Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndụ A Anyị Dị Ò Nwere Isi?

Ndụ A Anyị Dị Ò Nwere Isi?

Ndụ A Anyị Dị Ò Nwere Isi?

“NDỤ A anyị dị ò nwere isi?” Ọtụtụ ndị ajụọla ajụjụ a. Ọ dị mwute ikwu na otú ọ sọkwara ọtụtụ ndị há si lee ndụ anya, ndụ ha na-adị ha ka “ihe na-enweghị isi na ihe efu,” dị ka otu prọfesọ bụ́ onye Ọstria, nke aha ya bụ Viktor E. Frankl, si kwuo ya.

Gịnị mere o ji adị ọtụtụ ndị otú ahụ? Otu ihe kpatara ya bụ na ọtụtụ nde mmadụ ndị bi n’ebe dị iche iche n’ụwa bụ ogbenye ọnụ ntụ, ọnọdụ ha jọgbukwara onwe ya. Ha na-anọkarị n’agụụ, na-arịakarị ọrịa, a na-emesikarịkwa ha ike ma na-emegbu ha. Mgbe Job oge ochie na-ekwu banyere ahụhụ ụmụ mmadụ na-ata, ọ sịrị na ndụ ha ‘jupụtara ná nsogbu.’ (Job 14:1) Ndụ ha bụ ihe chi fotere, ha ewere.

E nwekwara ọtụtụ nde mmadụ ndị bara ọgaranya. O yiri ka hà nwere ihe niile ga-eme ka ha nwee obi ụtọ ná ndụ. Ma, ọtụtụ n’ime ha enweghị obi ụtọ. Ọ̀ bụ maka gịnị? Ọ bụ maka na ọtụtụ mgbe, “nsogbu na ihe ọjọọ” na-abịara ha. Dị ka ihe atụ, onye bụ́bu ọgaranya nwere ike ịda ogbenye na mberede, nwa ya nwere ike ịnwụ, ma ọ bụkwanụ nsogbu ọzọ abịara ya. Ihe ndị a nwere ike ime ka ike ụwa gwụ ya.—Abụ Ọma 90:10.

O nwere ihe ọzọ mere o ji adị ọtụtụ ndị ka ndụ a anyị dị “enweghị isi.” Gịnị ka ọ bụ? Ụmụ mmadụ anaghị adịte ndụ aka. Ọtụtụ ndị anaghị aghọta ihe mere ụmụ mmadụ, bụ́ ndị nwere ike ime ọtụtụ ihe dị egwu, anaghị adịte ndụ aka. Ọ na-esiri ha ike ịghọta ihe mere ụmụ mmadụ ji anwụ anwụ. Ọ bụrụgodị na ọdachi adakwasịghị mmadụ ná ndụ, mee elu mee ala, ọnwụ ga-abịa gburu ya.—Ekliziastis 3:19, 20.

Ò Nwere Mgbe Ndụ Na-agakwaghị Eyi Ihe Na-enweghị Isi?

Ihe Sọlọmọn, onye chịrị Izrel oge ochie, kwuru banyere ndụ ụmụ mmadụ bụ nnọọ eziokwu. Ọ hụrụ otú ndị mmadụ n’oge ya si gbasie mbọ ike ná ndụ ha ma rụọ ọrụ ugbo, rụọ ihe dị iche iche ma lekọta ezinụlọ ha, dị nnọọ ka anyị na-eme taa. Mgbe ọ hụchara ihe niile a, o yiri ka ọ jụrụ onwe ya, sị, ‘Oleekwanụ isi ihe niile a?’ O kwuziri na mbọ niile ụmụ mmadụ na-agba bụ “ihe efu, bụrụkwa ịchụso ifufe.”—Ekliziastis 2:17.

Ihe a Eze Sọlọmọn kwuru ọ̀ pụtara na o kweere na ihe niile mmadụ na-eme ná ndụ ga-abụ “ihe efu, bụrụkwa ịchụso ifufe” mgbe niile? Mba. Naanị ihe Sọlọmọn mere bụ ikwu ihe na-eme eme n’ụwa anyị a na-ezughị okè. Ma, Okwu Chineke e dere n’ike mmụọ nsọ kwuru ihe ndị ga-eme ka obi sie gị ike na o nwere mgbe ihe na-agaghị adịkwa otú ọ dị taa!

Gịnị bụ ihe ndị ahụ ga-eme ka obi sie gị ike na o nwere mgbe ihe na-agaghị adịkwa otú ọ dị taa? Biko, gụọ isiokwu abụọ na-esonụ. Ha nwere ike inyere gị aka ịghọta ihe mere o ji yie ka ndụ anyị na-adị enweghị isi, na otú a ga-esi mee ka ndụ kwụsị ịdị ka ihe na-enweghị isi. Ha ga-agwakwa gị ihe i nwere ike ime ka ndụ gị nwee isi ugbu a.