Ànyị Bi “n’Ụbọchị Ikpeazụ” n’Ezie?
Ànyị Bi “n’Ụbọchị Ikpeazụ” n’Ezie?
Ọ DỊ ụdị mgbanwe abụọ na-enyere anyị aka ịmata oge Bible kpọrọ ụbọchị ikpeazụ. Akwụkwọ Nsọ buru amụma banyere ihe ndị ga na-eme ná “ngwụsị nke usoro ihe a.” (Matiu 24:3) Bible kwukwara banyere otú àgwà na ihe ụmụ mmadụ bi “n’ụbọchị ikpeazụ” na-eme ga-esi gbanwee.—2 Timoti 3:1.
Ihe ndị na-eme n’ụwa na àgwà ụmụ mmadụ na-egosi na anyị bi n’ụbọchị ikpeazụ nakwa na n’oge na-adịghị anya, Alaeze Chineke ga-ewetara ndị hụrụ Chineke n’anya ngọzi ndị ga-adịru ebighị ebi. Anyị ga-amalite site n’ịtụle ihe atọ Jizọs kwuru ga-eme ka anyị mara ụbọchị ikpeazụ.
“Mmalite Ihe Ụfụ nke Nhụjuanya”
Jizọs kwuru, sị: “Mba ga-ebili megide mba, alaeze ga-ebilikwa megide alaeze, a ga-enwekwa ụkọ nri na ala ọma jijiji site n’otu ebe ruo ebe ọzọ.” O kwukwara, sị: “Ihe ndị a nile bụ mmalite ihe ụfụ nke nhụjuanya.” (Matiu 24:7, 8) Ka anyị tụlee “ihe ndị a” otu otu.
E gburu ọtụtụ mmadụ n’agha na n’esemokwu agbụrụ ndị e nwere na narị afọ gara aga. Ndị ọkà mmụta kwuru n’otu akụkọ sitere n’aka ụlọ ọrụ bụ́ Worldwatch Institute, sị: “Ndị nwụrụ n’agha na narị afọ [nke 20] ji okpukpu atọ karịa ndị nwụrụ n’agha nile a lụrụ site na narị afọ mbụ AD ruo n’afọ 1899.” Jonathan Glover dere n’akwụkwọ ya bụ́ Humanity—A Moral History of the Twentieth Century, sị: “Otu atụmatụ e mere bụ na agha tara isi nde mmadụ 86 site n’afọ 1900 ruo n’afọ 1989. . . . Agha ndị a lụrụ na narị afọ nke iri abụọ tara isi ndị mmadụ n’ọ̀tụ̀tụ̀ na-adịghị ekwe nghọta. Ikwu na ọnụ ọgụgụ ndị ahụ nwụrụnụ bụ ná nkezi abụghị eziokwu, ebe ọ bụ na e gburu ihe dị ka otu ụzọ n’ụzọ atọ (nde 58) n’agha ụwa abụọ ndị ahụ. Ma, ọ bụrụ na e kee ọnụ ọgụgụ ndị a nile nwụrụnụ ekee gaa n’ụbọchị n’ụbọchị n’oge ahụ dum, agha gburu ihe dị ka puku mmadụ abụọ na narị ise kwa ụbọchị, nke ahụ bụ ihe karịrị 100 mmadụ n’otu awa, n’akwụsịghị akwụsị, ruo afọ iri itoolu.” Lee nnọọ iru újú na obi mgbawa nke a kpataara ọtụtụ nde ndị ikwu na ibe nke ndị a nwụrụ n’agha!
N’agbanyeghị na a na-akọpụta nri buru ibu n’ụwa, otu n’ime ihe e ji mara mgbe ikpeazụ a bụ ụkọ nri. Ndị na-eme nchọpụta na-ekwu na nri a na-akọpụta kemgbe afọ 30 karịrị mmụba a na-enwe n’ọnụ ọgụgụ mmadụ bi n’ụwa. N’agbanyeghị nke ahụ, ụkọ nri dị n’ọtụtụ ebe n’ụwa n’ihi na ọtụtụ ndị enweghị ala ga-ezuru ha iji kọpụta nri ma ọ bụ ego iji zụta nri. Ná mba ndị ka na-emepe emepe, ihe dị ka otu ijeri mmadụ, na narị nde mmadụ abụọ na-akpata nanị otu dọla (U.S.) kwa ụbọchị ma ọ bụ ihe na-erughị ya. N’ime ọnụ ọgụgụ a, ihe dị ka narị nde mmadụ asaa, na nde iri asatọ na-anọ agụụ mgbe nile. Dị ka Òtù Ahụ́ Ike Ụwa si kwuo, ọ bụ erighị ezigbo nri kasị akpata ọnwụ nke ihe karịrị nde ụmụaka ise kwa afọ.
