Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ezigbo Ndị Kraịst Ji Okwu Chineke Kpọrọ Ihe

Ezigbo Ndị Kraịst Ji Okwu Chineke Kpọrọ Ihe

Ezigbo Ndị Kraịst Ji Okwu Chineke Kpọrọ Ihe

“Okwu gị bụ eziokwu.”—JỌN 17:17.

1. Kwuo otu ihe bara uru ị chọpụtara n’oge mbụ gị na Onyeàmà kparịtara nke gosiri gị na Ndịàmà Jehova dị iche n’okpukpe ndị ọzọ.

Ì CHETARA mgbe mbụ gị na Onyeàmà Jehova kparịtara ihe baara gị uru? Gịnị ka i chetara? Ọtụtụ ndị nwere ike ikwu na otú Onyeàmà ahụ si jiri Baịbụl zaa ajụjụ niile ha jụrụ ya masịrị ha. Obi tọrọ anyị ụtọ mgbe anyị chọpụtara ihe Chineke zubere maka ụwa, ghọta ihe na-eme ma anyị nwụọ, nakwa ihe a ga-emere ndị anyị hụrụ n’anya nwụrụ anwụ!

2. Olee ihe ụfọdụ mere Baịbụl ji amasị gị?

2 Ma, ka anyị na-amụtakwu ihe dị na Baịbụl, anyị chọpụtara na uru Baịbụl bara abụghị naanị ịza anyị ajụjụ gbasara ndụ, ọnwụ, na ihe ndị ga-eme n’ọdịnihu. Anyị bịara chọpụta na Baịbụl bụ akwụkwọ kacha baara mmadụ uru n’ụwa a. O nweghị ọgbọ ọ na-anaghị abara uru, ndị mere ihe o kwuru na-enwe obi ụtọ ná ndụ, ihe na-agakwara ha nke ọma. (Gụọ Abụ Ọma 1:1-3.) Ezigbo Onye Kraịst ọ bụla na-anabata Baịbụl, “ọ bụghị dị ka okwu ụmụ mmadụ, kama, dị nnọọ ka ọ bụ n’eziokwu, dị ka okwu Chineke.” (1 Tesa. 2:13) Ịtụle ihe ụfọdụ mere eme ga-enyere anyị aka ịghọta ihe dị iche ná ndị ji Okwu Chineke kpọrọ ihe na ndị na-ejighị ya kpọrọ ihe.

E DOZIRI OTU NSOGBU TARA AKPỤ

3. Olee okwu chọrọ ịkpaghasị udo e nwere n’ọgbakọ Ndị Kraịst na narị afọ mbụ, gịnịkwa mere ka o sie ike ndozi?

3 Afọ iri na atọ ka e techara Kọnịliọs, bụ́ onye Jentaịl a na-ebighị úgwù, mmanụ, e nwere okwu biliterenụ nke chọrọ ịkpaghasị udo e nwere n’ọgbakọ Ndị Kraịst. Ndị Jentaịl nọ na-aghọ Ndị Kraịst n’ike n’ike. Ihe bụ isiokwu bụ: Tupu e mee ndị nwoke ha baptizim, è kwesịrị ibi ha úgwù otú ndị Juu si eme? Ajụjụ a ga-esiri onye Juu ike ọzịza. Ndị Juu ndị na-edebe Iwu Mozis agaghịdị abanye n’ụlọ onye Jentaịl ma ya fọdụkwa iso ya na-emekọ ihe. A nọdị na-akpagbu ndị Juu ghọrọ Ndị Kraịst n’ihi na ha jụrụ okpukpe mbụ ha na-ekpe. Ọ bụrụ na ha anwaa anwa nabata ndị Jentaịl a na-ebighị úgwù, ọ ga-eme ka esemokwu dị n’etiti ndị na-ekpe okpukpe ndị Juu na Ndị Kraịst kara njọ, meekwa ka a katọwakwuo Ndị Kraịst.—Gal. 2:11-14.

