Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Mgbe Ahụ́ Ọkụ Jidere Nwa Gị

Mgbe Ahụ́ Ọkụ Jidere Nwa Gị

Mgbe Ahụ́ Ọkụ Jidere Nwa Gị

“Ahụ́ adịghị m!” Mgbe nwa gị ji olu ákwá kwuo ihe a, ị pụrụ ibitụ ya aka n’ahụ́ ozugbo iji mara otú ahụ́ ya na-ekporu n’ọkụ. Ọ bụrụ na ahụ́ ọkụ ji ya, ọ bụ ihe kwere nghọta na ị pụrụ inwe nchegbu.

Dị ka otu nnyocha Ogige Ụmụaka nke Johns Hopkins bụ́ nke dị na Baltimore, Maryland, U.S.A. mere si dị, pasent 91 nke ndị nne na nna kweere na “ọbụna obere ahụ́ ọkụ pụrụ ibibi, ma ọ dịkarịa ala, otu ihe n’ahụ́, dị ka ime ka onye ahụ tụbọọ ma ọ bụ imebi ụbụrụ ya.” Otu nnyocha ahụ na-egosi na “pasent 89 nke ndị nne na nna nyere ụmụ ha ọgwụ ndị na-ebelata ahụ́ ọkụ tupu ọ̀tụ̀tụ̀ ikpo ọkụ nke ahụ́ nwa ahụ eruo 102 degree Fahrenheit (38.9 degree Celsius).”

Olee nnọọ ókè i kwesịrị inweru nchegbu ma ahụ́ ọkụ jide nwa gị? Oleekwa ụzọ ndị kasị mma isi gwọọ ya?

Ọrụ Dị Mkpa Ahụ́ Ọkụ Na-arụ

Gịnị na-akpata ahụ́ ọkụ? Ọ bụ ezie na nkezi ọ̀tụ̀tụ̀ ikpo ọkụ nke ahụ́ onye ahụ́ dị bụ ihe dị ka 37 degree Celsius (nke a na-achọpụta site n’itinye ngwá ọrụ e ji achọpụta ọ̀tụ̀tụ̀ ikpo ọkụ nke ahụ́ n’ọnụ), ọ̀tụ̀tụ̀ ikpo ọkụ nke ahụ́ mmadụ na-ejikarị otu degree ma ọ bụ karịa na-ebelata ma ọ bụ na-arị elu n’oge dịgasị iche iche n’ụbọchị. * Ọ̀tụ̀tụ̀ ikpo ọkụ nke ahụ́ gị pụrụ ịdịtụ ala n’ụtụtụ ma dịtụ elu n’ehihie. Akụkụ ụbụrụ bụ́ hypothalamus, bụ́ nke dị n’ala ala ụbụrụ, na-achịkwa ọ̀tụ̀tụ̀ ikpo ọkụ nke ahụ́, dị nnọọ ka thermostat si achịkwa ọ̀tụ̀tụ̀ ikpo ọkụ nke ígwè ọrụ. Ahụ́ ọkụ na-ejide mmadụ mgbe usoro ahụ́ ji alụso ọrịa ọgụ mepụtara ihe na-akpata ahụ́ ọkụ nke a na-akpọ pyrogen n’ọbara, ikekwe n’ihi nje bacteria ma ọ bụ nje virus banyere onye ahụ n’ahụ́. Nke a na-eme ka akụkụ ụbụrụ bụ́ hypothalamus mee ka ọ̀tụ̀tụ̀ ikpo ọkụ nke ahụ́ onye ahụ laa elu.

