Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Olee Otú Ị Pụrụ Isi Guzogide Ọchịchọ Na-ezighị Ezi?

Olee Otú Ị Pụrụ Isi Guzogide Ọchịchọ Na-ezighị Ezi?

 Echiche nke Bible

Olee Otú Ị Pụrụ Isi Guzogide Ọchịchọ Na-ezighị Ezi?

“Mgbe m chọrọ ime ihe ziri ezi, ihe ọjọọ na-anọ n’ebe m nọ.”—NDỊ ROM 7:21.

I KEKWE, Pọl onyeozi rụsiri nnọọ ọrụ ike iji kwalite ụkpụrụ ndị dị elu nke Iso Ụzọ Kraịst karịa onyeozi ọ bụla ọzọ. (1 Ndị Kọrint 15:9, 10) N’agbanyeghị nke ahụ, o zoghị ọnụ n’ikweta ihe ahụ dị n’elu. Ọ nọgidere na-alụso ọchịchọ na-ezighị ezi ndị na-abata ya n’obi ọgụ. Ọ̀ dịtụwo mgbe i nwere mmetụta dị otú ahụ Pọl onyeozi nwere? N’ezie, dị ka ndị na-ezughị okè, ònye n’ime anyị bụ onye na-alụsotụbeghị ọchịchọ na-ezighị ezi ndị na-abata ya n’obi ọgụ?

Nye ọtụtụ ndị, ọgụ ha na-alụ iji guzogide ọchịchọ na-ezighị ezi na-esi nnọọ ike. Ndị ụfọdụ na-alụso ọchịchọ siri ike nke inwe mmekọahụ́ rụrụ arụ ọgụ. Ndị ọzọ bụ ndị ịgba chaa chaa, ise ụtaba, ịṅụ ọgwụ ọjọọ, ma ọ bụ ihe ọṅụṅụ na-aba n’anya riworo ahụ́. Mgbe anyị na-enwe ọchịchọ na-emerụ ahụ́ nakwa nke na-ezighị ezi, olee otú anyị pụrụ isi guzogide ha? Enyemaka dị aṅaa ka e nwere? Ọ̀ dị mgbe ọgụ a na-alụ megide ọchịchọ na-ezighị ezi ga-akwụsị?

Ịhụnanya—Isi Ihe Na-eme Ka E Guzogide Ọchịchọ Na-ezighị Ezi

Jizọs mere ka iwu abụọ kasịnụ n’Iwu Mozis pụta ìhè. Nke mbụ bụ nke a: “Ị ghaghị iji obi gị dum, jirikwa mkpụrụ obi gị dum, jirikwa uche gị dum hụ Jehova bụ́ Chineke gị n’anya.” (Matiu 22:37) Ọ bụrụ na anyị ahụ Chineke n’anya dị ka Jizọs kwuru na anyị aghaghị ịhụ ya, ó kwesịghị ka ime ihe na-atọ Ya ụtọ bụrụ ọchịchọ anyị kasịnụ? Ọ bụrụ otú ahụ, ezi ọchịchọ dị otú ahụ pụrụ inyere anyị aka ịlụso ọbụna ọchịchọ na-ezighị ezi ndị kasị sie ike ọgụ! Nke a abụghị ka e kwuwe ka ọ tọwa. Ọtụtụ nde Ndị Kraịst na-enwe ihe ịga nke ọma n’iguzogide ọchịchọ na-ezighị ezi kwa ụbọchị. Olee  otú ị pụrụ isi mee ka gị na Chineke nwee nkekọ siri ike otú ahụ? Ọ bụ site n’iji ekele na-atụgharị uche n’ịdị mma ya dị ka a na-ahụ ya n’ihe ndị o kere eke, n’ime Bible, nakwa n’otú o si emeso anyị ihe n’otu n’otu.—Abụ Ọma 116:12, 14; 119:7, 9; Ndị Rom 1:20.

Iwu nke abụọ kasịnụ Jizọs zoro aka na ya bụ: “Ị ghaghị ịhụ onye agbata obi gị n’anya dị ka onwe gị.” (Matiu 22:39) Pọl onyeozi kwuru na ịhụnanya “adịghị akpa àgwà na-ekwesịghị ekwesị” nakwa na “ọ dịghị achọ ọdịmma nke ya.” Ya mere, ịhụnanya dị otú ahụ nke na-adịghị achọ ọdịmma onwe ya nanị na-enyere anyị aka izere ịkpa àgwà ọ bụla ga-emerụ ndị ọzọ ahụ́. (1 Ndị Kọrint 13:4-8) Olee otú a pụrụ isi zụlite ya? Ọ bụ site n’itinye onwe anyị n’ọnọdụ ndị ọzọ na iji ezi obi na-echebara mmetụta na ọdịmma ha na-adịgide adịgide echiche.—Ndị Filipaị 2:4.

Enyemaka Dị Aṅaa Ka E Nwere?

