Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

 AKỤKỌ NDỤ

Ịtụkwasị Jehova Obi Abaarala Anyị Uru

Ịtụkwasị Jehova Obi Abaarala Anyị Uru

Anyị amaghị ihe ga-eme anyị echi. Mgbe ụfọdụ, naanị ihe anyị nwere ike ime bụ ikwu ihe anyị chere. Ma Jehova na-agọzi ndị tụkwasịrị ya obi, kama ịtụkwasị amamihe ha obi. Kemgbe ọtụtụ afọ mụ na nwunye m nọ na-ejere Jehova ozi, anyị achọpụtala na nke a bụ eziokwu. Ka anyị kọtụ ihe ụfọdụ banyere onwe anyị.

PAPA m na mama m matara n’afọ 1919 ná mgbakọ Ndị Mmụta Baịbụl nwere na Sida Pọịnt, Ohayo, dị n’Amerịka. Ha mechara lụọ n’afọ ahụ. A mụrụ m n’afọ 1922, mụọ Paul nwanne m mgbe afọ abụọ gara. A mụrụ Grace nwunye m n’afọ 1930. Aha nne ya bụ Ruth Howell. Aha nna ya abụrụ Roy Howell. Ha bụ Ndị Mmụta Baịbụl. Nne nne ya na nna nna ya bụkwa Ndị Mmụta Baịbụl. Ha na Nwanna Charles Taze Russell bụ enyi.

Mụ na nwunye m matara n’afọ 1947, anyị lụkwara n’abalị iri na isii n’ọnwa asaa, n’afọ 1949. Tupu anyị alụọ, anyị kwurịtara ihe ndị anyị ga-eji ndụ anyị eme. Anyị kpebiri na anyị ga-ejere Jehova ozi oge niile, nakwa na anyị agaghị amụ nwa. N’abalị mbụ n’ọnwa iri, n’afọ 1950, anyị ghọrọ ndị ọsụ ụzọ. N’afọ 1952, aghọrọ m onye nlekọta sekit.

MGBE M BỤ ONYE NLEKỌTA SEKIT NA ONYE NLEKỌTA DISTRIKTI NA MGBE M GARA ỤLỌ AKWỤKWỌ GILIED

Mụ na nwunye m chere na e kwesịrị inyere anyị aka ka anyị nwee ike ịrụ ọrụ a nke ọma. M mụtara ọtụtụ ihe n’aka ụmụnna ma nke a na-akọ. M chọkwara ka e nyere nwunye m aka. M kọọrọ ya Nwanna Marvin Holien n’ihi na ọ bụ enyi anyị, bụrụkwa onye nlekọta na-ejegharị ejegharị kemgbe ọtụtụ afọ. Agwara m ya na nwunye m amaghị nke a na-akọ n’ihi na ọ bụ nwata. M jụrụ ya, sị: “Olee onye i chere ya na nwunye m ga na-eso aga ozi ọma ka o nwee ike inyere ya aka?” O kwuru na ya chere na otu nwanna nwaanyị aha ya bụ Edna Winkle nwere ike inyere ya aka, n’ihi na ọ bụ ọsụ ụzọ bụ́ aka ochie. Ka oge na-aga, Grace kwuru na Edna mere ka ụjọ ghara ịna-atụ ya mgbe ya na-ezi ndị mmadụ ozi ọma. O kwuru na ọ kụziiri ya otú ya ga-esi agwa mmadụ okwu ma ọ bụrụ na onye ahụ ekwetaghị ihe ya na-ekwu. Ọ sịrị na Edna kụzikwaara ya otú ya ga-esi na-ege ndị mmadụ ntị mgbe ha na-ekwu okwu ka ya nwee ike ịma ihe ya ga-aza. Grace kwuru, sị: “Nwanna nwaanyị ahụ nyeere m ezigbo aka.”

Si n’aka ekpe: Nathan Knorr, Malcolm Allen, Fred Rusk, Lyle Reusch, Andrew Wagner

