Ọnụ Ọgụgụ 15:1-41

15  Jehova wee gwa Mozis okwu ọzọ, sị:  “Gwa ụmụ Izrel okwu, sị ha, ‘Mgbe unu mesịrị banye n’ala nke ga-abụ ebe obibi unu, nke m ga-enye unu,+  unu ga-achụrụ Jehova àjà a na-esure n’ọkụ,+ àjà nsure ọkụ+ ma ọ bụ àjà a na-achụ iji mezuo nkwa pụrụ iche ma ọ bụ nke a na-enye n’afọ ofufo+ ma ọ bụ n’oge ememme ndị unu na-eme n’oge a kara aka,+ site n’ìgwè ehi ma ọ bụ n’ìgwè ewu na atụrụ, iji chụọrọ Jehova àjà na-esi ísì ụtọ;+  onye na-eweta onyinye ya ga-ewetakwara Jehova àjà ọka* bụ́ ntụ ọka e gwere nke ọma,+ ya bụ, otu ụzọ n’ụzọ iri nke otu ihe ọ̀tụ̀tụ̀ efa, nke a gwara otu ụzọ n’ụzọ anọ nke otu ihe ọ̀tụ̀tụ̀ hin mmanụ.  Ị ga-ejikwa mmanya chụọ àjà ihe ọṅụṅụ,+ ọ ga-adị otu ụzọ n’ụzọ anọ nke otu ihe ọ̀tụ̀tụ̀ hin, ya na àjà nsure ọkụ ma ọ bụ iji chụọ nwa ebule nke ọ bụla n’àjà.  Ma ọ bụ, ya bụrụ ebule, ị ga-achụ àjà ọka bụ́ ụzọ abụọ n’ime ụzọ iri nke otu ihe ọ̀tụ̀tụ̀ efa ntụ ọka e gwere nke ọma, nke a gwara otu ụzọ n’ụzọ atọ nke otu ihe ọ̀tụ̀tụ̀ hin mmanụ.  Ị ga-ewetakwa mmanya ka ọ bụrụ àjà ihe ọṅụṅụ, ọ ga-adị otu ụzọ n’ụzọ atọ nke otu ihe ọ̀tụ̀tụ̀ hin, ka ọ bụrụ ihe na-esi ísì ụtọ nye Jehova.  “‘Ma ọ bụrụ na i ji oké ehi na-achụrụ Jehova àjà nsure ọkụ+ ma ọ bụ àjà a na-achụ iji mezuo nkwa pụrụ iche+ ma ọ bụ àjà udo,+  ị ga-eweta oké ehi ahụ, ya na àjà ọka+ bụ́ ụzọ atọ n’ime ụzọ iri nke otu ihe ọ̀tụ̀tụ̀ efa ntụ ọka e gwere nke ọma, nke a gwara ọkara otu ihe ọ̀tụ̀tụ̀ hin mmanụ. 10  Ị ga-eweta mmanya iji chụọ àjà ihe ọṅụṅụ,+ ọ ga-adị ọkara otu ihe ọ̀tụ̀tụ̀ hin, ka ọ bụrụ àjà na-esi ísì ụtọ nke a na-esurere Jehova n’ọkụ. 11  Ọ bụ otú a ka a ga-eme mgbe ị na-achụ oké ehi ọ bụla ma ọ bụ ebule ọ bụla ma ọ bụ nwa ebule ma ọ bụ ewu n’àjà. 12  N’agbanyeghị ole unu pụrụ ịchụ n’àjà, otú ahụ ka unu ga-eme nke ọ bụla dị ka ọnụ ọgụgụ ha si dị. 13  Ọ bụ otú a ka onye ọ bụla bụ́ nwa afọ ga-esi na-achụ ihe ndị a n’àjà mgbe o wetara àjà na-esi ísì ụtọ nke a na-esurere Jehova n’ọkụ.+ 14  “‘Ọ bụrụ na e nwere onye mbịarambịa binyeere unu dị ka ọbịa ma ọ bụ onye bi n’etiti unu, n’ọgbọ unu niile, ọ ga na-achụ àjà na-esi ísì ụtọ nke a na-esurere Jehova n’ọkụ, dị nnọọ ka unu kwesịrị ime, otú ahụ ka o kwesịrị ime.+ 15  Unu onwe unu bụ́ ndị so n’ọgbakọ a na onye mbịarambịa nke bi dị ka ọbịa ga-enwe otu ụkpụrụ.+ Ọ ga-abụ ụkpụrụ nke na-adịru mgbe a na-akaghị aka ruo ọgbọ unu niile. Unu na onye mbịarambịa ga-abụ otu n’ihu Jehova.+ 16  Otu iwu na otu mkpebi ikpe ga-adịrị unu, dịkwara onye mbịarambịa nke binyeere unu dị ka ọbịa.’”+ 17  Jehova wee gwa Mozis, sị: 18  “Gwa ụmụ Izrel okwu, sị ha, ‘Mgbe unu na-abata n’ala ahụ m na-akpọbata unu,+ 19  ọ ga-erukwa na mgbe unu na-eri nri ala ahụ mepụtara, unu ga-enye Jehova onyinye. 20  Unu ga-eji ntụ ọka nke si ná mkpụrụ mbụ+ unu mee achịcha ma weta ya dị ka onyinye. Unu ga-enye ya dị ka e si enye onyinye nke si n’ebe nzọcha mkpụrụ. 21  Unu ga-enye ụfọdụ n’ime ntụ ọka nke si ná mkpụrụ mbụ unu ka ọ bụrụ onyinye a na-enye Jehova n’ime ọgbọ unu niile. 