Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gịnị Ka Anyị Na-eme Ihe Oriri Anyị?

Gịnị Ka Anyị Na-eme Ihe Oriri Anyị?

Gịnị Ka Anyị Na-eme Ihe Oriri Anyị?

ỊGBANWE ọdịdị ihe oriri anyị abụghị ihe ọhụrụ. N’eziokwu, ruo ọtụtụ ọgbọ ụmụ mmadụ anọwo na-eji nkà agbanwe ọdịdị ihe oriri. Usoro nzụlite ndị a na-eji mkpachara anya eme emewo ka e nwee ụdị dịgasị iche iche nke ihe ọkụkụ, ehi, na atụrụ ndị ọhụrụ. N’ezie, onye nnọchiteanya nke Ụlọ Ọrụ Na-ahụ Maka Ihe Oriri na Ọgwụ na United States kwuru na “ọ fọrọ nke nta ka ọ bụrụ na ihe oriri ọ bụla ị zụrụ abụwo nke a gbanwere site n’usoro e si azụlite ihe ọkụkụ.”

Nzụlite abụghị nanị ụzọ e si emegharị ihe oriri. Ndị na-emepụta ihe oriri achọpụtawo ọtụtụ ụzọ isi megharịa ma chekwaa ihe oriri, ma ọ̀ bụ iji mee ka ụtọ ma ọ bụ ụcha ya pụtakwuo ma ọ bụ iji mee ka ọ dị otú a chọrọ nakwa iji chekwaa ya. Ọ marala ndị mmadụ ahụ iri nri e megharịrị emegharị n’otu ụzọ ma ọ bụ n’ụzọ ọzọ.

Ma ọnụ ọgụgụ na-arị elu nke ndị na-azụ ihe na-enwe nchegbu maka ihe a na-emezi ihe oriri anyị. N’ihi gịnị? Ụfọdụ ndị na-atụ egwu na usoro ọgbara ọhụrụ ndị e jizi eme ihe na-eme ka ihe oriri anyị bụrụ ihe dịzi ize ndụ. Ezi uche ọ̀ dị ná nchegbu a? Ka anyị tụlee ihe atọ a na-enwe nchegbu maka ha. *

Mmiri Ọgwụ Ahụ́ Bụ́ Hormone na Ọgwụ Nje

Kemgbe afọ ndị 1950, n’ebe ụfọdụ, a nọwo na-etinyetụ ọgwụ nje ná nri ọkụkọ, ezì, na ehi. Nzube e ji eme ya bụ iji belata ihe ize ndụ nke ọrịa, karịsịa n’ebe a na-edebekọta ụmụ anụmanụ. N’ala ụfọdụ, a na-etinye mmiri ọgwụ ahụ́ bụ́ hormone ná nri anụmanụ iji mee ka ha too ngwa ngwa. E kwuru na mmiri ọgwụ ahụ́ bụ́ hormone na ọgwụ nje na-eme ka anụmanụ ghara ibute ọrịa nakwa ka usoro ịkọ ugbo n’ụzọ sara mbara bụrụ nke a na-eritekwu uru na ya, na-abara ndị na-azụ ihe uru site n’ime ka ihe dị ọnụ ala karị.

Nke ahụ yiri ihe ezi uche dị na ya. Ma anụ ndị sitere n’anụmanụ ndị e nyere ọgwụ ndị a hà nwere ihe ize ndụ ọ bụla nye ndị ga-ata ha? Otu akụkọ nke sitere n’aka Kọmitii Na-ahụ Maka Ọnọdụ Akụ̀ na Ụba na Ọha Mmadụ nke Ógbè Ndị Dị na Europe kwubiri na nje bacteria pụrụ iguzogide ọgwụ nje ndị ahụ ma bụrụ nke e bufere n’ahụ́ ndị ga-ata anụ ahụ. Akụkọ ahụ gosiri na “ọ pụrụ ịbụ kpọmkwem ụfọdụ n’ime nje bacteria ndị a, dị ka Salmonella na Campylobacter, na-akpata ajọ ọrịa ndị mmadụ na-ebute site n’usoro mmepụta nri.” Ọzọkwa, gịnị ma ọ bụrụ na usoro mmepụta nri ahụ enwee ọ bụghị nanị nje bacteria kamakwa ụfọdụ n’ime ọgwụ nje ahụ? A na-atụ egwu na n’ihi ya, nje ndị na-akpatara ndị mmadụ ọrịa pụrụ iji nwayọọ nwayọọ malite iguzogide ọgwụ nje.

