Jenesis 11:1-32

  • Ụlọ elu a rụrụ na Babel (1-4)

  • Jehova ghagburu asụsụ ndị mmadụ (5-9)

  • Malite n’oge Shem ruo n’oge Ebram (10-32)

    • Ezinụlọ Tira (27)

    • Ebram si n’obodo Ọọ kwapụ (31)

11  N’oge ahụ, ndị niile bi n’ụwa na-asụ otu asụsụ, e nweghịkwa ihe dị iche n’otú ha niile si ekwu okwu.  Mgbe ha nọ na-aga n’ebe ọwụwa anyanwụ, ha hụrụ otu ndagwurugwu n’ala Shaịna,+ ha wee biri n’ebe ahụ.  Ha gwaziri ibe ha, sị: “Bịanụ ka anyị kpụọ brik ma nụchaa ya n’ọkụ.” Ha wee jiri brik mere nkume, jirikwa bitumen* mere ụrọ.  Ha kwuru, sị: “Bịanụ ka anyị rụọrọ onwe anyị obodo na ụlọ elu nke elu ya ga-eru n’eluigwe, ka anyị meekwa ka aha anyị na-ewu ewu, ka anyị wee ghara ịgbasa n’ebe niile n’ụwa.”+  Jehova wee gaa ka ọ hụ obodo ahụ na ụlọ elu ahụ ndị mmadụ nọ na-arụ.  Jehova kwuziri, sị: “Ndị a dị n’otu, ha na-asụkwa otu asụsụ.+ Legodị ihe ha malitere ime. E nweghị ihe ọ bụla ha bu n’obi ime ha na-enweghị ike ime.  Bịa ka anyị+ gaa ebe ahụ ghagbuo asụsụ ha ka ha ghara ịghọta asụsụ ibe ha.”  Jehova wee chụsaa ha n’ebe ahụ, ha agaa biri n’ebe dị iche iche n’ụwa.+ Ha kwụsịziri ịrụ obodo ahụ.  Ọ bụ ya mere e ji kpọọ obodo ahụ Babel*+ n’ihi na ọ bụ n’ebe ahụ ka Jehova gwagburu asụsụ ndị niile bi n’ụwa. Jehova chụsara ha n’ebe ahụ, ha agaa biri n’ebe dị iche iche n’ụwa. 10  Ihe a bụ akụkọ ndụ Shem.+ Shem dị otu narị afọ (100) mgbe ọ mụrụ Apakshad.+ Ọ mụrụ ya afọ abụọ Iju Mmiri ahụ gachara. 11  Mgbe Shem mụchara Apakshad, ọ nọrọ ndụ narị afọ ise (500). Ọ mụrụ ụmụ nwoke na ụmụ nwaanyị.+ 12  Apakshad nọrọ ndụ afọ iri atọ na ise, o wee mụọ Shila.+ 13  Mgbe Apakshad mụchara Shila, ọ nọrọ ndụ narị afọ anọ na atọ (403). Ọ mụrụ ụmụ nwoke na ụmụ nwaanyị. 14  Shila nọrọ ndụ afọ iri atọ, o wee mụọ Iba.+ 15  Mgbe Shila mụchara Iba, ọ nọrọ ndụ narị afọ anọ na atọ (403). Ọ mụrụ ụmụ nwoke na ụmụ nwaanyị. 16  Iba nọrọ ndụ afọ iri atọ na anọ, o wee mụọ Pileg.+ 17  Mgbe Iba mụchara Pileg, ọ nọrọ ndụ narị afọ anọ na iri atọ (430). Ọ mụrụ ụmụ nwoke na ụmụ nwaanyị. 18  Pileg nọrọ ndụ afọ iri atọ, o wee mụọ Riu.+ 19  Mgbe Pileg mụchara Riu, ọ nọrọ ndụ narị afọ abụọ na itoolu (209). Ọ mụrụ ụmụ nwoke na ụmụ nwaanyị. 20  Riu nọrọ ndụ afọ iri atọ na abụọ, o wee mụọ Sirọg. 21  Mgbe Riu mụchara Sirọg, ọ nọrọ ndụ narị afọ abụọ na asaa (207). Ọ mụrụ ụmụ nwoke na ụmụ nwaanyị. 22  Sirọg nọrọ ndụ afọ iri atọ, o wee mụọ Nehọ. 23  Mgbe Sirọg mụchara Nehọ, ọ nọrọ ndụ narị afọ abụọ (200). Ọ mụrụ ụmụ nwoke na ụmụ nwaanyị. 24  Nehọ nọrọ ndụ afọ iri abụọ na itoolu, o wee mụọ Tira.+ 25  Mgbe Nehọ mụchara Tira, ọ nọrọ ndụ otu narị afọ na iri na itoolu (119). Ọ mụrụ ụmụ nwoke na ụmụ nwaanyị. 26  Tira nọrọ ndụ afọ iri asaa, o wee mụọ Ebram,+ Nehọ,+ na Heran. 27  Ihe a bụ akụkọ ndụ Tira. Tira mụrụ Ebram, Nehọ, na Heran, Heran wee mụọ Lọt.+ 28  Mgbe Tira nna Heran ka nọ ndụ, Heran nwụrụ n’obodo ebe a mụrụ ya, ya bụ, n’obodo Ọọ+ nke ndị Kaldia.+ 29  Ebram lụrụ nwaanyị, Nehọ alụọkwa nwaanyị. Aha nwunye Ebram bụ Seraị,+ aha nwunye Nehọ abụrụ Milka,+ nwa Heran. Heran bụ nna Milka na Iska. 30  Seraị bụ nwaanyị aga.+ Ọ mụtaghị nwa. 31  Tira wee kpọrọ Ebram nwa ya na Lọt nwa nwa ya,+ bụ́ nwa Heran, kpọrọkwa Seraị nwunye nwa ya, bụ́ nwunye Ebram nwa ya. Ha wee soro ya si n’obodo Ọọ nke ndị Kaldia pụọ gawa Kenan.+ Mgbe e mechara, ha rutere Heran+ wee biri n’ebe ahụ. 32  Tira nọrọ ndụ narị afọ abụọ na ise (205). Tira wee nwụọ na Heran.

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Ma ọ bụ “korota.”
Babel pụtara “Ọgba Aghara.”