Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Enyemaka na Ọmịiko Site n’Ọtụtụ Ebe

Enyemaka na Ọmịiko Site n’Ọtụtụ Ebe

Enyemaka na Ọmịiko Site n’Ọtụtụ Ebe

N DỊ ọrụ afọ ofufo si n’akụkụ ndị ọzọ nke United States nakwa ná mba ndị ọzọ bịa. Otu n’ime ndị ọrụ afọ ofufo ahụ bụ Tom (onye e gosiri n’elu), onye dị afọ 29, bụ́ onye ọrụ mgbanyụ ọkụ sitere Ottawa, Canada. Ọ gwara Teta! sị: “Ahụrụ m ihe ahụ merenụ na TV wee chọọ inye ndị ọrụ mgbanyụ ọkụ ibe m nọ na New York nkwado agbamume. Eji m ụgbọala rute na Friday wee gaa n’Ebe Ihe Ọdachi ahụ Mere na Saturday iji nye aka. A gwara m ka m sonyere ndị a kpọrọ ndị ọrụ bọket, na-eji bọket ekpopụ ụmụ irighiri ihe dị iche iche.

“Anyị jiri nwayọọ na-enyocha ntụ ahụ, jiri shọvel na-eku ya otu otu, na-achọ ihe ndị pụrụ inye aka mee ka a mata ndị ọrụ mmenyụ ọkụ ụlọ ahụ dagburu. Ahụrụ m otu ngwá ọrụ Halligan bụ́ nke a na-eji emeghe ibo ụzọ a kpọchiri akpọchi, nakwa ígwè na-adị n’isi paịpụ. Ọ bụ ọrụ e ji mkpachara anya rụọ. Ebe ọ bụ na e nwere ihe dị ka ndị ọrụ afọ ofufo 50, ọ na-ewe awa abụọ iji kpojuo otu nnukwu tipa.

“Na Monday, September 17, anyị bupụtara ozu ụfọdụ n’ime ndị ọrụ mgbanyụ ọkụ bụ́ ndị ji ọsọ gbaba n’ime ụlọ ahụ na Tuesday bu ụzọ. Agaghị m echezọ ihe e mere n’ebe ahụ ma ọlị—ndị ọrụ nnapụta ahụ nile kwụsịrị ọrụ, kpupụ okpu ike na okpu ìgwè ha, wee guzoro—iji kwanyere ndị ọrụ ibe anyị nwụrụ anwụ ùgwù.

“Ka m guzo na-ele ihe a na-eme n’Ebe Ihe Ọdachi ahụ Mere, abịara m ghọta otú ndụ si bụrụ ihe na-esighị ike taa. O mere ka m chee echiche banyere ndụ m, ọrụ m, ezinụlọ m. N’agbanyeghị ihe ize ndụ ndị dị na ya, ọrụ m na-akwụghachi nnọọ ụgwọ—inwe ike inyere ndị mmadụ aka nakwa ọbụna ịzọpụta ndụ.”

Ndịàmà Enye Aka n’Ụzọ Bara Uru

N’ụbọchị abụọ mbụ nke ọdachi ahụ, ihe dị ka mmadụ 70 gbagara n’isi ụlọ ọrụ ụwa nile nke Ndịàmà Jehova. E nyere ụfọdụ ndị ọnụ ụlọ họtel na ibu ha funahụworo, ebe ha ga-anọ nakwa uwe ndị ha ga-eji gbanwee. E nyere ha nri. Ikekwe nke ka mkpa, Ndị Kraịst bụ́ ndị okenye nyere ha nkwado n’ụzọ mmetụta uche.

Ndịàmà Jehova zigakwara ngwá ndị e ji arụ ọrụ n’ọnọdụ mberede na ihe ndị dị ndị ọrụ nchọta na nnapụta ahụ mkpa bụ́ ndị nọ na-arụ ọrụ n’ebe a maliteziri ịkpọ Ebe Ihe Ọdachi Mere. E nyekwara ngalaba mgbanyụ ọkụ ụgbọala iji buga ndị ọrụ mgbanyụ ọkụ n’ebe ahụ a na-anapụta ndị mmadụ. Ricardo (n’elu aka nri), bụ́ Onyeàmà dị afọ 39, onye bụkwa onye ọrụ na-ahụ maka idebe ihe ọcha na ọtụtụ narị ndị ọzọ nọ na-ekpofu ọtụtụ tọn ụmụ irighiri ihe dị iche iche kwa ụbọchị. Ọ gwara Teta! sị: “Ihe ndị a hụrụ n’ebe ahụ kpatara nchegbu, karịsịa nye ndị ọrụ mgbanyụ ọkụ bụ́ ndị na-achọ ndị ọrụ ibe ha furu efu. Ahụrụ m mgbe ha bupụtara otu onye ọrụ mmenyụ ọkụ ná ndụ. Ozu nke si n’elu daa gburu onye ọrụ mgbanyụ ọkụ ọzọ. Ọtụtụ ndị ọrụ mgbanyụ ọkụ nọ na-ebe ákwá. Ejidelighị m onwe m, amalitekwara m ibe ákwá. N’ụbọchị ahụ, ọ dịghị onye nwere obi ike karịa ha.”