Mụ na nwunye m na-eleta ọgbakọ ndị dị na sekit abụọ e nwere na steeti Ayọwa. Ụfọdụ n’ime  ọgbakọ ndị ahụ dị na steeti Minesota na Saụt Dakota. E mechara ziga anyị na sekit nke mbụ e nwere na Niu Yọk. Ọgbakọ ndị dị na ya bụ ọgbakọ ndị dị na Bruklin na Kwins. Anyị agaghị echefu otú obi dị anyị mgbe e zigara anyị na sekit ahụ. Anyị chere na anyị agaghị arụli ọrụ ahụ. Ọgbakọ Bruklin Haịt so n’ọgbakọ ndị dị na sekit ahụ. Ha na-amụ ihe n’Ụlọ Nzukọ Alaeze dị na Betel. N’ọgbakọ ahụ, e nwere ọtụtụ ụmụnna nọrọla ọtụtụ afọ na Betel. Mgbe m kwuchara okwu mbụ m n’oge m gara ileta ha, Nwanna Nathan Knorr bịakwutere m, sị m: “Malcolm, i nyere anyị ndụmọdụ ga-abara anyị uru. Ihe i kwuru dabara adaba. Echefula na ọ bụrụ na i nyeghị anyị ndụmọdụ ga-abara anyị uru, ị bacharaghị nzukọ Jehova uru. Jide nke i ji.” Mgbe anyị gbasara ọmụmụ ihe, m kọọrọ nwunye m ihe ọ gwara m. Mgbe e mechara, anyị bara n’ụlọ e nyere anyị, nke dị n’otu n’ime ụlọ elu e nwere na Betel. Anyị malitere ibe ákwá n’ihi na ụjọ ji anyị mere ka ike gwụ anyị.

“Ọ bụrụ na i nyeghị anyị ndụmọdụ ga-abara anyị uru, ị bacharaghị nzukọ Jehova uru. Jide nke i ji”

Mgbe ọnwa ole na ole gachara, anyị natara akwụkwọ ozi e ji gwa anyị bịa klas nke iri abụọ na anọ nke Ụlọ Akwụkwọ Gilied. Anyị ga-agụcha n’ọnwa abụọ n’afọ 1955. Tupu anyị agawa ụlọ akwụkwọ a, a gwara anyị na e nwere ike a gaghị eziga anyị ná mba ọzọ ka anyị gaa kwusawa ozi ọma. Ma, ihe a ga-akụziri anyị n’ụlọ akwụkwọ a ga-abara anyị ezigbo uru n’ọrụ sekit anyị. Ụlọ akwụkwọ a tọrọ anyị ezigbo ụtọ, o mekwara ka anyị mụta ịdị umeala n’obi.

Mgbe mụ na nwunye m bụ́ Grace na George Couch na nwunye ya bụ́ Fern nọ n’Ụlọ Akwụkwọ Gilied n’afọ 1954

Mgbe anyị gụchara, aghọrọ m onye nlekọta distrikti. Sekit ndị anyị ga-eleta bụ sekit ndị dị na steeti Indiana, Mishigan, na Ohayo. N’ọnwa iri na abụọ n’afọ 1955, Nwanna Knorr detaara anyị akwụkwọ ozi juru anyị anya. N’akwụkwọ ozi ahụ, ọ sịrị: “Gwa m eziokwu. Ị̀ chọrọ ịbịa nọwa na Betel . . . ka ọ̀ bụ ị nọtụ na Betel, gị agawa ikwusa ozi ọma ná mba ọzọ? Gwakwa m ma ịbụ onye nlekọta sekit na onye nlekọta distrikti ọ̀ kaara gị mma.” Anyị gwara ya na anyị ga-arụ ihe ọ bụla a gwara anyị rụọ. A gwara anyị bịawa Betel ozugbo.

AFỌ NDỊ ANYỊ JI JEE OZI NA BETEL TỌRỌ ANYỊ ỤTỌ

Afọ ndị m ji jee ozi na Betel tọrọ m ụtọ. N’oge ahụ, otu n’ime ọrụ m na-arụ na Betel bụ ịga kwuo okwu n’ọgbakọ dị iche iche dị n’Amerịka, nakwa ná mgbakọ sekit na mgbakọ distrikti. Akụziiri m ọtụtụ ụmụ okorobịa ihe, bụ́ ndị mechara rụọ ọtụtụ ọrụ ná nzukọ Jehova. Emechara m bụrụ odeakwụkwọ Nwanna Knorr. Nwanna Knorr na-arụ n’ọfis na-ahazi ọrụ ikwusa ozi ọma n’ụwa niile.