4. Ole ndị zukọrọ ka ha dozie otu okwu biliterenụ, oleekwa ajụjụ ndị nwere ike ịgbata mmadụ n’obi?

4 N’afọ 49 O.A., ndịozi na ndị okenye nọ na Jeruselem, bụ́cha ndị Juu e biri úgwù, “zukọtara ka ha leba anya n’okwu a.” (Ọrụ 15:6) Ihe ha mere abụghị ịrụwa ibe ha ụka n’ihe na-enweghị isi, kama, ha kparịtara ihe Baịbụl kwuru, bụ́ nke onye ọ bụla n’ime ha ji obi ụtọ tinye ọnụ. Onye ọ bụla kwuru ihe o chere. À ga-eji ihe mmadụ chere kpebie ihe a ga-eme n’okwu ahụ, ka à ga-elekwasị anya n’ebe mmadụ si? Ndị okenye okwu ahụ dị n’aka hà ga-ahapụgodị okwu ahụ ruo mgbe nsogbu a na-enye Ndị Kraịst nọ n’Izrel kwụsịlatara? Ka hà ga-emecha kweta n’ihe ha ma na o zighị ezi naanị ka e nwee ike ikpebi otu ihe?

5. Olee otú nnọkọ e nwere na Jeruselem n’afọ 49 O.A. si dị iche na nke ndị kansụl chọọchị na-enwe taa?

5 Kansụl ndị chọọchị dị iche iche taa na-ekwetakarị n’ihe ha ma na o zighị ezi. A na-ahụkarịkwa ka ụfọdụ ndị isi chọọchị na-anwa ime ka ndị ọzọ kwere n’ihe hanwa chere. Ma, ụdị ihe a emeghị ná nnọkọ ahụ e nwere na Jeruselem. Nke ka mkpa bụ na ha mechara nwee otu olu. Olee otú nke a si kwe omume? N’agbanyeghị otú onye ọ bụla n’ime ha si kwenyesie ike n’ihe o chere, ha dum nọ ebe ahụ ji Okwu Chineke kpọrọ ihe, Akwụkwọ Nsọ nyekwaara ha aka idozi okwu ahụ.—Gụọ Abụ Ọma 119:97-101.

6, 7. Olee otú e si jiri Akwụkwọ Nsọ dozie okwu gbasara ibi úgwù?

6 Ihe e kwuru n’akwụkwọ Emọs 9:11, 12 nyere aka edozie okwu ahụ. E kwughachiri ihe e dere ebe ahụ n’Ọrụ 15:16, 17, sị: “M ga-alaghachi wee wughachi ụlọ ndò Devid nke dara ada; m ga-ewughachikwa mkpọmkpọ ebe ya ma wulite ya ọzọ, ka ndị fọdụrụ n’ime ndị a wee chọsie Jehova ike, ha na ndị mba ọzọ niile, ndị a kpọkwasịrị aha m, ka Jehova kwuru.”

7 Ma mmadụ nwere ike ịsị na ebe ahụ ekwughị na ọ dịghị mkpa ka e bie ndị Jentaịl ghọrọ Ndị Kraịst úgwù. Nke ahụ bụ eziokwu. Ma, ndị Juu bụ́ Ndị Kraịst ga-aghọta ihe e kwuru ebe ahụ nke ọma. Ha anaghị ewere ndị Jentaịl e biri úgwù ka ‘ndị mba ọzọ’ kama, ha na-ewere ha ka ụmụnne ha. (Ọpụ. 12:48, 49) Dị ka ihe atụ, ná nsụgharị Bible Nsọ Ọhụụ, Esta 8:17 kwuru, sị: “Ọtụtụ ndị dị iche iche ghọkwara ndị Juu.” N’ihi ya, mgbe Akwụkwọ Nsọ kwuru na ndị fọdụrụ n’ụlọ Izrel (ya bụ, ndị Juu na ndị Juu a tọghatara atọghata, bụ́ ndị e biri úgwù) na “ndị mba ọzọ niile” (ya bụ, ndị Jentaịl a na-ebighị úgwù) ga-aghọ otu ndị a ga-akpọkwasị aha Chineke, ihe a na-ekwu doro anya. Ọ dịghị mkpa ka e bie ndị Jentaịl chọrọ ịghọ Ndị Kraịst úgwù.

8. Gịnị mere ndị Juu ahụ bụ́ Ndị Kraịst ji kwesị ịkata obi iji nwee ike ikpebi ihe ahụ ha kpebiri?

8 Okwu Chineke na mmụọ ya duru Ndị Kraịst ahụ nwere ezi obi ha ejiri “otu olu kwekọrịta.” (Ọrụ 15:25) N’agbanyeghị na ihe ahụ e kpebiri nwere ike ime ka a kpagbuwekwuo ndị Juu bụ́ Ndị Kraịst, ndị kwesịrị ntụkwasị obi ji obi ike kwado ihe ahụ e ji Baịbụl kpebie.—Ọrụ 16:4, 5.