Gịnị ka a pụrụ ikwu banyere ala ọma jijiji e buru n’amụma? Ụlọ Ọrụ Mba United States Na-enyocha Ọdịdị Ala kwuru na ọ bụrụ na e jiri afọ ole gaferelanụ kemgbe 1990 kee ọnụ ọgụgụ ala ọma jijiji ndị nwere ike ịkwatu ụlọ bụ́ ndị merelanụ kemgbe ahụ, a ga-enweta 17
kwa afọ. E sikwa otú ahụ kee ndị nke nwere ike ịfọ nke nta ka ha bibie ụlọ kpamkpam, a ga-enweta otu kwa afọ. Ụlọ ọrụ ọzọ na-ekwu, sị: “Ala ọma jijiji egbuwo ọtụtụ narị puku mmadụ n’ime 100 afọ gara aga.” Otu ihe kpatara nke a bụ na kemgbe afọ 1914, ọnụ ọgụgụ buru ibu nke ndị mmadụ na-ebi n’ebe ndị ala ọma jijiji na-eme.Ihe Ndị Ọzọ A Ga-eji Mara Mgbe Ikpeazụ
Jizọs kwuru, sị: “A ga-enwekwa . . . ọrịa na-efe efe . . . site n’otu ebe ruo ebe ọzọ.” (Luk 21:11) Nkà mmụta ọgwụ na ahụ́ ike enweela ọganihu ugbu a karịa mgbe ọ bụla ọzọ. N’agbanyeghị nke ahụ, ọrịa ndị ochie na ndị ọhụrụ anọgidela na-akpa ụmụ mmadụ aka ọjọọ. Otu akụkọ sitere n’aka Òtù Na-ahụ Maka Ọrụ Ndị Uwe Ojii Nzuzo nke Mba United States na-ekwu, sị: “Ọrịa 20 a maara nke ọma—nke gụnyere ụkwara nta (TB), ịba, na ọgbụgbọ na ọnyụnyụ—alọghachila ma ọ bụ gbasaa kemgbe 1973, mgbe mgbe, ọrịa ndị a na-esi ike ọgwụgwọ karịa na mbụ. Ya dịkarịa ala, a chọpụtala ọrịa 30 a na-amabughị na mbụ kemgbe afọ 1973, ha gụnyere nje HIV, Ebola, ịba ọcha n’anya ụdị nke C, na nje Nipah, ọrịa ndị a enweghịkwa ọgwụgwọ.” Dị ka akụkọ sitere n’aka Òtù Red Cross nke June 28, 2000 si kwuo, n’afọ 1999, ọnụ ọgụgụ nke ndị nwụrụ n’ihi ọrịa ndị na-efe efe ji ihe dị ka otu narị ugboro na iri isii karịa ọnụ ọgụgụ nke ndị nwụrụ n’ihi ọdachi ndị na-emere onwe ha.
“Ịba ụba nke mmebi iwu” bụ ihe ọzọ pụtara ìhè anyị ji mara na anyị bi na mgbe ikpeazụ. (Matiu 24:12) N’akụkụ ka ukwuu n’ụwa taa, ndị mmadụ anaghị ahapụ ụlọ ha n’agbachighị ha agbachi, obi anaghịkwa eru ha ala mgbe ha na-aga n’okporo ụzọ n’abalị. Gịnị banyere mmetọ nke ikuku, nke mmiri, na nke ala bụ́ nke a na-ahụ taa, bụ́ nke na-emekarị n’ihi ime ihe ndị na-ekwekọghị n’iwu? Nke a na-emezukwa ihe Bible buru n’amụma. Akwụkwọ Mkpughe kwuru banyere oge Chineke kara aka maka “ibibi ndị na-ebibi ụwa.”—Mkpughe 11:18.
