Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

SIERA LION NA GINI

Baajị Mgbakọ Ha Bụ “Akwụkwọ Ikike” Ha Ji Gafere

Baajị Mgbakọ Ha Bụ “Akwụkwọ Ikike” Ha Ji Gafere

“N’AFỌ 1987, ihe karịrị otu puku mmadụ bịara mgbakọ distrikti e nwere na Guékédou, nke dị na Gini. Isiokwu mgbakọ ahụ bụ ‘Tụkwasị Jehova Obi.’ Ebe a nọ nwee mgbakọ a dị nso n’ókè ndị Siera Lion na ndị Laịberịa. Nke a mere ka ọtụtụ ndị Siera Lion na ndị Laịberịa bịara mgbakọ a na-esi n’ụlọ ha abịa kwa ụbọchị. Ma, e nwere nsogbu ha nwere. Ha enweghị akwụkwọ ikike ha ji abata Gini. N’ihi ya, ụfọdụ ụmụnna na ndị ọrụ gọọmenti na-enye ikike ịgafe nọkọrọ ma kwurịta ihe a ga-eme. Ha kwekọrịtara na ụmụnna anyị ga-agafe ma ha gosihaala baajị mgbakọ ha. Ọ na-abụ ndị uwe ojii na-eche ókè Gini hụhaala ndị yi baajị na-acha edo edo, ha asị ha gafere.”—Ọ bụ Nwanna Everett Berry, bụ́bu onye ozi ala ọzọ, kọrọ akụkọ a.

Ebe ụmụnna na-anọ eri nri ná mgbakọ distrikti