E NWERE EZIGBO IHE DỊ ICHE

9. Olee otu ihe mere ka ozizi ụgha metọọ ezi ofufe, oleekwa ozizi ụgha a malitere na-ezi?

9 Pọl onyeozi buru amụma na ọ bụrụ na ndịozi anwụchaa, a ga-enwe ndị ga-eji ozizi ụgha mebie okwukwe Ndị Kraịst. (Gụọ 2 Ndị Tesalonaịka 2:3, 7.) Ndị so ná ndị na-agaghị anabata “ozizi ahụ na-enye ezi ndụ” bụ ụfọdụ ndị nwere ihe úgwù n’ọgbakọ. (2 Tim. 4:3) Pọl gwara ndị okenye nọ n’oge ya, sị: “Ndị ikom ga-esikwa n’etiti unu onwe unu bilie, na-ekwu ihe gbagọrọ agbagọ iji dọrọ ndị na-eso ụzọ Jizọs ka ha sowe ha.” (Ọrụ 20:30) Otu akwụkwọ nkà ihe ọmụma kwuru otu ihe nke kacha mee ka e nwee ndị echiche ha gbagọrọ agbagọ. O kwuru, sị: “Ndị Kraịst, bụ́ ndị a kụzitụụrụ nkà ihe ọmụma ndị Grik, mechara chewe na ha kwesịrị ịna-akụziri ya ndị ọzọ iji gosi na ha ma ihe nakwa iji tọghata ndị na-ekpere arụsị, bụ́ ndị gụrụ akwụkwọ.” Ihe gbagọrọ agbagọ ha na-akụzi iji nweta ndị na-ekpere arụsị bụ ihe gbasara onye Jizọs Kraịst bụ. Baịbụl kwuru na ọ bụ Ọkpara Chineke; ndị hụrụ nkà ihe ọmụma Grik n’anya siri ọnwụ na ọ bụ Chineke.

10. Olee otú ndị kansụl chọọchị gaara esi ekpebi onye Kraịst bụ?

10 A rụrịtara ụka n’okwu a n’ọtụtụ nzukọ kansụl chọọchị nwere. Okwu a gaara ebi ngwa ngwa ma a sị na ndị zukọrọ ebe ahụ ji ihe Akwụkwọ Nsọ kwuru kpọrọ ihe, ma ọtụtụ n’ime ha ejighị ya kpọrọ ihe. Ọtụtụ n’ime ha ekpebiedịla ebe ha kwụ n’okwu ahụ tupu ha abịa ka e leba ya anya, o nweghịkwa ihe ga-eme ka ha gbanwee ihe ha chere. O sidịrị ike ịhụ ebe ha ji ihe Baịbụl kwuru kpebie ihe ọ bụla ha kwurịtara ná nzukọ ndị ahụ.

11. Olee otú e si ewere ihe ndị a na-akpọ Ndị Nna Chọọchị kwuru, oleekwa ihe mere o ji dị otú ahụ?

11 Gịnị mere ndị kansụl chọọchị agbakwasaghị ụkwụ n’Akwụkwọ Nsọ kpebie ihe ndị ha kpebiri? Ọkà mmụta bụ́ Charles Freeman kwuru na ‘o siiri ndị kwere na Jizọs bụ Chineke ike ikweta ọtụtụ ihe Jizọs kwuru nke gosiri na Chineke, onye bụ́ Nna, karịrị yanwa.’ N’ihi ya, e nwee okwu dapụtaranụ, a na-ahapụ ihe Baịbụl kwuru were ihe chọọchị kwekọrịtara ịna-eme na ihe ndị isi chọọchị kpebiri ka e mee. Ruokwa taa, ọtụtụ ndị isi chọọchị na-eji ihe ndị a na-akpọ Ndị Nna Chọọchị kwuru akpọrọ ihe karịa ihe Baịbụl kwuru! O nwere ike ịbụ na ị chọpụtala nke a ma ọ bụrụ na gị na onye na-aga ụlọ akwụkwọ seminarị akparịtatụla banyere ozizi Atọ n’Ime Otu.

