Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Iyi Oge Mkpapụ n’Etorughị Etoru—Gịnị Dị Njọ na Ya?

Iyi Oge Mkpapụ n’Etorughị Etoru—Gịnị Dị Njọ na Ya?

Ndị Na-eto Eto Na-ajụ Sị . . .

Iyi Oge Mkpapụ n’Etorughị Etoru—Gịnị Dị Njọ na Ya?

“Na nso nso a, ụmụ okorobịa nọ n’ụlọ akwụkwọ anyị anọwo na-arịọ m ka mụ na ha yie oge mkpapụ ma ọ bụ ka m bụrụ enyi ha nwanyị.”—Becky, dị afọ 11. *

“Ihe ka ukwuu n’ụmụaka nọ n’ụlọ akwụkwọ anyị na-eso onye na-abụghị nwoke ma ọ bụ nwanyị ibe ha eyi oge mkpapụ. N’ezie, ọ bụghị ihe ọhụrụ ịhụ ụmụ okoro na ụmụ agbọghọ ka ha na-esusu ọnụ kpọmkwem na paseji.”—Liana, onye nọ na klas nke anọ n’ụlọ akwụkwọ sekọndịrị.

ỌTỤTỤ ndị ntorobịa na-amalite iso onye na-abụghị nwoke ma ọ bụ nwanyị ibe ha eyi oge mkpapụ mgbe ha dị nnọọ obere. Usoro mgbasa ozi na-akwalite omume a dị ka ihe dị otú o kwesịrị—dị ka a ga-asị na ọ bụ ntụrụndụ na-adịghị emerụ ahụ. Oneyda, bụ́ onye dị afọ 12 na-akọ, sị: “Ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ onye ọ bụla nọ n’ụlọ akwụkwọ anyị nwere enyi nwoke ma ọ bụ enyi nwanyị.” Otu nwa agbọghọ aha ya bụ Jenifer na-ekwu, sị: “Ana m echeta ụmụaka ndị dị ihe dị ka afọ itoolu bụ́ ndị nọ na-eyi oge mkpapụ mgbe nile.” Ọ gbakwụnyere, sị: “Amalitere m inwe nrụgide iso ụmụ nwoke na-eyi oge mkpapụ mgbe m dị afọ 11.”

Mgbe ahụ, o kwere nghọta na ọ bụrụ na ọ dịghị nwoke ma ọ bụ nwanyị gị na ya na-eyi oge mkpapụ, ọ pụrụ ịdị gị ka ị gbapụrụ iche. N’eziokwu, a pụrụ ọbụna iji gị mee ihe ọchị ma kwaa gị emo n’ihi na ị dịghị eme otú ahụ. N’ịbụ onye chere na ya ka dị nnọọ obere iyi oge mkpapụ, Jenifer anabataghị arịrịọ ụmụ okoro rịọrọ ya ka ha na ya na-eyi oge mkpapụ. Olee otú ha si meghachi omume? Jenifer na-echeta, sị: “Ha kwara m emo, jirikwa ya na-eme ihe ọchị.” Ọ dịghị onye ọ na-amasị ka a kwaa ya emo. Ma ì kwesịrị iso onye na-abụghị nwoke ma ọ bụ nwanyị ibe gị na-eyi oge mkpapụ nanị n’ihi na ndị ọzọ na-eme otú ahụ? Gịnịdị bụ iso onye na-abụghị nwoke ma ọ bụ nwanyị ibe gị na-eyi oge mkpapụ? Nzube dịkwa aṅaa ka ọ na-emezu?

Gịnị Bụ Nwoke na Nwanyị Iyi Oge Mkpapụ?

‘Anyị anaghị eyi oge mkpapụ. Anyị bụ nanị enyi,’ ka ọtụtụ ndị ntorobịa na-ekwu, n’agbanyeghị na ha na-eso onye na-abụghị nwoke ma ọ bụ nwanyị ibe ha na-anọkọ ọtụtụ mgbe. Ma ihe ọ bụla ọ sọrọ gị kpọọ ya—iyi oge mkpapụ, ịgakọ ọnụ, ma ọ bụ nanị ịhụ onye nke ọzọ—mgbe nwa okoro na nwa agbọghọ na-enwe mmasị pụrụ iche n’ebe ibe ha nọ ma malite ịnọkọrịta n’ụzọ ntụrụndụ, ọ na-agụnyekarị ihe karịrị ọbụbụenyi. Iyi oge mkpapụ abụghị iwu na ọ ga-abụrịrị ihu na ihu. Mkparịta ụka n’ebe a na-ezirịta ozi n’Internet, na telifon, site n’akwụkwọ ozi, ma ọ bụ site n’ozi E-mail pụkwara ịbụ ụdị ụfọdụ nke iyi oge mkpapụ nwoke na nwanyị.