Mgbe m na-arụ ọrụ na Ngalaba Ije Ozi n’afọ 1956

Afọ ndị m ji jee ozi na Ngalaba Ije Ozi tọrọ m ezigbo ụtọ. Ọ bụ Nwanna T. J. (Bud) Sullivan ka  mụ na ya rụkọrọ ọrụ. Ọ bụ ya lekọtara ngalaba ahụ ruo ọtụtụ afọ. E nwekwara ndị ọzọ m mụtara ọtụtụ ihe n’aka ha. Otu n’ime ha bụ Fred Rusk. Ọ bụ ya ka a gwara zụọ m. M ka na-echeta mgbe m jụrụ ya, sị: “Fred, gịnị mere o ji abụ, m dechaa akwụkwọ ozi, gị akagbuo ọtụtụ ihe na ya, degharịa ya?” Ọ chịrị ọchị, sị m: “Malcolm, ọ bụrụ na mmadụ ekwuo ihe, o nwere ike ikwu ihe ndị ọzọ ka o dokwuo anya. Ma, ọ bụrụ na mmadụ edee ihe edee, nke ka nke, ọ bụrụ na o si n’alaka ụlọ ọrụ, e kwesịrị idezi ya edezi ka o doo anya.” Mgbe o kwuchara ihe a, o weturu obi sị m, “Obi sie gị ike. Ị na-agbalị. Ka oge na-aga, ị ga-amụtakwu ọrụ a.”

Mgbe ahụ anyị na-eje ozi na Betel, nwunye m rụrụ ọrụ n’ọtụtụ ebe. Otu n’ime ọrụ ndị ọ rụrụ na Betel bụ idozi ụlọ. Ọrụ ahụ tọrọ ya ezigbo ụtọ. Ugbu a, anyị hụ ụfọdụ ụmụnna bụ́ ụmụ okorobịa mgbe anyị nọ na Betel, obi na-adị ha ụtọ, ha agwa nwunye m, sị, “Ị kụziiri m otú e si edozi àkwà. N’eziokwu, obi dị mama m ụtọ maka ihe ị kụziiri m.” Nwunye m rụkwara ọrụ na Ngalaba Na-ahụ Maka Magazin, Ngalaba Na-ahụ Maka Akwụkwọ Ozi, nakwa na Ngalaba Na-emepụta Teepụ. Ọrụ niile ahụ ọ rụrụ mere ka ọ ghọta na n’agbanyeghị ihe anyị na-arụ na ebe anyị na-arụ ya, ije ozi ná nzukọ Jehova bụ ihe ùgwù, bụrụkwa ihe ọma Jehova meere anyị. Ọ bụ otú a ka ọ ka dị ya n’obi.

OTÚ ANYỊ SI GBANWEE IHE ỤFỌDỤ

N’ihe dị ka n’afọ 1975, mụ na nwunye m ghọtara na ndị mụrụ anyị emewela agadi, chọọkwa ka a na-elekọtakwu ha. N’ihi ya, anyị mechara kpebie ime otu ihe siiri anyị ike. Anyị achọbughị ịhapụ ozi Betel nakwa ụmụnna anyị anyị na ha bụ nnu na mmanụ kemgbe. Ma, aghọtara m na ọ bụ m kwesịrị ịna-elekọta ndị mụrụ anyị. N’ihi ya, anyị mechara hapụ Betel, buru n’obi na anyị nwere ike ịlaghachite ma ihe gbanwee.

Amalitere m ịrụrụ ụlọ ọrụ ịnshọransị ọrụ ka m nwee ike ịna-akpa afọ ezinụlọ anyị. Anaghị m echefu ihe otu onyeisi anyị gwara m mgbe a na-azụ m n’ọrụ ahụ. Ọ sịrị m: “A na-arụ ọrụ a ná mgbede. Ọ bụ mgbe a na-enweta ndị mmadụ. O nweghị ihe dị mkpa karịa ịga ná mgbede ọ bụla ka i nweta ndị mmadụ n’ụlọ.” M zara ya, sị: “Ihe i kwuru adịghị njọ. Amakwa m na ihe mere i ji kwuo ya bụ ihe ị hụrụla n’ọrụ a. Ma, e nwere ọtụtụ ihe m na-arụ n’ozi Chineke. E nwetụbeghị mgbe m leghaara ha anya. Achọghịkwa m ileghara ha anya ugbu a. M ga na-aga ná mgbede ụfọdụ. Ma, agaghị m aga ná mgbede Tuzdee na Tọzdee. M ga-eji ya na-aga ọmụmụ ihe dị m ezigbo mkpa.” Jehova gọziri m n’ihi na ekweghị m ka ọrụ ego mee ka m hapụ ọmụmụ ihe.

N’ọnwa asaa n’afọ 1987, anyị na mama m nọ tupu ya ekubie ume n’ebe a na-elekọta ndị agadi. Onyeisi ndị nọọsụ gwara nwunye m, sị: “Nwunye Allen, laa, gaa zuo ike. Onye ọ bụla ma na ị nọ ebe a kemgbe na-elekọta nne di gị. Ekwela ka obi na-ama gị ikpe. Nwee obi ụtọ n’ihi na ị gbalịala.”