Otú Ndị Bi n’Oge Ikpeazụ Ga-esi Na-akpa Àgwà
Biko sapee Bible gị na 2 Timoti 3:1-5 ma gụọ ya. Pọl onyeozi dere, sị: “N’ụbọchị ikpeazụ, oge pụrụ iche nke siri ike obibi gaje ịdị.” O depụtaziri àgwà 20 a ga-eji mara ndị na-adịghị asọpụrụ Chineke. Ndị bi n’ógbè unu hà na-akpa ụfọdụ n’ime àgwà ndị a? Tụlee ihe ndị e kwurula n’oge na-adịbeghị anya banyere ndị nke oge a.
“Ndị hụrụ onwe ha n’anya.” (2 Timoti 3:2) “[Ndị mmadụ] na-esi ọnwụ ime ihe otú ha si chọọ n’oge a karịa mgbe ọ bụla ọzọ. [Ha] na-ele onwe ha anya dị ka chi, na-atụkwa anya ka ndị mmadụ na-efe ha.”—Financial Times, bụ́ akwụkwọ akụkọ ndị England.
“Ndị hụrụ ego n’anya.” (2 Timoti 3:2) “N’oge a, ịhụ ego n’anya na mmadụ iche nanị maka onwe ya emeela ka ndị mmadụ gharakwa ịdị umeala n’obi. Ọ gwụla ma ụwa ò lere gị anya ka ọgaranya, ọ dịghị ihe a ga-eji gị kpọrọ.”—Jakarta Post, akwụkwọ akụkọ ndị Indonesia.
“Ndị na-enupụrụ ndị mụrụ ha isi.” (2 Timoti 3:2) “Ọ na-eju ndị mụrụ ụmụ anya ịhụ ka nwa ha dị afọ 4 na-enye ha iwu ka ọ̀ bụ [Eze ndị France bụ́] Louis nke Iri na Anọ ma ọ bụ ka nwa ha dị afọ 8 ji olu ike na-asị ha, ‘Akpọrọ m unu asị!’”—American Educator, magazin ndị United States.
“Ndị na-adịghị eguzosi ike n’ihe.” (2 Timoti 3:2) “Otú ụmụ nwoke sizi adị njikere ịhapụ nwunye ha na ụmụ ha nwere ike ịbụ àgwà kasị njọ ndị mmadụ malitere ịkpa kemgbe [afọ 40] gara aga.”—Wilson Quarterly, magazin ndị United States.
“Ndị na-enweghị obi mmadụ.” (2 Timoti 3:3) “Ihe ike ndị ezinụlọ na-eme ibe ha bụ nsogbu gbara ọkpụrụkpụ a na-enwe kwa ụbọchị n’ebe nile n’ụwa.”—Journal of the American Medical Association, magazin ndị United States.
“Ndị na-enweghị njide onwe onye.” (2 Timoti 3:3) “Ọtụtụ akụkọ na-agba n’ihu akwụkwọ akụkọ kwa ụbọchị na-egosi na ndị mmadụ adịghị enwe njide onwe onye, ha adịghị agbaso ụkpụrụ ezi omume, ma ọ bụkwanụ na-eme ebere mgbe ha na-emeso mmadụ ibe ha ihe, ha na-egosipụtakwa otu àgwà a mgbe ha na-eme ihe ga-emetụta ha onwe ha. . . . Ya bụrụ na ụwa anyị anọgide na-eme ihe ike otú o si eme ugbu a, n’oge na-adịghị anya, anyị agaghịkwa ama ihe bụ́ àgwà ọjọọ.”—Bangkok Post, akwụkwọ akụkọ ndị Thailand.
“Ndị na-eme ihe ike ike.” (2 Timoti 3:3) “Ndị mmadụ na-egosipụta iwe iberibe ha na-ewe na oké ọnụma ha na-eko site n’ịkparị ndị mmadụ n’okporo ụzọ, iti ndị ezinụlọ ha ihe, . . . na site n’ime ihe ike na-enweghị isi nke ya na mpụ na-esokarị. A na-emeso ndị mmadụ ihe ike na mberede, nke a na-emekwa ka ndị mmadụ nọrọ ná mgbagwoju anya na n’ụjọ.”—Business Day, akwụkwọ akụkọ ndị South Africa.
