Gaa n'Isiokwu

Gịnị Mere Jizọs Ji Nwụọ?

Gịnị Mere Jizọs Ji Nwụọ?

Ihe Baịbụl kwuru

Jizọs nwụrụ ka e nwee ike ịgbaghara ụmụ mmadụ mmehie ha nakwa ka ha nwee ike ịdị ndụ ebighị ebi. (Ndị Rom 6:23; Ndị Efesọs 1:7) Ọnwụ Jizọs gosikwara na mmadụ nwere ike irubere Chineke isi, ọ bụrụgodị na ọnwụnwa tara ezigbo akpụ abịara ya.​—Ndị Hibru 4:15.

Ka anyị tụlee otú ọnwụ otu onye nwere ike isi mee ihe a niile.

  1. Jizọs nwụrụ ka e wee ‘gbaghara anyị mmehie anyị.’​—Ndị Kọlọsi 1:​14.

    Nwoke mbụ bụ́ Adam zuru okè. O nweghị mmehie. Ma, o kpebiri inupụrụ Chineke isi. Isi Adam nupụrụ, ya bụ, mmehie o mere, kpara ụmụ ya niile aka. Baịbụl kwuru, sị: “E mere ka ọtụtụ mmadụ ghọọ ndị mmehie site ná nnupụisi nke otu onye ahụ.”​—Ndị Rom 5:19.

    Jizọs zukwara okè, ma e nweghị mgbe o mehiere. Ọ bụ ya mere o ji bụrụ “àjà ime udo maka mmehie anyị.” (1 Jọn 2:2) Isi Adam nupụrụ mere ka ụmụ mmadụ ghọọ ndị mmehie. Otú ahụkwa ka ọnwụ Jizọs wepụrụ mmehie nke ndị niile nwere okwukwe na ya.

    E nwere ike ikwu na Adam rere ụmụ mmadụ ka ha bụrụ ndị ohu nke mmehie. Ma, mgbe Jizọs ji obi ya niile nwụọ maka anyị, ọ gbapụtara ụmụ mmadụ ka ha bụrụ ndị nke ya. N’ihi ya, “ọ bụrụ na onye ọ bụla emee mmehie, anyị nwere onye na-enyere anyị aka, onye ya na Nna anyị nọ, ya bụ, Jizọs Kraịst, onye ezi omume.”​—1 Jọn 2:1.

  2. Jizọs nwụrụ “ka e wee ghara ibibi onye ọ bụla nke nwere okwukwe na ya, kama ka o nwee ndụ ebighị ebi.”​—Jọn 3:​16.

    N’agbanyeghị na e kere Adam ka ọ dị ndụ ebighị ebi, mmehie ya kpataara ya ọnwụ. Mmehie si n’aka Adam “bata n’ụwa, ọnwụ esikwa ná mmehie bata, ọnwụ wee si otú ahụ gbasaa ruo mmadụ niile n’ihi na ha niile mehiere.”​—Ndị Rom 5:12.

    Ma, ọ bụghị naanị na ọnwụ Jizọs wepụrụ mmehie, kama o mekwara ka a kagbuo ikpe ọnwụ a mara ndị niile nwere okwukwe na ya. Baịbụl kwuru, sị: “Ka obiọma na-erughịrị mmadụ wee chịa dị ka eze site n’ezi omume nke na-eduga ná ndụ ebighị ebi site na Jizọs Kraịst Onyenwe anyị, dị nnọọ ka mmehie na ọnwụ chịrị dị ka eze.”​—Ndị Rom 5:21.

    N’eziokwu, ụmụ mmadụ ka na-anwụ anwụ. Ma, Chineke kwere nkwa na ya ga-eme ka ndị ezi omume dị ndụ ebighị ebi nakwa na ya ga-akpọlite ndị nwụrụ anwụ ka ha soro rite uru n’àjà Jizọs ji ndụ ya chụọ.​—Abụ Ọma 37:29; 1 Ndị Kọrịnt 15:22.

  3. Jizọs ‘rubere isi ruo ọnwụ,’ si otú ahụ gosi na mmadụ nwere ike irubere Chineke isi n’agbanyeghị ụdị ọnwụnwa bịaara ya.​—Ndị Filipaị 2:8.

    N’agbanyeghị na Adam nwere uche na ahụ́ zuru okè, o nupụụrụ Chineke isi n’ihi na ọ chọrọ inweta ihe na-abụghị nke ya. (Jenesis 2:​16, 17; 3:6) Mgbe e mechara, Setan, bụ́ onyeisi ndị iro Chineke, kwuru na e nweghị onye ga-eji obi ya niile rubere Chineke isi, karịchaa mgbe ime otú ahụ nwere ike ịkpatara onye ahụ ọnwụ. (Job 2:4) Ma, Jizọs, bụ́ onye zuru okè, rubeere Chineke isi ma kwụsie ike n’ebe Chineke nọ. Ọ tadịrị ahụhụ ma nwụọ ọnwụ ihere. (Ndị Hibru 7:26) Ihe a Jizọs mere mere ka o doo anya na mmadụ nwere ike irubere Chineke isi n’agbanyeghị ụdị ọnwụnwa bịaara ya.

