Gaa n'Isiokwu

IHE NDỊ GA-ENYERE EZINỤLỌ AKA

Ịkụziri Nwa Gị Ihe O Kwesịrị Ịma Banyere Mmanya Na-aba n’Anya

Ịkụziri Nwa Gị Ihe O Kwesịrị Ịma Banyere Mmanya Na-aba n’Anya

 Otu nwoke aha ya bụ Alexander kwuru, sị: “Mgbe mbụ anyị kụziiri nwa anyị nwaanyị ihe ndị o kwesịrị ịma banyere mmanya na-aba n’anya bụ mgbe ọ dị afọ isii. O juru anyị anya na ọ ma ọtụtụ ihe gbasara ya karịa otú anyị chere.”

 Ihe i kwesịrị ịma

 Ịkụziri ụmụaka banyere mmanya na-aba n’anya dị mkpa. Echela ruo mgbe nwa gị ruru afọ iri na ụma. Otu nwoke bi na Rọshịa aha ya bụ Khamit kwuru, sị: “Ọ na-ewute m na anyị ebidoghị mgbe nwa anyị nwoke dị obere kụziwere ya ihe ndị o kwesịrị ịma banyere ịṅụ mmanya na-aba n’anya. Ọ bụ mgbe ọ kpataara m nsogbu ka m matara na ọ bụ ihe m gaara eme kemgbe. Mgbe nwa m nwoke dị afọ iri na atọ, achọpụtara m na ọ na-aṅụ mmanya na-aba n’anya mgbe mgbe.”

 Gịnị mere i kwesịrị iji chebara ya echiche?

  •   Nwa gị nwere ike ịmụta ihe na-adịghị mma banyere mmanya na-aba n’anya n’aka ụmụ akwụkwọ ibe ya, ndị na-akpọsa ngwá ahịa nakwa na Tiivi.

  •   Ụlọ Ọrụ Na-ahụ Maka Nchịkwa na Mgbochi Ọrịa n’Amerịka kwuru na e kee mmanya na-aba n’anya a na-aṅụ n’Amerịka ụzọ iri, ụmụaka na-aṅụ ihe karịrị otu ụzọ.

 Ọ bụ ya mere ndị na-ahụ gbasara ahụ́ ike ji agwa ndị mụrụ ụmụ ka ha malite mgbe ụmụ ha ka dị obere kụziwere ha nsogbu ịṅụ mmanya na-aba n’anya na-akpatara mmadụ. Olee otú ị ga-esi eme ya?

 Ihe i nwere ike ime

 Chee gbasara ihe nwa gị nwere ike ịjụ gị. Ụmụaka na-achọkarị ịmata ihe. Ndị nke toturu eto na-achọdị ịmata ihe karịa.  Ọ bụ ya mere i kwesịrị iji jikere ejike maka ịza ajụjụ ndị ha nwere ike ịjụ gị. Dị ka ihe atụ:

  •   Ọ bụrụ na nwa gị chọrọ ịmata otú biya si atọ, i nwere ike ịgwa ya na biya na-akụtụ ilu.

  •   Ọ bụrụ na nwa gị chọrọ ịṅụtụ mmanya na-aba n’anya iji mara otú ọ na-atọ, i nwere ike ịgwa ya na mmanya na-enye ụmụ ntakịrị nsogbu n’ahụ́. Gwa ya ihe ụfọdụ ọ na-eme, dị ka: Mmanya na-aba n’anya na-eme ka ahụ́ ruo mmadụ ala, ma ịṅụfe ya ókè nwere ike ime ka mmadụ na-adagharị, na-emegheri emegheri, ma ọ bụ kwuo ihe ọ ga-emecha kwaara mmakwaara.​—Ilu 23:​29-35.

 Mee nchọchọ iji matakwuo ihe ụfọdụ gbasara mmanya na-aba n’anya. Baịbụl kwuru, sị: “Onye ọ bụla nke maara ihe ga-eji ihe ọmụma mee ihe.” (Ilu 13:16) Mata nsogbu ịṅụ mmanya na-aba n’anya na-akpatara mmadụ, ihe iwu obodo unu kwuru banyere otú mmadụ nwere ike ịṅụru ya ma ọ chọọ ịnya ụgbọala na afọ mmadụ ga-eru tupu ya aṅụwa ya. Ọ bụ mgbe ahụ ka ị ga-enwe ike ịkụziri ya nwa gị.

 Gwa nwa gị ka gị na ya kwurịta ya. Otu nwoke bi na Briten kwuru, sị: “Okwu banyere ịṅụ mmanya na-aba n’anya nwere ike ịna-agbagwoju ụmụaka anya. M jụrụ nwa m nwoke dị afọ asatọ ma ọ̀ dị mma mmadụ ịṅụ mmanya na-aba n’anya ka ọ̀ bụ na ọ dịghị. M mere ka ahụ́ ruo ya ala, o mekwara ka o medaa obi kọọrọ m ihe o chere.”

 Ị ga-aka eru nwa gị n’obi ma ọ bụrụ na gị na ya ekwurita ihe gbasara mmanya na-aba n’anya ugboro ugboro. Dabere n’afọ ole nwa gị dị, i nwere ike ịkụziri ya banyere ịṅụ mmanya na-aba n’anya mgbe ị na-akụziri ya ihe ndị ọzọ, dị ka, otú ọ ga-esi akpachara anya n’okporo ụzọ nakwa ihe banyere mmekọahụ.

 Bụrụ ezigbo ihe nlereanya. Ụmụaka na-amụta ihe a na-eme gburugburu ha otú ahụ fom si amịkọrọ mmiri e tinyere ya na ya. Nchọpụta ndị e mere na-egosi na ụmụaka na-emekarị ihe ndị mụrụ ha na-eme. Ọ pụtara na ọ bụrụ na ihe mbụ ị na-eme ma e nwee ihe na-echegbu gị bụ ịṅụ mmanya na-aba n’anya, nwa gị ga-ewere ya na mmanya na-aba n’anya bụ ihe e ji akwụsị nchegbu. N’ihi ya, bụrụ ezigbo ihe nlereanya. Jide n’aka na  na-aṅụ ya ka onye nwere uche.

Ụmụ gị ga-amụta ihe n’otú i si aṅụ mmanya