“Ndị hụrụ ihe ụtọ n’anya kama ịbụ ndị hụrụ Chineke n’anya.” (2 Timoti 3:4) “Ndị na-akwado ka a na-enwe mmekọahụ aghara aghara na-akatọzi ụkpụrụ omume Ndị Kraịst ka a na-anwụ anwụ.”—Boundless, magazin dị n’Intanet.
“Ndị na-enwe ọdịdị nke nsọpụrụ Chineke ma na-agọnarị ike ya.” (2 Timoti 3:5) “[Otu onye na-agbabu akwụna na Netherlands] kwetara na ọ bụ ndị okpukpe kasị emegide atụmatụ a na-eme ime ka iwu kwado [ịgba akwụna]. Ọ kwụsịtụrụ, ma jirizie ọnụ ọchị kwuo na mgbe ya ka na-agba akwụna, ndị ụkọchukwu so ná ndị kasị agba ya aka ahịa. Ọ chịrị ọchị ma kwuo, sị, ‘Ndị akwụna na-ekwukarị na ndị kasị agba ha aka ahịa bụ ndị chọọchị.’”—National Catholic Reporter, akwụkwọ akụkọ ndị United States.
Olee Ihe Ga-eme n’Ọdịnihu?
Ụwa jupụtara ná nsogbu taa, dị nnọọ ka Bible buru n’amụma. Ma, amụma ahụ e buru banyere “ihe ịrịba ama nke ọnụnọ [Kraịst] nakwa nke ngwụsị nke usoro ihe a” nwere akụkụ dị mma. Jizọs kwuru, sị: “A ga-ekwusakwa ozi ọma nke a nke alaeze n’elu ụwa dum mmadụ bi ka ọ bụrụ àmà nye mba nile.” (Matiu 24:3, 14) A na-ekwusa ozi ọma nke Alaeze Chineke n’ihe karịrị narị ala abụọ na iri atọ. Ihe karịrị nde mmadụ isii si ná “mba na ebo na ndị na asụsụ nile pụta” ji ịnụ ọkụ n’obi na-ekwusa ozi Alaeze ahụ. (Mkpughe 7:9) Olee ihe sirila n’ozi ha ji ịnụ ọkụ n’obi na-eje pụta? Ha arụzuwo nke a: Ọ fọrọ nke nta ka ọ bụrụ na mmadụ nile nọ n’ụwa enweela ike ịnụ ozi banyere ihe Alaeze ahụ bụ, ihe ọ ga-eme, na otú mmadụ pụrụ isi nweta ngọzi ndị ọ ga-eweta. N’ezie, ‘ihe ọmụma abawo ụba na mgbe ọgwụgwụ a.’—Daniel 12:4.
I kwesịrị inweta ihe ọmụma a. Tụlee ihe ga-eme mgbe e kwusara ozi ọma ahụ ruo n’ókè Jehova chọrọ. Jizọs kwuru, sị: “Mgbe ahụkwa ka ọgwụgwụ ga-abịa.” (Matiu 24:14) Ọ ga-abụ oge Chineke ga-eji wepụ ihe ọjọọ nile n’ụwa. Ilu 2:22 na-ekwu, sị: “Ma ndị na-emebi iwu ka a ga-ebipụ n’ụwa, ọ bụkwa ndị na-aghọ aghụghọ ka a ga-efopụ na ya.” Oleekwanụ ihe a ga-eme Setan na ndị mmụọ ọjọọ ya? A ga-atụba ha n’abis, ebe ha na-agaghịkwa enwe ike iduhie mba nile ọzọ. (Mkpughe 20:1-3) Mgbe ahụ, ‘ndị ziri ezi na ndị zuru okè ga-afọdụ’ n’ụwa. Ha ga-enwetakwa ngọzi ndị magburu onwe ha Alaeze ahụ ga-eweta.—Ilu 2:21; Mkpughe 21:3-5.
Olee Ihe I Nwere Ike Ime?
