Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ole Ndị Bụ Ndị Ohu Taa?

Ole Ndị Bụ Ndị Ohu Taa?

 Ole Ndị Bụ Ndị Ohu Taa?

CHEEDỊ nnọọ ọnụ ọgụgụ ha. A na-eme atụmatụ na n’agbata nde ụmụaka 200 na 250 na-erubeghị afọ 15 na-eji ihe ka ọtụtụ n’oge ha mụ anya arụ ọrụ. A kwabara otu ụzọ n’ụzọ anọ nke otu nde ụmụaka, bụ́ ndị ụfọdụ n’ime ha dị nanị afọ asaa, n’agha na 1995 na 1996 nanị, ụfọdụ n’ime ha si otú a ghọọ ndị ohu nke agha. A na-eme atụmatụ na ọnụ ọgụgụ ndị inyom na ụmụaka a na-ere dị ka ohu kwa afọ karịrị otu nde.

Ma ọnụ ọgụgụ nkịtị apụghị ikpughe enweghị olileanya nke ndị a. Dị ka ihe atụ, n’otu mba dị n’ebe ugwu Africa, Elinor Burkett na-ede akwụkwọ zutere Fatma, bụ́ nwa agbọghọ jisiri ike gbapụ n’aka nna ya ukwu nwere obi ọjọọ. Otú ọ dị, mgbe ya na ya kwurịtasịrị okwu, Burkett chọpụtara na Fatma “ga-abụ ohu ruo mgbe ebighị ebi, n’echiche ya.” Fatma ọ̀ pụrụ ọbụna iche n’echiche inwe ọdịnihu ka mma? “O nweghị ike iche echiche banyere ihe echi ga-abụ,” ka Burkett na-ekwu. “Ọdịnihu bụ otu n’ime ọtụtụ ihe ndị ọ na-adịghị eche n’echiche.”

Ee, ugbu a, ọtụtụ nde mmadụ ibe anyị bụ ndị ohu na-enweghị olileanya. N’ihi gịnị, oleekwa otú ndị a si na-aghọ ndị ohu? N’ụdị ohu dị aṅaa ka a na-akwaba ha?

Ndị Na-agba Mgbere Mmadụ

Ọ dịghị ụzọ ọzọ akwụkwọ maka ndị na-eme njem nke a na-ekesa na United States pụrụ isi kọwapụta ya: “Njem mmekọahụ a na-aga na Thailand. Ụmụ agbọghọ chara acha. Mmekọahụ dere ede. Ha dị nnọọ ọnụ ala. . . . Ị̀ maara na ị pụrụ n’ezie iji nanị $200 zụta nwa agbọghọ na-amaghị nwoke?” Ihe akwụkwọ ahụ na-ekwughị bụ na ọ ghaghị ịbụ na a tọọrọ ma ọ bụ jiri ike renye ‘ụmụ agbọghọ ndị a na-amaghị nwoke’ n’ụlọ ndị akwụna, bụ́ ebe ha na-enweta ná nkezi ihe dị ka ndị ahịa 10 ruo 20 kwa ụbọchị. Ọ bụrụ na ha ajụ inwe mmekọahụ, e tie ha ihe. Mgbe ọkụ gbara otu ụlọ ndị akwụna dị n’Àgwàetiti Phuket, bụ́ ebe ezumike dị n’ebe ndịda Thailand, ọkụ gbagburu ndị akwụna ise. N’ihi gịnị? N’ihi na ndị nwe ha kegidere ha n’àkwà ha ka ha ghara ịgbapụ n’agbụ ha.

Olee ebe ụmụ agbọghọ ndị  a si? A sịrị na ọ bụ ọtụtụ nde ụmụ agbọghọ na ndị inyom nọ gburugburu ụwa bụ́ ndị a tọọrọ, manye ma renye n’ịgba akwụna jupụtara n’ụlọ mmekọahụ ndị a. Azụmahịa mmekọahụ ná mba nile na-aga n’ihu n’ihi ịda ogbenye nke mba ndị na-emepe emepe na inwe akụ̀ na ụba nke mba ndị bara ọgaranya, nakwa n’ihi nleghara nke iwu na-eleghara ịzụ ahịa na-ezighị ezi nke a na-azụ ná mba nile na ịbụ odido.

