Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Olee Ebe Chineke Nọ?

Olee Ebe Chineke Nọ?

Olee Ebe Chineke Nọ?

Septemba 11, 2001: Mgbe ọ fọrọ nkeji iri na anọ ka ọ kụọ elekere itoolu nke ụtụtụ, otu ụgbọelu bu ndị njem kpọbara n’otu n’ime ụlọ elu ndị dị n’Ebe Azụmahịa Ụwa n’Obodo Niu Yọk—bụ́ mmalite nke mwakpo ndị na-eyi ọha egwu wakporo ebe dị iche iche. N’ime ihe karịtụrụ otu awa na ọkara, ihe dị ka puku mmadụ atọ nwụrụ.

Disemba 26, 2004

Nnukwu ala ọma jijiji nke mere n’Oké Osimiri India mere ka oké idei mmiri kpaa mba iri na otu aka ọjọọ, tinyere mba ụfọdụ dị n’Afrịka, bụ́ ebe dị puku kilomita ise site n’oké osimiri ahụ. N’otu ụbọchị, otu narị puku mmadụ na puku iri ise nwụrụ ma ọ bụ fuo, ihe karịkwara otu nde mmadụ ghọrọ ndị na-enwekwaghị ụlọ.

Ọgọst 1, 2009: Otu nwoke dị afọ iri anọ na abụọ na nwa ya nwoke dị afọ ise nọ n’ụgbọ epeepe ụgbọ mmiri na-adọkpụ mgbe ụgbọ ha kpọkasịrị n’osisi e ji rụọ ebe ụgbọ mmiri na-akwụsị. Nwoke ahụ nwụrụ. Nwa ahụ nọ ndụ ruo echi ya ma nwụọ. Otu onye ikwu ha ọnwụ ha wutere kwuru, sị: “Anyị nọ na-atụ anya na Chineke ga-arụrụ anyị ọrụ ebube, ya enwetaghachi onwe ya.”

Mgbe ị gụrụ banyere arụ ndị na-eyi ọha egwu kpara ma ọ bụ ọdachi ndị na-emere onwe ha ma ọ bụ mgbe ọdachi dakwasịrị gị, ị̀ na-ajụ ma Chineke ọ̀ na-ahụkwa ihe na-emenụ? Ị̀ na-ajụ ma ọ̀ hapụla anyị? Anyị ga-ahụ na Baịbụl zara ajụjụ ndị ahụ otú ga-akasi anyị obi.

[Ebe e si Nweta Foto dị na peeji nke 3]

© Dieter Telemans/Panos Pictures

PRAKASH SINGH/AFP/Getty Images

© Dieter Telemans/Panos Pictures