Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ị̀ Maara?

Ị̀ Maara?

Ị̀ Maara?

Olee ụdị ọrụ Jizọs rụrụ n’oge ọ bụ ọkwá nkà?

Onye Jizọs ji mere nna bụ ọkwá nkà. Jizọs mụkwara otu aka ọrụ ahụ. Mgbe ọ malitere ozi o jere n’ụwa n’oge ọ dị “ihe dị ka afọ iri atọ,” ọ bụghị naanị “nwa ọkwá nkà,” kama, ọ ghọọla ọkwá nkà zuru ka e mee.—Luk 3:23; Matiu 13:55; Mak 6:3.

N’obodo a mụrụ Jizọs, ọ ga-abụrịrị na ihe dị iche iche e ji akọ ugbo dị ndị mmadụ mkpa, dị ka ọ́gụ̀ na yok. Osisi bụ isi ihe e ji arụ ha. Ihe ọzọ ndị ọkwá nkà na-arụpụtakarị bụ tebụl, ụdị oche dị iche iche, igbe e ji echekwa ihe, ibo ụzọ, windo, ihe e ji akpọchi ụzọ bụ́ ndị e ji osisi rụọ, nakwa osisi e ji akụ elu ụlọ. N’eziokwu, iwu ụlọ so n’ọrụ ndị ọkwá nkà na-arụ.

Jọn Onye Na-eme Baptizim kwuru banyere anyụike n’otu ihe atụ o mere. Ọ ga-abụ anyụike ka Jizọs na ndị ọkwá nkà ndị ọzọ ji egbutu osisi. Ha gbutuchaa osisi, ha na-anọ n’ebe ha gbuturu ya waa ya ma ọ bụkwanụ ha ebulata ya n’ụlọ ọrụ ha. O doro anya na ọrụ a chọrọ ikike ọkpụkpụ aka. (Matiu 3:10) Aịzaya kwuru banyere ngwá ọrụ ndị ọkwá nkà ji arụ ọrụ n’oge ndụ ya, sị: “Onye na-eji osisi atụ́ ihe esetịwo eriri e ji atụ̀ ihe. Ọ na-eji nzụ uhie ese otú ọ ga-adị. Ọ na-eji ihe e ji akpụcha osisi arụ ya. Ọ na-eji mkpịsị ígwè ese otú ọ ga-adị.” (Aịzaya 44:13) Ndị na-amụ banyere ihe ndị mgbe ochie achọpụtala ihe ndị na-egosi na e ji mma ígwè e ji akwọ osisi, hama e ji nkume rụọ, nakwa ntu ndị e ji ọla nchara mee, rụọ ọrụ n’oge ochie. (Ọpụpụ 21:6; Aịzaya 10:15; Jeremaya 10:4) Amamihe dị n’ikwere na Jizọs ji ụdị ngwá ọrụ ndị ahụ rụọ ọrụ.

Olee ndị bụ “ndị na-echekwa ego” Jizọs kwuru okwu ha n’ilu ọ tụrụ, oleekwa otú ha si echekwa ego?

Jizọs kọrọ banyere otu nna ukwu nke baara ohu ya dị umengwụ mba, sị: “Ị gaara etinye ego ọlaọcha m n’aka ndị na-echekwa ego, mgbe m lọtara, m gaara anata ihe m, ya na ọmụrụ nwa ya.”—Matiu 25:27.

Nnukwu ụlọ akụ̀ ndị e nwere n’oge a adịghị n’oge Jizọs nọ n’ụwa. Ma, n’oge dị anya tupu Jizọs abịa n’ụwa, ụlọ akụ̀ na-akwụ ndị na-akwụnye ego n’aka ha ọmụrụ nwa, na-anatakwa ndị ha na-agbazinye ego ọmụrụ nwa ka ukwuu. Dị ka akwụkwọ bụ́ The Anchor Bible Dictionary si kwuo, ịgbazite ego kwụọ ọmụrụ nwa bụ ihe a ma ama ndị mmadụ na-eme na Gris n’ihe dị ka puku afọ abụọ na narị afọ atọ gara aga. N’oge ndị Rom mere ka e nwee udo n’ụwa, ọmụrụ nwa ndị mmadụ na-akwụ kwa afọ n’ebe niile Rom na-achị anaghị eru otu ụzọ n’ime ụzọ iri nke ego ha gbazitere.

Iwu Mozis gwara ụmụ Izrel ka ha ghara ịnara ụmụ Izrel ndị nọ ná mkpa ọmụrụ nwa mgbe ha gbazinyere ha ego. (Ọpụpụ 22:25) O yiri ka è nyere iwu a naanị maka ịgbazinye ndị ogbenye ego. Otú ọ dị, dị ka ilu ahụ Jizọs tụrụ gosiri, ndị mmadụ na-enweta ọmụrụ nwa ma ha tinye ego n’ụlọ akụ̀ ma ọ bụ n’aka “ndị na-echekwa ego.” Ya mere, ihe Jizọs kwuru bụ ihe ndị gere ya ntị ma nke ọma.