Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Abụ nke 75

Ihe Mere Anyị Ji Enwe Ọṅụ

Ihe Mere Anyị Ji Enwe Ọṅụ

(Matiu 5:⁠12)

1. Ihe n’eny’anyị ọṅụ dị ọtụtụ,

Dị ka akụ̀ dị ok’ọnụ ahịa.

Ihe a n’achọs’ike nke mba dum

N’esonyer’anyị n’ụwa dum.

Anyị nwere ezigbo ọṅụ

Nke si n’Okwu Chineke.

Ọ n’ezi anyị ihe kw’ụbọchị,

N’eme k’anyị nwee okwukwe.

Ọṅụ anyị nwere si anyị n’obi.

Ọ n’enwu n’obi anyị k’ọkụ.

Ọnwụnwa na nsogbu n’abịa.

Jehova n’akwado anyị.

(KORỌS)

Jehova bụ ọṅụ anyị; ọrụ

Ya n’amasị anyị; uche

Ya miri emi; ọrụ ya dịkwa

Ukwuu, dị mma, dịkwa ike.

2. Anyị ji ọṅụ n’ahụ ọrụ aka ya,

El’igwe, mmiri, n’ala.

Anyị n’ahụ ihe ndị o kere

Ma n’eto ọrụ aka ya.

Anyị ji ọṅụ n’agb’àmà ugbu a,

N’ekwus’Al’eze Chineke.

Anyị n’ekwusa ọmụmụ ya

Na ngọzi ya n’ụwa dum.

Ọṅụ ebigh’ebi dị nso,

Dị k’ụtụtụ n’eso abalị.

El’igwe na ụw’ọhụrụ ya

G’ewet’ọṅụ ebigh’ebi.

(KORỌS)

Jehova bụ ọṅụ anyị; ọrụ

Ya n’amasị anyị; uche

Ya miri emi; ọrụ ya dịkwa

Ukwuu, dị mma, dịkwa ike.