Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ụtụ Isi Ọ̀ Bụ Ụgwọ A Na-akwụ Iji Nwee “Obodo Mepere Anya”?

Ụtụ Isi Ọ̀ Bụ Ụgwọ A Na-akwụ Iji Nwee “Obodo Mepere Anya”?

 Ụtụ Isi Ọ̀ Bụ Ụgwọ A Na-akwụ Iji Nwee “Obodo Mepere Anya”?

“Ụtụ isi bụ ụgwọ anyị na-akwụ iji nwee obodo mepere anya.”—Ihe e dere n’ụlọ nke Ụlọ Ọrụ Na-ahụ Maka Ụtụ Isi, Washington, D.C.

GỌỌMENTI dị iche iche na-azọrọ na ụtụ isi bụ ihe a na-achọghị bụ́ nke dị mkpa—ụgwọ a na-akwụ iji nwee “obodo mepere anya.” Ma i kwere ma ọ bụ na i kweghị, ịrụ ụka adịghị ya na ụgwọ ahụ na-adịkarị elu.

A pụrụ ikewa ụtụ isi ụzọ abụọ: ndị a na-atụ maka uru na ndị a na-atụ maka ngwá ahịa. Ụtụ isi a na-atụ maka ego mmadụ na-akpata, ụtụ isi ụlọ ọrụ, na ụtụ isi maka ihe onwunwe socha n’ụtụ isi ndị a na-atụ maka uru. N’ime ndị a, o yiri ka ọ̀ bụ ụtụ isi a na-atụ maka ego mmadụ na-akpata ka a kasị eweso iwe. Ọ na-adị otú a karịsịa n’ala ndị ụtụ isi a na-atụ maka ego mmadụ na-akpata na-arị elu—ka ego ị na-akpata na-ebukwu ibu, otú ahụ ka ụtụ isi gị ga na-ebukwu ibu. Ndị na-ekwenyeghị n’ụdị ụtụ isi a, na-ekwu na ọ na-ata mmadụ ahụhụ maka ịrụsi ọrụ ike na inwe ọganihu.

Akwụkwọ Òtù Na-ahụ Maka Nzụkọrịta Ahịa na Mmepe na-ebipụta, bụ́ OECD Observer, na-echetara anyị na tụkwasị n’ụtụ isi ndị a na-atụ n’aka gọọmenti etiti, “ndị na-akpata ego nwere ike ịdị na-atụkwa ụtụ isi maka ego ha na-akpata n’aka gọọmenti ime obodo, nke ógbè, ma ọ bụ nke steeti n’elu nke ha tụworo atụ n’aka gọọmenti etiti. Otú ahụ ka ọ dị na Belgium, Canada, Iceland, Japan, Korea, mba ndị dị na Scandinavia, Spen, Switzerland na United States.”

Ụtụ isi maka ngwá ahịa na-agụnye ụtụ isi maka ihe mmadụ zụrụ, ụtụ isi maka mmanya ọkụ na siga, na ụtụ isi iji bupụ ma ọ bụ bubata ngwá ahịa. Ụdị ụtụ isi a adịghị apụtacha ìhè dị ka ụtụ isi maka uru ma ọ ka pụkwara ịkpatara ndị mmadụ, karịsịa ụmụ ogbenye, ihe isi ike akụ̀ na ụba. Na magazin India bụ́ Frontline, onye edemede bụ́ Jayali Ghosh na-ekwu na ọ bụghị eziokwu na ọ bụ ndị ọkwá ha dịtụ elu na ndị ọgaranya na-atụ ihe ka ukwuu n’ụtụ isi a na-atụ n’India. Ghosh na-ekwu, sị: “N’akụkụ gọọmenti Steeti, ụtụ isi maka ngwá ahịa na-emejupụta pasent 95 nke ụtụ isi nile ha na-anata. . . . O yikarịrị ka ọ̀ bụ ndị ogbenye na-aka ndị ọgaranya atụ ụtụ isi n’ego ha na-akpata.” Dị ka ihe àmà na-egosi, ụtụ isi dị elu a na-atụ maka ihe ọha na eze na-azụ, dị ka ncha na ihe oriri, na-akpata ọdịiche a.

