ỤLỌ NCHE—NKE A NA-AMỤ AMỤ Ọgọst 2014

Ihe dị n’Ụlọ Nche a bụ isiokwu ndị a ga-amụ malite na Septemba 29 ruo Ọktoba 26, 2014.

Ị̀ Na-enweta ‘Nri n’Oge Kwesịrị Ekwesị’?

Ihe ga-eme ka okwukwe mmadụ sie ike ọ̀ bụ inweta ihe niile ohu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi na-ewepụta?

Olee Ọrụ Ụmụ Nwaanyị Na-arụ Iji Hụ na Nzube Jehova Mezuru?

Mata nsogbu isi Adam na Iv nupụrụ kpataara ụmụ mmadụ. Gụọ gbasara ụfọdụ ụmụ nwaanyị fere Chineke n’oge ochie na otú ụmụ nwaanyị si arụ ọrụ Chineke taa.

Okwu Chineke Dị Ndụ, Jiri Ya Na-akụzi Ihe

Onyeàmà Jehova ọ bụla kwesịrị ịna-akụzi ihe nke ọma n’ozi ọma. Mata ihe ụfọdụ e kwuru i nwere ike ime ka i nwee ike iji Baịbụl na traktị na-ezi ndị mmadụ ozi ọma.

Otú Jehova Si Abịaru Anyị Nso

Anyị na Jehova kwesịrị ịdị n’ezigbo mma. Chọpụta otú Baịbụl na àjà Jizọs chụrụ si egosi na Jehova chọrọ ka anyị bịaruo ya nso.

Na-anụ Olu Jehova n’Ebe Ọ Bụla Ị Nọ

Mụta ihe mere o ji dị mkpa ka anyị gee Jehova ntị, anyị na ya ana-ekwurịta okwu. Isiokwu a ga-eme ka anyị mata ihe anyị ga-eme ka Setan na ezughị okè ghara igbochi anyị ige Jehova ntị.

‘Laghachi ma Mee Ka Ụmụnna Gị Dị Ike’

Ọ bụrụ na nwanna abụghịzi okenye, ọ̀ ka nwere ike ‘ịgbalị ka o ruo eru ịbụ onye nlekọta’ ọzọ?

Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

Mgbe Jizọs kwuru na ndị a ga-akpọlite n’ọnwụ “adịghị alụ nwunye, a dịghịkwa eke ha di,” ọ̀ na-ekwu gbasara ndị a ga-akpọlite n’ọnwụ ka ha biri n’ụwa?

IHE SI N’EBE ANYỊ NA-EDEBE IHE OCHIE

Fim “Eureka Drama” Nyeere Ọtụtụ Ndị Aka Ịmụta Eziokwu Baịbụl

E nwere ike igosi “Eureka Drama” n’ime ime obodo, ọ bụrụgodị na ọkụ eletrik adịghị n’ebe ahụ.