Ebe ọ bụ na Chineke na-aghọta otú o si esiri anyị ike ime ihe ziri ezi, o mewo ka e nwee ihe enyemaka n’ụzọ dị iche iche. Site n’Okwu ya e dere ede, bụ́ Bible, ọ na-ezi anyị ịkpọ ihe ọjọọ asị na inwe nkwanye ùgwù kwesịrị ekwesị n’ebe ọ nọ. (Abụ Ọma 86:11; 97:10) Bible nwere ihe ndekọ ndị mere eme bụ́ ndị na-egosi ihe ọjọọ na-esite n’inwe ọchịchọ na-ezighị ezi. Ọzọkwa, Jizọs kwuru na Chineke ga-enye anyị mmụọ nsọ Ya, bụ́ ikike kasịnụ n’eluigwe na ala, ma ọ bụrụ na anyị arịọ maka ya. (Luk 11:13) Ọ pụrụ ime ka mkpebi anyị mere ime ihe ziri ezi sikwuo ike. Ihe enyemaka ọzọ bụ nkwado na agbamume Ndị Kraịst ndị ọzọ, bụ́ ndị na-eguzogidekwa ọchịchọ na-ezighị ezi pụrụ inye anyị. (Ndị Hibru 10:24, 25) Ka mmetụta ndị a dị mma na-anọchi ndị na-adịghị mma, anyị na-enweta enyemaka ná mgbalị anyị na-eme ime ihe ziri ezi. (Ndị Filipaị 4:8) Ụzọ ndị a e si enweta enyemaka hà dị irè n’ezie?

Tụlee ihe banyere Fidel, bụ́ onye a maara nke ọma n’ógbè ya dị ka onye aṅụrụma. Mgbe ọ bụla mmanya na-egbu ya, ọ na-ese ụtaba, na-agba chaa chaa, na-alụsokwa ndị ọzọ ọgụ. Ọmụmụ Bible nakwa mmekọrịta ya na Ndịàmà Jehova na-enwe nyeere ya aka ịkwụsị omume ndị ahụ. Ugbu a, ya na nwunye ya na ụmụ ya abụọ na-anụ ụtọ ndụ ka nnọọ mma.

Mmadụ pụrụ ịjụ, sị, ‘Gịnịkwanụ ma m kpaghachi àgwà ahụ?’ Jọn onyeozi kwuru banyere nke ahụ. O dere, sị: “Ụmụntakịrị m, m na-edetara unu ihe ndị a ka unu wee ghara ime mmehie. Ma, ọ bụrụ na onye ọ bụla emee mmehie, anyị nwere onye inyeaka nọ n’ebe Nna ahụ nọ, bụ́ Jizọs Kraịst, onye ezi omume. Ọ bụkwa àjà ime udo maka mmehie anyị, ma ọ bụghị nanị maka nke anyị kamakwa maka nke ụwa dum.” (1 Jọn 2:1, 2) Ee, àjà mgbapụta Jizọs na-ekpuchi njehie nke onye chegharịrị echegharị ma jiri ezi obi na-agbalịsi ike ime mgbanwe iji na-eme ihe na-atọ Chineke ụtọ. N’ihi ndokwa dị otú ahụ e mere, olee ezi ihe mmadụ pụrụ ikwu na ọ bụ ya mere ọ ga-eji kwụsị mgbalị ọ na-eme iji mee ihe ziri ezi?

A Ga-emeri Ọchịchọ Ndị Na-ezighị Ezi

Ọ bụrụ na anyị enwee ịhụnanya n’ebe Chineke na onye agbata obi anyị nọ ma jiri enyemaka Chineke na-enye anyị na-eme ihe, ọbụna ugbu a, anyị pụrụ inwe ihe ịga nke ọma n’ọgụ anyị na-alụso ọchịchọ na-ezighị ezi. Ọzọkwa, Okwu Chineke na-emesi anyị obi ike na ọgụ a agaghị adịgide ruo mgbe ebighị ebi. N’ọdịnihu dị nso, ndị ji ndokwa ime mmụọ Chineke nyere mee ihe, ga-abụ ndị e mere ka ha nwere onwe ha kpam kpam, ma n’ụzọ anụ ahụ́ ma n’ụzọ ime mmụọ. (Mkpughe 21:3-5; 22:1, 2) Ha ga-enwere onwe ha pụọ n’ibu arọ nke mmehie nakwa ọnwụ ọ na-akpata. (Ndị Rom 6:23) N’aka nke ọzọ, ndị nọgidere na-enwe ọchịchọ nke ime ihe ndị na-adịghị ọcha nakwa nke na-emerụ ahụ́ agaghị eso enweta ngọzi ndị ahụ.—Mkpughe 22:15.

Lee ihe nkasi obi ọ bụ ịmara na ọgụ anyị na-alụ megide ọchịchọ ndị na-ezighị ezi abụghị nke na-agaghị akwụsị akwụsị. A ga-ewepụ ha kpam kpam ruo mgbe ebighị ebi. Lee ahụ́ efe nke ahụ ga-eweta!