Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Obodo Ukwu—Gịnị Ka Ha Ji Nọrọ ná Nsogbu?

Obodo Ukwu—Gịnị Ka Ha Ji Nọrọ ná Nsogbu?

Obodo Ukwu—Gịnị Ka Ha Ji Nọrọ ná Nsogbu?

“Ngwa, ka anyị wuoro onwe anyị obodo, na ụlọ elu, nke elu ya ga-eru n’eluigwe, . . . ka anyị wee ghara ịgbasa n’elu ụwa nile.”—Jenesis 11:4.

OKWU a e kwuru ihe karịrị afọ 4,000 gara aga bụ ịma ọkwa nke owuwu nke obodo ukwu Bebel.

Bebel, nke e mesịrị kpọọ Babilọn, dị na mbara ala na-emepụta nri nke bụbu Shaịna, na Mesọpotemia. Otú ọ dị, n’ụzọ dị iche n’echiche e nwere ebe nile, ọ bụghị ya bụ obodo ukwu mbụ e dekọrọ na Bible. N’ezie, obodo ukwu malitere ịdị tupu Iju Mmiri nke oge Noa. Ọ bụ ogbu mmadụ ahụ bụ́ Ken wuru nke mbụ e dekọrọ. (Jenesis 4:17) Ma eleghị anya, obodo a, a kpọrọ Inọk, bụ nanị ebe e wusiri ike ma ọ bụ obodo nta. N’aka nke ọzọ, Bebel bụ obodo ukwu—ebe bụ́ isi a ma ama maka ofufe ụgha, nke nwere nnukwute ụlọ elu okpukpe. Otú ọ dị, Bebel na ụlọ elu ya a ma ama bụ ihe iji maa Chineke aka. (Jenesis 9:7) Ya mere, dị ka Bible si kwuo, Chineke tinyere aka ma ghagbuo asụsụ nke ndị na-ewu ya, na-eweta atụmatụ okpukpe ha nke sitere n’oké ọchịchọ ná njedebe. Chineke “wee mee ka ha si n’ebe ahụ gbasaa n’elu ụwa nile,” ka Jenesis 11:5-9 na-ekwu.

Ọ bụghị ihe ijuanya na nke a dugara ná mgbasa nke obodo ukwu. E kwuwerị, obodo ukwu bụ ihe nchebe pụọ ná mwakpo nke ndị iro. Obodo ukwu bụ ebe ndị ọrụ ubi pụrụ ịkwakọba na ikesa ihe ha rụpụtara. Nguzobe nke ebe ndị a na-azụ ahịa mekwara ka ọtụtụ ndị bi n’obodo ukwu nwee ike ịrụ ọrụ ndị ọzọ na-abụghị ọrụ ubi. Akwụkwọ bụ́ The Rise of Cities na-ekwu, sị: “Ozugbo ha na-enweghịzi ihe mgbochi nke ibi ndụ a kpata e rie, ndị bi n’obodo ukwu pụrụ itinye aka n’ọtụtụ aka ọrụ ndị pụrụ iche: ịkpa nkata, ịkpụ ite, ịtụ ogho, ịkpa ákwà, iji akpụkpọ anụ arụpụta ihe, ịkwa nkà na ido ụlọ—ihe ọ bụla a pụrụ iji kpata ego.”

Obodo ukwu bụ ebe dị nnọọ mma ịnọ kesaa ihe ndị dị otú ahụ. Tụlee ihe ndekọ Bible banyere oké ụnwụ dara n’Ijipt. Josef, bụ́ osote eze, hụrụ na ọ dị mkpa ime ka ndị mmadụ biri n’obodo ukwu. N’ihi gịnị? Dị ka ihe àmà gosiri, n’ihi na nke a mere ka e nwee ike ikesa ihe oriri fọrọ afọ n’ụzọ dị mma.—Jenesis 47:21

Obodo ukwu mekwara ka e nwekwuo ike izirịta ozi nakwa ndị mmadụ imekọrịta ihe n’oge usoro ime njem dị ntakịrị ma na-egbu oge. Nke a, n’aka nke ya, mere ka a na-enwekwu mgbanwe ná mmekọrịta ọha mmadụ na nke ọdịbendị. Obodo ukwu ghọrọ ebe a na-emepụta ihe ndị ọhụrụ ma na-akwalite nkà na ụzụ. Ka echiche ndị ọhụrụ na-agbasa n’enweghị ihe mgbochi, a malitere inwe ihe ndị ọhụrụ na nkà mmụta sayensị, okpukpe na nkà ihe ọmụma.