Ọ bụ ezie na ahụ́ ọkụ pụrụ ime ka ahụ́ ghara iru mmadụ ala ma mee ka mmiri gwụ mmadụ n’ahụ́, ọ bụchaghị ihe dị njọ. N’ezie, o yiri ka ahụ́ ọkụ ọ̀ na-ekere òkè bụ́ isi n’inyere ahụ́ aka iwepụ nje bacteria na nje virus, dị ka Ụlọ Ọrụ Mayo Maka Ịmụ na Ime Nnyocha Banyere Ọgwụ si kwuo. “Nje virus ndị na-akpata àzụ̀zụ̀ na ọrịa akpa ume ndị ọzọ na-enwe mmasị ịnọ n’ebe jụrụ oyi. Site n’ime ka obere ahụ́ ọkụ jide gị, ahụ́ gị pụrụ n’ezie ịdị na-enye aka egbu nje virus ahụ.” N’ihi ya, ụlọ ọrụ a kwukwara na “ọ dịghị mkpa ibelata obere ahụ́ ọkụ jidere nwa gị, n’ihi na ime otú ahụ pụrụ ime ka ahụ́ nwa gị gharazie inwe ike ịlụso ọrịa ọgụ n’onwe ya.” N’ụzọ na-akpali mmasị, otu ụlọ ọgwụ dị na Mexico ọbụna na-agwọ ụdị ọrịa ụfọdụ site n’ime ka ọ̀tụ̀tụ̀ ikpo ọkụ nke ahụ́ rịkwuo elu, bụ́ ụdị ọgwụgwọ a na-akpọ hyperthermia.

Dr. Al Sacchetti nke Kọleji America nke A Na-azụ Ndị Dibịa Na-ahụ Maka Ndị Ọrịa Nọ n’Ọnọdụ Chọrọ Ime Ihe Ngwa Ngwa na-ekwu, sị: “Ahụ́ ọkụ n’onwe ya adịchaghị abụ nsogbu. Otú ọ dị, ọ bụ ihe àmà nke na-egosi na mmadụ pụrụ ibu ọrịa. N’ihi ya, mgbe ahụ́ ọkụ jidere nwatakịrị, ebe e kwesịrị ilekwasị anya bụ n’ebe nwa ahụ nọ, nakwa n’ọrịa ọ pụrụ ịbụ na o butere, ọ bụghị n’ọ̀tụ̀tụ̀ ikpo ọkụ nke ahụ́ ya.” Ụlọ Akwụkwọ America A Na-amụ Banyere Ọrịa Ụmụaka na-ekwu, sị: “Ahụ́ ọkụ ndị ọ̀tụ̀tụ̀ ikpo ọkụ ha na-erughị 101 degree Fahrenheit (38.3 degree Celsius) n’ozuzu ha adịghị mkpa ka a ṅụwara ha ọgwụ, ọ gwụla ma ọ bụ na ahụ́ erughị nwa gị ala ma ọ bụ na ihe ọdịdọ emetụla ya n’oge ahụ́ ọkụ ji ya. Ọbụna oké ahụ́ ọkụ n’onwe ya adịghị ize ndụ ma ọ bụ bụrụ oké ihe, ọ gwụla ma ihe ọdịdọ ò metụla nwa gị ma ọ bụ na ọ na-arịa ọrịa na-adịghị ala ala. Ihe dị mkpa karị bụ ịchọpụta otú nwa gị si na-akpa àgwà. Ọ bụrụ na ọ na-eri ihe ma na-ehi ụra nke ọma, na-egwukwa egwuregwu mgbe ụfọdụ, o yighị ka ọ̀ dị mkpa inye ya ọgwụ ọ bụla.”