 N’ọnwa iri na abụọ n’afọ 1987, anyị dejupụtara akwụkwọ ka anyị jewekwa ozi na Betel, bụ́ ebe na-atọ anyị ụtọ. Ma, mgbe abalị ole na ole gachara, dọkịta chọpụtara ọrịa kansa n’eriri afọ Grace. Mgbe a wachara ya ahụ́, dọkịta kwuru na ọrịa ahụ alaala. N’oge ahụ, e si na Betel detara anyị akwụkwọ ozi, gwa anyị ka anyị nọrọ n’ọgbakọ anyị na-asụ ụzọ. Anyị kpebisiri ike na anyị ga na-arụsi ọrụ Jehova ike.

Ka oge na-aga, enwetara m ọrụ n’obodo Teksas. Anyị kpebiri na ebe ahụ ga-adị anyị mma n’ahụ́ ebe ọ bụ na oyi anaghị atụcha na ya. Ọ ka dịkwa anyị mma n’ahụ́. Kemgbe iri afọ abụọ na ise anyị biwere na Teksas ebe a, ụmụnna anyị na ha nọ hụrụ anyị n’anya. Anyị na ha dịkwa n’ezigbo mma.

IHE NDỊ ANYỊ MỤTARA

Kemgbe ọtụtụ afọ, kansa emeela nwunye m ma n’eriri afọ ma n’olu. O mekwara ya n’ara n’oge na-adịbeghị anya. Ma, o nwetụbeghị mgbe ọ kwara ụwa ma ọ bụ chọwa ka mụ na ya zọwa onye ga-abụ onyeisi ezinụlọ. Ndị mmadụ ajụọla ya ọtụtụ mgbe, sị, “Gịnị mere gị na di gị ji na-ebi n’udo, obi ana-adịkwa unu ụtọ?” Ọ na-agwa ha ihe anọ kpatara ya. Ọ na-asị: “Mụ na di m bụ ezigbo enyi. Anyị na-ekwurịta okwu kwa ụbọchị. Ọ na-atọ anyị ụtọ iwepụta oge nọrịa. Anyị anaghị eburu ibe anyị iwe n’obi alakpu.” Ọ bụ eziokwu na anyị na-emejọ ibe anyị mgbe ụfọdụ, anyị na-agbaghara ibe anyị mgbe niile, chefuokwa ihe merenụ. Ọ na-abara anyị ezigbo uru.

“Tụkwasị Jehova obi mgbe niile, nabatakwa ihe ọ bụla o kwere ka o mee”

Anyị amụtala ọtụtụ ihe ná nsogbu niile bịaara anyị. Ihe ndị anyị mụtara bụ:

  1.  Tụkwasị Jehova obi mgbe niile, nabatakwa ihe ọ bụla o kwere ka o mee. Atụkwasịla amamihe gị obi.—Ilu 3:5, 6; Jere. 17:7.

  2.  N’agbanyeghị ihe merenụ, na-eme ihe Baịbụl kwuru. Irubere Jehova na iwu ya isi dị ezigbo mkpa. Ma ọ́ bụghị na anyị na-erubere Jehova isi, ya abụrụ na anyị na-enupụrụ ya isi. E kwesịrị inwe ebe anyị kwụ.—Rom 6:16; Hib. 4:12.

  3. (3  Ihe kacha mkpa ná ndụ bụ ka anyị na Jehova dị ná mma. Buru ụzọ na-achọ ihe gbasara ofufe Jehova, ọ bụghị akụnụba.—Ilu 28:20; Ekli. 7:1; Mat. 6:33, 34.

  4.  Na-ekpe ekpere ka Jehova nyere gị aka ịna-eme nke ọma n’ozi ya. Na-eche banyere ihe ndị ị ga-emeli n’ozi Jehova, ọ bụghị ihe ị na-agaghị emeli.—Mat. 22:37; 2 Tim. 4:2.

  5.  Ka o doo gị anya na e nweghị nzukọ ọzọ Jehova na-akwado ma na-agọzi.—Jọn 6:68.

Mụ na Grace bụ di na nwunye kemgbe ihe karịrị afọ iri isii na ise. Onye ọ bụla n’ime anyị ejeerela Jehova ozi ihe karịrị iri afọ asaa na ise. Obi dị anyị ụtọ na anyị abụọ nọ na-ejere Jehova ozi kemgbe ahụ. Anyị na-arịọ Jehova ka o mee ka ụmụnna anyị niile ghọta na ya na-agọzi ndị niile tụkwasịrị ya obi. Anyị nwere olileanya na Jehova ga-eme otú ahụ.