12. Olee otú na-adịghị mma ndị eze ukwu si kpaa ike na chọọchị?

12 Ndị eze ukwu Rom na-atụrụ ndị kansụl chọọchị ihe ha na-eme. Dị ka ihe atụ, o nwere ihe Prọfesọ Richard E. Rubenstein dere nke mere ná Nzukọ e nwere na Naịsie. O kwuru na eze ukwu ọhụrụ bụ́ Constantine mere ka ndị bishọp baa ezigbo ọgaranya. N’ihe na-erughị otu afọ, o nyeghachiri ha ihe niile a naara ha, ma chọọchị ha ma ọrụ ha na-arụ ma aha ndị a na-etu ha. O nyere ndị ụkọchukwu ọkwá o nyeburu ndị isi ndị ọgọ mmụọ. Ọ bụ nke a mere Constantine ji nwee ike ịna-agwa ha ihe ga na-eme, ikekwe na-atụdị ihe na-eme ná Nzukọ e nwere na Naịsie.” Charles Freeman kwuru ihe gosiri na nke a bụ eziokwu. Ọ sịrị: “Ihe a meziri ka eze ukwu ọ bụla nwee ike ịna-etinye ọnụ n’ihe na-eme na Chọọchị iji mee ka ọ kwụsie ike, na-ekpebikwa ihe a ga na-akụzi na ya.”—Gụọ Jems 4:4.

13. Olee ihe i chere mere ndị isi chọọchị nke oge anyị a anaghị achọ ịnabata ihe doro anya Baịbụl na-akụzi?

13 Ọ bụ eziokwu na o siiri ndị isi chọọchị ike ịchọpụta onye Jizọs Kraịst bụ, o sighịrị ọtụtụ ndị nkịtị ike ịchọpụta onye ọ bụ. Ebe ọ bụ na mkpa ha abụghị ime ihe ga-eme ka eze ukwu na-enye ha ezigbo ego ma ọ bụ ka ha nweta ọkwá ukwu na chọọchị, ha sara anya mmiri tụlee ihe Akwụkwọ Nsọ kwuru banyere ihe ndị ha chọrọ ịma. Ha kwere n’ihe niile Akwụkwọ Nsọ kwuru. Otu ọkà mmụta okpukpe aha ya bụ Gregory of Nyssa nwere ihe o kwuru iji katọọ ndị nkịtị. Ọ sịrị: “Ma ndị na-ere ákwà, ma ndị na-agbanwere ndị mmadụ ego, ma ndị na-ere ihe ndị e ji esi nri aghọchaala ndị ọkà mmụta okpukpe. Ọ bụrụ na ị jụọ ndị ọkà ihe ọmụma a ihe ego gị ga-azụtali, ha akọọrọ gị otú Ọkpara ahụ si dị iche ná Nna ahụ. Ị jụọ ha ego ole a na-ere bred, ha asị gị na Nna ahụ karịrị Ọkpara ahụ. Ị jụọkwa ha ma à gbanyela mmiri e ji asa ahụ́, ihe ọzọ ị ga-anụ bụ na e kere Ọkpara ahụ eke, ma o nweghị ihe e ji kee ya.” Ndị nkịtị a adịghị ka ndị na-achọ ọkwá ukwu, kama, ọtụtụ n’ime ha na-eji Okwu Chineke ekpebi nke bụ́ eziokwu. Ọ gaara adị mma ma a sị na Gregory na ndị òtù ya gere ha ntị.

“ỌKA WIT” NA “ATA” ETOKỌỌ

14. Olee ihe mere anyị nwere ike iji kwuo na malite na narị afọ mbụ gawa, ọ dịbeghị mgbe a na-enweghị ezigbo Ndị Kraịst e tere mmanụ n’ụwa?

14 Jizọs ji otu ilu ọ tụrụ gosi na malite na narị afọ mbụ gawa, a ga na-enwe ezigbo Ndị Kraịst e tere mmanụ n’ụwa. O ji ha tụnyere “ọka wit” nke na-eto n’etiti “ata.” (Mat. 13:30) Ọ bụ eziokwu na anyị agaghị enwe ike ịkpọ aha ìgwè ma ọ bụ ndị so ná ndị e tere mmanụ, bụ́ ndị e ji tụnyere ọka wit, ma anyị nwere ike ịchọpụta na o nwebeghị mgbe a na-enweghị ndị ji obi ike kwenyesie ike n’ihe Okwu Chineke kwuru ma gbaa nkụzi ụgha nke ndị chọọchị n’anwụ. Ka anyị tụlee ihe atụ ole na ole.

