Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

 ISIOKWU ỤLỌ NCHE A | SETAN Ọ̀ DỊ ADỊ?

Setan Ọ̀ Bụ Ihe Ọjọọ Dị Ndị Mmadụ n’Obi?

Setan Ọ̀ Bụ Ihe Ọjọọ Dị Ndị Mmadụ n’Obi?

Ọtụtụ ndị na-ekwu na Setan a kpọrọ aha na Baịbụl bụ ihe ọjọọ dị ndị mmadụ n’obi. Ma ihe a ha na-ekwu ọ̀ bụ ihe Baịbụl kwuru? Ọ bụrụ na Setan bụ ihe ọjọọ dị mmadụ n’obi, gịnị mere Baịbụl ji kwuo na Setan na Jizọs Kraịst kwurịtara okwu, kwuokwa na Setan na Chineke Onye Pụrụ Ime Ihe Niile kwurịtara okwu? Ka anyị leba anya n’okwu Setan na Jizọs kwurịtara nakwa nke Setan na Chineke kwurịtara.

MGBE SETAN NA JIZỌS KWURỊTARA OKWU

Mgbe Jizọs bidoro ikwusa ozi ọma n’ụwa, Ekwensu nwara ya ọnwụnwa ugboro atọ. N’ọnwụnwa mbụ Setan nwara ya, Setan gbalịrị ime ka Jizọs jiri ike Chineke nyere ya mee ihe ọ na-ekwesịghị ime ka agụụ na-agụ ya kwụsị. Ọnwụnwa ọzọ Ekwensu nwara Jizọs bụ na ọ gwara ya na ọ sị na ọ bụ Ọkpara Chineke, ka o mee ihe ga-eme ka ndị mmadụ too ya n’agbanyeghị na ime ihe ahụ nwere ike ịkpatara Jizọs nsogbu. N’ọnwụnwa nke atọ, Setan gwara Jizọs na yanwa bụ́ Setan ga-enye ya alaeze niile nke ụwa ma ọ bụrụ na Jizọs adaa n’ala fee ya. Jizọs ekweghị ka Setan nwata ya, kama o ji ihe e dere n’Akwụkwọ Nsọ zaa Setan okwu ugboro atọ ahụ ọ nwara ya.—Matiu 4:1-11; Luk 4:1-13.

Ọ̀ bụ onye ka ya na Jizọs kwuru okwu? Ọ̀ bụ ihe ọjọọ dị Jizọs n’obi? Akwụkwọ Nsọ kwuru na ‘a nwalere Jizọs n’ụzọ niile dị ka anyị onwe anyị, ma o nweghị mmehie.’ (Ndị Hibru 4:15) Baịbụl kwukwara, sị: “Ọ dịghị mmehie o mere, a hụghịkwa aghụghọ n’ọnụ ya.” (1 Pita 2:22) Jizọs emeghị mmehie, kama ọ nọ na-eme ihe ọma mgbe niile. O nweghị mgbe Jizọs kwere ka ihe ọjọọ bata ya n’obi. O doro anya na ọ bụ onye dị adị ka Jizọs gwara okwu, ọ bụghị ihe ọjọọ dị ya n’obi.

Ụka ahụ Jizọs na Setan kpara gosiri anyị ihe ọzọ mere o ji bụrụ na Setan bụ onye dị adị.

  • Ì chetara na Ekwensu gwara Jizọs na ya ga-enye ya ọchịchị niile nke ụwa ma ọ bụrụ na ọ daa n’ala fee ya ofufe? (Matiu 4:8, 9) Ọ bụrụ na Setan adịghị adị, o nweghị otú ọ ga-esi ekwu na ya ga-enye Jizọs ọchịchị. Ihe ọzọ bụ na Jizọs agwaghị Setan na ọ bụghị ya nwe ọchịchị niile ahụ ọ sịrị bụ́ nke ya.

  • Mgbe Jizọs merichara ọnwụnwa ndị ahụ, Ekwensu “si n’ebe ọ nọ pụọ ruo oge ọzọ ga-adaba adaba.” (Luk 4:13) Ihe a Baịbụl kwuru ọ̀ na-egosi na Setan bụ ihe ọjọọ dị mmadụ n’obi ka ọ̀ na-egosi na ọ bụ onye iro sigburu onwe ya n’ọnwụ?

  • Baịbụl kwukwara na ‘ndị mmụọ ozi bịara malite ijere Jizọs ozi.’ (Matiu 4:11) Ndị mmụọ ozi ahụ bịara nyere Jizọs aka hà bụ ndị dị adị? O doro anya na ha bụ. Ya bụrụ otú ahụ, gịnị mere anyị ga-eji chewe na Setan adịghị adị?

 MGBE SETAN NA CHINEKE KWURỊTARA OKWU

Ọ bụ mgbe Baịbụl na-akọ akụkọ nwoke na-atụ egwu Chineke bụ́ Job ka a kọọrọ anyị otú Ekwensu na Chineke si kparịta ụka ugboro abụọ. N’oge abụọ ahụ ha kparịtara ụka, Chineke toro Job n’ihi na ọ na-agbalị ime ihe ọma mgbe niile. Setan kwuru na ọ bụ ihe ọma Chineke na-emere Job mere o ji na-efe Chineke. Ihe Ekwensu na-ekwu bụ na ya ma Job karịa otú Chineke ma ya. Jehova hapụrụ Setan ka o bibie ihe Job nwere, gbuo ụmụ ya ma kpatara ya ọrịa. * O mechara doo onye ọ bụla anya na ihe Jehova kwuru gbasara Job bụ eziokwu. Nke a gosiri na Setan bụ onye ụgha. Chineke gọziri Job maka na ọ kwụsịghị ife ya.—Job 1:6-12; 2:1-7.

