Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ikiri Ụwa

Ikiri Ụwa

Ikiri Ụwa

Ndị Nwere Nrụgide

“Ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ ọkara nke ndị Canada na-ekwu na ha na-enwe site ná nrụgide na-agabigaghị ókè ruo na nke gabigara ókè ka ha na-agbalị ilebachara ọrụ ha na ndụ ha na-ebi n’ebe obibi ha anya,” ka akwụkwọ akụkọ Vancouver Sun, na-akọ. “Nke ahụ karịrị nke afọ iri gara aga okpukpu abụọ.” N’ihi gịnị ka e ji nwee ịrị elu ahụ? Otu nnyocha nke Òtù Bọọdụ Nzukọ nke Canada mere, kpughere na e nwere ịrị elu n’ọnụ ọgụgụ ndị Canada na-arụ ọru, bụ́ ndị na-elekọta ndị òtù ezinụlọ ha. Ọtụtụ na-amụ ụmụ mgbe ha mere okenye, ndị a na-abụkarịkwa ndị ihe ịma aka “nke ilekọta ma ụmụ ha ma nne na nna ha n’otu oge ahụ na-eche ihu.” Ọ bụ ezie na pasent 84 nke ndị zaghachirinụ ná nnyocha ahụ ka nwere afọ ojuju n’ọrụ ha, akụkọ ahụ na-ekwu na mgbe ịchọ imecha ihe a chọrọ ka e mee n’ebe obibi na n’ebe ọrụ ghọrọ nsogbu, “ihe ka n’ọtụtụ mmadụ na-ebu ụzọ ebelata oge ha ji egbo mkpa onwe ha, gụnyere oge ihi ụra.” Òtù Bọọdụ Nzukọ ahụ na-ekwu, sị: “Ọ na-akpata nrụgide, ọ na-akpakwa ahụ ike aka ọjọọ.”

Ịkụzi Inwe Nkwanye Ùgwù Maka Ịchịisi

“Ndị nne na nna nke taa adịchaghị achọ inweta nkwanye ùgwù maka ịchịisi nke na ọ pụrụ ịbụ n’ezie na ha na-eweda ùgwù onwe onye nke ụmụ ha ala,” ka otu akụkọ dị n’akwụkwọ akụkọ bụ́ The Toronto Star na-ekwu. “Ịmara ebe ikike ha jedebere na-egbo nnọọ mkpa ụmụaka nwere nke ịmata ihe ha ga-atụ anya ya na ịnọ ná nchebe—nke na-enyere ha aka, n’aka nke ha, inwekwu ùgwù onwe onye,” ka ọkachamara n’ihe banyere akparamàgwà bụ́ Ronald Morrish na-ekwu. “Ọ bụ ụmụaka na-enweghị ụkpụrụ nduzi na ibu ọrụ, bụ ndị na-etolite n’enwechaghị mmetụta nke ịnọ ná nchebe na n’enweghị obi ike.” Ọ na-gbakwụnye, sị: “Amaara m ụmụaka dị afọ 6 na-ekpebi mgbe ha ga-alakpu ụra. Amaara m ụmụaka dị afọ 3, ndị mama ha na-agbalị ịgba ume ka ha ghara ịkpa àgwà ọjọọ site n’ịkọwara ha otú ọ na-adị ha n’obi.” Ọ dị ụmụaka mkpa ịmụta irube isi n’iwu ezinụlọ, echiche ahụ bụ́ na ha adịghi erubecha isi mgbe ha na-etolite ezighị ezi, ka Morrish na-ekwu. “Anyị na-atụ anya ka ụmụaka na-enwewanye ihe ọmụma a na-amụta n’ụlọ akwụkwọ kwa afọ. Ya mere n’ihi gịnị ka anyị na-agaghị ejikwa tụọ anya ka àgwà ụmụaka na-aka mma kwa afọ?” ka ọ na-ajụ. Ọ bụrụ na ị gaghị eji ikike gị mee ka nwa na-amụ ije tụtụlite ihe o ji egwuri egwu, o ruo afọ iri na ụma ọ gaghị na-alọta oge a gwara ya ka ọ na-alọta.”