15, 16. Kpọọ aha ụfọdụ ndị jiri Okwu Chineke kpọrọ ihe.

15 Achịbishọp Agobard onye Liọns, bụ́ obodo dị na Frans (779-840 O.A.), kwuru na ihe ndị chọọchị na-eme, bụ́ ndị Akwụkwọ Nsọ na-akwadoghị, na ememme okpukpe ndị na-esighị na Baịbụl dị njọ. O kwukwara na e kwesịghị ịna-efe ihe oyiyi ofufe ma ọ bụ ịrara chọọchị nye ndị senti. Otu n’ime ndị ha na ya dịkọrọ ndụ, bụ́ Bishọp Claudius, kpọkwara omenala chọọchị asị, kwuokwa na ikpegara ndị senti ekpere na ife ihe ndị a kpụrụ akpụ ofufe adịghị mma. Na narị afọ nke iri na otu, a chụpụrụ Achịdikin Berengarius onye Tọọz, bụ́ obodo dị na Frans, na chọọchị Katọlik n’ihi na o kwetaghị n’ihe ha na-akụzi, nke bụ́ na achịcha na mmanya ha ji eme oriri nsọ na-agbanwe ghọọ ahụ́ na ọbara Kraịst. O kwenyesikwara ike na e kwesịrị ịna-ewere ihe Baịbụl kwuru kama ihe chọọchị kpebiri ịna-eme.

16 Na narị afọ nke iri na abụọ, e nwere mmadụ abụọ na-anaghị eji eziokwu ndị dị na Baịbụl egwu egwu. Ha bụ Peter, onye Brus na Henry onye Lozan. Peter gbara arụkwaghịm n’ọrụ ụkọchukwu ọ na-arụ n’ihi na ọ chọpụtara na Akwụkwọ Nsọ akwadoghị ihe ndị Katọlik na-akụzi, ndị dị ka, ime nwa ọhụrụ baptizim, ikwu na achịcha na mmanya e ji eme oriri nsọ na-agbanwe ghọọ ahụ́ na ọbara Kraịst, ikpe ekpere maka ndị nwụrụ anwụ, na ife obe ofufe. N’afọ 1140, ihe Peter kweere tara isi ya. Henry, bụ́ onye mọnk, kwuru na ihe ndị rụrụ arụ a na-eme na chọọchị adịghị mma, kwuokwa na otú chọọchị si efe ofufe adịghị mma. A nwụchiri ya n’afọ 1148, tụọ ya mkpọrọ, ya anọrọkwa ná mkpọrọ nwụọ.

17. Olee ihe bara uru Waldo na ndị òtù ya mere?

17 N’ihe dị ka n’oge ahụ a kpọrọ Peter onye Brus ọkụ ná ndụ maka ịkatọ ihe chọọchị na-eme, a mụrụ onye ga-emecha mee ka a mara eziokwu ndị dị na Baịbụl n’ọtụtụ ebe. Aha nna ya bụ Valdès, ma ọ bụ Waldo. * O nweghị ọkwá ukwu na chọọchị ka Peter onye Brus na Henry onye Lozan. Ọ bụ onye nkịtị, ma o ji Okwu Chineke kpọrọ ihe nke na o tinyere ihe niile o nwere n’ịsụgharị Baịbụl, ọ hụkwara na a sụgharịrị akwụkwọ ụfọdụ dị na Baịbụl n’asụsụ ndị nkịtị bi na ndịda ọwụwa anyanwụ Frans ga-aghọta. Obi dị ụfọdụ ndị ụtọ mgbe ha nụrụ ihe Baịbụl kwuru n’asụsụ ha nke na hanwa hapụkwara ihe ndị ha nwere ma jiri ndụ ha na-akụziri ndị ọzọ Baịbụl. Nke a gbakasịrị ndị chọọchị ahụ́. N’afọ 1184, poopu chụpụrụ ndị nwoke na ndị nwaanyị ndị a na-anụ ọkụ n’obi na chọọchị, bishọp chụpụkwara ha n’ụlọ ha. E mechara na-akpọ ndị a ndị òtù Waldo. Nchụpụ a a chụpụrụ ha mere ka e zisaa ozi si na Baịbụl n’ebe ndị ọzọ. N’ikpeazụ, ma ndị òtù Waldo, ma ndị òtù Peter onye Brus, ma ndị òtù Henry onye Lozan, ma ndị ọzọ na-ekwetaghị n’ihe chọọchị na-akụzi, bịara ju ebe niile na Yurop. E nwere ndị ọzọ gbachiteere eziokwu ndị dị na Baịbụl na narị afọ ndị sochiri. Ha bụ: John Wycliffe (ihe dị ka n’afọ 1330-1384), William Tyndale (ihe dị ka n’afọ 1494-1536), Henry Grew (1781-1862), na George Storrs (1796-1879).