Ajụjụ dị n’ebe ahụ bụ, olee nnọọ otú iso onye na-abụghị nwoke ma ọ bụ nwanyị ibe gị na-anọkọ ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ ọtụtụ mgbe bụruru okwu siri ike?

Iso Onye Na-abụghị Nwoke Ma Ọ Bụ Nwanyị Ibe Gị Eyi Oge MkpapụIhe Ize Ndụ Ndị Dị na Ya

N’Ilu 30:19, Bible na-ekwu banyere “ụzọ nwoke n’ebe nwa agbọghọ nọ.” Okwu a na-egosi na mmekọrịta nwoke na nwanyị nwere usoro o yiri ka ọ̀ na-agbaso. Ọ bụrụ na mmadụ abụọ ahụ tozuchara okè ma na-agbaso ụkpụrụ omume ndị Chineke setịpụrụ, iyi oge mkpapụ pụrụ iduga n’ịhụnanya nakwa, n’ikpeazụ, n’alụmdi na nwunye dị ùgwù. E kwuwerị, Chineke kere nwoke na nwanyị inwe mmasị n’ebe ibe ha nọ. Ma gịnị ma ọ bụrụ na i torubeghị ịlụ di ma ọ bụ nwunye? Site n’iso onye na-abụghị nwoke ma ọ bụ nwanyị ibe gị na-eyi oge mkpapụ n’etorughị etoru, ị na-etinye onwe gị n’ọnọdụ ga-eweta ọdachi.

N’ihi gịnị? N’ihi na ọ bụrụ na gị na onye na-abụghị nwoke ma ọ bụ nwanyị ibe gị ana-anọkarị, ọ bụ nanị ihe dị otú o kwesịrị na a ga-akpali mmetụta unu. Tupu ị mara ihe na-emenụ, ọ ga na-agụ gị agụụ ịhụ onye ahụ. Mgbe unu na-anọkọghị, ị ga-ahụ onwe gị ka ị na-eche banyere ya. Otú ọ dị, ọtụtụ mgbe, mmetụta ahụ na-adịkarị n’otu akụkụ—otu onye enweekwa obi mgbawa. Ọ bụrụgodị na mmadụ abụọ ahụ nwechara mmetụta ahụ, ọ ga-akpatakwa nkụda mmụọ na obi mgbawa ma ọ bụrụ na otu onye ma ọ bụ onye nke ọzọ etorubeghị ịlụ di ma ọ bụ nwunye. N’ezie, gịnị ka mmekọrịta dị otú ahụ pụrụ iduga na ya? Otu ilu Bible na-ekwu, sị: “Mmadụ, ọ̀ ga-agụrụ ọkụ tinye n’uwe obi ya, ma uwe ya agaghị ere ọkụ?”—Ilu 6:27.

Tụlee ihe banyere otu onye ntorobịa aha ya bụ Nina. Ọ na-akọ, sị: “Ezutere m otu nwa okorobịa n’Internet. Anyị na-ekwurịta okwu n’ebe mkparịta ụka ruo ọtụtụ awa kwa ụbọchị. Obi m malitere ịdị n’ebe ọ nọ, ndụ m malitekwara ịdabere n’ebe ọ nọ. Mmekọrịta ahụ adịteghị aka. Mgbe o jedebere, abịara m daa nnọọ mbà n’obi. E mesịa, ọ kpọrọ m ma gwa m na ya gaje igbu onwe ya n’ihi ntisa ahụ. Nke ahụ mere ka m nwekwuo ịda mbà n’obi.” N’ileghachi anya azụ, Nina kwubiri, sị: “O kwesịghị ahụhụ m na-ata! Mmekọrịta ahụ jedebere afọ abụọ gara aga, m ka dakwara mbà n’obi.” Nina dị nnọọ obere itinye obi ya n’ebe mmadụ nọ.

Ọ dị mma ịmara na mgbe Bible na-ekwu banyere “ụzọ nwoke n’ebe nwa agbọghọ nọ,” ọ pụrụ izo aka ná mmekọahụ. N’ụwa taa, nwoke na nwanyị iyi oge mkpapu na-abụkarị nke mmekọahụ na-esochi. Ọ pụrụ ịmalite n’ebughị ihe ọjọọ n’obi, site nanị n’ijide aka. Ibi ọma ngwa ngwa na isutụ ọnụ na ntì pụrụ isochi. Ya na mmadụ abụọ tozuworo etozu bụ́ ndị kweworo onwe ha nkwa ọlụlụ siri ike igosipụta mmetụta ịhụnanya dị otú ahụ abụghị otu ihe. Ma mgbe mmadụ abụọ na-etorubeghị ịlụ di na nwunye, nanị ihe omume dị otú ahụ ga-eme bụ ịkpalite agụụ mmekọahụ n’ụzọ na-enweghị isi. Omume “mmetụta ịhụnanya” pụrụ ịghọwanye nke na-ezighị ezi ma ọ bụ nke na-adịghị ọcha. Ha pụrụ iduga ọbụna n’ụdị ụfọdụ nke ịkwa iko. *

