Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Isiokwu Afọ 2014

“Ka Alaeze Gị Bịa.”​—Matiu 6:10

Isiokwu Afọ 2014

Ihe dị ka otu narị afọ gara aga, Jehova chiri Jizọs eze n’eluigwe. Kemgbe ahụ, ndị na-efe Chineke ji obi ha niile na-agwa ndị ọzọ ihe Alaeze Chineke ga-emere ụmụ mmadụ. Ị̀ makwa ihe ọma Jizọs ga-emere ụmụ mmadụ? Ọ ga-eme ka ụwa ghọọ paradaịs. Ndị ga-ebi na ya ga-ejikwa obi ha niile hụ ibe ha n’anya. Ihe ọjọọ agaghị adịkwa, ndị mmadụ agaghịzi na-alụ agha. A gaghịkwa enwe onye na-arịa ọrịa ma ọ bụ onye na-ata ahụhụ, ndị mmadụ agaghịzikwa na-anwụ anwụ.

N’oge na-adịghịzi anya, Chineke ga-eme ihe niile ahụ o kwere anyị ná nkwa. Ọ bụ Alaeze Chineke ka Jehova ga-eji mezuo ihe ahụ niile. Na-ekpe ekpere ka Alaeze ahụ bịa. Na-agwa ndị mmadụ banyere ya, echefukwala ihe ọma Alaeze ahụ ga-emere gị.