Ajụjụ gbasara ọnwụ Jizọs

  • Gịnị mere Jizọs ji kwesị ịta ahụhụ ma nwụọ iji gbapụta ụmụ mmadụ? Gịnị mere na Chineke akagbughị ikpe ọnwụ ahụ a mara ụmụ mmadụ?

    Iwu Chineke kwuru na “ụgwọ ọrụ nke mmehie na-akwụ bụ ọnwụ.” (Ndị Rom 6:23) Kama ime ka Adam ghara ịma banyere iwu a, Chineke gwara ya na ọ ga-anwụ ma o nupụrụ ya isi. (Jenesis 3:3) Mgbe Adam mehiere, Chineke, “onye na-apụghị ịgha ụgha,” mere ihe o kwuru. (Taịtọs 1:2) Adam bufeere ụmụ ya ma mmehie ma ụgwọ ọrụ mmehie na-akwụ, ya bụ, ọnwụ.

    N’agbanyeghị na ụmụ mmadụ, bụ́ ndị mmehie, kwesịrị ịnwụ, Chineke mere ka ha nweta “obiọma ya dị ukwuu nke na-erughịrị mmadụ.” (Ndị Efesọs 1:7) Izite Jizọs ka o jiri ndụ ya chụọ àjà zuru okè mere ka a gbapụta ụmụ mmadụ. Ihe a Chineke mere bụ nnọọ ihe ziri ezi, gosikwa na ebere ya enweghị atụ.

  • Olee mgbe Jizọs nwụrụ?

    Jizọs nwụrụ “n’oge awa nke itoolu,” ma e bido mgbe anyanwụ wara gụwa ya, ya bụ, n’ihe dị ka elekere atọ nke ehihie n’ụbọchị ndị Juu na-eme Ememme Ngabiga. (Mak 15:​33-37) Na kalenda oge anyị a, ụbọchị ahụ dabara na Fraịdee, abalị mbụ n’ọnwa Eprel afọ 33.

  • Olee ebe Jizọs nọ nwụọ?

    E gburu Jizọs ‘n’ebe a na-akpọ Ebe Okpokoro Isi, nke a na-akpọ Gọlgọta n’asụsụ Hibru.’ (Jọn 19:​17, 18) N’oge Jizọs nọ n’ụwa, ebe ahụ dị ná “mpụga ọnụ ụzọ ámá” Jeruselem. (Ndị Hibru 13:12) O nwere ike ịbụ na ọ dị n’ugwu, ebe ọ bụ na Baịbụl kwuru na ụfọdụ “nọ n’ebe dịtụ anya” na-ele anya mgbe a na-egbu Jizọs. (Mak 15:40) Ma, a maghị kpọmkwem ebe Gọlgọta dị ugbu a.

  • Olee otú Jizọs si nwụọ?

    N’agbanyeghị na ọtụtụ ndị kweere na a kpọgidere Jizọs n’obe, Baịbụl kwuru, sị: “Ya onwe ya . . . . buuru mmehie niile anyị n’ahụ́ ya n’elu osisi ahụ.” (1 Pita 2:​24, Bible Nsọ nke Union Version) Ndị dere Baịbụl ji okwu Grik abụọ bụ́ stau·rosʹ na xyʹlon kọwaa ihe e ji gbuo Jizọs. Ọtụtụ ndị ọkà mmụta Baịbụl ekwuola na okwu abụọ ahụ pụtara otu ogologo osisi.

  • Olee otú e kwesịrị isi na-echeta ọnwụ Jizọs?

    N’abalị ụbọchị ndị Juu ji eme Ememme Ngabiga, Jizọs malitere otu ememme mgbe ya na ndị na-eso ụzọ nọ ma nye ha iwu, sị: “Na-emenụ nke a ka unu wee na-echeta m.” (1 Ndị Kọrịnt 11:24) Mgbe awa ole na ole gara, e gburu Jizọs.

    Ndị dere Baịbụl ji Jizọs tụnyere nwa atụrụ e ji chụọ àjà n’Ememme Ngabiga. (1 Ndị Kọrịnt 5:7) Otú ahụ Ememme Ngabiga si echetara ndị Izrel na a kpọpụtala ha n’ohu ha na-agba ka Ncheta Ọnwụ Jizọs Kraịst si echetara Ndị Kraịst na a napụtala ha n’aka mmehie na ọnwụ. Ndị Juu na-eme Ememme Ngabiga n’abalị iri na anọ n’ọnwa Naịsan. Ọ bụ otu ugboro ka ha na-eme ya n’afọ. Ndị Kraịst oge mbụ mekwara Ncheta Ọnwụ Jizọs otu ugboro n’afọ.

    Kwa afọ, ọtụtụ nde mmadụ n’ụwa niile na-echeta ọnwụ Jizọs n’ụbọchị dabara n’abalị iri na anọ n’ọnwa Naịsan.