AspctStyle/stock.adobe.com

Jizọs Ga-eme Ka Agha Kwụsị

Jizọs Ga-eme Ka Agha Kwụsị

 N’oge Jizọs nọ n’ụwa, o mere ihe gosiri na ọ hụrụ ndị mmadụ n’anya nke ukwuu. O ji ndụ ya chụọ àjà maka ha. (Matiu 20:28; Jọn 15:13) N’oge na-adịghị anya, ọ ga-egosi ụmụ mmadụ ọzọ na ọ hụrụ ha n’anya. Otú ọ ga-esi eme ya bụ iji ike ya ka Eze Alaeze Chineke mee ka “agha kwụsị n’ebe niile n’ụwa.”​—Abụ Ọma 46:9.

 Chọpụta otú Baịbụl si kọwaa ihe Jizọs ga-eme:

  •   “N’ihi na ọ ga-anapụta ogbenye nke na-ebe ákwá ka e nyere ya aka, napụtakwa onye ọ na-enweghị ka ọ hà ya na onye ọ bụla na-enweghị onye na-enyere ya aka. Ọ ga-emere ogbenye na onye ọ na-enweghị ka ọ hà ya ebere, ọ ga-azọpụtakwa ndị ogbenye. Ọ ga-anapụta ha n’aka ndị na-emegbu ha nakwa n’aka ndị na-emesi ha ike.”​—Abụ Ọma 72:12-14.

 Olee otú anyị ga-esi gosi na obi dị anyị ụtọ maka ihe Jizọs meere anyị nakwa ihe ọ ga-emere anyị n’ọdịnihu? Otu ụzọ anyị ga-esi eme ya bụ ịmụtakwu gbasara “ozi ọma Alaeze Chineke” nke bụ́ isi ihe o zisaara ndị mmadụ. (Luk 4:43) Gụọ isiokwu bụ́ “Gịnị Bụ Alaeze Chineke?