Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

IKWUSA OZI ỌMA NA ỊKỤZI IHE N’ỤWA NIILE

Yurop

Yurop
  • MBA OLE DỊ NA YA 47

  • MMADỤ OLE BI NA HA 741,892,871

  • NDỊ NKWUSA OLE NỌ NA HA 1,601,915

  • MMADỤ OLE A MỤỤRỤ BAỊBỤL 862,555

“Ọ Dị Ka Ì Furu Ụzọ”

Na Swidin, a gwara otu nwaanyị onye Somalịa ka ọ bịa ọmụmụ ihe, ya ekweta ịga. Ma, ihe ọ hụrụ mgbe o ruru abụghị ihe ọ tụrụ anya ya. E nweghị onye nabatara ya, onye ọ bụla nọ na-ele ya shii. Ihere onwe ya mewere ya. Otu onye hụrụ na ahụ́ erughị ya ala bịara jụọ ya, sị: “Ọ dị ka ì furu ụzọ.”

Ya asị ya, “Ee, ọ dị ka!,” bilie lawa. Mgbe nwaanyị ahụ hụrụ ụmụnna ndị ahụ kpọrọ ya ka ọ bia ọmụmụ ihe, o ji iwe gwa ha na ya agaghị abịa ọmụmụ ihe ha ọzọ. Ụmụnna ahụ nọ na-eche ihe mere o ji sị na ya agaghị abịa ọzọ ebe ọ bụkwanụ na ha ahụghị ya n’ọmụmụ ihe. Ma, mgbe ha na ya kwurịtachara, ha chọpụtara na ọ gahiere ụzọ, banye n’otu chọọchị.

Ụmụnna ahụ gwara ya ọzọ ka ọ bịa ọmụmụ ihe, gwakwa ya ka o leruo anya hụ na ọ bịara n’Ụlọ Nzukọ Alaeze. O kwetara na ya ga-aga, kama na ya agaghị anọfe nkeji iri ebe ahụ ma ọ bụrụ na ahụ́ erughị ya ala. Ma, mgbe ọ batara n’Ụlọ Nzukọ Alaeze, onye ọ bụla ji obi ụtọ nabata ya. Ọmụmụ ihe ahụ tọgidere ya ụtọ, nke na ọ bụ yanwa bụ onye ikpeazụ lara mgbe a gbasara. Kemgbe ahụ, ọ na-agachi ọmụmụ ihe anya, ọ ghọọkwala onye nkwusa e mere baptizim.

Ọ Hụrụ Akwụkwọ Ịkpọ Òkù n’Okporo Ụzọ

Gris: Stergios na-akụziziri ndị ọzọ ihe ọ na-amụta

O nwere otu nwoke bi na n’obodo Gris aha ya bụ Stergios. N’otu ụtụtụ, ka ọ na-alọta ọrụ, ọ hapụrụ ụzọ ọ na-esibu, si ụzọ ọzọ. Ọ hụrụ mpempe akwụkwọ tọgbọ n’akụkụ ụzọ. Ọ bụ akwụkwọ ịkpọ òkù Ncheta Ọnwụ Jizọs. Ajụjụ e dere n’ihu akwụkwọ ịkpọ òkù ahụ bụ: “Gịnị Ka I Chere Jizọs Bụ?” Ọ tụtụụrụghị akwụkwọ ahụ n’ihi na ndị mmadụ nọ ebe ahụ. Mgbe ọ laruru, o bidoro chewe gbasara ajụjụ ahụ dị n’ihu akwụkwọ ahụ, chọọkwa ịmatakwu ihe ọ na-ekwu.

Stergios na ndị enyi ya chọrọ ịga ṅụọ kọfị n’ehihie ụbọchị ahụ. Ka ọ na-aga ka ya na ha soro gawa, o si ụzọ ebe ahụ ọ hụburu akwụkwọ ịkpọ òkù ahụ, na-ele ma ọ̀ ka dị ya. Mgbe o ruru ebe ahụ, ọ hụrụ na ọ ka dị ya, ma ọ tụtụụrụghị ya maka na ndị mmadụ ka nọ ebe ahụ. Mgbe ha ṅụchara kọfị, Stergios sikwa ụzọ ahụ hụ na mpempe akwụkwọ ahụ ka dịkwa ebe ahụ. Na nke ugbu a ọ tụtụụrụ ya gụọ. Mgbe ọ gụchara ya, o kpebiri na ya ga-aga Ncheta Ọnwụ Jizọs.

Mgbe a gbasara Ncheta Ọnwụ Jizọs, a gwara ya ka a bịa mụwara ya Baịbụl, ya ekweta. O bidoro bịawa ọmụmụ ihe, na-emekwa nke ọma n’ọgbakọ. E mere ya baptizim ná mgbakọ pụrụ iche e mere na Mach 2013.

