibru, bụ́ asụsụ a na-esi n’aka nri gụrụ gaa n’aka ekpe, aha ahụ na-adị n’ụdị mgbochiume anọ, יהוה. A maara mkpụrụ akwụkwọ Hibru anọ ndị a—nke e ji mkpụrụ akwụkwọ ọzọ depụta ịbụ YHWH—dị ka Tetragrammaton. E dekwara aha Chineke n’ụdị a ná mkpụrụ ego ndị Europe ruo ọtụtụ iri afọ.

A pụkwara ịhụ aha Chineke n’ụlọ, n’ihe ncheta, n’ọrụ nkà dị iche iche, nakwa n’ọtụtụ abụ chọọchị. Dị ka akwụkwọ bụ́ Brockhaus encyclopedia nke Germany si kwuo, n’otu oge, ọ bụ ihe a na-ahụkarị bụ́ ndị ọchịchị Protestant iyi baajị nke bu anyanwụ e sere n’ụdị pụrụ iche, burukwa Tetragrammaton. A maara ihe osise na Tetragrammaton ahụ, bụ́ ndị e jikwa mee ihe n’ọkọlọtọ nakwa ná mkpụrụ ego, dị ka baajị Jehova na Anyanwụ. N’ụzọ doro anya, ndị Europe bụ́ ndị ji okpukpe kpọrọ nnọọ ihe na narị afọ nke 17 na 18 maara na Chineke nke Pụrụ Ime Ihe Nile nwere aha. Ihe dị ịrịba ama karị bụ na ha atụghị ụjọ iji ya mee ihe.

Aha Chineke abụghịkwa ihe omimi n’America n’oge mba ọzọ na-achị ha. Dị ka ihe atụ, tụlee banyere otu onye lụrụ agha maka Mgbanwe Ọchịchị n’America, bụ́ Ethan Allen. Dị ka akụkọ ndụ ya o dere n’onwe ya si kọọ, na 1775, o nyere iwu ka ndị iro ya chịlie aka elu “n’aha Jehova Ukwu ahụ.” E mesịa, n’oge Abraham Lincoln bụ president, ọtụtụ ndị ndụmọdụ ya kpọtụrụ Jehova aha ọtụtụ ugboro n’akwụkwọ ozi ndị ha degaara Lincoln. Akwụkwọ akụkọ ihe mere eme ndị ọzọ dị n’America, bụ́ ndị bu aha Chineke, dị n’ọtụtụ ọ́bá akwụkwọ ka ọha na eze wee nwee ike ịga tụlee ha. Ndị a bụ nanị ihe atụ ole na ole ndị na-egosi otú e siworo mee ka aha Chineke pụta ìhè eri ọtụtụ narị afọ.

 Gịnị banyere taa? È chezọwo aha Chineke? Mbanụ. Nsụgharị Bible dị iche iche nwere aha Chineke n’ọtụtụ amaokwu ha. Ọ bụrụ na ị gbara ngwa ngwa gaa n’ọ́bá akwụkwọ ma ọ bụ jiri minit ole na ole mee nnyocha n’akwụkwọ ọkọwa okwu gị, ikekwe ị ga-achọpụta na a nakweere aha ahụ bụ́ Jehova n’ebe nile dị ka nsụgharị nke Tetragrammaton ahụ. Dị ka ihe atụ, akwụkwọ bụ́ Encyclopedia International kọwara aha ahụ bụ́ Jehova n’ụzọ doro anya dị ka “nsụgharị ọgbara ọhụrụ nke aha nsọ Chineke nke dị n’asụsụ Hibru.” Mbipụta ọhụrụ nke akwụkwọ bụ́ The New Encyclopædia Britannica na-akọwa na Jehova bụ “aha ndị Juu na Ndị Kraịst na-akpọ Chineke.”

Ị pụrụ iche, sị, ‘Ndị mmadụ taa hà nwere mmasị n’aha Chineke?’ A ka na-ede aha Chineke, n’ụzọ dị iche iche, n’ọtụtụ ebe ọha na eze na-anọ. Dị ka ihe atụ, e dere aha ahụ bụ́ Jehova n’otu ụlọ dị na New York City. N’otu obodo ahụ, a hụwokwa aha ahụ n’asụsụ Hibru n’otu ihe osise mara mma nke e ji chọọ otu ọdụ ụgbọ okporo ígwè dị n’okpuru ala bụ́ nke na-ekwo ekwo, mma. Otú ọ dị, nke bụ́ eziokwu bụ na, ma eleghị anya, n’ime ọtụtụ puku ndị jiworo ụkwụ si n’ebe ndị a gafee, ọ bụ nanị mmadụ ole na ole weerela ihe odide ndị ahụ dị ka ihe dị mkpa.

Ndị nọ n’akụkụ ụwa ebe i bi, hà weere aha Chineke dị ka ihe dị mkpa? Ka ihe ka ọtụtụ hà na-akpọ Onye Okike ahụ “Chineke,” dị ka à ga-asị na utu aha a bụ ezigbo aha ya? Nchọpụta gị pụrụ ịbụ na ọtụtụ ndị adịghị eche echiche ma Chineke ò nwedịrị aha. Gịnị banyere gị? Ahụ́ ọ̀ na-eru gị ala ịkpọ Chineke aha ya, bụ́ Jehova?

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 4 Usoro isiokwu ndị a na-egosipụta ụzọ 39 e si ede aha ahụ bụ́ Jehova n’ihe karịrị asụsụ 95.

[Igbe/Foto dị na peeji nke 18]

Eze nke Mere Ka A Mara Aha Jehova

N’afọ 1852, otu ìgwè ndị ozi ala ọzọ si Hawaii gawa àgwàetiti Micronesia. Ha ji akwụkwọ ozi nkọwa nke Eze Kamehameha nke Atọ, bụ́ eze na-achị Àgwàetiti Hawaii n’oge ahụ, bịanyere aka na ya. Ihe ụfọdụ e dere n’akwụkwọ ozi a, bụ́ nke e bu ụzọ dee n’asụsụ Hawaiian, nke e degakwaara ọtụtụ ndị na-achị àgwàetiti ndị dị na Pacific, bụ: “Ụfọdụ ndị ozizi nke Chineke Kasị Ihe Nile Elu, bụ́ Jehova, na-aga iji ụgbọ mmiri bịa n’àgwàetiti unu, ime ka unu mara Okwu Ya maka nzọpụta ebighị ebi unu. . . . Ana m asị ka unu kwanyere ezigbo ndị ozizi a ùgwù ma mee ha enyi, ana m agbakwa unu ume ka unu gee ntị n’ihe ha ga-ezi unu. . . . Ana m adụ unu ọdụ ka unu tụfusịa arụsị unu, nakwere Onyenwe anyị Jehova dị ka Chineke unu, fee Ya ofufe ma hụ Ya n’anya, Ọ ga-agọzikwa ma zọpụta unu.”

[Foto]

Eze Kamehameha nke At

[Ebe E Si Nweta Foto]

Hawaii State Archives

[Foto dị na peeji nke 17]

Tetragrammaton ahụ, nke pụtara “mkpụrụ akwụkwọ anọ,” bụ aha Chineke n’asụsụ Hibru