Gịnị banyere anụ nke anụmanụ ndị e nyere mmiri ọgwụ ahụ́ bụ́ hormone? Otu prọfesọ nọ na Munich, Germany, bụ́ Dr. Heinrich Karg, na-ekwu, sị: “Ndị ọkachamara nile kweere na anụ sitere n’anụmanụ ndị e nyere mmiri ọgwụ ahụ́ bụ́ hormone adịghị emebi ahụ́ ike, ma ọ bụrụhaala na e jiri mmiri ọgwụ ndị ahụ mee ihe n’ụzọ kwekọrọ n’ụkpụrụ nduzi ndị e nwere.” Otú ọ dị, akwụkwọ akụkọ bụ́ Die Woche na-akọ na a bịa n’ihe banyere adịghị ize ndụ nke anụ sitere n’anụmanụ ndị e ji mmiri ọgwụ ahụ́ bụ́ hormone zụọ, “ruo afọ 15 gara aga, ndị nnyocha enwebeghị ike ikwekọrịta n’otu ihe.” Na France kwa, ajụjụ ma a ga-eji mmiri ọgwụ ahụ́ bụ́ hormone mee ihe n’anụ enwetawo azịza dara ụda bụ́, ‘Ee e! E kwesịghị iji mmiri ọgwụ ahụ́ bụ́ hormone mee ihe!’ N’ụzọ doro anya, arụmụka ahụ ebibeghị.

Ihe Oriri Ndị E Mere Ka Ụzarị Ọkụ Chakwasị

Kemgbe a malitere nnwale na Sweden na 1916, ọ dịkarịa ala mba 39 akwadowo ime ka ụzarị ọkụ na-adịghị achasị ike chakwasị ihe oriri ndị dị ka poteto, ọka, mkpụrụ osisi, na anụ. N’ihi gịnị? E kwuru na ime ka ụzarị ọkụ chakwasị ha na-egbu ihe ka ọtụtụ na nje bacteria, ahụhụ, na nje ndị ọzọ, si otú a na-ebelata ohere ndị ga-eri ihe ahụ nwere ibute ọrịa site n’ihe oriri. Ọ na-agbatịkwu oge ihe oriri ga-anọru.

N’ezie, ndị ọkachamara na-ekwu na dị ka o kwesịrị ịdị, ihe oriri anyị na-eri kwesịrị ịdị ọcha ma bụrụ nke e nwetara ọhụrụ. Ma ò nwekwaranụ onye dị njikere iwepụta oge na-esi nri ọhụrụ mgbe nile? “Minit iri maka nri ụtụtụ na minit 15 maka nri ehihie na nri abalị” bụ, dị ka magazin bụ́ Test si kwuo, ogologo oge ihe ka ọtụtụ ná ndị mmadụ na-eji eri nri. Mgbe ahụ, ọ bụghị ihe ijuanya na ọtụtụ ndị na-azụ ihe na-ahọrọ ihe oriri a kwadebeworo akwadebe nakwa nke a pụrụ ichekwa ruo ogologo oge. Ma ihe oriri ndị e mere ka ụzarị ọkụ chakwasị hà dị mma oriri?

Na 1999, Òtù Ahụ́ Ike Ụwa bipụtara otu nnyocha nke otu ìgwè ndị ọkachamara mba nile mere. Ha kwubiri na ihe oriri e mere ka ụzarị ọkụ chakwasị “dị mma oriri, na-edozikwa ahụ́.” Ndị na-akwado ya ji ime ka ụzarị ọkụ chakwasị ihe oriri tụnyere igbu nje ndị dị na bandeeji—nke a na-emekwa site n’ime ka ụzarị ọkụ chakwasị ya—ma ọ bụ ibufe ibu n’ígwè electronic na-enyocha ibu n’ọdụ ụgbọelu. Otú ọ dị, ndị na-akatọ ya na-esi ọnwụ na ime ka ụzarị ọkụ chakwasị ihe oriri na-ebelata ihe ndị na-edozi ahụ́ dị na ya nakwa na ọ pụrụ inwe ihe ize ndụ ndị a ka-amatabeghị.

Ihe Oriri Ndị A Gbanwere Mkpụrụ Ndụ Ihe Nketa Ha

Ruo oge ụfọdụ, ndị ọkà n’ihe banyere mkpụrụ ndụ ihe nketa enwewo ike iwefe otu mkpụrụ ndụ ihe nketa site na DNA nke otu ihe dị ndụ gaa na DNA nke ihe ọzọ dị ndụ bụ́ otu ụdị. Otú ọ dị, taa ndị ọkà n’ihe banyere mkpụrụ ndụ ihe nketa pụrụ ime ihe karịrị nke ahụ. Dị ka ihe atụ, e nwere strawberry na tomato ndị e jiworo mkpụrụ ndụ ihe nketa e wetara n’azụ̀ gbanwee nke ha, na-eme ka ha bụrụ ndị oyi na-adịkwaghị emetụtacha.