Olee nnọọ ihe gọọmenti na-eji ego nile ahụ ha na-anata eme?

Ebe Ego ahụ Na-abanye

N’eziokwu, ọ na-efu gọọmenti nnukwu ego iji na-arụ ọrụ ma na-eje ozi ndị dị mkpa. Dị ka ihe atụ, na  France, 1 mmadụ n’ime mmadụ 4 ọ bụla na-arụ ọrụ Bekee. Ha na-agụnye ndị nkụzi, ndị na-arụ ọrụ na post ọfịs, n’ebe ngosi ihe mgbe ochie nakwa n’ụlọ ọgwụ, ndị uwe ojii, na ndị ọrụ gọọmenti ndị ọzọ. Ụtụ isi dị mkpa iji na-akwụ ha ụgwọ ọnwa. A na-ejikwa ụtụ isi arụ ụzọ, ụlọ akwụkwọ, na ụlọ ọgwụ, ọ na-enyekwa aka iji kwụọ ihe ọ na-efu iji na-eje ozi ndị dị ka ikpofu unyi na izipụ akwụkwọ ozi.

Ihe ọ na-efu iji nọgide na-enwe usuu ndị agha bụkwa ihe ọzọ na-eme ka a na-ana ụtụ isi. Ọ bụ ndị Britain bara ọgaranya bụ ndị mbụ e kwuru ka ha tụọ ụtụ isi maka ego ndị ha na-akpata iji kwadoo agha Britain na-alụso France n’afọ 1799. Otú ọ dị, n’oge Agha Ụwa nke Abụọ, gọọmenti Britain malitere ịna ndị ọrụ ụtụ isi maka ego ha na-akpata. Taa, ịkwado ndị agha nke mba ọ bụla anọgidewo na-efu nnukwu ego, ọbụna n’oge udo. Ụlọ Akwụkwọ Stockholm Maka Nnyocha Udo Mba Nile mere atụmatụ na ego agha riri n’ụwa nile n’afọ 2000 dị ihe dị ka ijeri dollar 798.

Ihe E Ji Agbanwe Omume Ndị Mmadụ

A na-ejikwa ụtụ isi eme ka ndị mmadụ na-eme ma ọ bụ kwụsị ime omume ụfọdụ. Dị ka ihe atụ, e bu n’uche na ịna ụtụ isi maka mmanya na-aba n’anya na-ebelata ịṅụbiga mmanya ókè. N’ihi ya, n’ọtụtụ ala, ụtụ isi na-emejupụta ihe dị ka pasent 35 nke ihe a na-ere otu karama biya.

A na-anakwa nnukwu ụtụ isi maka ụtaba. Na South Africa, ụtụ isi na-emejupụta site pasent 45 ruo pasent 50 nke ihe a na-ere otu mkpọ siga. Otú ọ dị, nzube gọọmenti n’ịkwalite ụdị ụtụ isi ahụ nwere ike ghara ịbụcha maka ọdịmma nke ụmụ amaala. Dị ka onye edemede bụ́ Kenneth Warner si kwuo na magazin bụ́ Foreign Policy, ụtaba bụ “ihe na-akwalite nnọọ ọnọdụ akụ̀ na ụba bụ́ nke e si n’ire ya ere nakwa n’ụtụ isi a na-atụ maka ya enweta ọtụtụ narị ijeri dollar kwa afọ.”

Otu ihe atụ dị ịrịba ama nke ịgbanwe omume ndị mmadụ weere ọnọdụ ná mmalite narị afọ nke 20. Ndị omeiwu United States bịara chọọ ibelata ọnụ ọgụgụ nke ezinụlọ ndị na-akpakọbara onwe ha akụ̀ site n’otu ọgbọ gaa n’ọzọ. N’ụzọ dị aṅaa? Site n’iguzobe ụtụ isi maka ala na ụlọ na ihe onwunwe nke onye nwụrụ anwụ. Ọ bụrụ na ọgaranya anwụọ, ụtụ isi na-amịkọrọ ihe dị ukwuu n’akụ̀ ọ kpakọbara. Ndị na-akwado ụdị ụtụ isi a na-ekwu na ọ “na-anapụta ezinụlọ onye ọgaranya ahụ nwụrụ anwụ akụ̀ ndị ọ kpakọbara ma were ya meere obodo ihe.” Nke ahụ pụrụ ịbụ eziokwu, ma ndị ọgaranya bụ́ ndị na-atụ ụtụ isi achọpụtawo ụzọ akọ ndị ha ga-esi na-ebelata ụtụ isi a ga-ana maka ihe onwunwe ha.