22  “‘Ọ bụrụ na unu emehie ihe, wee ghara ime ihe a niile e nyere n’iwu,+ bụ́ ihe Jehova gwara Mozis, 23  ihe niile Jehova nyere unu n’iwu site n’ọnụ Mozis, malite n’ụbọchị Jehova nyere ha n’iwu gaa n’ihu ruo ọgbọ unu niile, 24  ọ ga-erukwa na ọ bụrụ na e mere ihe ahụ n’amaghị ama n’ebe anya nzukọ unu na-ahụghị ya, nzukọ unu dum ga-eji nwa oké ehi chụọ àjà nsure ọkụ ka ọ bụrụ ihe na-esi ísì ụtọ nye Jehova, unu ga-achụkwa àjà ọka ya na àjà ihe ọṅụṅụ ya, dị ka usoro ya si dị,+ werekwa nwa ewu chụọ àjà mmehie.+ 25  Onye nchụàjà ga-ekpuchikwara+ nzukọ ụmụ Izrel dum mmehie ha, a ga-agbagharakwa ha mmehie ahụ; n’ihi na e mere ya n’amaghị ama,+ ha onwe ha kwa wetara àjà a na-esurere Jehova n’ọkụ dị ka onyinye ha, wetakwa àjà mmehie ha n’ihu Jehova n’ihi ihe ha mere n’amaghị ama. 26  A ga-agbaghara+ nzukọ ụmụ Izrel dum na ndị mbịarambịa bi dị ka ọbịa n’etiti ha, n’ihi na ndị ahụ niile mere ya n’amaghị ama. 27  “‘Ọ bụrụ na mkpụrụ obi ọ bụla emehie n’amaghị ama,+ ọ ga-eweta nne ewu na-agafebeghị otu afọ ka e were chụọ àjà mmehie.+ 28  Onye nchụàjà ga-ekpuchiri mkpụrụ obi ahụ nke mehiere ihe mmehie ya, bụ́ onye mehiere n’ihu Jehova n’amaghị ama, ka e wee kpuchie mmehie ahụ, a ga-agbagharakwa ya.+ 29  Otu iwu ga-adịrị ma nwa afọ Izrel ma onye mbịarambịa nke bi dị ka ọbịa n’etiti ha n’ihe banyere ime ihe n’amaghị ama.+ 30  “‘Ma mkpụrụ obi nke kpachaara anya mee ihe,+ ma ọ̀ bụ nwa afọ ma ọ̀ bụ onye mbịarambịa, o wee kwujọọ Jehova,+ a ga-ebipụ mkpụrụ obi ahụ n’etiti ndị ya.+ 31  N’ihi na ọ bụ okwu Jehova ka o leghaara anya,+ n’ihi na ọ bụkwa ihe o nyere n’iwu ka o mebiri,+ a ghaghị ibipụ+ mkpụrụ obi ahụ. Njehie ya ga-adị ya n’isi.’”+ 32  Mgbe ụmụ Izrel ka nọ n’ala ịkpa, otu mgbe, ha hụrụ otu nwoke ka ọ na-akpa nkụ n’ụbọchị izu ike+. 33  Ndị hụrụ ka ọ na-akpa nkụ wee kpọrọ ya bịakwute Mozis na Erọn na nzukọ ahụ dum. 34  Ha wee kpọchie ya,+ n’ihi na e kwubeghị kpọmkwem ihe a ga-eme ya. 35  Ka oge na-aga, Jehova gwara Mozis, sị: “A ghaghị igbu nwoke ahụ,+ nzukọ ahụ dum ga-atụ ya nkume ná mpụga ebe unu mara ụlọikwuu.”+ 36  Nzukọ ahụ dum wee kpọpụta ya ná mpụga ebe ha mara ụlọikwuu wee were nkume tụgbuo ya, dị nnọọ ka Jehova nyere Mozis n’iwu. 37  Jehova wee gaa n’ihu ịgwa Mozis, sị: 38  “Gwa ụmụ Izrel okwu, sị ha ka ha dụnye ihe dị yọrị yọrị n’ọnụ ọnụ ala uwe mwụda ha ruo ọgbọ ha niile, ha ga-adụnyekwa eriri na-acha anụnụ anụnụ n’elu ebe ahụ a dụnyere ihe ahụ dị yọrị yọrị n’ọnụ ọnụ ala uwe mwụda ha,+ 39  ‘Ọ ga-abụkwara unu ihe dị yọrị yọrị n’ọnụ ọnụ ala uwe mwụda unu, unu ga-ahụ ya wee cheta ihe niile Jehova nyere n’iwu+ wee mee ha, unu esola obi unu na anya unu,+ bụ́ ihe unu na-eso wee na-enwe mmekọahụ rụrụ arụ.+ 40  Ihe mere unu ga-eji mee ya bụ ka unu na-echeta ihe niile m nyere n’iwu ma na-eme ha, bụrụkwa ndị dị nsọ nye Chineke unu.+ 41  Abụ m Jehova bụ́ Chineke unu, onye kpọpụtara unu n’ala Ijipt iji gosi na m bụ Chineke unu.+ Abụ m Jehova bụ́ Chineke unu.’”+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Ọka a na-ekwu okwu ya ebe a bụ ụdị dị ka ọka wit na ọka bali.