Ọ̀ bụ ihe ọjọọ dị n’obi Jehova ka Jehova nọ na-agwa okwu mgbe ya na Setan na-ekwu okwu? Baịbụl kwuru, sị: “Ezi Chineke, ụzọ ya zuru okè.” (2 Samuel 22:31) Baịbụl kwukwara, sị: “Nsọ, nsọ, nsọ ka Jehova Chineke, Onye Pụrụ Ime Ihe Niile dị.” (Mkpughe 4:8) Ihe a Baịbụl kwuru, nke bụ́ na Jehova dị nsọ, pụtara na Jehova zuru okè, o nweghị mmerụ, o nweghịkwa mmehie ọ bụla.

Ọtụtụ nsogbu bịaara Job mgbe Setan na Chineke kparịtachara ụka

Ụfọdụ ndị nwere ike ikwu na o nwedịghị onye dịrị ndụ n’oge ochie a na-akpọ Job, kama na ihe a kọrọ gbasara ya bụ akụkọ ifo. Ma ọ̀ bụ eziokwu na e nweghị onye dịrị ndụ n’oge ochie a na-akpọ Job? E nwere ebe ndị ọzọ Baịbụl kwuru ihe gosiri na Job dịrị ndụ n’eziokwu. Dị ka ihe atụ, n’akwụkwọ Jems 5:7-11, a gwara Ndị Kraịst ka ha na-atachi obi ka Job n’oge ihe siiri ha ike n’ihi na Jehova ga-akwụ ha ụgwọ ọrụ otú ọ kwụrụ Job. Akụkọ Job ọ̀ ga-abara Ndị Kraịst uru ma a sị na o nweghị onye bụ́ Job, nke e ji enwe onye bụ́ Setan? N’akwụkwọ Ezikiel 14:14, 20, e dere aha Job, Noa, na Daniel. Ha atọ bụ ndị ezi omume. Ebe ọ bụ na Noa na Daniel dịrị ndụ n’oge ochie, ihe ọ pụtara bụ na Job bụkwa nwoke nwere okwukwe nke dịrị ndụ n’oge ochie. Ebe ọ bụ na e nwere onye dịrị ndụ bụ́ Job, ọ pụtakwara na onye ahụ kpataara ya nsogbu bụkwa onye dị adị.

N’eziokwu, Baịbụl gosiri na Setan bụ mmụọ dị adị. Ma, i nwere ike ịna-ajụ n’obi gị ma Setan ò nwere ike ịkpatara gị na ezinụlọ gị nsogbu n’oge a.

OLEEKWANỤ MAKA OGE ANYỊ A?

Weregodị ya na e nwere ndị omekome bịara biri n’obodo unu. O doro anya na egwu ga-adị n’obodo unu, ọtụtụ ndị ga-amalitekwa ịkpa àgwà ọjọọ. Ihe yiri nke a emeela n’ụwa anyị a. A chụdara Setan na ndị mmụọ ọjọọ ya, bụ́ ndị dị adị, n’ụwa anyị a n’ihi na ha na-enupụrụ Chineke isi. Gịnị ka nchụda a a chụdara ha n’ụwa na-akpatara ụmụ mmadụ? Chegodị echiche. Olee ihe ị na-anụ na-eme n’obodo unu ma ọ bụ n’ebe ndị ọzọ n’ụwa ma gee akụkọ ụwa na redio ma ọ bụ kirie televishọn ma ọ bụkwanụ gụọ akwụkwọ akụkọ?

  • Ị̀ na-ahụ na tigbuo zọgbuo na-aka njọ n’agbanyeghị mbọ ndị mmadụ na-agba n’ụwa niile ka ọ kwụsị?

  • Ị̀ na-ahụ na ime mgbaasị na nsí na àjà na-akarịzi akarị na fim ma ọ bụ na tiivi nakwa n’ihe omume ndị a na-egere egere na redio n’agbanyeghị na ọtụtụ ndị nne na nna na-eti mkpu na ihe ndị a na-emebi ụmụaka?

  • Ị̀ na-ahụ na a na-emebisị ụwa anyị a n’agbanyeghị mbọ ndị mmadụ na-agba ka a ghara imebisị ya?

  • Ọ̀ dị gị ka e nwere onye fooro ntutu taa na ọ ga-alarịrị ụwa a n’iyi?

Legodị onye Baịbụl kwuru na ọ bụ ya na-akpata nsogbu n’ụwa a: “E wee chụda dragọn ukwu ahụ, bụ́ agwọ mbụ ahụ, onye a na-akpọ Ekwensu na Setan, onye na-eduhie elu ụwa dum mmadụ bi; a chụdara ya n’ụwa, a chụdara ya na ndị mmụọ ozi ya. . . . Ahụhụ ga-adịrị ụwa na oké osimiri, n’ihi na Ekwensu agbadatawo n’ebe unu nọ, ọ na-ewe oké iwe, ebe ọ maara na o nwere oge dị mkpirikpi.” (Mkpughe 12:9, 12) Mgbe ọtụtụ ndị chebachaara ihe Baịbụl kwuru na ihe ndị na-eme eme echiche, ha kwetara na Setan bụ mmụọ ọjọọ, kwetakwa na ọ na-akpa ụwa anyị a aka ọjọọ.

Ma, i nwere ike ịna-eche ihe ị ga-eme ka Setan ghara inweta gị. Mmadụ iche ụdị ihe a adịghị njọ. Isiokwu na-eso nke a ga-agwa gị ihe ị ga-eme.

^ para. 12 Baịbụl kwuru na aha Chineke bụ Jehova.