A nọgidewo na-eji ụtụ isi eme ihe iji na-eleba anya n’ihe ụfọdụ metụtara ọha na eze, dị ka gburugburu ebe obibi. Magazin bụ́ The Environmental Magazine na-akọ, sị: “Mba itoolu dị n’Ebe Ọdịda Anyanwụ Europe eguzobewo ụtụ isi maka gburugburu ebe obibi na nso nso a, karịsịa dị ka ụzọ isi belata mmetọ ikuku.” Ụtụ isi ndị na-ebukwu ibu ka ego mmadụ na-akpata na-ebukwu ibu, bụ́ nke a kpọtụrụ aha na mbụ, bụkwa ụzọ ọzọ e si anwa ịgbanwe omume ndị mmadụ; nzube e ji guzobe ya bụ iji belata oghere dị n’etiti ndị ọgaranya na ndị ogbenye. Gọọmenti ụfọdụ na-esepụkwara ndị na-enye onyinye ebere ma ọ bụ ndị di na nwunye ji ụmụ ego n’ego ha ga-atụ n’ụtụ isi.

N’ihi Gịnị Ka O Ji Dị Nnọọ Mgbagwoju Anya?

Mgbe ọ bụla a tụrụ aro maka ụdị ụtụ isi ọhụrụ, ndị omeiwu na-agbalị ime iwu ndị ga-eme ka a ghara inwe ụzọ ọ bụla a ga-esi zere ya. Chetakwa: Nnukwu ego na-aga ifu ma e meghị ihe ọ bụla. Gịnị ka ọ na-akpata? Iwu ụtụ isi na-abịa dịrị mgbagwoju anya ma sie nnọọ ike ịgbaso. Otu akụkọ dị na magazin bụ́ Time na-akọwa na ọtụtụ n’ime ihe mgbagwoju anya ndị e nwere n’iwu ụtụ isi United States “na-abịa site n’ịkọwa ihe bụ́ ego mmadụ kpatara,” ya bụ, n’ikpebi nnọọ ihe e kwesịrị ịtụ ụtụ isi maka ya. Mgbagwoju anya ndị ọzọ na-esite n’imerime iwu ndị “na-enye ohere maka ịgụpụ ihe e mefuru n’ime ego a kpatara na ịgụpụ ihe ụfọdụ dị ka ihe ndị a na-agaghị atụrụ ụtụ isi.” Otú ọ dị, ọ bụghị nanị mba United States nwere iwu ụtụ isi ndị dị mgbagwoju anya. Akwụkwọ iwu ụtụ isi nke mba United Kingdom bipụtara n’oge na-adịbeghị anya dị peeji 9,521, bụ́ nke e mepụtara ná mpịakọta iri.