E kwuwo ọtụtụ ihe iji kwadoo nakwa iji megide ihe oriri ndị a gbanwere mkpụrụ ndụ ihe nketa ha (GM). * Ndị na-akwado ya na-ekwu na a pụrụ ịchịkwa na iji ụdị nkà na ụzụ banyere ihe ndị dị ndụ a n’aka karịa usoro ịzụlite ihe ọkụkụ bụ́ nke dịwara kemgbe ụwa, nakwa na ọ ga-eme ka ihe ọkụkụ na-emepụtakwu ihe ma belata ọnụ ọgụgụ ndị agụụ na-egbu. Ma ihe oriri GM hà dị mma oriri?

Otu ìgwè ndị ọkà mmụta sayensị na-anọchite anya òtù ndị ọkachamara nọ n’England na United States nakwa Brazil, China, India, Mexico, na mba ndị ọzọ ka na-emepe emepe, kwadebere otu akụkọ banyere okwu ahụ. N’ịbụ nke e bipụtara na July 2000, akụkọ ahụ na-ekwu, sị: “Ruo ugbu a, a kọwo ihe ọkụkụ ndị a gbanwere mkpụrụ ndụ ihe nketa ha [GM] karịrị nde hekta 30 [nde eka 70], ọ dịbeghịkwa nsogbu ahụ ike ụmụ mmadụ a chọpụtara bụ́ nke sitere kpọmkwem n’oriri ha riri ihe ọkụkụ ndị a gbanwere mkpụrụ ndụ ihe nketa ha ma ọ bụ mkpụrụ ha.” N’ógbè ụfọdụ, a na-ewere mkpụrụ ihe ọkụkụ GM dị ka ndị na-adịghị ize ndụ dị ka ihe oriri ndị a kọrọ n’usoro ndị dịbu adị.

Otú ọ dị, n’ebe ndị ọzọ, ọtụtụ ndị na-enwe obi abụọ. N’Austria, Britain, na France, ụfọdụ ndị adịghị atụkwasị ihe oriri GM obi. Otu onye ndọrọ ndọrọ ọchịchị na Netherlands kwuru banyere ihe oriri GM, sị: “E nwere ụdị ihe oriri ụfọdụ na-adịghị nnọọ amasị anyị.” Ndị na-akatọ ihe oriri dị otú ahụ na-ezo aka n’ụkpụrụ omume na ihe ize ndụ ndị ọ pụrụ ịbụrụ gburugburu ebe obibi.

Ndị ọkà mmụta sayensị ụfọdụ na-eche na ihe oriri GM ka malitere amalite nakwa na e kwesịrị imekwu nnwale maka ihe ize ndụ ndị ọ pụrụ iwetara ndị na-eri ha. Dị ka ihe atụ, Òtù Ọgwụ na Ahụ́ Ike nke Britain na-eche na nkà mgbanwe mkpụrụ ndụ ihe nketa pụrụ iweta abamuru dị ukwuu maka ndị bi n’ala ha. Ma, o kwuru na akụkụ ụfọdụ na-akpata nchegbu—dị ka okwu banyere ahụ anabataghị ihe oriri GM—pụtara na “ọ dị mkpa ka e mekwuo nnyocha.”

Ime Nhọrọ Onwe Onye Ndị Ziri Ezi

N’ala ụfọdụ, ihe hà ka pasent 80 nke ihe oriri a na-eri eri bụ ndị e ji mmiri ọgwụ dị iche iche echekwa. Ọtụtụ mgbe, a na-etinye ha ihe ndị na-eme ka ụtọ ma ọ bụ ụcha ha pụtakwuo ma ọ bụ dị otú a chọrọ, ndị na-emekwa ka ha nọtekwuo aka. N’eziokwu, otu akwụkwọ ntụaka na-ekwu na “e wezụga ihe ndị e ji eme ka ihe oriri tọkwuo ụtọ, a gaghị emepụtali ọtụtụ ihe ndị a na-emepụta n’oge a, dị ka nri ndị nwere calorie dị ala, mgbadume, na ndị a gbara ná mkpọ.” Ihe oriri ndị dị otú ahụ yikarịrị ka hà ga-enwe ihe ndị a gbanwere mkpụrụ ndụ ihe nketa ha.

Ruo ọtụtụ afọ, ọrụ ubi adaberewo n’usoro ndị ọtụtụ ndị na-ele anya dị ka ndị na-emerụ ahụ́. Otu ihe atụ bụ ojiji a na-eji ọgwụ ahụhụ ndị nsí dị na ha eme ihe. Ọzọkwa, ruo oge ụfọdụ, ndị na-emepụta ihe oriri anọwo na-etinye ha ihe ndị na-eme ka ụtọ ihe pụtakwuo bụ́ ndị pụrụ imewo ka ahụ́ ndị riri ha ghara ịdị na-anabata ha. Nkà na ụzụ ndị ọhụrụ e ji emepụta ihe oriri hà dị nnọọ ize ndụ karịa usoro ndị a? Ndị ọkachamara apụghịdị ikwekọrịta. N’eziokwu, akụkọ dị iche iche gbara ọkpụrụkpụ ndị ọkà mmụta sanyesị wepụtara na-akwadogasị akụkụ abụọ nke arụmụka ahụ, o yikwara ka hà na-eme ka e nwee echiche dịgasị iche iche.