O doro anya na ọgwụgwụ nke ụwa Setan dị nso. Ndị leghaara ihe ndị na-egosi na anyị nọ na mgbe ikpeazụ anya agaghị adị njikere mgbe ọgwụgwụ ahụ ga-abịa. (Matiu 24:37-39; 1 Ndị Tesalonaịka 5:2) N’ihi ya, Jizọs gwara ndị na-ege ya ntị, sị: “Lezienụ onwe unu anya ka a ghara inwe mgbe iribiga ihe ókè na ịṅụ oké mmanya na nchegbu nke ndụ ga-anyịgbu obi unu, ụbọchị ahụ ewee bịakwasị unu na mberede n’otu ntabi anya dị ka ọnyà. N’ihi na ọ ga-abịakwasị ndị nile bi n’elu ụwa nile. Ya mere, mụrụnụ anya, na-arịọsikwanụ arịrịọ ike mgbe nile ka unu wee nwee ihe ịga nke ọma n’ịgbanahụ ihe ndị a nile a kara aka na ha ga-ewere ọnọdụ, nakwa n’iguzo n’ihu Nwa nke mmadụ.”—Luk 21:34-36.
Ọ bụ nanị ndị mere ihe Nwa nke mmadụ, bụ́ Jizọs, chọrọ ga-enwe ike ịlanahụ ọgwụgwụ nke ụwa dị ugbu a. Lee ka o si dị nnọọ mkpa anyị iji oge fọdụụrụ anyị mee ihe ga-amasị Jehova Jọn 17:3) Mgbe ahụ, ọ bụ ihe amamihe dị na ya gị ịmụtakwu ihe banyere Jehova Chineke na ihe ndị ọ chọrọ ka i mee. Ndịàmà Jehova bi n’ógbè gị ga-enwe obi ụtọ inyere gị aka ịghọta ihe Bible na-akụzi. Anyị ji obi ụtọ na-agwa gị ka ị kpọtụrụ ha ma ọ bụ detara ndị bipụtara magazin a akwụkwọ.
Chineke na Jizọs Kraịst! N’ekpere Jizọs kpegaara Chineke, ọ sịrị: “Nke a pụtara ndụ ebighị ebi, ha inweta ihe ọmụma banyere gị, bụ́ nanị ezi Chineke ahụ, nakwa banyere onye ahụ i zitere, bụ́ Jizọs Kraịst.” ([Igbe/Foto ndị dị na peeji nke 7]
IHE NDỊ A GA-EJI MARA MGBE IKPEAZỤ
IHE NDỊ PỤRỤ ICHE GA NA-EMENỤ:
▪ Agha.—Matiu 24:6, 7.
▪ Ụkọ nri.—Matiu 24:7.
▪ Ala ọma jijiji.—Matiu 24:7.
▪ Ọrịa na-efe efe.—Luk 21:11.
▪ Ịba ụba nke mmebi iwu.—Matiu 24:12.
▪ Mbibi a na-ebibi ụwa.—Mkpughe 11:18.
NDỊ MMADỤ:
▪ Ndị hụrụ onwe ha n’anya. —2 Timoti 3:2.
▪ Ndị hụrụ ego n’anya. —2 Timoti 3:2.
▪ Ndị mpako.—2 Timoti 3:2.
▪ Ndị na-enupụrụ ndị mụrụ ha isi.—2 Timoti 3:2.
▪ Ndị na-enweghị ekele. —2 Timoti 3:2.
▪ Ndị na-adịghị eguzosi ike n’ihe.—2 Timoti 3:2.
▪ Ndị na-enweghị obi mmadụ.—2 Timoti 3:3.
▪ Ndị na-enweghị njide onwe onye.—2 Timoti 3:3.
▪ Ndị na-eme ihe ike ike. —2 Timoti 3:3.
▪ Ndị hụrụ ihe ụtọ n’anya.—2 Timoti 3:4.
▪ Ndị okpukpe nwere ihu abụọ.—2 Timoti 3:5.
NDỊ NA-EFE CHINEKE EZI OFUFE:
▪ Ga-enweta ọtụtụ ihe ọmụma. —Daniel 12:4.
▪ Ga-ekwusa ozi ọma gburugburu ụwa.—Matiu 24:14.
[Ebe E Si Nweta Foto]
ÒTÙ MBA ỤWA/Foto F. GRIFFING sere