Ụlọ Ọrụ Na-enyocha Ụkpụrụ Ndị Metụtara Ụtụ Isi na Mahadum Michigan na-akọ, sị: “Kwa afọ, ndị United States bụ́ ndị na-atụ ụtụ isi na-etinye ihe karịrị ijeri awa atọ n’idejupụta akwụkwọ ụtụ isi n’ịgụkọta ego ole ha kpatara na ego ole ha ga-atụ n’ụtụ isi. . . . N’ozuzu, oge na ego ndị na-atụ ụtụ isi maka ego ha na-akpata na United States na-etinye [n’idejupụta akwụkwọ ụtụ isi] na-eru nnọọ 100 ijeri dollar kwa afọ, ma ọ bụ ihe dị ka pasent 10 nke ụtụ isi a nakọtara. Ihe dị ukwuu n’ihe a a na-emefu site n’ịgbaso iwu ụtụ isi na-abụkarị n’ihi otú iwu ụtụ isi a na-atụ maka ego mmadụ na-akpata si dị nnọọ mgbagwoju anya.” Reuben, bụ́ onye a kpọtụrụ aha ná mmalite nke isiokwu bu ụzọ na-ekwu, sị: “Ana m agbalịbu idejupụta akwụkwọ ụtụ isi m n’onwe m, ma ọ na-eri m oge, ọ na-adịkwa m ka m na-atụ ụtụ isi karịa otú m kwesịrị ịtụ. Ya mere, ugbu a, ana m egozi onye mpịazi ego  n’ọrụ ka o dejupụtara m akwụkwọ ụtụ isi m.”—Lee igbe bụ́ “Ịgbaso Iwu Ụtụ Isi,” nke dị na peeji nke 8.

Ụfọdụ Ndị Tụọ, Ụfọdụ Ndị Ezere, Ndị Ọzọ Aghọọ Aghụghọ

Ma ọ́ dịghị ihe ọzọ, ihe ka n’ọtụtụ mmadụ ga-atachi ezé kweta na ụtụ isi na-abara obodo ha uru. N’otu oge, onyeisi nke Ụlọ Ọrụ Na-ahụ Maka Ụtụ Isi n’Ime Ime Obodo Britain kọwara, sị: “Ọ dịghị onye ọ na-atọ ụtọ ịtụ ụtụ isi maka ego ọ kpatara, ma o siri ike ịhụ ndị ga-ekwu na ọnọdụ ga-akara anyị mma ma ọ bụrụ na a kwụsị ịtụ ya.” Ụfọdụ ndị na-eme atụmatụ na ndị na-agbaso iwu ụtụ isi na United States ruru pasent 90. Otu onye na-ahụ maka ụtụ isi kwetara, sị: “Ihe na-akpatakarị agbasoghị iwu ụtụ isi bụ mgbagwoju anya a na-enwe n’iwu ahụ na usoro ndị o kwuru ka a gbasoo, kama ịbụ ịma ụma zere ya.”

Ma, ọtụtụ ndị na-achọ ụzọ ndị ha ga-esi zere ịtụ ụdị ụtụ isi ụfọdụ. Dị ka ihe atụ, tụlee ihe otu akụkọ dị na magazin bụ́ U.S.News & World Report kọrọ banyere ụtụ isi ụlọ ọrụ: “Ọtụtụ ụlọ ọrụ na-esi ụzọ ndị na-emegideghị iwu ezere ịtụ ihe dị ukwuu n’ụtụ isi ha—mgbe ụfọdụkwa ha na-ezere ya kpam kpam—site n’ihe ndị ha na-agụpụ dị ka ihe ha mefuru nakwa ịgbagọtụ ihe n’ihe ndekọ ego ha.” N’inye ihe atụ banyere ụdị nzere ụtụ isi e ji ịdị akọ dị otú ahụ zere, akụkọ ahụ gara n’ihu ikwu, sị: “Otu òtù nọ na United States guzobere ụlọ ọrụ ná mba ọzọ ebe a na-atụ ụtụ isi dị ala. O meziri ka ụlọ ọrụ ahụ dị na United States dịrị n’okpuru nke ahụ dị  ná mba ọzọ.” Ụlọ ọrụ ahụ si otú a na-ezere ịtụ ụtụ isi nke United States—bụ́ nke pụrụ ịdị elu ruo pasent 35—n’agbanyeghị na o nwere ike bụrụ na ihe dị “n’isi ụlọ ọrụ ahụ agwụla nnọọ shelf na ebe a na-etinye akwụkwọ ozi na ihe ole na ole ndị ọzọ.”