Òtù ụmụ nwanyị dị iche iche dị n’Ebe Ndịda Ọwụwa Anyanwụ Esia emewo atụmatụ na site n’etiti afọ ndị 1970 ruo ná mmalite afọ ndị 1990, e rere nde ndị inyom 30 n’ụwa nile. Ndị na-agba mgbere mmadụ na-agagharị n’ebe ụgbọ okporo ígwè na-akwụsị, n’obodo nta ndị dara ogbenye, na n’okporo ámá ndị dị n’obodo ukwu na-achọ ụmụ agbọghọ na ndị inyom yiri ndị na-enweghị nchebe. Ndị ha na-aratakarị bụ ndị na-agụghị akwụkwọ, ụmụ mgbei, ndị a gbahapụrụ agbahapụ, ma ọ bụ ndị ọ na-enweghị ka ọ dị ha. A na-ekwe ha nkwa elu ọnụ inye ha ọrụ, bufee ha n’ókèala ma renyezie ha n’ụlọ ndị akwụna.

Kemgbe ndakpọ nke ìgwè mba ndị Kọmụnist na 1991, e nwewo ọnụ ọgụgụ ọhụrụ nke ụmụ agbọghọ na ndị inyom dara ogbenye. Ịkagbu iwu, inyefe ndị mmadụ ụlọ ọrụ, na ahaghị nhata nke ụmụ mmadụ bụ́ nke na-amụbawanyenụ emewo ka e nwee mmụba nke mpụ, ịda ogbenye, na enweghị ọrụ. Ọtụtụ ndị inyom na ụmụ agbọghọ ndị Russia na ndị Ebe Ọwụwa Anyanwụ Europe aghọziela ngwá ọrụ ndị e ji eme ihe n’ịgba akwụna a haziri ahazi ná mba nile. “Ihe ize ndụ na-adị ala mgbe ị na-agba mgbere mmadụ karịa mgbe ị na-agba mgbere ọgwụ ọjọọ,” ka Kọmishọna Ikpe Ziri Ezi nke Europe bụ́ Anita Gradin kwuru.

Oge Ịbụ Nwata nke Furu Efu

N’otu obere ụlọ ọrụ na-emepụta kapet n’Esia, ụmụaka dị nanị afọ ise na-arụ ọrụ site n’elekere anya 4 nke ụtụtụ ruo elekere anya 11 nke abalị n’anataghị ụgwọ ọrụ. N’ọtụtụ ọnọdụ ụmụaka dị ka ndị a e ji akpa ego na-eche  ajọ ihe ize ndụ ahụ ike ihu: ígwè ọrụ dị ize ndụ, ịnọ ọtụtụ awa n’ebe ìhè na ikuku na-adịghị abata nke ọma, na ikuru mmiri ọgwụ ndị dị ize ndụ e ji emepụta ihe. *

N’ihi gịnị ka e ji achọsi ụmụaka ike dị ka ndị ọrụ? Ọ bụ n’ihi na iji ụmụaka akpa ego adịghị efu oké ego nakwa na n’ihi na ụmụaka na-erubekarị isi, na-adị mfe inye ahụhụ, egwu adịghịkwa ekwe ha ime mkpesa. Ndị ọjọọ na-ewe mmadụ n’ọrụ na-ahụ obere ahụ ha na aka ha na-aghọ nkọ dị ka ihe bara uru maka ịrụ ụdị ọrụ ụfọdụ, dị ka ịkpa kapet. A na-enyekarị ụmụaka dị otú ahụ ọrụ, ebe ndị mụrụ ha na-anọ n’ụlọ, n’enweghị ọrụ.

N’ịkpatakwuru ha nhụsianya, a pụrụ imetọ ụmụaka na-arụ ọrụ n’ụlọ n’ụzọ mmekọahụ ma tirụọ ha ahụ karị. A na-atọrọ ọtụtụ ụmụaka, jichie ha n’ogige ndị dị n’ime ime obodo, ma tụọ ha ịgà n’abalị iji gbochie ha ịgbapụ. N’ehihie, a pụrụ inye ha ọrụ ịrụ ụzọ na ịgbari okwute.

Ụzọ ọzọ oge ịbụ nwata si efu bụ site n’alụmdi na nwunye ịgba ohu. Òtù Na-emegide Ịgba Ohu nke Mba Nile na-akọwa otu nke merenụ: “A gwara otu nwa agbọghọ dị afọ 12 na ezinụlọ ya emewo ndokwa ka ọ lụọ otu nwoke dị afọ 60. A na-eme ka o yie ka o nweere onwe ya ịjụ, ma n’ezie o nwereghị onwe ya ịzọ ihe ruuru ya, ọ maghịkwa na ọ pụrụ ime otú ahụ.”