Ihe ndị ịkwa iko na-arụpụta dị njọ. Ụfọdụ ndị na-etinye aka na ya na-enweta ọrịa ndị a na-ebute site ná mmekọahụ. Ndị ọzọ na-aghọ ndị na-enweghịzi ùgwù onwe onye na ndị e mebiri akọ na uche ha. Ụmụ agbọghọ ụfọdụ na-atụrụ ime. Ka a sịkwa ihe mere Bible ji enye ndụmọdụ a: “Gbanahụnụ ịkwa iko”! (1 Ndị Kọrint 6:13, 18; 1 Ndị Tesalọnaịka 4:3) Izere iso onye na-abụghị nwoke ma ọ bụ nwanyị ibe gị eyi oge mkpapụ mgbe ị na-etorughị etoru ga-enyere gị aka irube isi n’iwu a.

Mgbe Ị Ga-eso Onye Na-abụghị Nwoke Ma Ọ Bụ Nwanyị Ibe Gị Eyi Oge Mkpapụ

Nke a apụtaghị na ọ dịghị mgbe ọ bụla ị ga-eso onye na-abụghị nwoke ma ọ bụ nwanyị ibe gị eyi oge mkpapụ. Ma ọ bụrụ na ị bụ onye nọ n’afọ iri na ụma, eleghị anya ị nọ n’ihe Bible na-akpọ “ntoju ntorobịa.” (1 Ndị Kọrint 7:36) Ị ka na-amalite nnọọ itoju n’ụdị nwoke ma ọ bụ n’ụdị nwanyị ị ga-emesị ghọọ. N’oge a, ị na-amalite itozu okè n’ụzọ anụ ahụ, n’ụzọ mmetụta uche, nakwa n’ụzọ mmekọahụ. Mmetụta gị—gụnyere agụụ mmekọahụ—pụrụ isi nnọọ ike karịsịa. Otú ọ dị, mmetụta ndị ahụ pụkwara ịgbanwe n’ụzọ ndị dị ngwa. N’ihi nke a, mmekọrịta ịhụnanya nke ndị nọ n’afọ iri na ụma pụrụ ịdịru nwa mgbe. “Mgbe m na-eso nwoke eyi oge mkpapụ,” ka otu nwa agbọghọ nọ n’afọ iri na ụma na-echeta, “ọ na-abụkarị nke a tọọ taa e tisaa echi.”

N’ụzọ doro anya, ezi uche adịghị ya iso onye na-abụghị nwoke ma ọ bụ nwanyị ibe eyi oge mkpapụ n’oge “ntoju ntorobịa.” Ọ kasị mma ichere ruo mgbe ị matara onwe gị nke ọma, ihe ndị na-amasị gị na ihe ndị na-adịghị amasị gị, na ihe mgbaru ọsọ ndị ị chọrọ ịchụso. Ọzọkwa, i kwesịrị itoru etoru ibu ibu ọrụ ndị na-adị n’alụmdi na nwunye. Dị ka ihe atụ, Jehova na-atụ anya ka di na-egbo mkpa ezinụlọ ya—n’ụzọ anụ ahụ, n’ụzọ ihe onwunwe, nakwa n’ụzọ ime mmụọ. Ọ bụrụ na ị bụ nwa okorobịa nọ n’afọ iri na ụma, ị̀ dị njikere inweta ọrụ ma lekọta nwunye nakwa ikekwe ụmụaka? Ị̀ dị njikere inyere ha aka n’ịnọgide na-eji ihe ime mmụọ akpọrọ ihe? Gịnịkwanụ ma ọ bụrụ na ị bụ nwa agbọghọ na-eto eto? A chọrọ ka nwunye na-ahụ di ya n’anya ma na-erubere ya isi; ọ ghaghị ịkwado mkpebi ndị ọ ga-eme. Ị̀ dị njikere n’ezie ime otú ahụ ruo ogologo oge? Ọzọkwa, ị̀ dị njikere ilekọta ezinụlọ kwa ụbọchị—ịkwadebe ihe oriri na ilekọta ụmụaka?—Ndị Efesọs 5:22-25, 28-31; 1 Timoti 5:8.