“E KEGHỊ OKWU CHINEKE AGBỤ”

18. Kwuo otú ndị mmụta Baịbụl si mụọ Baịbụl na narị afọ nke iri na itoolu, nakwa ihe mere otú ahụ ha si mụọ Baịbụl ji baa uru.

18 Ndị na-ekwenyeghị n’ihe Baịbụl kwuru anwaala ịhụ na a kpọsaghị ya, ma ha emelighị ya. Na 2 Timoti 2:9, e kwuru, sị: “E keghị okwu Chineke agbụ.” N’afọ 1870, otu ìgwè ndị mmụta Baịbụl, bụ́ ndị chọrọ ịma nke bụ́ eziokwu, malitere ịchọ eziokwu ahụ. Olee otú ha si amụ ihe? Otu onye ga-ajụ otu ajụjụ. Ha akparịta ya. Ha ga-eleba anya n’ihe niile Akwụkwọ Nsọ kwuru n’okwu ahụ, ọ bụrụkwa na ha achọpụta na amaokwu dị iche iche ha lebara anya na-ekwu otu ihe, ha ga-ekwu ihe ha kpebiri n’okwu ahụ ma detuo ya. Otú a ha si amụ ihe magburu onwe ya n’ihi na ọ bụ otú ndịozi na ndị okenye nọ na narị afọ mbụ si mụọ ihe. Obi dị anyị ụtọ na ndị ikom ndị a kwesịrị ntụkwasị obi, bụ́ ndị mbụ ghọrọ Ndịàmà Jehova nke oge anyị a, kpebisiri ike na ihe ọ bụla ha kweere ga-agbakwasịrịrị ụkwụ n’Okwu Chineke.

19. Gịnị bụ isiokwu afọ 2012, oleekwa ihe mere o ji daba adaba?

19 Baịbụl ka bụ ebe ihe niile anyị kweere na-esi. N’ihi ya, Òtù Na-achị Isi nke Ndịàmà Jehova ekpebiela na isiokwu afọ 2012 ga-abụ ihe ahụ Jizọs ji obi ya niile kwuo, ya bụ, “okwu gị bụ eziokwu.” (Jọn 17:17) Ebe ọ bụ na onye ọ bụla nke chọrọ ka ya na Chineke dịrị ná mma ga na-eje ije n’eziokwu, ka anyị niile na-agbasi mbọ ike ka Okwu Chineke na-edu anyị mgbe niile.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 17 Ihe a na-akpọ Valdès mgbe ụfọdụ bụ Pierre Valdès ma ọ bụ Peter Waldo, a matabeghị kpọmkwem ihe bụ́ aha ya.

LEE MA Ị̀ GA-AHỤ AZỊZA AJỤJỤ NDỊ A:

․․․․․

Olee otú nnọkọ e nwere na Jeruselem n’afọ 49 O.A. si dị iche na nke ndị kansụl chọọchị mechara na-enwe?

․․․․․

Olee ụfọdụ ndị dịrị ndụ Mgbe Ụwa Na-emepechabeghị Anya, bụ́ ndị gbachiteere ihe Okwu Chineke na-akụzi?

․․․․․

Olee otú Ndị Kraịst kwesịrị ntụkwasị obi ná ngwụcha afọ ndị 1800 si mụọ Baịbụl, oleekwa ihe mere otú ahụ ha si mụọ Baịbụl ji baa uru?

[Ajụjụ nke paragraf ndị a na-amụ amụ]

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 8]

Isiokwu afọ 2012 bụ: “Okwu gị bụ eziokwu.”—Jọn 17:17

[Foto dị na peeji nke 7]

Waldo

[Foto dị na peeji nke 7]

Wycliffe

[Foto dị na peeji nke 7]

Tyndale

[Foto dị na peeji nke 7]

Grew

[Foto dị na peeji nke 7]

Storrs