Nrọ Ndị A Na-emezughị

N’oge a, obodo ukwu nọgidere na-eme ka e nwee ọtụtụ uru dị otú ahụ. Ka a sịkwanụ ihe mere ha ka ji nọgide na-adọta ọtụtụ nde mmadụ—karịsịa n’ala ebe ibi ndụ n’ime obodo ghọworo nke sibigara ike ókè. Otú ọ dị, nye ọtụtụ ndị na-akwaga n’obodo ukwu, a dịghị emezu nrọ ha nke ibi ndụ ka mma. Akwụkwọ bụ́ Vital Signs 1998 na-ekwu, sị: “Dị ka nchọpụta nke Kansụl Ụba Mmadụ mere na nso nso a gosiri, ụdị ndụ a na-ebi n’ọtụtụ obodo ukwu ná mba ndị ka na-emepe emepe dị njọ n’oge a karịa n’ime obodo.” Gịnị mere o ji dị otú a?

Henry G. Cisneros na-ede n’akwụkwọ bụ́ The Human Face of the Urban Environment, sị: “Mgbe ndị ogbenye bikọjuru n’otu ógbè a kpaara ókè, nsogbu ha na-arị elu nke ukwuu. . . . Enweghị ọrụ nke na-arị elu, mmụba nke ndị na-adabere n’ihe enyemaka nakwa ruo ogologo oge, ọtụtụ nsogbu ahụ ike ọha na eze, nakwa, nke kasị atụ n’anya, mpụ nke na-arị elu esochiwo ọnụ ọgụgụ na-amụba amụba nke ndị ogbenye, karịsịa ndị ka nta n’ọnụ ọgụgụ, ibikọta ọnụ.” N’otu aka ahụ, akwụkwọ bụ́ Mega-city Growth and the Future na-ekwu, sị: “Oké nnubata nke ndị mmadụ na-edujekarị n’ọ̀tụ̀tụ̀ dị elu nke enweghị ọrụ na enweghị ezigbo ọrụ n’ihi na ndị na-ewe mmadụ n’ọrụ nwere ike ha agaghị ewechali ọnụ ọgụgụ na-arị elu nke ndị na-achọ ọrụ n’ọrụ.”

Ọnụ ọgụgụ na-arị elu nke ụmụaka na-ehi n’okporo ámá bụ ihe àmà na-agbawa obi nke oké ịda ogbenye e nwere n’obodo ukwu ndị dị n’akụkụ ụwa ndị ka na-emepe emepe. Dị ka atụmatụ ụfọdụ e mere na-egosi, e nwere ihe ruru nde ụmụaka 30 na-ehi n’okporo ámá gburugburu ụwa! Akwụkwọ bụ́ Mega-city Growth and the Future na-ekwu, sị: “Ịda ogbenye na nsogbu ndị ọzọ emebiwo ihe nkekọ ezinụlọ nke na a manyewo ụmụaka na-ehi n’okporo ámá ịchọta ihe ha ga-eri n’onwe ha.” Ụmụaka dị otú ahụ na-ata oké ahụhụ iji nweta ihe e ji adị ndụ site n’ịtụtụta ihe, ịrịọ arịrịọ, ma ọ bụ ịrụ ọrụ a na-eleda anya n’ahịa ndị dị n’ógbè ha.

Ihe Ọjọọ Ndị Ọzọ Na-emenụ

Ịda ogbenye pụrụ iduga n’ime mpụ. N’otu obodo ukwu e ji iwu ụlọ ọgbara ọhụrụ mara n’Ebe Ndịda America, mpụ ejuwo ebe nile nke na obodo ahụ na-aghọ n’ike n’ike ógbè ebe ígwè ngebichi jupụtara. Malite ná ndị kasị baa ọgaranya ruo ná ndị kasị daa ogbenye, ụmụ amaala na-eji ígwè agba ogige iji chebe ihe ụlọ ha na ka a ghara ịwabata n’ụlọ ha. Dị ka a pụrụ isi kwuo ya, ha na-ebi ná ngịga. Ụfọdụ ndị ọbụna na-etinye ígwè ngebichi ndị ahụ tupu e wuchaa ụlọ ha.

Oké ụba mmadụ na-ejikwa ikike obodo ukwu nwere iweta ihe ndị dị mkpa dị ka mmiri na ọnọdụ ịdị ọcha emebiga ihe ókè. A na-eme atụmatụ na n’otu obodo ukwu dị n’Esia, a chọrọ ụlọ mposi 500,000 maka ọha na eze. Ma, otu nnyocha e mere na nso nso a gosiri na e nwere nanị ụlọ mposi 200!