Iji maa atụ: N’ala ndị dị n’Ebe Ọdịda Anyanwụ Ụwa, ọ na-agụsi ndị na-eto eto agụụ ike ịkwọ ụgbọala ezinụlọ ha. Ma gịnị ka onye ntorobịa na-aghaghị ime tupu e kwe ka o mee otú ahụ? N’ọtụtụ ala, ị ghaghị inweta ọzụzụ, a nwaleekwa gị, tupu e nye gị akwụkwọ ikike. N’ihi gịnị? N’ihi na ịkwọ ụgbọala abụghị obere ibu ọrụ. Ndụ gị na ndụ ndị ọzọ ga-adị n’aka gị mgbe ị na-akwọ ụgbọala. Alụmdi na nwunye bụkwa ibu ọrụ siri ike! Dị ka onye ntorobịa, ọ pụrụ ịbụ nnọọ na ị dịbeghị njikere maka ya ka ọ dị ugbu a. Ọ bụrụ otú ahụ, ọ ga-abụrụ gị ihe amamihe iguzogide ọnwụnwa nke iyi oge mkpapụ, ebe ọ bụ na mmadụ iso onye na-abụghị nwoke ma ọ bụ nwanyị ibe ya eyi oge mkpapụ bụ nzọụkwụ a na-ewere n’ịchọ onye a ga-alụ. N’ikwu ya n’ụzọ dị mfe: Ọ bụrụ na ị dịghị njikere maka alụmdi na nwunye, i kwesịghị iso onye na-abụghị nwoke ma ọ bụ nwanyị ibe gị eyi oge mkpapụ.

Iji mee mkpebi amamihe dị na ya n’okwu a, ihe Bible kpọrọ “ihe ọmụma na izuzu” dị gị mkpa. (Ilu 1:4) Mgbe ahụ, ọ pụrụ ịbụ echiche dị mma irite uru n’ihe ọmụma na ahụmahụ nke onye bụ okenye karịa gị. Ndị nne na nna bụ́ Ndị Kraịst na-anọkarị n’ọnọdụ kasị mma inyere gị aka ịtụle ma ị̀ dịla njikere maka alụmdi na nwunye. Ị pụkwara ịchọ inweta ndụmọdụ ụfọdụ n’aka ndị tozuru okè nọ n’ọgbakọ Ndị Kraịst. Ọ bụrụ na nne na nna gị achọghị ka i soro onye na-abụghị nwoke ma ọ bụ nwanyị ibe gị yie oge mkpapụ, ọ ga-adị mma ka i kwenyere ha. Ọchịchọ ha bụ inyere gị aka ‘mee ka ihe ọjọọ si n’anụ ahụ gị gabiga.’—Eklisiastis 11:10.

Ọ bụrụ na ha echee na ị dịbeghị njikere iso onye na-abụghị nwoke ma ọ bụ nwanyị ibe gị eyi oge mkpapụ, ha pụrụ ịtụ aro na ka ọ dịgodị, kama itinye uche nanị n’ebe otu onye nọ, ka ị gbasapụ usoro ndị enyi gị. Iso ndị mmadụ na-akpakọrịta, ma ndị lụrụ di na nwunye ma ndị na-alụbeghị, ma ndị agadi ma ụmụntakịrị, nakwa ndị ọgbọ gị, pụrụ inyere gị aka itozu okè ma nwee echiche ka zie ezi banyere ndụ na alụmdi na nwunye.

Ichere ruo mgbe ị dị njikere iso onye na-abụghị nwoke ma ọ bụ nwanyị ibe gị eyi oge mkpapụ agaghị adị mfe. Ma abamuru ị ga-enweta ga-ekwesị nchere ahụ. Site n’iji oge “ntoju ntorobịa” mee ihe iji bụrụ onye tozuru okè, nke ji ihe akpọrọ ihe, ị ga-ezere ọtụtụ nsogbu. Ị ga-enye onwe gị oge iji tozuo okè ịbụ ụdị onye pụrụ ịchịkwa nrụgide na ibu ọrụ ndị na-eso alụmdi na nwunye. Ị ga-enyekwa onwe gị oge iji bụrụ onye tozuru okè n’ụzọ ime mmụọ. N’ụzọ dị otú ahụ, mgbe i mesịrị dị njikere iso onye na-abụghị nwoke ma ọ bụ nwanyị ibe gị eyi oge mkpapụ, ndị ọzọ pụrụ ịhụ gị dị ka onye e kwesịrị ka a matakwuo n’ezie.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

^ par. 3 A gbanwewo aha ụfọdụ.

^ par. 14 Okwu Grik mbụ e ji mee ihe maka ịkwa iko bụ por·neiʹa. Ọ na-ezo aka n’omume mmekọahụ nile nke e ji akụkụ ahụ ndị e ji enwe mmekọahụ eme, n’abụghị ná nkekọ alụmdi na nwunye. Nke a na-agụnye ịdịda akụkụ ahụ ndị e ji enwe mmekọahụ aka na iji ọnụ amị akụkụ ahụ nwoke na nwanyị.

[Foto dị na peeji nke 24]

Omume mmetụta ịhụnanya na-edubakarị ná nsogbu