Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndị Na-eto Eto na Ọgwụ Ọjọọ

Ndị Na-eto Eto na Ọgwụ Ọjọọ

Ndị Na-eto Eto na Ọgwụ Ọjọọ

“Hà ga-anwụrịrị?”

Nke ahụ bụ ajụjụ a jụrụ n’ihu magazin Brazil bụ́ Veja. N’akụkụ ebe e dere okwu ndị ahụ, e sere foto ọmarịcha ndị ntorobịa ahụ́ zuru okè, bụ́ ndị nwụworonụ—ha nwụrụ n’ihi iji ọgwụ ọjọọ eme ihe.

N’AGBANYEGHỊ ihe ize ndụ ndị a maara nke ọma dị na ya, ndị mmadụ anọgidewo na-eji ọgwụ ọjọọ eme ihe, àgwà dị otú ahụ anọgidewokwa na-ebibi ndụ ndị mmadụ. Kwa afọ, iji ọgwụ ọjọọ eme ihe na-efu United States ihe dị ka 100 ijeri dollar n’inweta ọgwụgwọ, n’ihi arụpụtaghị ihe nke ọma, ụgwọ ọrụ ndị furu efu, na mpụ. Ikekwe, ọ bụ ndị na-eto eto—ụmụaka—kasị ata ahụhụ ya. Dị ka otu nnyocha e mere na Brazil bụ́ nke a kọrọ akụkọ ya n’akwụkwọ akụkọ bụ́ Jornal da Tarde, na-egosi, pasent 24.7 nke ndị ntorobịa nọ n’agbata afọ 10 na afọ 17 anwaleworị ụdị ọgwụ ọjọọ ụfọdụ.

Ọ bụ ezie na ọ pụrụ ịbụ na ọnụ ọgụgụ ndị nọ n’afọ iri na ụma bụ́ ndị na-eji ọgwụ ọjọọ eme ihe na United States adalatatụwo n’afọ ndị na-adịbeghị anya, ọnụ ọgụgụ dị ukwuu nke ndị na-eto eto n’ebe ahụ bụ ndị o riri ahụ́. Tụlee ụmụ akwụkwọ kọleji. Dị ka otu nnyocha gosiri, pasent 37 nke ụmụ akwụkwọ kọleji n’ebe ahụ, ma ọ dịghị ihe ọzọ, anwalewo wii wii n’afọ bu ụzọ. Otu onye n’ime ụmụ akwụkwọ kọleji 5 ejiriwo ya mee ihe n’ọnwa bu ụzọ. Ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ 1 onye n’ime ụmụ akwụkwọ kọleji 10 anwalewo ọgwụ ecstasy n’afọ bu ụzọ. Ihe karịrị pasent 6 anwalewo ọgwụ LSD.

Akụkọ a na-enweta n’ụwa nile dị mwute. Ụlọ Ọrụ Britain Na-ahụ Maka Ndekọ Ọnụ Ọgụgụ ná Mba ahụ na-akọ na “pasent 12 nke ụmụ akwụkwọ ndị nọ n’afọ 11 ruo 15 ejiwo ọgwụ ọjọọ mee ihe n’afọ gara aga . . . O yikarịrị ka ọ̀ bụ wii wii ka e ji nnọọ mee ihe.” Ihe kasị atụ egwu bụ eziokwu ahụ bụ́ na “e nyewo ihe karịrị otu ụzọ n’ụzọ atọ (pasent 35) n’ime ha otu ọgwụ ọjọọ ma ọ bụ karịa.”

Otu akụkọ nke Njikọ nke Mba Ndị Dị na Europe kwadoro n’ụzọ ego na-ekpughe n’otu aka ahụ na n’etiti ndị na-eto eto, “aṅụrụma na-aghọwanye ihe zuru ebe nile.” Akụkọ ahụ na-akọkwa na “e jikọtara ịṅụbiga mmanya ókè dị otú ahụ na mmetụta dịgasị iche iche bụ́ ndị na-adịghị adịte aka, ndị dị ka ihe mberede, ime ihe ike na mkpaghasị uche, nakwa nsogbu ito eto na nke mmekọrịta mmadụ na ibe ya.” Otu akụkọ sitere Japan na-ekwu na “ọgwụ ọjọọ ndị ndị nọ n’afọ iri na ụma na-eji eme ihe na Japan karịsịa bụ ihe ndị nwere ísì na-ekpo ekpo, bụ́ nke pụrụ iduga n’iji ọgwụ ọjọọ ndị ọzọ eme ihe.”