A gaghịkwa eleghara mmetụta ọjọọ nke oké ụba mmadụ na-enwekarị n’ógbè anya. Ala ubi ndị dị nso na-apụ n’anya ka obodo ukwu na-agbasawanye. Onye bụbu onyeisi nke Òtù Mmụta, Sayensị, na Ọdịbendị nke Mba Ndị Dị n’Otu, bụ́ Federico Mayor, na-ekwu, sị: “Obodo ukwu na-ewekọrọ ike dị ukwuu, na-eme ka mmiri gwụsịa, na-elodakwa nri na ihe dị iche iche. . . . Gburugburu ha adịghịzi abachara ndị bi n’ime ha uru n’ihi na ọ pụghịzi igbo mkpa ha ma ọ bụ ịnagide ihe ha na-ekpofu.”

Nsogbu Obodo Ukwu n’Ala Ndị Dị n’Ebe Ọdịda Anyanwụ Ụwa

Ọ pụrụ ịbụ na ọnọdụ ndị dị n’ala ndị dị n’Ebe Ọdịda Anyanwụ Ụwa adịchaghị njọ otú ahụ, ma a ka nwere nsogbu nke obodo ukwu. Dị ka ihe atụ, akwụkwọ bụ́ The Crisis of America’s Cities na-ekwu, sị: “E ji ime ihe ike gabigara ókè mara obodo ukwu ndị dị n’America taa. . . . Ime ihe ike jupụtara n’obodo ukwu ndị dị n’America nke na magazin ahụ ike dị iche iche amalitewo iji ohere buru nnọọ ibu na-ede banyere ya dị ka otu n’ime okwu ndị gbara ọkpụrụkpụ na-emetụta ahụ ike ọha na eze n’oge anyị.” N’ezie, ime ihe ike bụ nsogbu n’ọtụtụ obodo ukwu bụ́ isi n’ụwa nile.

Ndakpọ nke ndụ a na-ebi n’obodo ukwu bụ otu ihe mere ọtụtụ obodo ukwu ji ghọọ ndị na-adịghị adọrọ mmasị nke ndị na-ewe mmadụ n’ọrụ. Akwụkwọ bụ́ The Human Face of the Urban Environment na-ekwu, sị: “Ụlọ ahịa dị iche iche akwagawo n’ógbè ndị dịpụrụ adịpụ ma ọ bụ n’obodo ndị ọzọ, mechie ụlọ ọrụ mmepụta ihe ha, gbahapụ ‘ala e bibiri ebibi’—ihe owuwu tọgbọrọ chakoo n’ala e metọrọ emetọ, nsí na-egbu egbu ndị e liri n’ala ndị a na-ekwesịtụghị iwu ihe ọ bụla na ha.” N’ihi ya, ndị ogbenye na-ebikọta n’ọtụtụ obodo ukwu n’ógbè “ebe a na-elegharakarị nsogbu gburugburu ebe obibi anya—ebe usoro mbupụ mmiri ruru unyi mebiri emebi; ebe a na-enweghị usoro dị mma nke ime ka mmiri dị ọcha; ebe òké na ihe ndị ọzọ na-ejupụta n’ala ebe ihe mkpofu jupụtara ma na-awakpo ebe obibi dị iche iche; ebe ụmụaka na-aracha ágbá opu dị na ya site n’ahụ ụlọ ndị na-adakpọ adakpọ . . . ebe o yiri ka ọ dịghị onye chọrọ ịma.” Na gburugburu ebe obibi dị otú a, mpụ, ime ihe ike, na obi nkoropụ na-ejupụta.

Ọzọkwa, obodo ukwu ndị dị n’Ebe Ọdịda Anyanwụ na-enwe ihe isi ike n’igbo mkpa ndị bụ́ isi. Laa azụ na 1981, ndị edemede bụ́ Pat Choate na Susan Walter dere otu akwụkwọ nwere isiokwu na-adọrọ mmasị bụ́ America in Ruins—The Decaying Infrastructure (America Ebibiela—Ihe Owuwu Ndị Na-adakpọsị Adakpọsị). Ha kwuru n’ime ya, sị: “Ihe owuwu ọha na eze ndị dị n’America na-emebi ngwa ngwa karịa otú e si edochi ha.” Ndị ahụ dere akwụkwọ na-adọsi aka ná ntị ike banyere ọnụ ọgụgụ àkwà mmiri na-emebi emebi, ụzọ ndị na-ajọwanye njọ, na usoro mbupụ mmiri ruru unyi ndị na-emebinụ n’obodo ukwu ndị bụ́ isi.