Ndị Ohu nke Ụgwọ

Ọtụtụ narị puku ndị ọrụ nọ n’agbụ nke ndị were ha n’ọrụ na n’ebe ndị ha na-arụ ọrụ n’ihi ego a gbazinyere ha ma ọ bụ ndị mụrụ ha. Dị ka ọ na-adịkarị, a na-ahụkarị ndị ọrụ ji onwe ha gbaa ibè n’ebe ndị a na-arụ ọrụ ugbo, bụ́ ebe ndị ọrụ na-arụ ọrụ dị ka ụmụ odibo ma ọ bụ dị ka ndị ọrụ ugbo. N’ọnọdụ ụfọdụ, a na-ebufe ụgwọ site n’otu ọgbọ gaa n’ọgbọ ọzọ, iji hụ na ndị òtù ezinụlọ nọgidere n’agbụ ebighị ebi. N’ọnọdụ ndị ọzọ, ndị were mmadụ n’ọrụ bụ́ ndị e ji ụgwọ na-eme ka ụgwọ ahụ bụrụzie nke e ji onye ọhụrụ na-ewe mmadụ n’ọrụ. N’ọnọdụ ndị dị oké njọ, a dịghị akwụ ndị ọrụ ji onwe ha gbaa ibè ụgwọ ma ọlị maka ọrụ ha na-arụ. Ma ọ bụ a pụrụ ijichi ha site n’ịkwụ ha obere ego e wetara n’ụgwọ ọrụ ha, bụ́ nke a na-anọgide na-eme ugboro ugboro, ha ewee si otú a bụrụ ndị ji onwe ha gbaa ibè n’aka onye were ha n’ọrụ.

Ịbụ Ohu Arụsị

Binti, bụ́ onye si n’Ebe Ọdịda Anyanwụ Africa, dị afọ 12 ma bụrụ otu n’ime ọtụtụ puku ụmụ agbọghọ  na-eje ozi dị ka trocosi, nke pụtara n’asụsụ Ewe “ohu ndị bụ́ chi.” A manyere ya ibi ndụ dị ka ohu na onye mgbapụta maka mpụ ọ na-emeghị—ndina n’ike nke kpatara ọmụmụ ya! Ka ọ dị ugbu a ọrụ ya bụ nanị ịrụrụ otu dibịa afa nọ n’obodo ha ọrụ ụlọ. Ọrụ Binti ga-emesị buwanye ibu ịgụnye isoro dibịa ahụ, bụ́ onye nwe ya, na-enwe mmekọahụ. Mgbe ahụ, mgbe ọ na-akatatụla ahụ, a ga-eji onye ọzọ dochie Binti—dibịa ahụ ga-achọta ụmụ agbọghọ ndị ọzọ mara mma ijere ya ozi dị ka ndị trocosi.

Dị ka Binti, ọ bụ ezinụlọ nke ọtụtụ puku ndị ohu arụsị na-enyefe ha ịrụ ọrụ na-eme ka ọ fọdụ nke nta ka ha bụrụ ndị ohu ná mgbalị ikpuchi omume a ghọtara dị ka mmehie ma ọ bụ ịda iwu dị nsọ. N’ọtụtụ akụkụ nke ụwa, ọ bụ iwu na ụmụ agbọghọ ma ọ bụ ndị inyom ga-arụ ọrụ okpukpe ma na-esoro ndị dibịa ma ọ bụ ndị ọzọ na-enwe mmekọahụ—na-eburu n’obi na arụsị na-alụ ndị inyom dị otú ahụ. N’ọtụtụ ọnọdụ ndị inyom ahụ na-eje ozi ndị ọzọ a na-adịghị akwụ ụgwọ ha. Ha enwereghị onwe ha ịgbanwe ebe ha bi ma ọ bụ ebe ha na-arụ ọrụ, ha na-anọgidekarịkwa n’agbụ ruo ọtụtụ afọ.

