Ezikiel 14:1-23

  • Ihe a ga-eme ndị na-ekpere arụsị (1-11)

  • E nweghị ihe ga-eme ka a ghara ibibi Jeruselem (12-23)

    • Noa, Daniel, na Job bụ ndị ezi omume (14, 20)

14  Ụfọdụ n’ime ndị okenye Izrel bịakwutere m ma nọrọ ọdụ n’ihu m.+  Jehova wee sị m:  “Nwa nke mmadụ, ndị a ekpebisiela ike ịna-efe arụsị ha dị iche iche na-asọ oyi.* Ha edowekwala ihe na-eme ka ndị mmadụ mehie. M̀ ga-ekwe ka ha jụta m ihe?+  Ugbu a, gwa ha okwu, sịkwa ha, ‘Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova sịrị: “Ọ bụrụ na onye Izrel ọ bụla ekpebisie ike ịna-efe arụsị ya na-asọ oyi, dowekwa ihe na-eme ka mmadụ mehie, ma bịa ka ọ jụta onye amụma ihe, mụnwa, bụ́ Jehova, ga-aza ya ihe e kwesịrị ịza onye arụsị ọ na-efe dị ọtụtụ.  M ga-eme ihe a ka obi wụnye ndị Izrel n’afọ, n’ihi na arụsị ha dị iche iche na-asọ oyi emeela ka ha niile hapụ m.”’+  “N’ihi ya, gwa ndị Izrel, sị, ‘Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova sịrị: “Lọghachikwutenụ m ma gbakụta arụsị unu dị iche iche na-asọ oyi azụ, kwụsịkwanụ arụ niile unu na-akpa.+  Ọ bụrụ na onye Izrel ọ bụla ma ọ bụ onye mbịarambịa n’Izrel ahapụ m ma kpebisie ike ịna-efe arụsị ya na-asọ oyi, dowekwa ihe na-eme ka mmadụ mehie, ma bịa ka ọ jụta onye amụma m ihe,+ mụnwa, bụ́ Jehova, ga-aza ya n’onwe m.  M ga-eche onye ahụ ihu ka m mee ya ihe. M ga-emekwa ya ihe m ga-eji dọọ ndị ọzọ aka ná ntị. A ga-ejikwa ya na-ama atụ. M ga-egbukwa ya ka ọ gharazie iso ná ndị m.+ Unu ga-amarakwa na m bụ Jehova.”’  “‘Ma ọ bụrụ na a ghọgbuo onye amụma, ya ekwuo ihe ọ bụla, ọ bụ mụnwa, bụ́ Jehova, ghọgburu onye amụma ahụ.+ M ga-ewelikwa aka m mee ya ihe ma laa ya n’iyi n’Izrel bụ́ obodo ndị m. 10  Ikpe mara onye amụma ga-amakwa onye jụrụ ya ase. Ha ga-eji isi ha buru ihe ha metara. 11  Ihe a ga-eme ka ndị Izrel kwụsị ịna-ahapụ m, kwụsịkwa ihe ọjọọ niile ha ji na-emerụ onwe ha. Ha ga-abụzi ndị m. Mụnwa ga-abụkwa Chineke ha.’+ Ọ bụ Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova kwuru ihe a.” 12  Jehova gwara m ọzọ, sị: 13  “Nwa nke mmadụ, ọ bụrụ na ndị obodo ọ bụla emebie iwu m ma si otú ahụ mehie m, m ga-eweli aka m mee ha ihe. M ga-eme ka ha ghara inwe ebe ha si enweta nri,*+ mee ka ụnwụ daa n’obodo ha,+ bibiekwa mmadụ na anụmanụ nọ na ya.”+ 14  “‘Ọ bụrụgodị na ụmụ nwoke atọ a, Noa,+ Daniel,+ na Job,+ nọ ebe ahụ, ha ga-azọpụta naanị onwe ha* n’ihi ezi omume ha.’