Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ụra—Ọ̀ Bụ Ihe Ọma Na-adịchaghị Mkpa Ka Ọ̀ Bụ Ihe Dị Oké Mkpa?

Ụra—Ọ̀ Bụ Ihe Ọma Na-adịchaghị Mkpa Ka Ọ̀ Bụ Ihe Dị Oké Mkpa?

 Ụra—Ọ̀ Bụ Ihe Ọma Na-adịchaghị Mkpa Ka Ọ̀ Bụ Ihe Dị Oké Mkpa?

NYE ỤFỌDỤ NDỊ, ihi ụra bụ ịla oge n’iyi. N’ịbụ ndị na-ahọrọ iji ọrụ n’aka kwa ụbọchị n’ihe banyere achụmnta ego na ntụrụndụ, ha na-ehi ụra nanị mgbe ike gwụkasịrị ha ahụ́. N’ụzọ dị iche, ndị ọzọ, bụ́ ndị na-anọ ọtụtụ abalị n’ehighị ụra ka ha na-atụgharị ma na-adagharị n’elu ihe ndina ruo isi isi ụtụtụ, ga-adị njikere ime ihe ọ bụla iji hie ụra nke ọma n’abalị.

N’ihi gịnị ka o ji esiri nnọọ ụfọdụ ndị ike ihi ụra, ebe ndị ọzọ na-achọsi ike ịmụrụ anya? Ànyị kwesịrị iwere ụra dị ka ihe ọma na-adịchaghị mkpa ka ọ̀ bụ dị ka ihe dị oké mkpa? Iji zaa ajụjụ  ndị a, ọ dị mkpa ka anyị ghọta ihe na-eme mgbe anyị nọ n’ụra.

Ihe Omimi nke Ụra Iburu Mmadụ

A ghọtachabeghị ihe ọ bụ ya kpọmkwem na-eme ka mmadụ gharazie ịma onwe ya ma hie ụra. Otú ọ dị, ndị nnyocha achọpụtawo na ụra bụ usoro dị mgbagwoju anya nke ụbụrụ na-achịkwa, nakwa na ọ na-agbaso usoro ahụ́ ji arụ ọrụ n’oge dum n’ụbọchị.

Ka anyị na-emewanye okenye, ụzọ anyị si ehi ụra na-agbanwe. Nwa ọhụrụ na-ehi ụra mkpirikpi oge mkpirikpi oge ruo ihe dị ka ngụkọta nke awa 18 n’ụbọchị. Dị ka ndị ọkachamara n’ihe banyere ụra si kwuo, n’agbanyeghị na ọ na-eyi ka ọ̀ bụ nanị awa atọ dị ụfọdụ ndị toworo eto mkpa iji hie ụra n’ụbọchị, ihe ruru awa iri na-adị ndị ọzọ mkpa.

Nnyocha e mere na nso nso a egosiwo na ọ bụ ndịrịta iche nke usoro ahụ́ ji arụ ọrụ mere o ji esiri ụfọdụ ndị nọ n’afọ iri na ụma ike ibili ụra n’ụtụtụ. O yiri ka usoro ahụ ahụ́ ji arụ ọrụ ọ̀ na-agatụkwu n’ihu ná mmalite oge uto, na-eme ka ndị na-eto eto na-achọ ịghara ịlakpu na iteta n’oge. Ehighị ụra n’oge a zuru ebe nile, ọ na-akwụsịwakwa mgbe mmadụ nọ n’etiti ma ọ bụ ná ngwụsị nke afọ iri na ụma ya.

Ọ bụ mmiri ọgwụ ahụ́ dị iche iche, bụ́ ndị a chọpụtaworo ọtụtụ n’ime ha, na-achịkwa usoro ahụ ahụ́ ji arụ ọrụ. Otu n’ime ha bụ melatonin, bụ́ mmiri ọgwụ ahụ́ e chere na-akpata iro ụra. A na-emepụta mmiri ọgwụ ahụ́ bụ́ melatonin n’ụbụrụ, ụfọdụ ndị ọkà mmụta sayensị kwekwaara na ọ bụ ya na-ebelata ịrụ ọrụ nke ahụ́ bụ́ nke na-ewere ọnọdụ obere oge tupu ụra eburu mmadụ. Ka ahụ́ na-ewepụta mmiri ọgwụ bụ́ melatonin, ọ̀tụ̀tụ̀ ikpo ọkụ nke ahụ́ na ọ̀tụ̀tụ̀ ọbara ji eruba n’ụbụrụ na-ebelata, uru ahụ́ anyị na-eji nke nta nke nta dị nro ma kụgbọọ. Gịnịzi na-eme ka onye ahụ na-abanye n’ọnọdụ dị omimi nke ụra?