Otú E Si Agwọ Obere Ahụ́ Ọkụ

Nke a apụtaghị na ọ dịghị ihe ị pụrụ ime iji nyere nwa gị aka. Ụfọdụ ndị ọkachamara n’ịgwọ ọrịa na-atụ aro ndị na-esonụ maka ịgwọ obere ahụ́ ọkụ: Mee ka ọnụ ụlọ nwa gị jụtụ oyi. Yiwe nwa ahụ uwe dị fere fere. (Iyiwe ya uwe nke ga-eme ka ọsụsọ gbaa ya pụrụ ime ka ahụ́ ọkụ ahụ ka njọ.) Gbaa nwa ahụ ume ịdị na-aṅụkwu ihe ọṅụṅụ, dị ka mmiri, mmiri mkpụrụ osisi a gwara agwa, na ofe, n’ihi na ahụ́ ọkụ pụrụ ime ka mmiri gwụ ya n’ahụ́. * (Ihe ọṅụṅụ ndị nwere caffeine, dị ka ihe ọṅụṅụ kola ma ọ bụ tii ojii, na-eme ka mmadụ na-anyụ mamịrị ugboro ugboro, ọ pụkwara ime ka mmiri gwụkwuo mmadụ n’ahụ́.) E kwesịrị ịnọgide na-enye ụmụ ọhụrụ ara. Zere inye ha nri ndị na-adịghị agbari ngwa ngwa, ebe ọ bụ na ahụ́ ọkụ na-eme ka afọ ghara ịrụ ọrụ nke ọma.

Mgbe ọ̀tụ̀tụ̀ ikpo ọkụ nke ahụ́ nwatakịrị gafere 38.9 degrees Celsius, a na-enyekarị ya ọgwụ na-ebelata ahụ́ ọkụ, dị ka paracetamol ma ọ bụ ibuprofen, bụ́ ndị a na-azụ n’aka ndị na-ere ọgwụ. Otú ọ dị, ọ dị mkpa ịgbaso usoro e kwuru ka e siri na-aṅụ ya, bụ́ nke e dere ná mpempe akwụkwọ ma ọ bụ ná mkpọ ọgwụ ahụ. (E kwesịghị inye ụmụaka ndị na-erubeghị afọ abụọ ọgwụ n’enwetaghị ntụziaka dọkịta.) Ọgwụ ndị na-ebelata ahụ́ ọkụ adịghị egbu nje virus. N’ihi ya, ha adịghị eme ka nwatakịrị gbakee ngwa ngwa ma ọ bụrụ na o nwere àzụ̀zụ̀ ma ọ bụ ọrịa ndị ọzọ yiri ya, ma ha pụrụ ime ka o nwetatụ onwe ya. Ụfọdụ ndị ọkachamara na-atụ aro ka a ghara inye ụmụaka ndị na-erubeghị afọ 16 ọgwụ aspirin iji belata ahụ́ ọkụ ha, ebe ọ bụ na e kwuwo na ọ na-akpata Reye’s syndrome—ọrịa nke pụrụ igbu mmadụ. *

Iji ákwà saa nwatakịrị ahụ́ pụkwara ibelata ahụ́ ọkụ. Kunye nwa ahụ n’ime efere ịsa ahụ́ nke a wụnyere obere mmiri dị ṅara ṅara, na-edetụ ákwà ná mmiri ahụ ma jiri ya na-ehicha ya ahụ́. (Etela ya ihe otite ndị e ji mmanya ọkụ mee, ebe ọ bụ na ọ pụrụ ịdị ize ndụ nye ya.)

Igbe ya na isiokwu a so nwere ụfọdụ ihe ọmụma ndị pụrụ inyere mmadụ aka ịmata oge ọ pụrụ ikpebi ịkpọ dọkịta. Onye ọ dị mkpa ka dọkịta lebara anya karịsịa bụ onye bi n’ógbè a na-arịakarị ajọ ahụ́ ọkụ ndị dị ka ọrịa dengue, ọrịa Ebola, ịba ahụ́ ọkụ, ma ọ bụ ịba anya odo.

Ya mere, n’ozuzu, ihe kasị mma ị ga-eme bụ ime ka ahụ́ rukwuo nwa gị ala. Cheta na o siri ike ahụ́ ọkụ ịdị oké njọ ruo n’ókè nke ibibi akwara ozi ma ọ bụ igbu mmadụ. Ọbụna ntụbọ nke ahụ́ ọkụ kpatara, ọ bụ ezie na ọ na-emenye egwu, adịkebeghị emebi ihe n’ụzọ na-adịgide adịgide.