+ Ọ bụ Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova kwuru ihe a.” 15  “‘Ọ bụrụkwa na mụ emee ka anụ ọhịa ọjọọ dị iche iche bata n’obodo ma tagbuo ndị bi na ya,* meekwa ka obodo ahụ tọgbọrọ nkịtị nke na e nweghịzi onye ga na-esi na ya agafe n’ihi anụ ọhịa ndị ahụ,+ 16  ebe ọ bụ na m na-adị ndụ, ụmụ nwoke atọ ahụ nọrọgodị ebe ahụ, ha agaghị azọpụtali ma ụmụ ha ndị nwoke ma ụmụ ha ndị nwaanyị. Ọ bụ naanị onwe ha ka ha ga-azọpụta. Obodo ahụ ga-atọgbọrọkwa nkịtị.’ Ọ bụ Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova kwuru ihe a.” 17  “‘Ọ bụrụ na mụ emee ka e jiri mma agha bata n’obodo,+ ọ bụrụkwa na mụ asị: “Ka e jiri mma agha gagharịa n’obodo ahụ,” gbuo ma mmadụ ma anụmanụ nọ na ya,+ 18  ebe ọ bụ na m na-adị ndụ, ụmụ nwoke atọ ahụ nọrọgodị ebe ahụ, ha agaghị azọpụtali ma ụmụ ha ndị nwoke ma ụmụ ha ndị nwaanyị. Ọ bụ naanị onwe ha ka ha ga-azọpụta.’ Ọ bụ Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova kwuru ihe a.” 19  “‘Ọ bụrụ na ọ bụ ọrịa na-efe efe ka m mere ka ọ rịawa ndị bi n’obodo ahụ,+ ọ bụrụkwa na mụ ejiri iwe gbuo ma mmadụ ma anụmanụ nọ na ya, 20  ebe ọ bụ na m na-adị ndụ, Noa,+ Daniel,+ na Job+ nọrọgodị ebe ahụ, ha agaghị azọpụtali ma ụmụ ha ndị nwoke ma ụmụ ha ndị nwaanyị. Ha ga-azọpụta naanị onwe ha* n’ihi ezi omume ha.’ Ọ bụ Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova kwuru ihe a.”+ 21  “Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova kwukwara, sị: ‘Ihe a niile ga-eme mgbe m ga-eji ụzọ ihe anọ taa ndị bi na Jeruselem ahụhụ.+ M ga-eji mma agha, ụnwụ, anụ ọhịa ọjọọ, na ọrịa na-efe efe+ gbuo ma mmadụ ma anụmanụ nọ na ya.+ 22  Ma, a ga-enwe ụfọdụ ndị a na-agaghị egbu. A ga-akpọpụtakwa+ ma ha ma ụmụ ha ndị nwoke ma ụmụ ha ndị nwaanyị. Ha ga-abịakwute unu. Ọ bụrụkwa na unu ahụ àgwà ha na omume ha, obi ga-esi unu ike na ọdachi m mere ka ọ dakwasị Jeruselem, ya bụ, ihe niile m mere ya, kwesịrị ekwesị.’” 23  “‘Mgbe unu hụrụ àgwà ha na omume ha, obi ga-esi unu ike, unu ga-amarakwa na e nwere ihe mere m ji mee ha ihe niile m mere ha.’+ Ọ bụ Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova kwuru ihe a.”

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Ọ ga-abụ na ihe a kpọrọ arụsị ndị ahụ n’asụsụ Hibru bụ nwanne okwu Hibru ọzọ nke pụtara “nsị.” E ji ya egosi na ihe na-asọ oyi.
Na Hibru, “M ga-agbajisị osisi e ji ekonye achịcha.” O nwere ike ịbụ osisi e ji ekowe achịcha ka ọ ghara imebi.
Ma ọ bụ “mkpụrụ obi ha.”
Ma ọ bụ “gbawa ndị obodo ahụ aka ụmụ.”
Ma ọ bụ “mkpụrụ obi ha.”