Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Jehova Na-agọzi Ndị Ji Obi Ha Niile Na-ejere Ya Ozi

Jehova Na-agọzi Ndị Ji Obi Ha Niile Na-ejere Ya Ozi

CHINEKE kere ụmụ mmadụ ka ha nwee ike iji aka ha kpebie ihe ha ga-eme. Ọ na-agọzikwa ndị ji obi ha niile na-akwado ofufe ya, ndị so na-eme ka e doo aha ya nsọ, na-akwadokwa nzube ya dị ebube. Jehova achọghị ka isi anyị na-erubere ya bụrụ n’ihi na anyị achọghị ka a taa anyị ahụhụ ma ọ bụ n’ihi na a manyere anyị amanye. Kama, ọ chọrọ ka anyị jiri obi anyị niile na-erubere ya isi n’ihi na anyị hụrụ ya n’anya n’eziokwu, nweekwa obi ụtọ maka ihe ndị ọ na-emere anyị.

Dị ka ihe atụ, mgbe ụmụ Izrel nọ n’ala ịkpa Saịnaị, Jehova gwara ha ka ha rụọ ebe ha ga-anọ na-efe ya ofufe. O kwuru, sị: “Sinụ n’etiti unu nata onyinye a ga-enye Jehova. Ka onye ọ bụla obi ya kpaliri weta onyinye Jehova.” (Ọpụ. 35:5) Onye Izrel ọ bụla ga-enye ihe otú ike ya hà. A ga-eji ihe onye ọ bụla nyere rụọ ọrụ Jehova, n’agbanyeghị ihe onye ahụ nyere ma ọ bụ otú ọ hà. Gịnị ka ụmụ Izrel mere?

Baịbụl kwuru, sị: “Onye ọ bụla obi ya kwaliri na onye ọ bụla mmụọ ya kpaliri” nyere onyinye. Ma ụmụ nwoke ma ụmụ nwaanyị ji obi ha niile nye onyinye a ga-eji rụọ ọrụ Jehova, ya bụ, ọla a na-etinye n’uwe, ọla ntị, mgbaaka, ọlaedo, ọlaọcha, ọla kọpa, eri na-acha anụnụ anụnụ, ajị atụrụ e sijiri odo odo, eri na-acha uhie uhie, ezigbo eri linin, ajị ewu, akpụkpọ ebule e sijiri ọbara ọbara, akpụkpọ anụ sil, osisi akeshịa, nkume ndị dị oké ọnụ ahịa, mmanụ bọlsọm, mmanụ ọkụ, na mmanụ e ji ete mmadụ mmanụ. “Ihe e wetara wee zuo maka ọrụ niile a gaje ịrụ, o zuru ọbụna gafee.”Ọpụ. 35:21-24, 27-29; 36:7.

Ihe kacha tọọ Jehova ụtọ abụghị ihe ndị Izrel nyere ya, kama ọ bụ otú ha si jiri obi ha niile nye ya ihe ndị ahụ, si otú ahụ gosi na ha na-akwado ezi ofufe. Ha jikwa oge ha na ike ha rụọ ọrụ Chineke. Baịbụl kwuru, sị: “Ndị inyom niile ndị maara ihe ji aka ha kpaa ihe.” N’eziokwu, “ndị inyom niile nwere nkà bụ́ ndị obi ha kpaliri ji ajị ewu kpaa ihe ọkpụkpa.” Jehova nyekwara Bezalel “amamihe na nghọta na ihe ọmụma na nkà ịrụ ụdị ọrụ ọ bụla.” Chineke mere ka Bezalel na Oholiab nwee nkà ha ga-eji rụọ ọrụ niile o kwuru ka a rụọ.Ọpụ. 35:25, 26, 30-35.

Mgbe Jehova gwara ụmụ Izrel ka ha nye onyinye, obi siri ya ezigbo ike na “onye ọ bụla obi ya kwaliri” ga-akwado ezi ofufe. Ọ gọzikwara ndị niile ji obi ha niile nye ya ihe. O duziri ha, meekwa ka ha nwee obi ụtọ na-enweghị atụ. Jehova si otú ahụ gosi na ọ bụrụ na ya agọzie ndị ohu ya ji obi ha niile na-ejere ya ozi, ọ ga-eme ka ha nwee nkà na ihe ndị ọzọ ha ga-eji mee uche ya. (Ọma 34:9) Ka i ji obi gị niile na-ejere Jehova ozi, o doro anya na ọ ga-agọzi gị.