Ka a sịkwa ihe mere Odeakwụkwọ Ukwu nke òtù UN bụ́ Kofi Annan ji kwuo, sị: “Ọgwụ ọjọọ na-etisasị ọha mmadụ, na-akpata mpụ, na-agbasa ọrịa ndị dị ka AIDS, na-egbu ndị ntorobịa anyị, na-ebibikwa ọdịnihu anyị.” Ọ bụ ndị na-eji ọgwụ ọjọọ eme ihe na-emekarị mpụ ndị dị ka ịzụ ahịa ọgwụ ọjọọ na igbu ọchụ nke iji ọgwụ ọjọọ eme ihe kpatara. Ọzọkwa, n’ihi iji ọgwụ ọjọọ eme ihe, ọtụtụ ndị na-abụ ndị e mesoro ihe ike, ndị e merụrụ ahụ́, ma ọ bụ na-enwe mmekọahụ dị ize ndụ, bụ́ nke ha na-emeghị atụmatụ ya. Ọ bụrụkwa na ị na-eche na ọ gaghị emetụta ezinụlọ gị, cheghachi echiche banyere ya! Otu akụkọ sitere n’aka gọọmenti United States, kọrọ, sị: “Ọgwụ ọjọọ abụghị nsogbu nke nanị ndị ogbenye, ndị ka nta n’ọnụ ọgụgụ, ma ọ bụ ndị bi n’obodo ndị mepere emepe. . . . A na-ahụ ndị na-eji ọgwụ ọjọọ eme ihe n’etiti ndị nọ n’ọnọdụ dị iche iche ná ndụ nakwa ndị si n’akụkụ dị iche iche nke mba a. Nsogbu ọgwụ ọjọọ na-emetụta mmadụ nile.”

Ma, ndị mụrụ ụmụ adịghị amatakebe ihe ize ndụ dị na ya ruo mgbe oge gafeworo. Tụlee ihe banyere otu nwa agbọghọ bụ́ onye Brazil. “Ọ nọ na-aṅụ mmanya na-aba n’anya,” ka nwanne ya nwanyị bụ́ Regina, na-akọwa. * “Ezinụlọ anyị chere na ọ bụ ihe na-adọrọ mmasị. Ma nke a dugara ya n’isoro ndị enyi ya nwoke na-eji ọgwụ ọjọọ eme ihe. Ebe ọ bụ na ndị mụrụ m na-emesokarị ya dị ka a ga-asị na nsogbu ndị ọ kpatara enweghị ihe ọ bụ, ọnọdụ ya bịara dị njọ gabiga ókè. Ọtụtụ mgbe, ọ pụrụ n’enweghị onye maara ebe ọ gara. Mgbe ọ bụla a hụrụ ozu nwa agbọghọ, ndị uwe ojii na-akpọ papa m iji mata ma ọ̀ bụ nwanne m nwanyị! Nke a kpataara ezinụlọ anyị oké nhụjuanya.”

Òtù Ahụ Ike Ụwa kwuru ihe ise bụ́ isi mere ndị na-eto eto pụrụ iji bụrụ ndị a dọtara mmasị ha n’ebe n’ọgwụ ọjọọ dị:

(1) Ha na-achọ inwe mmetụta nke ịbụ ndị toworo eto na ime mkpebi nke onwe ha

(2) Ha na-achọ igosi na ha sokwa biri

(3) Ha na-achọ inwe ntụsara ahụ́ ma nwee obi ụtọ

(4) Ha na-achọ ime ihe ndị dị ize ndụ ma nupụ isi

(5) Ha na-achọkwa imejụ ọchịchọ ha nwere ịmata ihe

Nnweta a pụrụ inweta ọgwụ ọjọọ n’ụzọ dị mfe na nrụgide ndị ọgbọ na-amụbakwa ohere e nwere na ndị ntorobịa ga-amalite ụzọ ndụ a nke ibibi onwe onye. “Ndị mụrụ m ekwutetụghị ihe ọ bụla banyere ọgwụ ọjọọ. N’ụlọ akwụkwọ, ndị nkụzi kwuru okwu banyere nsogbu dị na ya ma ha akọwaghị ya nke ọma,” ka Luiz Antonio, bụ́ onye ntorobịa si Brazil, na-akọwa. N’ịbụ onye ụmụ akwụkwọ ibe ya gbara ume, ọ malitere iji ọgwụ ọjọọ na-eme ihe mgbe ọ dị afọ 14. E mesịa, mgbe ọ nwara ịkwụsị ya, “ndị enyi” ya ndị na-enye ya ọgwụ ọjọọ, ji mma yie ya egwu, na-arụgide ya ịnọgide n’àgwà ya!

Ị̀ ghọtawo eziokwu ahụ bụ́ na ụmụ nke gị onwe gị pụrụ ịnọ n’ihe ize ndụ? Gịnị ka i meworo iji chebe ha pụọ n’iji ọgwụ ọjọọ na-eme ihe? Isiokwu na-esonụ ga-atụle ụzọ ụfọdụ ndị mụrụ ụmụ pụrụ isi chebe ụmụ ha.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 9 A gbanwewo aha ụfọdụ.

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 4]

“Ọgwụ ọjọọ na-etisasị ọha mmadụ, na-akpata mpụ, na-agbasa ọrịa ndị dị ka AIDS, na-egbu ndị ntorobịa anyị, na-ebibikwa ọdịnihu anyị.”—KOFI ANNAN, ODEAKWỤKWỌ UKWU NKE ÒTÙ UN

[Ebe E Si Nweta Foto Dị na peeji 3]

© Veja, Editora Abril, May 27, 1998