Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ị̀ Maara?

Ị̀ Maara?

Ị̀ Maara?

Olee ihe a na-eme n’iwu ịtụtụkọta ihe e wefọrọ ewefọ n’ubi, oleekwa ndị ritere uru na ya?

Iwu Mozis machibidoro ndị ọrụ ugbo iwu iwere ihe niile mere n’ubi ha mgbe ha na-ewe ihe ubi. Kama nke ahụ, ndị na-aghọrọ ọka agaghị aghọrọcha ọka ndị dị n’ọnụ ọnụ ubi ha. Ndị na-achịkọta mkpụrụ vaịn agaghị atụtụkọta ndị dasasịrị adasasị n’ubi ma ọ bụ gaghachi ịghọrọ ndị na-akabeghị aka n’oge mbụ ha gara ịghọ ya. Ndị na-akụtusị mkpụrụ dị n’osisi oliv ga-ahapụ ndị nke na-adaghị. (Levitikọs 19:9, 10; Diuterọnọmi 24:19-21) Ndị ogbenye, ụmụ na-enweghị nne na nna, ụmụ nwaanyị di ha nwụrụ, na ndị mbịarambịa nweziri ike ịga tụtụkọta ihe ndị ahụ e wefọrọ n’ubi.

Iwu a e nyere banyere ịtụtụkọta ihe e wefọrọ n’ubi baara ndị Izrel niile uru. Ọ na-agba ndị nwe ubi ume imesapụ aka, ịghara ịchọ ọdịmma onwe ha naanị na ịdabere ná ngọzi Chineke. Ọ na-eme ka ndị na-atụtụkọta ihe e wefọrọ n’ubi na-adị uchu n’ọrụ, n’ihi na ịtụtụkọta ihe e wefọrọ n’ubi abụghị obere ọrụ. (Rut 2:2-17) Ịtụtụkọta ihe e wefọrọ n’ubi mere ka ndị ogbenye ghara ibu ọnụ ma ọ bụ ghọọrọ ndị obodo ibu arọ. O mekwara ka ha ghara ire ùgwù ha site n’ịrịọ arịrịọ ma ọ bụ ịdabere n’ihe ndị ọzọ na-enyetụ ha.

Olee ihe mere Sọlọmọn ji si na Lebanọn, bụ́ ebe dị ezigbo anya, tụbata osisi ndị e ji wuo ụlọ nsọ dị na Jeruselem?

Ndị Eze nke Mbụ 5:1-10 kọrọ banyere nkwekọrịta Sọlọmọn na Haịram, eze Taya, nwere. Ha kwekọrịtara na a ga-esi n’oké osimiri site na Lebanọn bubata osisi sida na junipa n’Izrel ma jiri ha rụọ ụlọ nsọ ahụ.

Sida bụ oké ngwá ahịa n’ala Izrel na mba ndị gbara ya gburugburu n’oge ochie. N’Ijipt na Mesopotemia oge ochie, a na-eji osisi a eme ogidi ụlọ, jirikwa ya machie ahụ́ ụlọ arụsị na obí eze. Ihe ndị e dere banyere ndị eze n’oge ochie, ihe ndị edemede dere, na ihe ndị a tụrụ atụ na-egosi na a nọgidere na-atụbata osisi sida n’obodo dị iche iche dị n’ebe ndịda Mesopotemia. Mgbe ụfọdụ, ha na-abụ ihe a kwatara n’agha ma ọ bụ ụtụ a tụụrụ mba ọzọ. N’Ijipt, e ji ya rụọ ụgbọ ndị eze, igbe ozu, na ihe ndị ọzọ e ji eli ozu.

A ma sida Lebanọn ama karịchaa dị ka osisi na-anọ ọdụ, nke mara mma, na-esikwa ísì ọma. Ihe ọzọ e ji mara ya bụ na akịka anaghị ara ya. N’ihi ya, Sọlọmọn ji osisi kacha mma rụọ ụlọ nsọ ahụ. Taa, ọ bụ naanị obere osisi sida ole na ole fọrọ n’ugwu Lebanọn ahụ osisi sida juburu.

[Foto dị na peeji nke 15]

Otú e si ebu sida Lebanọn, ihe ndị Asiria tụrụ nke dị n’obí Sagọn

[Ebe E Si Nweta Foto]

Erich Lessing/Art Resource, NY