‘Ihe Kasị Edozi Ahụ́ ná Ndụ’

Ihe dị ka awa abụọ ụra burusịịrị anyị, anya anyị na-amalite ịma jijiji na-aga n’ihu nakwa n’azụ. Nchọpụta ndị ọkà mmụta sayensị chọpụtara nke a mere ka ha kee ụra gaa n’ụzọ abụọ bụ́ isi: Oge ụra mgbe anya na-ama jijiji na oge ụra mgbe anya na-adị jụụ. A pụrụ ikewakwu oge anya na-adị jụụ gaa n’ụzọ anọ a na-ehimiru ụra. N’oge ụra abalị na-edò ahụ́, a na-enwe oge mgbe anya na-ama jijiji ọtụtụ ugboro, e nwetụ ya, e nwetụkwa oge mgbe anya na-adị jụụ.

Ọ bụ n’oge anya na-ama jijiji ka a na-arọ ihe ka ọtụtụ ná nrọ. Uru ahụ́ na-akụjụkwa nke ukwuu, bụ́ nke na-eme ka onye na-ehi ụra nwee ahụ́ gbasighachiri ike mgbe o tetara. Tụkwasị na nke a, ndị  nnyocha ụfọdụ kweere na ọ bụ ná nkebi ụra nke a ka a na-etinye ihe ọmụma ndị ga-adịte aka n’ike ncheta anyị.

N’oge ụra miri emi (oge ụra mgbe anya na-adị jụụ nkebi nke 3 na nke 4), ọ̀tụ̀tụ̀ ọbara ji erugharị anyị n’ahụ́ na ọ̀tụ̀tụ̀ obi anyị ji eti eti na-ebelata, na-eme ka usoro nrugharị ọbara zuo ike, na-enyekwa aka egbochi ọrịa obi na nke akwara. Tụkwasị na nke a, mmepụta nke mmiri ọgwụ ahụ́ ndị na-akwalite uto na-arị elu karịsịa n’oge ụra mgbe anya na-adị jụụ. N’abalị, ahụ́ nke ụfọdụ ndị nọ n’afọ iri na ụma na-emepụta mmiri ọgwụ ahụ́ ji okpukpu 50 karịa ka ha na-emepụta n’ụbọchị.

O yikwara ka ụra ọ̀ na-emetụta agụụ anyị na-enwe iri ihe. Ndị ọkà mmụta sayensị achọpụtawo na n’ezie ụra bụ, n’ikwu ya dị ka Shakespeare si kwuo ya, “ihe kasị edozi ahụ́ n’oriri nke ndụ.” Ụbụrụ anyị na-aghọta ehighị ụra dị ka erighị nri. Ka anyị na-ehi ụra, ahụ́ anyị na-ewepụta leptin, bụ́ mmiri ọgwụ ahụ́ nke na-eme ka ahụ́ anyị mara na anyị eriwo ihe nke ọma. Mgbe anyị mụ anya gabiga mgbe anyị kwesịrị ịmụru anya, ahụ́ anyị na-ewepụta leptin dị nta karị, anyị na-enwekwu agụụ iri ihe ndị na-enye carbohydrate. Ya mere, ichu onwe onye ụra pụrụ iduga n’irikwu ihe ndị na-enye carbohydrate, bụ́ nke n’aka nke ya, pụrụ ịkpata oké ibu.—Lee igbe bụ́ “Obere Ụra Ehihie,” nke dị na peeji nke 14.

Ọ Dị Oké Mkpa Maka Ahụ́ Ike

Ma ọ bụghị ebe ahụ ka okwu biri. Ụra na-eme ka ọ dịrị ahụ́ anyị mfe karị ịgbari atọm ndị kpụkọtara akpụkọta—irighiri ihe ndị a sịrị na-emetụta  ịka nká nke mkpụrụ ndụ, ọbụnakwa na-akpata ọrịa cancer. N’otu nnyocha Mahadum Chicago mere na nso nso a, e kwere ka ụmụ okorobịa 11 ahụ́ sichara ike na-ehi ụra nanị awa anọ kwa ụbọchị ruo ụbọchị isii. Ná ngwụsị nke oge a, mkpụrụ ndụ ndị dị n’ahụ́ ha nọ na-arụ ọrụ dị ka nke ndị dị afọ 60, ọ̀tụ̀tụ̀ mmiri ọgwụ bụ́ insulin nke dị n’ọbara ha hà ka nke onye na-arịa ọrịa shuga! Ọbụna, ichu onwe onye ụra na-emetụta mmepụta nke mkpụrụ ndụ ọbara ọcha na mmiri ọgwụ ahụ́ bụ́ cortisol, na-eme ka ọ dịrị mmadụ mfe karị ibute ọrịa na ịrịa ọrịa ndị metụtara nrugharị ọbara.