E nwekwara ndị nke na-aghọ aghụghọ chara acha iji zere ịtụ ụtụ isi. A kọrọ na n’otu mba dị na Europe, a na-ele iji aghụghọ ezere ịtụ ụtụ isi anya dị ka “ihe egwuregwu.” Dị ka otu nnyocha e mere na United States si kwuo, ọ bụ nanị pasent 58 nke ndị ikom nọ n’agbata afọ 25 na 29 kwetara na ọ dị njọ mmadụ ịghara ikwupụtacha ego ole ọ na-akpata. Ndị dere banyere nnyocha ahụ na-ekweta, sị: “Akụkọ ahụ adịghị egosi na e nwere ụkpụrụ dị elu na omume ọma ná mba anyị.” Na Mexico, a na-eme atụmatụ na ihe dị ka pasent 35 na-ezere ịtụ ụtụ isi.

Otú ọ dị, n’ozuzu, ndị mmadụ kwetara na ụtụ isi dị mkpa, ọ dịghị ewutekwa ha ịtụ ókè ruuru ha. Ma, okwu ahụ a ma ama, nke a sịrị na ọ bụ Tiberius Caesar kwuru, yiri eziokwu: “Ezi onye ọzụzụ atụrụ kwesịrị ịkpụ atụrụ ya ajị̀, ọ bụghị ịgba ya akpụkpọ.” Ọ bụrụ na i chere na usoro ụtụ isi bụụrụ gị ibu arọ, bụrụ nke a na-ana n’ụzọ na-ezighị ezi, na nke dị nnọọ mgbagwoju anya, olee nnọọ otú i kwesịrị isi na-ele ịtụ ụtụ isi anya?

[Igbe dị na peeji nke 7]

Chee Echiche Tupu Ị Kwapụ!

Usoro e ji atụ ụtụ isi dịgasị iche iche site n’otu mba gaa n’ọzọ. N’ezie, ụtụ isi a na-atụ n’ógbè dị iche iche maka ego mmadụ na-akpata pụrụ ịdịgasị nnọọ iche n’ime otu mba. Ò ruru ime ka i chewe ịkwaga n’ebe a na-atụ ụtụ isi dị ala karị? Ikekwe o ruru, ma i kwesịrị iche echiche tupu ị kwapụ.

Dị ka ihe atụ, otu akụkọ nke gbara na magazin bụ́ OECD Observer na-echetara ndị na-agụ ya na okwu ahụ ebighị nanị n’ụtụ isi a na-atụ maka ego a na-akpata. Ọ na-ekwu, sị: “Ihe mmadụ na-emefu n’ego ọ na-akpata na-emetụtakwa ego ole ọ ga-atụ n’ụtụ isi.” Dị ka ihe atụ, ná mba ụfọdụ, a na-ana ụtụ isi dị ala maka ihe mmadụ na-akpata. Ma mba ndị ahụ adịchaghị esepụ ego n’ụtụ isi, ha adịchaghị agụpụ ego e mefuru n’ime ego a kpatara, ha adịchaghịkwa agụpụ ihe ụfọdụ dị ka ihe ndị a na-agaghị atụrụ ụtụ isi. N’ihi ya, mmadụ pụrụ imecha tụọ ụtụ isi ka ukwuu n’ebe ahụ karịa ka ọ gaara atụ ná mba ndị ọnụ ego ụtụ isi ha dị elu ma bụrụ ebe a ‘na-aka agụpụ ihe ụfọdụ dị ka ihe a na-agaghị atụrụ ụtụ isi nakwa ebe a na-aka esepụ ego n’ụtụ isi a ga-atụ maka ihe ụfọdụ.’

Na United States, ụfọdụ ndị na-atụle ịkwaga na steeti ndị na-adịghị ana ụtụ isi maka ego mmadụ na-akpata. Ma nke a, ọ̀ na-eme ka mmadụ ghara imefu ego ahụ? Akwụkwọ bụ́ Kiplinger’s Personal Finance ekweghị, ọ na-ekwu, sị: “N’ọtụtụ ọnọdụ, nnyocha anyị mere na-egosi na steeti ndị a na-adịghị ana ụtụ isi maka ego mmadụ na-akpata na ha, na-esite ná mbuli nke ọnụ ego ụtụ isi ha na-ana maka ihe onwunwe, maka ịzụ ihe nakwa ụdị ụtụ isi ndị ọzọ enweta ego ha gaara enweta ma a sị na ha nwere ụtụ isi ahụ.”