“Mgbe na Ihe Ndapụta”

Ọtụtụ puku ndị mmadụ nwụrụ n’ọdachi ahụ. Ụfọdụ n’ime ha bụ ma ọ dịkarịa ala Ndịàmà 14, bụ́ ndị ọ dabara na ha nọ n’ebe ọdachi ahụ mere ma ọ bụ na nso ebe ahụ. E nyere Joyce Cummings, bụ́ onye dị afọ 65, bụ́kwa onye si Trinidad, oge ọ ga-abịa maka nlekọta ezé na nso Ebe Azụmahịa Ụwa. N’ụzọ dị mwute, ọ bụ ihe dị ka oge e nwere ọdachi ahụ. O yiri ka anwụrụ ọkụ ọ̀ kwụjuru ya imi, e bugakwara ya n’ụlọ ọgwụ dị nso. Ha azọpụtalighị ya. O so n’ime ọtụtụ ndị “mgbe na ihe ndapụta” metụtara. (Eklisiastis 9:11) A maara ya dị ka onye na-eji nnọọ ịnụ ọkụ n’obi ezisa ozi ọma.

Calvin Dawson (lee igbe) na-arụ ọrụ n’ụlọ ọrụ na-azụ ma na-ere ihe ibé bụ́ nke dị n’okpukpu nke 84 nke ụlọ elu nke dị n’ebe ndịda. Ọ nọ n’ọfịs ya wee hụ ụlọ elu nke dị n’ebe ugwu nke ọma ozugbo ụgbọelu susịrị ya. Onye ọ na-arụrụ ọrụ, bụ́ onye na-anọghị n’ọfịs ya, kpọrọ ya na fon iji chọpụta ihe merenụ. O kwuru, sị: “Calvin nọ na-agbalị ịkọrọ m ihe ọ hụrụ. O kwuru, sị: ‘Ndị mmadụ na-amapụ!’ Agwara m ya ka o si n’ebe ahụ pụọ ma kpọpụ ndị ọzọ n’ọfịs ahụ.” Calvin apụtalighị. Onye ahụ ọ na-arụrụ ọrụ gara n’ihu ikwu, sị: “Calvin bụ ezigbo mmadụ, bụ́kwa onye anyị nile, ọbụna ụfọdụ n’ime anyị na-ejighị ihe ime mmụọ akpọrọ ihe, nwere mmasị n’ebe ọ nọ. Anyị nwere mmasị n’ebe àgwà nsọpụrụ Chineke ya na obiọma ya dị.”

Onyeàmà ọzọ o metụtara bụ James Amato (n’ala aka nri na peeji nke ọzọ), bụ́ nna nke nwere ụmụ anọ, bụrụkwa onyeisi ná ngalaba mgbanyụ ọkụ nke New York. Ndị maara ya kwuru na o nwere nnọọ obi ike nke na “ọ ga-abanye n’ụlọ ọkụ na-agba n’agbanyeghị na ndị mmadụ na-agbapụsị.” E bugoro James n’ọkwá nnukwu onyeisi ìgwè ndị na-agbanyụ ọkụ mgbe ọ nwụsịworo.

Onye ọrụ mgbanyụ ọkụ ọzọ bụ́ Onyeàmà, bụ́ onye rụworo ọrụ ahụ ruo afọ asaa, bụ George DiPasquale. Ọ lụrụ Melissa, mụtakwa nwa nwanyị dị afọ abụọ, bụ́ Georgia Rose. Ọ bụ okenye n’otu ọgbakọ Ndịàmà Jehova nke dị na Staten Island, ọ nọkwa n’okpukpu ụlọ nke iri nke ụlọ elu nke dị n’ebe ndịda mgbe ọ dakpọrọ. Ya onwe ya kwa jiri ndụ ya kwụọ ụgwọ ka ọ na-agbalị ịzọpụta ndị ọzọ.

