Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Ùnu Chere na Ọ Bụ Naanị Unu Na-ekpere Chineke Otú Ọ Chọrọ?

Ùnu Chere na Ọ Bụ Naanị Unu Na-ekpere Chineke Otú Ọ Chọrọ?

Ndị ji obi ha niile na-ekpere Chineke ga na-eche na ebe ha na-aga ekpere Chineke dị Chineke na Jizọs mma. Ma ọ́ bụghị ya, ha ga-akwụsị ịga ebe ahụ.

Jizọs Kraịst asịghị na a ga-azọpụta onye nọ ebe ọ bụla masịrị ya ma ọ bụ onye si ụzọ ọ bụla masịrị ya na-efe Chineke. Kama, ọ sịrị na “ọnụ ụzọ ámá nke na-eduba ná ndụ dị warara, okporo ụzọ ya dịkwa mkpagide, ndị na-achọta ya dịkwa ole na ole.” (Matiu 7:14) Obi siri Ndịàmà Jehova ike na ha achọtala ụzọ ahụ, ọ bụ ya mere ha ji nọsie ike ebe ha nọ.

GỤKWUO GBASARA YA

Gịnị Ga-eme Okpukpe Ndị E Nwere n’Ụwa A?

È nwere mgbe mmadụ niile ga na-efe Chineke?

Okpukpe Niile Hà Dị Mma?

Okpukpe niile hà bụcha ezigbo ya? Lee ihe Jizọs kwuru.