Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Oghere Dị n’Agbata Ndị Ọgaranya na Ndị Ogbenye Na-ebuwanye Ibu

Oghere Dị n’Agbata Ndị Ọgaranya na Ndị Ogbenye Na-ebuwanye Ibu

Oghere Dị n’Agbata Ndị Ọgaranya na Ndị Ogbenye Na-ebuwanye Ibu

“E nwewo ọganihu ka ukwuu n’ibelata ịda ogbenye n’ụwa n’afọ iri ise gara aga karịa ka e nwere na narị afọ ise gara aga,” ka UNDP Today, bụ́ akwụkwọ nke Usoro Mmepe nke Mba Ndị Dị n’Otu, bipụtara na-ekwu. “Kemgbe 1960, mba ndị ka na-emepe emepe egbubilatawo ọnụ ọgụgụ ụmụaka na-anwụnụ ruo ọkara, mee ka erighị ihe na-edozi ahụ dalata ruo otu ụzọ n’ụzọ atọ, meekwa ka ọnụ ọgụgụ [ndị na-edebanye aha ha n’ụlọ akwụkwọ] mụbaa.” Ma, akwụkwọ ahụ na-ekweta na n’agbanyeghị ọganihu a, ịda ogbenye “ka dị n’ọtụtụ ebe n’ụwa.”

Nke ka njọ bụ na ikpe na-ezighị ezi n’etiti ọha mmadụ na-amụbawanye. “N’iji ya tụnyere otu afọ gara aga,” ka Catherine Bertini, bụ́ ọga kpata kpata nke Atụmatụ Maka Ihe Oriri Ụwa nke Òtù UN na-ekwu, “ọtụtụ ndị nọ n’ụwa adịghị eri ihe na-edozi ahụ, ha nọkwa n’agụụ.” N’ezie, taa, ihe dị ka nde mmadụ 840 nọ ná mba ndị ka na-emepe emepe na-anọ n’agụụ mgbe nile, ihe karịrị nnọọ otu ijeri enweghị mmiri dị mma ọṅụṅụ, ihe fọkwara nke nta ka ọ bụrụ ijeri mmadụ 1.5 na-eji ihe na-erughị otu dollar ebi ndụ kwa ụbọchị. Mary Robinson, bụ́ Kọmishọna Ukwu nke Òtù UN Maka Ihe Ndị Ruuru Mmadụ, na-adọ aka ná ntị na “anyị nọ n’ihe ize ndụ nke iru oge mgbe ụwa na-agaghị abụzi nke e kewara n’etiti mba ndị ka na-emepe emepe na ndị mepere emepe kama ọ ga-abụ n’etiti [mba ndị] mepebigara ókè na ndị na-agaghị emepe emepe.”

Gịnị ka ọ ga-efu ijeri mmadụ isii nọ n’ụwa taa iji belata oghere dị n’agbata ndị ọgaranya na ndị ogbenye? Ihe na-erughị ihe mmadụ pụrụ iche n’echiche. Òtù UN na-eme atụmatụ na a ga-achọkwu ijeri $9 ($1.50 site n’aka otu onye) kwa afọ iji debe ebe nile ọcha ma mee ka e nwee mmiri dị ọcha n’ụwa nile nakwa na a ga-achọkwu ijeri $13 (ihe dị ka $2.00 site n’aka otu onye) kwa afọ iji hụ na onye ọ bụla nọ n’ụwa nwere nlekọta ahụ ike bụ́ isi na ihe oriri na-edozi ahụ. Ọ bụ ezie na ego a buru ibu, ma o yiri ihe dị ntakịrị ma e jiri ya tụnyere ihe ụwa na-emefu n’ihe ndị ọzọ. Iji maa atụ, n’otu afọ na nso nso a, ụwa mefuru ijeri $435 (ihe karịrị $70 maka otu onye) n’ịkpọsa ngwá ahịa na ijeri $780 ($130 maka otu onye) n’ihe ndị metụtara agha. O doro anya na ibelata oghere dị n’agbata ndị ọgaranya na ndị ogbenye n’ụwa abụchaghị okwu banyere inweta ego zuru ezu kama ọ bụ okwu banyere ibute ihe ndị kwesịrị ekwesị ụzọ.