Otu Ihe Omume Redio Mere Ka Ọ Kwụsị Ile Ndịàmà Jehova Anya Ọjọọ

E nwere otu nwanna aha ya bụ Finn. O bi na Kopenhegen dị na Denmak. Otu ụbọchị na Jenụwarị 2010, ọ sị ka ya kpagharịtụ gburugburu ebe ha bi. O weekwara magazin anyị ụfọdụ mgbe ọ na-apụ. Ka ọ na-aga n’ụzọ, ọ hụrụ otu dimkpa nwoke na-abịa ya n’ihu. O nyere ya Ụlọ Nche na Teta! Disemba 2009. E nwere isiokwu ndị dị na ha kwuru gbasara Krismas. Mgbe nwoke ahụ kwuru okwu, ọ matara olu ya. Ọ bụ otu nwoke a ma ama na-ekwu okwu na redio. Ọ gụrụ ezigbo akwụkwọ. N’echi ya, nwanna Finn gere ihe omume nwoke ahụ na-eme na redio. Ọ tụrụ ya n’anya mgbe nwoke ahụ kwuru gbasara magazin ndị ahụ o nyere ya. Nwoke ahụ gụpụtara ihe ụfọdụ dị na magazin ndị ahụ na redio. Otu n’ime ihe ndị ọ gụpụtara bụ gbasara “kpakpando” ahụ pụtara n’eluigwe ụbọchị ahụ a mụrụ Jizọs. O kwukwara na ọ ga-abụrịrị Setan zitere kpakpando ahụ.

Ihe ahụ o mere tọrọ nwanna Finn ụtọ, ya ekpebie na ya ga-aga hụ nwoke ahụ. Mgbe ya na nwoke ahụ na-ekwurịta okwu, nwanna Finn jụrụ ya ma è nwere ike inwe ihe omume redio a ga na-ekwurịta gbasara Baịbụl na ya. Mgbe izu abụọ gachara, nwoke ahụ gwara ya na e nwere ike. E bidoro ime ihe omume redio na-ekwu gbasara Ndịàmà Jehova na Baịbụl. Ihe omume ahụ na-ewe awa abụọ, e meekwala ya ihe karịrị ugboro iri atọ. Nwoke ahụ na nwanna Finn kwurịtara ihe ụfọdụ gbasara Baịbụl, zaakwa ọtụtụ ndị na-akpọ ha n’ekwentị ajụjụ ndị ha na-ajụ.

E nwere otu nwoke nọ na-ege ihe ha na-ekwu. O teela nwoke a nụwara ọtụtụ ihe ọjọọ gbasara Ndịàmà Jehova n’ọnụ ndị ezinụlọ ya na ndị enyi. Mgbe o gechara ihe nwoke ahụ na nwanna Finn nọ na-ekwu, ọ kpọrọ ụlọ ọrụ redio ahụ ma nye ha akara ekwentị ya, gwakwa ha na ya chọrọ ka Ndịàmà Jehova bịa na nke ya. Ihe ndị nwoke a nụrụ n’ihe omume redio ahụ emeela ka ọ kwụsị ile Ndịàmà Jehova anya ọjọọ. A gwara ụmụnna ka ha gaa na nke ya. E bidoro mụwara ya Baịbụl. Ọ bịara Ncheta Ọnwụ Jizọs e mere n’afọ 2013, bịakwa gere okwu ihu ọha pụrụ iche e kwuru n’afọ ahụ. Ọ na-abịa ọmụmụ ihe ụbọchị Sọnde niile, na-azakwa ajụjụ n’ọmụmụ ihe Ụlọ Nche. E nweekwala ndị ọzọ si n’obodo ahụ ihe omume redio a mere ka ha gewe ntị n’ozi ọma.

O Dosara Akwụkwọ Ịkpọ Òkù n’Ọnụ Ụzọ Ha

Mgbe e mechiri ihe omume n’ụbọchị ikpeazụ nke otu mgbakọ distrikti e nwere n’Ịtali, nwanna Lucio nọ na-asị ndị enyi ya gaa nke ọma mgbe otu di na nwunye bịakwutere ha. Nwanna Lucio jụrụ ha ọgbakọ ha si, ha asị ya na o nweghị ọgbakọ ha si. Ọ jụziri ha ma ò nwere onye gwara ha bịa, ha asị ya na o nweghị.

Ihe a juru Lucio anya, ya asị ha, “Biko unu ewekwala iwe, olee ihe mere unu ji bịa.”

Ha azaa ya, sị, “Anyị hụrụ akwụkwọ ịkpọ òkù n’ọnụ ụzọ anyị, sị ka anyị bịa mara ihe na-emenụ.”

Mgbe ha gwara Nwanna Lucio ebe ha bi, Ester nwunye ya chetara na ọ bụ ya dosara akwụkwọ ịkpọ òkù ahụ. Ọ gwara ha, sị: “Ọ bụ mụnwa dosara akwụkwọ ịkpọ òkù ahụ n’ụbọchị ikpeazụ anyị ji kpọọ ndị mmadụ òkù. Mgbe anyị nyechara ndị anyị hụrụ n’ụlọ akwụkwọ ịkpọ òkù n’ụbọchị ahụ, ya afọ, m chere na ọ ka mma idowere ndị na-anọghị n’ụlọ ndị nke fọrọ afọ kama ịtụfu ha atụfu.” Akwụkwọ ịkpọ òkù ahụ ha hụrụ mere ka ha kpebie ịga Mgbakọ na Sọnde ya. Ka ha kpatụrụ nkata obere, ha gwara di na nwunye ahụ ka ha bịa na nke ha ka ha na ha nọrịa. Mgbe ha bịara, ha na ha kpaara nkata ahụ gaa n’ihu. Di na nwunye ahụ kwere ka a mụwara ha Baịbụl. Ha na-akwado nke ọma tupu onye na-amụrụ ha ihe abịa. Ugbu a, ha na-agachi ọmụmụ ihe anya, na-azakwa ajụjụ.