Obi abụọ adịghị ya na ụra dị oké mkpa iji nwee ahụ́ ike na uche zuru okè. N’echiche nke onye nchọpụta bụ́ William Dement, bụ́ onye guzobere ebe mbụ a na-eme nnyocha maka ụra, na Mahadum Stanford, U.S.A., “o yiri ka ụra ọ̀ bụ ihe kasị mkpa na-egosi ókè ị pụrụ ịdịru ndụ.” Deborah Suchecki, bụ́ onye nchọpụta nke nọ n’ebe a na-eme nnyocha banyere ụra na São Paulo, Brazil, na-ekwu, sị: “Ọ bụrụ na ndị mmadụ maara ihe na-eme n’ime ahụ́ e churu ụra, ha ga-eche echiche ugboro abụọ tupu ha ekwubie na ụra bụ ịla oge n’iyi ma ọ bụ ihe dịịrị nnọọ ndị umengwụ.”—Lee igbe dị n’elu.

Ma ụra nile hà na-enye ume ọhụrụ? N’ihi gịnị ka ụfọdụ ndị na-eji ehi ụra abalị dum ma ka ghara inwe ume ọhụrụ? Isiokwu na-esonụ ga-enyere gị aka ịmata ụfọdụ n’ime nsogbu ihi ụra ndị bụ́ isi e nwere, ọ ga-akọwakwa otú ị pụrụ isi hie ezigbo ụra.

[Igbe/Foto dị na peeji nke 14]

MMETỤTA NKE ICHU ONWE ONYE ỤRA

MMETỤTA NDỊ NA-ADỊGHỊ ADỊTE AKA

▪ Iro ụra

▪ Mgbanwe mberede nke ọnọdụ uche

▪ Ichezọ ihe ndị mere na nso nso

▪ Enwekwaghị ikike nke ichepụta ihe, ime atụmatụ, na ime ihe

▪ Enweghị ike itinye uche n’ihe

MMETỤTA NDỊ NA-ADỊTE AKA:

▪ Oké ibu

▪ Ịka nká n’ike

▪ Ike ọgwụgwụ

▪ Ohere ka ukwuu nke ibute ọrịa, inwe ọrịa shuga, ọrịa obi na akwara, na ọrịa eriri afọ

▪ Echetaghị ihe bụ́ nke na-adịte aka

[Igbe dị na peeji nke 14]

OBERE ỤRA EHIHIE

Ì rotụwo ụra n’ụzọ na-ekweghị nchịkwa mgbe i risịrị nri ehihie? Nke a abụchaghị ihe àmà na-egosi na i churu onwe gị ụra. Ọ bụ ihe dị otú o kwesịrị bụ́ ụra ịtụ mmadụ n’etiti ehihie n’ihi mbelata nke ọ̀tụ̀tụ̀ ikpo ọkụ nke ahụ́. Tụkwasị na nke a, na nso nso a, ndị ọkà mmụta sayensị achọpụtawo otu protein a na-akpọ hypocretin, ma ọ bụ orexin, bụ́ nke a na-emepụta n’ụbụrụ, nke na-enyekwa aka eme ka anyị mụrụ anya. Olee ihe jikọrọ hypocretin na nri?

Mgbe anyị riri nri, ahụ́ anyị na-emepụta mmiri ọgwụ leptin iji mee ka anyị mara na afọ ejuwo anyị. Ma mmiri ọgwụ leptin na-egbochi mmepụta nke hypocretin. N’ikwu ya n’ụzọ ọzọ, e nwee mmiri ọgwụ leptin dị ukwuu n’ụbụrụ, a ga-enwe hypocretin dị nta, iro ụra ga-arịkwa elu. Ikekwe, ọ bụ ya mere na, ná mba ụfọdụ, ndị mmadụ na-enwe oge nkwụsịtụ ọrụ n’ụbọchị iji wee hie obere ụra mgbe ha risịrị nri ehihie.

[Ihe e sere na peeji nke 13]

(Ị chọọ ịhụ ebe e sere map a, gaa n’akwụkwọ a nke e biri ebi)

NKEBI DỊ ICHE ICHE NKE ỤRA

Graf e mere ka ọ dị mfe nghọta

Nkebi dị iche iche nke ụra

Ịmụ anya

Oge anya na-ama jijiji

Oge anya na-adị jụụ

Ụra na-emighị emi 1

2

3

Ụra miri emi 4

1 2 3 4 5 6 7 8

Awa Ndị E Ji Hie Ụra

[Foto dị na peeji nke 12, 13]

Ọ dị oké mkpa ihi ụra nke ọma iji nwee ahụ́ ike na uche zuru okè

[Foto dị na peeji nke 13]

Mmepụta nke mmiri ọgwụ ahụ́ nke na-enye aka maka uto na-arị elu karịsịa n’oge a na-ehi ụra