Ịgba Ohu nke Dịwara Kemgbe Ụwa

Ọ bụ ezie na ihe ka ọtụtụ ná mba na-ekwu na iwu ha akwụsịwo ịgba ohu, ịgba ohu nke dịwara kemgbe ụwa amaliteghachiwo n’ebe ụfọdụ na nso nso a. Nke a na-ewerekarị ọnọdụ n’ebe ndị ọgụ ime obodo ma ọ bụ agha tisasịrị. “N’ebe ndị a na-alụ agha e legharatụwo ụkpụrụ iwu anya n’ụzọ doro anya,” ka Òtù Na-emegide Ịgba Ohu nke Mba Nile na-ekwu, “ndị soja ma ọ bụ ndị agha bu ngwa agha na-amanye ndị mmadụ ịrụrụ ha ọrụ n’akwụghị ha ụgwọ . . . n’atụghị egwu ntaramahụhụ; a kọwo na omume ndị dị otú ahụ na-emekarịsị n’ebe ndị bu ngwá agha na-achịkwa bụ́ ndị mba nile na-elebarabeghị anya.” Otú ọ dị, dị ka otu òtù ahụ si kwuo, “na nso nso a, a nụwokwa akụkọ banyere ndị soja nke gọọmenti na-amanye ndị nkịtị ịrụ ọrụ dị ka ndị ohu, n’enweghị nkwado iwu ọ bụla. A kọwokwa na ndị soja na ndị agha na-azụ ahịa ohu, na-ere ndị ha jidere ka ha rụọrọ ndị ọzọ ọrụ.”

Ọ dị mwute na ihe ndabara ọjọọ nke ịgba ohu ka na-adabara ihe a kpọrọ mmadụ n’ọtụtụ ụzọ na ọdịdị. Kwụsị ma chee banyere ọnụ ọgụgụ ndị o metụtara—ọtụtụ nde ndị na-ata ahụhụ dị ka ndị ohu gburugburu ụwa. Chezie banyere otu ohu ma ọ bụ abụọ nke oge a bụ́ ndị ị gụrụ akụkọ banyere ha na peji ndị a—ikekwe Lin-Lin ma ọ bụ Binti. Ị̀ chọrọ ịhụ ka mpụ nke ịgba ohu nke oge a kwụsịrị? Ọ̀ dị mgbe a ga-ekpochapụ ịgba ohu n’ezie? Tupu e mee nke a, a ghaghị inwe oké mgbanwe. Biko gụọ banyere ha n’isiokwu na-esonụ.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

^ par. 11 Lee “Iji Ụmụaka Akpa Ego—Nkwụsị Ya Dị Nso!” dị ná mbipụta Teta! nke June 8, 1999.

[Igbe/Foto dị na peeji nke 6]

ỊGBALỊ INWETA IHE NGWỌTA YA

Ọtụtụ ụlọ ọrụ gọọmenti, dị ka Òtù Maka Ụmụaka nke Mba Ndị Dị n’Otu na Òtù Mba Nile Na-ahụ Maka Ọrụ, ji ịdị uchu na-echepụta ma na-etinye usoro dị iche iche n’ọrụ iji kpochapụ ịgba ohu nke oge a. Ọzọkwa, ọtụtụ òtù ndị na-abụghị nke gọọmenti, dị ka Òtù Na-emegide Ịgba Ohu nke Mba Nile na Òtù Na-akwado Ihe Ndị Ruuru Mmadụ, agbawo mbọ ime ka ọha na eze matakwuo banyere ịgba ohu nke oge a nakwa ka a tọhapụ ndị nọ n’ohu. Ụfọdụ n’ime òtù ndị a na-agbalị ime ka a malite ịdị na-amapawa mpempe akwụkwọ ndị pụrụ iche bụ́ ndị ga-egosi na ọ bụghị ndị ohu ma ọ bụ ụmụaka mepụtara ihe ndị ahụ. Òtù ndị ọzọ na-ekwu ka e tie iwu ná mba ebe ndị “njem mmekọahụ” si malite, ka e wee nwee ike ikpe ndị na-eso ụmụaka enwe mmekọahụ ikpe mgbe ha laghachiri ná mba a mụrụ ha. Ụfọdụ ndị na-akwado ihe ndị ruuru mmadụ eruwo n’ókè nke ịkwụ ndị na-agba ahịa ohu na ndị nwere ohu nnukwu ego iji gbapụta ọtụtụ ndị ohu ha pụrụ ịgbapụta. Nke a akpatatụwo arụmụka, ebe ọ bụ na omume ndị dị otú ahụ pụrụ ime ka a na-ere ndị ohu oké ọnụ ma mee ka ọnụ ego mgbapụta ha rịa elu.

[Foto dị na peeji nke 7]

A na-amanye ọtụtụ ụmụ agbọghọ ịlụ di

[Ebe E Si Nweta Foto]

MBA NDỊ DỊ N’OTU/J.P. LAFFONT

[Foto dị na peeji nke 8]

Ebe ndị ohu e ji gbaa ibè kwụ n’ahịrị maka ihe oriri

[Ebe E Si Nweta Foto]

Ricardo Funari

[Foto dị na peeji nke 8]

Mgbe ụfọdụ, a na-amanye ụmụaka ịga ozi agha

[Ebe E Si Nweta Foto]

MBA NDỊ DỊ N’OTU/J.P. LAFFONT