Ndị a bụ nanị abụọ n’ime ọtụtụ narị ndị ọrụ mgbanyụ ọkụ, ndị uwe ojii, na ndị ọrụ ọnọdụ mberede bụ́ ndị tụfuru ndụ ha ka ha ji obi ike gbalịa ịnapụta ndị mmadụ. A pụghị ikwubiga okwu ókè banyere obi ike nke ndị ọrụ nnapụta a. Onyeisi obodo nke New York City, bụ́ Rudolph Giuliani, mesịrị gwa otu ìgwè ndị ọrụ mgbanyụ ọkụ e bugoro n’ọkwá, sị: “Njikere unu dị ịga n’ihu n’enweghị nkụda mmụọ n’ọnọdụ ndị kasị sie ike bụ ihe mkpali nye anyị nile. . . . E nweghịkwa . . . ihe nlereanya nke inwe obi ike ka nke Ngalaba Mgbanyụ Ọkụ nke Obodo New York mma.”

Ozi Nkasi Obi

N’ime ụbọchị ụfọdụ mgbe ọdachi ahụ gasịrị, ihe dị ka Ndịàmà Jehova 900,000 nọ na United States tinyesiri mgbalị ike ná mba ahụ dum ịkasi ndị na-eru újú obi. Ịhụnanya maka ndị agbata obi kpaliri ha ịkasi ndị na-eru újú obi. (Matiu 22:39) N’ozi ha, ha agbalịwokwa izo aka n’ebe nanị ezi olileanya e nwere maka ihe a kpọrọ mmadụ na-ahụju anya dị.—2 Pita 3:13.

Ndịàmà ahụ nwere ọmịiko n’otú ha si jekwuru ọha na eze. Nzube ha bụ ịkasi ndị mmadụ obi site n’Akwụkwọ Nsọ ma ṅomie ihe nlereanya na-akpali akpali nke Kraịst, bụ́ onye sịrị: “Bịakwutenụ m, unu nile ndị na-adọgbu onwe ha n’ọrụ na ndị a na-ebogbu n’ibu, m ga-emekwa ka unu nwee ume ọhụrụ. Nyaranụ yok m, mụtakwanụ ihe n’aka m, n’ihi na enwere m obi dị nwayọọ, m dịkwa umeala n’obi, unu ga-enwetakwara mkpụrụ obi unu ume ọhụrụ. N’ihi na yok m adịghị egbu mgbu, ibu m dịkwa mfe.”—Matiu 11:28-30.

E kwere ka ìgwè dị iche iche nke ndị okenye sitere n’ọgbakọ Ndịàmà Jehova ndị dị na Manhattan banye n’Ebe Ihe Ọdachi ahụ Mere iji gwa ndị ọrụ nnapụta nọ ebe ahụ okwu na ịkasi ha obi. Mmeghachi omume ha dị nnọọ mma. Ndị ozi a kwuru, sị: “Anya mmiri gbara ndị ikom ahụ ka anyị na-agụrụ ha akụkụ Akwụkwọ Nsọ dị iche iche.” Ndị ọrụ nnapụta nọ n’otu ụgbọ mmiri dị n’ọdụ obere ụgbọ mmiri iji nweta onwe ha. “Ndị ikom ahụ nwere nnọọ nkụda mmụọ, ha hudara isi ha, n’enweghị nnọọ ike ịnagide ihe ha hụworo. Anyị sooro ha nọdụ ala wee gụọrọ ha amaokwu ndị sitere na Bible. Ndị ikom ahụ kelere anyị nke ukwuu maka ịbịakwute ha, na-ekwu na nkasi obi ahụ dị ha mkpa n’ezie.”