N’ezie, ọgwụgwọ kasị mma bụ igbochi ya egbochi, otu n’ime ụzọ ndị kasị dị irè isi chebe nwa gị pụọ n’ibute ọrịa bụkwa ịkụziri ya ụzọ bụ́ isi ọ ga-esi na-edebe onwe ya ọcha. E kwesịrị ịkụziri ụmụaka ịdị na-akwọ aka ha mgbe mgbe—karịsịa tupu ha eriwe nri, mgbe ha gasịrị mposi, mgbe ha nọsịrị n’etiti ìgwè mmadụ, ma ọ bụ mgbe ha metụsịrị anụmanụ aka. Ọ bụrụ na, n’agbanyeghị mgbalị kasị mma i mere, obere ahụ́ ọkụ ejide nwa gị, obi amapụla gị. Dị ka anyị mụtaworo, e nwere ọtụtụ ihe ị pụrụ ime iji nyere nwa gị aka ịgbake.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

^ par. 6 Ọ̀tụ̀tụ̀ ikpo ọkụ nke ahụ́ pụrụ ịdịgasị iche dabere n’ebe a nọ tụọ ya ma ọ bụ n’ụdị ígwè ọrụ thermometer e ji mee ihe.

^ par. 10 Lee mbipụta Teta! (Bekee) nke April 8, 1995, peeji nke 11, maka igbo ihe ọṅụṅụ na-eme ka mmiri dịghachi mmadụ n’ahụ́, bụ́ nke a pụrụ inye onye afọ ọsịsa ma ọ bụ ịgbọ agbọ sonyeere ahụ́ ọkụ ya.

^ par. 11 Reye’s syndrome bụ ajọ ọrịa na-emetụta akwara ozi, bụ́ nke ụmụaka pụrụ ịrịa mgbe ha butesịrị nje virus.

[Igbe dị na peeji nke 27]

Kpọtụrụ Dọkịta Ma Ọ Bụrụ na Nwa Ahụ́ Ọkụ Ji . . .

▪ Dị ọnwa atọ ma ọ bụ na o rubeghị ọnwa atọ, ọ̀tụ̀tụ̀ ikpo ọkụ nke afọ ya adịkwa 38 degree Celsius ma ọ bụ karịa

▪ Nọ n’agbata ọnwa atọ na ọnwa isii, ọ̀tụ̀tụ̀ ikpo ọkụ nke ahụ́ ya adịkwa 38.3 degree Celsius ma ọ bụ karịa

▪ Akarịwo ọnwa isii, ọ̀tụ̀tụ̀ ikpo ọkụ nke ahụ́ ya adịkwa 40 degree Celsius ma ọ bụ karịa

▪ Ajụ ịṅụ ihe ọṅụṅụ ma nwee ihe na-egosi na mmiri agwụwo ya n’ahụ́

▪ Tụbọrọ ma ọ bụ ghara inwe nnọọ mmasị n’ihe

▪ Ka nọgidere na-enwe ahụ́ ọkụ mgbe awa 72 gasịrị

▪ Na-ebesi ákwá ike ma ọ bụ nwee ihe mgbaàmà nke mgbagwoju anya ma ọ bụ nke uche mgbasasị

▪ Nwere ihe ndị ghara ya n’ahụ́, adịghị eku ume nke ọma, nwere afọ ọsịsa, ma ọ bụ nọgide na-agbọ agbọ

▪ Abụrụ onye olu ya na-apụghị imegharị emegharị ma ọ bụ onye isi ọwụwa ji aka ọjọọ

[Ebe E Si Nweta Foto]

Ebe e si nweta ya: Ụlọ Akwụkwọ America A Na-amụ Banyere Ọrịa Ụmụaka