Ịkpọrọ Anụ Ụlọ Tepụ Ka Ha Wee Rie Nri

Ndị Canada bụ́ ndị ọkà mmụta sayensị achọpụtawo na a pụrụ ịkpali ụmụ anụ ụlọ iri nri site n’ịkpọrọ ha tepụ, ka magazin bụ́ New Scientist na-akọ. “Anyị tinyere ụrịa nne ọkụkọ na-ebe mgbe ọ hụrụ ihe ọ chọrọ ka ụmụ ya rie, na tepụ,” ka Luis Bate nke Mahadum Àgwàetiti Prince Edward na-ekwu. Mgbe a kpọgharịrị ụrịa ahụ na tepụ ka ọ na-ada n’ígwè okwu ndị e debere n’akụkụ nri ha, ụmụ ọkụkọ ndị ahụ riri nri, ọ bụ ezie na nne ha anọghị ya. Ma ụda ahụ aghaghị iyi nke ọkụkọ. Bate na-ekwu, sị: “Mgbe anyị kpọọrọ ha ụrịa nne ọkụkọ na-ebe mgbe ọ bụsịrị àkwá, nke na-ada ná ntị m dị ka ụrịa o ji enye ha nri, ụmụ ọkụkọ ndị ahụ kwụụrụ otu ebe.” Nzube ndị ọkà mmụta bụ ime ka ụmụ anụ ahụ too ngwa ngwa, ná nnwale ndị mbụ e mere, ụmụ ọkụkọ ahụ jiri ihe ha ka pasent 20 too ngwa ngwa karịa ka ha kwesịrị ito n’ime izu atọ mbụ ha. Ná nnwale ndị yiri ya e mekwara, a pụkwara ịkpali ụmụ torotoro na ụmụ ezì iri nri ọtụtụ ugboro karị.

Ndepụta Ọgwụ Dị Ize Ndụ

“Ọgwụ gburu ọtụtụ mmadụ na Germany n’afọ gara aga karịa ka ihe mberede okporo ụzọ gburu,” ka akwụkwọ akụkọ bụ́ Stuttgarter Nachrichten kọrọ. A kọrọ na ọgwụ ndị na-ekwesịghị ekwesị ndị dọkịta depụtara gburu ihe dị ka mmadụ 25,000 na 1998. Nke a ji okpukpu atọ karịa ndị nwụrụ n’ihe mberede okporo ụzọ n’otu oge ahụ. A sịrị na inye onwe onye ọgwụ na-esote ya. Nsogbu bụ́ isi na-akpata ya yiri ka ọ bụ na ndị dọkịta adịghị enweta ihe ọmụma na ọzụzụ banyere ọgwụ na otú ha si arụ ọrụ. Ọkachamara n’ihe banyere ọgwụ bụ́ Ingolf Cascorbi kwuru na dị ka otu atụmatụ e mere na-egosi, “na Germany kwa afọ, a pụrụ igbochi 10,000 mmadụ ịnwụ na mmadụ 250,000 ịbụ ndị ọgwụ kpataara nsogbu ma ọ bụrụ na e mee nnyocha ma nye ọzụzụ n’ụzọ zuru ezu,” ka akụkọ ahụ na-ekwu.

N’otu aka ahụ, magazin France bụ́ Sciences et avenir na-akọ na nnyocha e mere na nso nso a na France na-ekpughe na n’ime ọgwụ 150,000 ndị dọkịta depụtaara ndị gafeworo afọ 70, ihe dị ka 10,700 ekwesịghị ekwesị ma ọ bụ arụghị ọrụ. Ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ 1 n’ime ọgwụ 50 pụrụ ịdị ize ndụ n’ihi nsogbu nke ọgwụ ndị ọzọ dọkịta depụtara pụrụ inye ma ọ bụ ihe ndị ọzọ dị ize ndụ pụrụ ịdị na ya. Na France ndị meworo okenye na-anọ ihe dị ka otu nde ụbọchị kwa afọ n’ụlọ ọgwụ n’ihi nsogbu nke ọgwụ na-enye ha n’ahụ.