Gaa n'Isiokwu

Ịṅụ Sịga Ọ̀ Bụ Ihe Ọjọọ

Ịṅụ Sịga Ọ̀ Bụ Ihe Ọjọọ

Ihe Baịbụl zara

 E nweghị ihe Baịbụl kwuru banyere ịṅụ sịga * ma ọ bụ ihe ọ bụla ọzọ e ji sịga eme. Ma, Baịbụl kwuru ihe ndị na-egosi na Chineke akwadoghị ka anyị na-eme ihe otú ga-emerụ anyị ahụ́, o sikwa otú a gosi na ịṅụ sịga bụ ihe ọjọọ.

  •   Ka anyị jiri ndụ kpọrọ ihe. “Chineke . . . na-enye mmadụ niile ndụ na ume na ihe niile.” (Ọrụ Ndịozi 17:​24, 25) Ebe ọ bụ Chineke nyere anyị ndụ, anyị ekwesighị ime ihe ọ bụla ga-anapụ anyị ndụ a n’ike, dị ka ịṅụ sịga. Ịṅụ sịga bụ otu n’ime ihe ndị kacha akpata ndị mmadụ ịnwụchu ọnwụ n’ụwa niile.

  •   Ka anyị hụ ndị ọzọ n’anya. “Hụ onye agbata obi gị n’anya dị ka onwe gị.” (Matiu 22:39) Onye nọ n’ebe ndị ọzọ nọ na-aṅụ sịga anaghị egosi na ọ hụrụ ha n’anya. Ndị na-anọkarị n’ebe a na-aṅụ sịga nwere ike ịda ọrịa ịṅụ sịga na-akpata ngwa ngwa karịadị ndị ahụ na-aṅụ ya.

  •   Anyị kwesịrị ịdị nsọ. “Ka unu nyefee Chineke ahụ́ unu dị ka àjà dị ndụ, dị nsọ, nke dị Chineke mma.” (Ndị Rom 12:1) “Ka anyị sachapụ onwe anyị mmerụ niile nke anụ ahụ́ na nke mmụọ, wee mee ka ịdị nsọ anyị zuo okè n’egwu Chineke.” (2 Ndị Kọrịnt 7:1) Ịṅụ sịga bụ agwa ọjọọ, onye na-aṅụkwa ya adịghị nsọ, ya bụ, ọ dịghị ọcha n’ihi na ndị na-aṅụ sịga ma ụma na-eri nsí na-ala ahụ́ ha n’iyi.

Ò nwere ihe Baịbụl kwuru banyere ịṅụ igbó ma ọ bụ ọgwụ ike ndị ọzọ?

 Baịbụ ekwughị ihe ọ bụla banyere igbó (bụ́kwa nke a na-akpọ ahịhịa ike ma ọ bụ wiiwii), otú ahụ ọ na-akpọghịkwa ọgwụ ike ndị ọzọ n’aha. Ma, o nwere ihe ndị o kwuru gosiri na ịṅụ ọgwụ ike ndị dị otú ahụ, n’ụdị iji ya na-atụrụ ndụ, bụ ihe ọjọọ. E wepụ ihe ndị si na Baịbụl ndị anyị kwurula okwu ha n’isiokwu a, amaokwu ndị a na-esonụ na-ekwukwa otu ihe ahụ:

  •   Isi kwesịrị ịkpakọ anyị ọnụ mgbe niile. “Jiri . . . uche gị dum hụ Jehova bụ́ Chineke gị n’anya.” (Matiu 22:​37, 38) “Nweenụ uche ziri ezi.” (1 Pita 1:​13) Onye na-aṅụ ọgwụ ọjọọ agaghị asị na ihe niile ọ na-eme doro ya anya. Ụdị ọgwụ ndị ahụ nwedịrị ike iri ọtụtụ ndị na-aṅụ ha ahụ́. Kama ịna-eche ihe bara uru, ihe ha na-eche mgbe niile bụ otú ha si enweta ọgwụ ahụ ṅụọ​—Ndị Filipaị 4:8.

  •   Anyị kwesịrị ịna-erubere ndị ọchịchị isi. ‘Na-erubekwara ọchịchị na ikike dị iche iche isi.’ (Taịtọs 3:1) N’ọtụtụ mba, e nwere iwu a kapịrị ọnụ kwuru ọgwụ mmadụ nwere ike ịṅụ na ndị nke ọ na-agaghị aṅụ. Ọ bụrụ na anyị chọrọ ime ihe Chineke chọrọ, anyị kwesịrị ịna-erubere ndị ọchịchị isi​—Ndị Rom 13:1.

^ Ihe a na-ekwu okwu ya ebe a bụ mmadụ ịkpachara anya na-aṅụ anwụrụ ọkụ sịga, ọkpọkọ, ma ọ bụ ihe ndị yiri ya. Ma, ihe ndị ọzọ so n’ihe a na-ekwu ebe a bụ ịracha ụtaba, ịkpọ anwụrụ, ịṅụ sịga, ma ndị nke ọgbara ọhụrụ ya ndị ọzọ.