Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

 ISIOKWU ỤLỌ NCHE A | GỊNỊ MERE O JI ESIRI ỤFỌDỤ NDỊ IKE ỊHỤ CHINEKE N’ANYA?

Ihe Mere O Ji Esiri Ndị Mmadụ Ike Ịhụ Chineke n’Anya

Ihe Mere O Ji Esiri Ndị Mmadụ Ike Ịhụ Chineke n’Anya

“‘Jiri obi gị dum na mkpụrụ obi gị dum na uche gị dum hụ Jehova bụ́ Chineke gị n’anya.’ Ọ bụ ya bụ iwu kasị ukwuu, bụrụkwa nke mbụ.”Jizọs Kraịst kwuru ihe a n’afọ 33 Oge Ndị Kraịst. *

Ọ na-esiri ụfọdụ ndị ike ịhụ Chineke n’anya. Ihe kpatara ya bụ na ha chere na obi tara Chineke mmiri ma ọ bụ na ha agaghị amatali onye ọ bụ. Lee ihe ụfọdụ ndị kwuru banyere Chineke:

  • “M na-ekpegara Chineke ekpere ka o nyere m aka, ma m na-echekwa na ọ gaghị anụ ekpere m n’ihi na ọ na-adị m ka ọ̀ nọ n’ebe dị ezigbo anya. M chere na ihe anaghị emetụ Chineke n’obi.”—Marco, Ịtali.

  • “Ọ bụ eziokwu na m ji obi m niile chọọ ife Chineke, ma ọ dị m ka o nweghị ihe ga-ejikọtali mụ na ya. M chere na ọ bụ Chineke obi ọjọọ nke ọrụ ya bụ naanị ịta ndị mmadụ ahụhụ. Ekwetaghị m na ọ na-eme ebere.”—Rosa, Gụatemala.

  • “Mgbe m bụ nwata, echere m na ihe Chineke na-achọ bụ ka ọ hụ ihe ọjọọ anyị mere ka ọ taa anyị ahụhụ. M mechara chewe na ya na ụmụ mmadụ enweghị ike ịdị ná mma nakwa na ọ dị ka onyeisi ala nke na-achọghị ịma gbasara ndị ọ na-achị.”—Raymonde, Kanada.

Olee ihe gịnwa chere? Ọ̀ bụ eziokwu na Chineke abụghị onye anyị ga-ahụli n’anya? Ndị Kraịst ajụọla ajụjụ a kemgbe ọtụtụ narị afọ. N’oge ụwa na-emepechabeghị anya, ọtụtụ ndị bi ná mba ndị sịrị na ha bụ Ndị Kraịst ekwedịghị ekpegara Chineke Onye Pụrụ Ime Ihe Niile ekpere. Gịnị kpatara ya? Ọ bụ n’ihi na ndị mmadụ na-atụ Chineke ụjọ. Otu ọkọ akụkọ ihe mere eme aha ya bụ Will Durant sịrị: “Onye chere na ya bụ onye mmehie ọ̀ ga-anwa anwa kpegara onye a ndị mmadụ na-atụ ụjọ ekpere, bụ́ onye na-achọdịghị ịma gbasara anyị?”

Gịnị mere ndị mmadụ ji ‘tụwa Chineke ụjọ’ ma were ya ka onye “na-achọdịghị ịma gbasara anyị”? Gịnị ka Baịbụl na-akụzi gbasara Chineke? Ọ bụrụ na ị mata nke bụ́ eziokwu gbasara Chineke, ò nwere ike ime ka ị hụ Chineke n’anya?