Ka afọ 20 gasịrị, obodo ukwu ndị dị ka New York City ka nwere ihe owuwu ndị na-adakpọ adakpọ. Otu isiokwu dị na New York Magazine kọwara nnukwute atụmatụ ọrụ Ọwara Mmiri nke Atọ ahụ. A rụwo ya ugbu a ruo ihe dị ka afọ 30, a na-akpọkwa ya otu atụmatụ ọrụ ihe owuwu kasịnụ n’Ebe Ọdịda Anyanwụ Ụwa. Ọ ga-ewe ihe dị ka ijeri dollar ise. Mgbe a rụsịrị ya, ọwara mmiri ahụ ga na-ebuga otu ijeri galọn mmiri dị mma na New York City kwa ụbọchị. “Ma n’oké igwu ala nile a,” ka onye edemede ahụ na-ekwu, “e bu n’obi nanị ka ọwara mmiri ahụ nyere paịpụ mmiri ndị dị adị aka, na-eme ka e nwee ike ịrụzi ha na nke mbụ ya kemgbe e liri ha ná mmalite narị afọ a.” Dị ka otu isiokwu dị na New York Times si kwuo, ịrụzi ihe owuwu ndị ọzọ na-emebi emebi nke obodo ukwu ahụ—ụzọ okpuru ala ya, okporo mmiri ya, ụzọ ya, àkwà mmiri ya—ga-efu ihe e mere atụmatụ ya ịbụ ijeri dollar 90.

Ọ bụghị nanị New York bụ obodo ukwu nwere ihe isi ike n’inye ihe ndị dị mkpa. N’ezie, ọtụtụ obodo ukwu abụrụwo ndị ọtụtụ ihe pụrụ ịkpatara nsogbu. Na February 1998, o nweghị ihe na-aga aga na Auckland, New Zealand, ruo ihe karịrị izu abụọ n’ihi ọkụ eletrik a na-enweghị, nke kpatara oké mfu. Ndị bi na Melbourne, Australia, enweghị mmiri ọkụ ruo ụbọchị 13 mgbe a kwụsịrị nkesa gas n’ihi ihe ọghọm nke mere n’ụlọ ọrụ mmepụta ihe.

E nwekwara nsogbu nke ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ obodo nile nwere—ụgbọala ijubiga ókè n’okporo ụzọ. Onye na-atụpụta ụkpụrụ ụlọ bụ́ Moshe Safdie na-ekwu, sị: “E nwere enweghị nkwekọrịta gbara ọkpụrụkpụ—ihe na-adabaghị adaba—n’agbata otú obodo ukwu dị iche iche hà na usoro ime njem ha. . . . Obodo ukwu ndị ka mee ochie aghaghị ịrụgharị ógbè achụmnta ego ha ka o nwee ike ịnagide njupụta nke ụgbọala n’okporo ụzọ bụ́ nke a na-echetụghị n’echiche mgbe a rụrụ ha.” Dị ka The New York Times si kwuo, n’obodo ukwu ndị dị ka Cairo, Bangkok, na São Paulo, ụgbọala ijubiga ókè n’okporo ụzọ “bụ ihe a na-ahụkarị.”

N’agbanyeghị nsogbu nile a, ọ na-eyi ka e nweghị mbelata ná nkwaga a na-akwaga n’obodo ukwu. Dị ka otu isiokwu dị na The UNESCO Courier si kwuo, “n’ụzọ ziri ezi ma ọ bụ n’ụzọ na-ezighị ezi, obodo ukwu yiri ka ọ̀ na-eme ka e nwee ọganihu na nnwere onwe, olileanya nke inwe ọganihu, ihe ndọrọ a na-apụghị iguzogide.” Ma gịnị na-echere nnọọ obodo ukwu ndị dị n’ụwa n’ọdịnihu? È nwere ezi ihe ngwọta dịnụ nye nsogbu ha?

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 5]

“Oké nnubata nke ndị mmadụ na-edujekarị n’ọ̀tụ̀tụ̀ dị elu nke enweghị ọrụ na enweghị ezigbo ọrụ”

[Foto dị na peeji nke 7]

Ụgbọala ijubiga ókè n’okporo ụzọ bụ nsogbu dị n’ọtụtụ obodo ukwu

[Foto dị na peeji nke 7]

Ọtụtụ nde ụmụaka ndị na-ehi n’okporo ámá na-achọta ihe ha na-eri n’onwe ha

[Foto dị na peeji nke 7]

Nye ọtụtụ ndị bi n’obodo ukwu, nrọ nke ibi ndụ ka mma bụ nke a na-adịghị emezu emezu