Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndị Amamihe Atọ Hà Letara Nwa Ọhụrụ Bụ́ Jizọs n’Ezie?

Ndị Amamihe Atọ Hà Letara Nwa Ọhụrụ Bụ́ Jizọs n’Ezie?

Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

Ndị Amamihe Atọ Hà Letara Nwa Ọhụrụ Bụ́ Jizọs n’Ezie?

N’akụkọ ọmụmụ Jizọs a na-akọ n’oge Krismas n’ebe niile n’ụwa, a na-egosi ebe ndị eze atọ, ma ọ bụ ndị amamihe atọ, bu onyinye ndị dị oké ọnụ ahịa ha wetaara nwa ọhụrụ, bụ́ Jizọs. Akụkọ a ọ̀ bụ eziokwu? Ò kwekọrọ n’ihe ndị mere eme? Ka anyị hụ.

Oziọma Matiu na Luk kwuru ihe ndị mere mgbe a mụrụ Jizọs. Ihe ndekọ ndị a gosiri na ọ bụ naanị ndị ọzụzụ atụrụ ọ na-enweghị ka ọ hà ha, bụ́ ndị nọ n’ọhịa dị nso, letara Jizọs mgbe a mụrụ ya. Ndị a a sị na ha bụ ndị eze, ma ọ bụ ndị amamihe, bụ n’ezie ndị na-agụ kpakpando, ọ bụghị ndị eze, e kwughịkwa ole ha dị. Ndị ahụ na-agụ kpakpando bịara mgbe Jizọs bụ nwatakịrị, birikwa n’ụlọ, ọ bụghị mgbe ọ bụ nwa ọhụrụ nọ n’ihe e ji etinyere anụ ụlọ nri. Ọbịbịa ha tinyedịrị ndụ Jizọs n’ihe ize ndụ!

Leruo ihe onye so dee Baịbụl bụ́ Luk dere banyere ọmụmụ Jizọs anya, ị ga-ahụ na ọ sịrị: “E nwere ndị ọzụzụ atụrụ ndị bi n’ọhịa. Ha na-eche ìgwè atụrụ ha nche n’abalị. Na mberede, mmụọ ozi Jehova guzoro ha n’akụkụ, . . . [sị] ha: ‘. . . Unu ga-ahụ nwa ọhụrụ e ji ákwà fụọ, nke dina n’ihe e ji etinyere anụ ụlọ nri.’ . . . Ha gara ngwa ngwa hụ Meri na Josef nakwa nwa ọhụrụ ahụ nke dina n’ihe e ji etinyere anụ ụlọ nri.”—Luk 2:8-16.

Ọ bụ naanị Josef, Meri, na ndị ọzụzụ atụrụ na nwa ọhụrụ ahụ, bụ́ Jizọs, nọ. Ọ dịghị onye ọzọ Luk dere na ọ nọ ebe ahụ.

Tụlezie ihe ndekọ ahụ na Matiu 2:1-11 na Bible Nsọ nke Union Version, * nke na-agụ, sị: “Ma mgbe a mụrụ Jizọs na Betlehem nke Judia n’ụbọchị Herọd, bụ́ eze, lee, ụfọdụ ndị maara ihe, ndị sitere n’Ọwụwa anyanwụ, bịaruru Jeruselem, . . . Ha wee baa n’ime ụlọ, hụ Nwatakịrị ahụ, Ya na Meri nne Ya.”

Ị̀ hụrụ na ihe ndekọ ahụ kwuru naanị “ndị maara ihe,” ọ bụghị “ndị atọ maara ihe,” nakwa na ebe mbụ ha si n’ebe ọwụwa anyanwụ gaa bụ Jeruselem, ọ bụghị Betlehem, bụ́ obodo a mụrụ Jizọs? Mgbe ha mechara ruo Betlehem, Jizọs bụzi “Nwatakịrị,” ọ bụghị nwa ọhụrụ, ọ nọkwa n’ime ụlọ, ọ bụghị n’ụlọ anụ.

Ihe ọzọ bụ na ọ bụ ezie na Bible Nsọ nke Union Version kpọrọ ndị ahụ bịara leta Jizọs “ndị maara ihe,” nsụgharị ndị ọzọ kpọrọ ha ndị “Magi” ma ọ bụ “ndị na-agụ kpakpando.” Akwụkwọ bụ́ A Handbook on the Gospel of Matthew sịrị na okwu bụ́ “ndị maara ihe” bụ nsụgharị nke “okwu Grik pụtara ndị nchụàjà Peshia bụ́ ndị bụ́ aka ochie n’ịgụ kpakpando.” Akwụkwọ bụ́ The Expanded Vine’s Expository Dictionary of New Testament Words kọwakwara okwu ahụ dị ka “dibịa afa, onye na-ekwu na ya nwere ikike ime anwansi, onye amoosu.”

Ọ bụ ezie na ịgụ kpakpando na amoosu ka na-ewu ewu n’oge a, Baịbụl na-adọ anyị aka ná ntị ka anyị ghara itinye aka na ha. (Aịzaya 47:13-15) Ha bụcha ikpere arụsị, bụrụkwa omume ndị Jehova Chineke kpọrọ asị. (Diuterọnọmi 18:10-12) Ọ bụ ya mere na ọ dịghị mmụọ ozi Chineke kpọsaara ndị na-agụ kpakpando ọmụmụ Jizọs. Ma, Chineke dọrọ ha aka ná ntị ná nrọ ka ha ghara ịlaghachikwuru ajọ Eze Herọd, ebe ọ bụ na ọ na-achọ igbu Jizọs. Ya mere, “ha si ụzọ ọzọ laghachi n’ala ha.”—Matiu 2:11-16.

Ezi Ndị Kraịst hà ga-achọ iso na-akọ akụkọ ụgha na-ewu ewu banyere ọmụmụ Jizọs? O doro anya na ha agaghị achọ.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 7 A sụpere okwu niile si ná nsụgharị Baịbụl a otú e si asụpe okwu n’oge a.