[Igbe dị na peeji nke 8]

Ịgbaso Iwu Ụtụ Isi

Nye ọtụtụ n’ime anyị, ịtụ ụtụ isi bụ ihe na-agwụ ike, ee, ibu arọ. N’ihi ya, Teta! jụrụ otu ọkachamara n’ihe banyere ụtụ isi maka aro ụfọdụ bara uru.

“Nweta Ezigbo Ndụmọdụ. Nke a dị oké mkpa, ebe ọ bụ na iwu ụtụ isi pụrụ ịdị mgbagwoju anya, a dịghị elechakwa amaghị banyere iwu anya dị ka ihe ngọpụ ziri ezi maka ịghara ịgbaso iwu ụtụ isi. N’agbanyeghị na onye na-atụ ụtụ isi pụrụ ile ndị ọrụ na-ahụ maka ụtụ isi anya dị ka ndị iro, ha pụrụ mgbe mgbe, inye ntụziaka ziri ezi ma dị mfe banyere otú a pụrụ isi mee ihe banyere ụtụ isi. Ọ ga-amasị ndị ọrụ na-ahụ maka ụtụ isi ma ọ bụrụ na i dejupụta akwụkwọ ụtụ isi gị nke ọma. Ọ dịghị atọ ha ụtọ ịkpọga mmadụ n’ụlọikpe n’ihi agbasoghị iwu ndị metụtara ụtụ isi.

“Ọ bụrụ na usoro mkpata ego gị adịghị ekwe gị ngụkọta, chọọ enyemaka n’aka ọkachamara n’ihe banyere ụtụ isi. Ma kpachapụ anya! Ọ bụ ezie na e nwere ọtụtụ ndị ọkachamara banyere ụtụ isi bụ́ ndị bu ọdịmma gị kasịnụ n’obi, e nwere ọtụtụ n’ime ha bụ́ ndị na-ebughị ọdịmma gị n’obi. Gwa enyi gị ma ọ bụ onye gị na ya na-azụkọ ahịa bụ́ onye ị tụkwasịrị obi ka ọ tụọrọ gị aro onye ọkachamara ị ga-agakwuru, meekwa nnyocha iji chọpụta iru eru nke onye ọkachamara ahụ.

“Mee ihe ozugbo. Ahụhụ a na-enye maka iweta akwụkwọ ụtụ isi n’azụ oge pụrụ isi ike.

“Nwee ihe ndekọ ziri ezi. N’agbanyeghị usoro i ji edekọ ego gị, mee ka o zie ezi. N’ụzọ dị otú ahụ, ọrụ ị ga-arụ n’oge ị ga-edejupụta akwụkwọ ụtụ isi ga-adị obere. Ị ga-anọkwa n’ọnọdụ ka mma ma ọ bụrụ na ọ dị mkpa ka a gụzigharịa ihe ndekọ ego gị.

“Na-eme ihe n’eziokwu. Ọ pụrụ imetụ gị n’obi ịghọ aghụghọ ma ọ bụ ikekwe ịgbagọtụ iwu. Ma ndị ọrụ na-ahụ maka ụtụ isi nwere ọtụtụ ụzọ akọ ha si achọpụta emeghị ihe n’eziokwu. Ọ na-akasị mma ime ihe n’eziokwu.

“Tinye uche na ya. Ọ bụrụ na onye i goro n’ọrụ ịkwadebere gị akwụkwọ ụtụ isi enye ihe ọmụma na-ezighị ezi, ọ ka bụkwa n’isi gị ka ọ dị. Ya mere kpachapụ anya ịhụ na onye na-emechitere gị ya mere ihe dị ka i si chọọ.”

[Foto dị na peeji nke 7]

N’ọtụtụ ala, a na-ana ụtụ isi dị elu maka ihe ndị e ji ụtaba mee nakwa ihe ọṅụṅụ na-aba n’anya

[Foto ndị dị na peeji nke 8, 9]

 A na-eji ụtụ isi emere anyị ọtụtụ n’ime ihe ndị anyị pụrụ iwere dị ka ihe ndị ruuru anyị