Ọtụtụ mgbe, ndị a kpọtụụrụ mgbe ọdachi ahụ mesịrị na-achọ ihe ha ga-agụ, e nyekwara ha ọtụtụ puku broshuọ n’efu. Ụfọdụ n’ime ha bụ Mgbe Onye Ị Hụrụ n’Anya Nwụrụ, Will There Ever Be a World Without War?, na Chineke Ọ̀ Na-eche Banyere Anyị n’Ezie? E jikwa usoro isiokwu ndị bu ụzọ ná mbipụta abụọ nke Teta! (Bekee) mee ihe n’ụzọ pụrụ iche: “The New Look of Terrorism” (Ọdịdị Ọhụrụ nke Iyi Ọha Egwu) (May 22, 2001) na “Coping With Post-traumatic Stress” (Ịnagide Mkpaghasị Uche nke Na-abịa Mgbe Ọdachi Gasịrị) (August 22, 2001). N’ọtụtụ ọnọdụ Ndịàmà ahụ kọwara olileanya Bible nke mbilite n’ọnwụ. (Jọn 5:28, 29; Ọrụ 24:15) Ma eleghị anya, e ji ozi nkasi obi a gakwuru ọtụtụ nde mmadụ.

O Kwesịrị Ime Ka Anyị Chee Echiche

Ọdachi ndị dị ka nke a mere na New York City kwesịrị ime ka anyị nile chee echiche banyere ihe anyị ji ndụ anyị eme. Ànyị na-ebi ndụ nanị maka nchụso onwe onye nanị, ka ànyị na-agbalị ịtụnye ụtụ n’obi ụtọ nke ndị ọzọ? Maịka onye amụma jụrụ, sị: “Ọ̀ bụkwa gịnị ka Jehova na-achọ n’aka gị, ma ọ́ bụghị nanị ime ihe e kpere n’ikpe, na ịhụ ebere n’anya, na iji obi umeala soro Chineke gị na-eje ije?” (Maịka 6:8) Obi umeala kwesịrị ịkwali anyị ịga n’Okwu Chineke iji chọta ezi olileanya dịịrị ndị nwụrụ anwụ na iji chọpụta ihe Chineke ga-eme n’oge na-adịghị anya iji mee ka e nweghachi ọnọdụ Paradaịs n’ụwa a. Ọ bụrụ na ị ga-achọ ịmatakwu banyere nkwa dị iche iche nke Bible, anyị na-agba gị ume ịkpọtụrụ Ndịàmà Jehova nọ n’ógbè gị.—Aịsaịa 65:17, 21-25; Mkpughe 21:1-4.

[Igbe/Foto ndị dị na peeji nke 11]

EKPERE TATIANA

Lena, bụ́ nwanyị di ya bụ́ Calvin Dawson nwụnahụrụ, gwara Teta! banyere ekpere nwa ya nwanyị dị afọ asaa kpere ụbọchị ole na ole mgbe ọ matasịrị na nna ya agaghị alọta. Lena kpere ekpere, Tatiana wee jụọ, sị: “Mama, m̀ pụrụ ikpe ekpere?” Mama ya kwere. Tatiana kpere ekpere, sị: “Jehova, Nna anyị nke bi n’eluigwe, anyị chọrọ ikele gị maka nri a na maka ụbochị a anyị dị ndụ. Anyị na-arịọ ka mmụọ gị dinyere mụ na mama m ka anyị wee nwee obi ike. Anyị na-arịọkwa ka mmụọ gị dinyere papa m, ka o wee nwee obi ike mgbe ọ ga-alọta. Ka ọ dị mma, nwee obi ike, ma nwee obi ụtọ nakwa ahụ́ ike mgbe ọ ga-alọta, anyị ga-ahụkwa ya ọzọ. N’aha Jizọs . . . ehee, echezọkwala ime ka mama m nwee obi ike. Amen.”

Lena, bụ́ onye na-amachaghị ma Tatiana ọ̀ ghọtawo ihe merenụ, kwuru, sị: “Tiana, nke ahụ magburu onwe ya. Nne ọma, ma, ị̀ ma na papa gị agaghị alọta?” Ozugbo, ọ wụrụ Tatiana akpata oyi. “Ọ́ gaghị alọta?” ka ọ jụrụ. “Ee,” ka mama ya kwuru. “Echere m na agwara m gị ya. Echere m na ị ghọtara na papa gị agaghị alọta.” Tatiana kwuru, sị: “Ma ị na-agwa m mgbe nile na ọ ga-alọta n’ụwa ọhụrụ!” N’ịbụ onye ghọtaziri ihe nwa ya nwanyị bu n’obi, Lena kwuru, sị: “Gbaghara m, Tatiana. Aghọtahiere m gị. Echere m ma ì bu n’uche na papa gị ga-alọta echi.” Lena kwuru, sị: “Enwere m obi ụtọ ịmata na ụwa ọhụrụ ahụ bụ ihe dị adị otú ahụ nye ya.”