Ebe ọ bụ na ha na-ele ihe oriri ndị bụ́ ọkpọka anya dị ka ndị siri ike izere ezere ma ọ bụ n’ihi na ha na-ele ihe ndị ọzọ a na-echebara echiche anya dị ka ndị chọrọ ime ihe ngwa ngwa karị, ọtụtụ ndị taa na-ekpebi ịghara ichegbu onwe ha banyere okwu ahụ. Otú ọ dị, ndị ọzọ na-enwe nnọọ nchegbu. Gịnị ka ị pụrụ ime ma ọ bụrụ na gị na ezinụlọ gị enwee obi abụọ banyere iri ihe oriri ndị e ji ọgwụ chekwaa bụ́ ndị yiri ka nkà na ụzụ ọgbara ọhụrụ ò mere ka ha dị mgbagwoju anya gabiga ókè? E nwere ọtụtụ ihe ndị bara uru ị pụrụ ịhọrọ ime, bụ́ ndị a tụlere ụfọdụ n’ime ha n’isiokwu na-esonụ. Otú ọ dị, nke mbụ, ọ pụrụ ịbụ ihe amamihe dị na ya ijide n’aka na anyị nwere echiche ziri ezi banyere okwu a.

Ihe oriri ịghara ịdị ize ndụ dị ka ahụ́ ike. Ọ dịghị ụzọ e ji eme ihe ugbu a na-eme ka ọ dịchaa mma. Dị ka magazin Germany bụ́ natur & kosmos si kwuo, ọbụna ndị a ma ama na ha na-akpachara anya nke ukwuu n’ịhọrọ nakwa n’ịkwadebe ihe oriri anaghị enwetacha ihe nile a chọrọ ná nri na-edozi ahụ́. Ihe baara otu onye uru pụrụ imerụ onye ọzọ ahụ́. Mgbe ahụ, ọ́ bụghị ihe amamihe dị na ya ịzụlite àgwà ziri ezi ma zere ịgabiga ókè?

N’ezie, Bible adịghị agwa anyị mkpebi anyị ga-eme banyere ihe oriri ndị e ji nkà na ụzụ ndị bụ́ ọkpọka nke taa emepụta. Ma ọ na-ezi anyị banyere àgwà anyị ga-azụlite bụ́ nke ga-enyere anyị aka n’okwu a. Ndị Filipaị 4:5 na-ekwu, sị: “Ka inwe ezi uche unu bụrụ nke mmadụ nile maara.” Ezi uche pụrụ inyere anyị aka ime mkpebi ndị ziri ezi ma zere ịgabiga ókè. Ọ pụrụ ime ka anyị ghara ikpebiri ndị ọzọ ihe ha kwesịrị ime ma ọ bụ ihe ha na-ekwesịghị ime n’okwu a. Ọ pụkwara ime ka anyị zere arụmụka na-enweghị isi, nke na-akpata nkewa n’etiti anyị na ndị echiche ha banyere okwu ahụ pụrụ ịdị iche na nke anyị.

Otú ọ dị, a ghaghị ikweta na ọtụtụ n’ime ihe ize ndụ ndị e jikọtara ha na ihe oriri adịchaghị akpata arụmụka. Gịnị bụ ụfọdụ n’ime ha, ihe ndị dịkwa aṅaa ka ị pụrụ ime?

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

^ par. 4 Ihe anyị na-eri bụ n’ụzọ dị ukwuu okwu dịịrị onwe onye. Teta! adịghị atụ aro ka e rie ma ọ bụ zere iri ihe oriri dịgasị iche iche a tụlere n’ebe a, n’agbanyeghị usoro e ji kwadebe ha. Nzube nke isiokwu a bụ ime ka ndị na-agụ akwụkwọ anyị mata ihe bụ́ eziokwu dị ka a maara ha ugbu a.

^ par. 15 Biko lee mbipụta Teta! (Bekee) nke April 22, 2000.

[Foto dị na peeji nke 14]

Mmiri ọgwụ ahụ́ bụ́ “hormone” na ọgwụ nje a na-eji azụ ehi hà na-emetụta ndị na-ata anụ ha?

[Foto dị na peeji nke 16]

Ọ bụ ihe amamihe dị na ya iji nlezianya gụọ ihe a mapawara n’ahụ́ ihe oriri

[Foto dị na peeji nke 17]

E nwere abamuru ndị dị n’ịzụ ihe oriri ndị e nwetara ọhụrụ mgbe nile