Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Abụ nke 122

Ìgwè Ụmụnna Anyị

Ìgwè Ụmụnna Anyị

(Mkpughe 7:​9, 10)

1. Oké ìgwè ụmụnn’anyị,

Ha dị ọtụtụ nde

Ndịàmà nwer’okwukwe,

Kwesị ntụkwasị obi.

Anyị bụ ìgw’ụmụnna,

N’agh’ok’ìgwè ’madụ,

Si ná mba dum n’asụsụ niile,

N’eto Chinek’anyị.

2. Anyị bụ ìgwè ụmụnna,

N’ekwusa n’ebe dum

“Ozi ọma nk’ihe ka mma,”

Nk’ọtụtụ g’anụ.

K’anyị n’ekwus’ozi ọma,

A’yị pụr’inwe nsogbu,

Kraịst n’enye nd’ike gwụrụ ume,

Mee k’anyị zur’ike.

3. Anyị bụ ìgwè ụmụnna

Nọ n’ihu Chineke,

N’ogige ya dị n’ụwa,

N’efe ya mgbe niile.

Anyị bụ ìgw’ụmụnna

N’ekwus’ozi Al’eze,

A’yị na Chineke n’arụk’ọrụ,

N’ej’ozi ya n’ụwa.