Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

Ebe ọ bụ na Eze Solomọn nke Izrel oge ochie kwụsịrị ikwesị ntụkwasị obi nye Chineke n’oge agadi ya, ànyị pụrụ ikwubi na a gaghị akpọlite ya n’ọnwụ?—1 Ndị Eze 11:3-9.

Ọ bụ ezie na n’ime Bible, e depụtara aha ndị ikom na ndị inyom ụfọdụ bụ́ ndị nwere okwukwe, ndị obi abụọ na-adịghị ya na a ga-akpọlite ha n’ọnwụ, o kwughị kpọmkwem banyere mbilite n’ọnwụ nke onye nke ọ bụla. (Ndị Hibru 11:1-40) Otú ọ dị, na nke Solomọn, anyị pụrụ ịghọtatụ ihe Chineke kpebiri site n’iji ihe mere ya mgbe ọ nwụrụ tụnyere ihe mere ụfọdụ ndị kwesịrị ntụkwasị obi mgbe ha nwụrụ.

Akwụkwọ Nsọ na-ekwu na ndị nwụrụ anwụ nwere nanị ọnọdụ abụọ ha pụrụ ịnọ na ya—ọnọdụ nke adịghị adị ruo nwa oge na ọnọdụ nke adịghị adị ruo mgbe ebighị ebi. A na-atụba ndị a na-agaghị akpọlite n’ọnwụ na “Gehena,” ma ọ bụ “n’ime ọdọ ọkụ ahụ.” (Matiu 5:22; Mak 9:47, 48; Mkpughe 20:14) Mmadụ abụọ mbụ ahụ, bụ́ Adam na Iv, onye ahụ raara Jizọs nye bụ́ Judas Iskarịọt, na ndị nwụrụ mgbe Chineke mezuru ihe o kpere n’ikpe n’isi ha, dị ka ndị nke oge Noa na ndị Sọdọm na Gọmọra, so na ha. * Mgbe ndị a ga-akpọlite n’ọnwụ nwụrụ, ha na-aga n’ili nkịtị nke ihe a kpọrọ mmadụ—Shiol, ma ọ bụ Hedis. Bible na-ekwu banyere ọdịnihu ha, sị: “Oké osimiri hapụkwara ndị nwụrụ anwụ nọ n’ime ya, ọnwụ na Hedis hapụkwara ndị nwụrụ anwụ nọ n’ime ha, e kpekwara ha ikpe n’otu n’otu dị ka omume ha si dị.”—Mkpughe 20:13.

Ya bụrụ otú ahụ, ndị ahụ kwesịrị ntụkwasị obi a kpọtụrụ aha ná Ndị Hibru isi 11 nọ na Shiol, ma ọ bụ Hedis, na-echere mbilite n’ọnwụ. Ha gụnyere ndị ohu Chineke kwesịrị ntụkwasị obi bụ́ Ebreham, Mozis na Devid. Ugbu a, tụlee ihe Bible kwuru banyere ọnwụ ha. Jehova gwara Ebreham, sị: “Ma gị onwe gị ga-alakwuru nna gị ha n’udo; a ga-eli gị n’ezi isi awọ.” (Jenesis 15:15) Jehova gwara Mozis, sị: “Lee gị na nna gị ha ga na-edina.” (Deuterọnọmi 31:16) Bible kwuru banyere nna Solomọn bụ́ Devid, sị: “Devid wee soro nna ya ha dinaa n’ọnwụ, e lie ya n’obodo Devid.” (1 Ndị Eze 2:10) N’ihi ya, okwu ahụ bụ́ ‘mmadụ isoro nna ya ha dinaa’ bụ ụzọ ọzọ isi kwuo na onye ahụ gara Shiol.

Gịnị mere Solomọn mgbe ọ nwụrụ? Bible na-aza, sị: “Ma ụbọchị nile Solomọn bụ eze Izrel nile n’ime Jeruselem dị [afọ iri anọ]. Solomọn wee soro nna ya ha dinaa n’ọnwụ, e lie ya n’obodo Devid, bụ́ nna ya.” (1 Ndị Eze 11:42, 43) N’ihi ya, o yiri ihe ezi uche dị na ya ikwubi na Solomọn nọ na Shiol, ma ọ bụ Hedis, bụ́ ebe a ga-esi kpọlite ya n’ọnwụ.

Nkwubi okwu a pụtara na e nwere ike ịkpọlite ndị ọzọ Akwụkwọ Nsọ kwuru kpọmkwem na ‘ha sooro ndị nna ha dinaa’ n’ọnwụ. N’eziokwu, ọ bụkwa otu ihe a ka e kwuru banyere ọtụtụ ndị eze sochiri Solomọn, ọ bụ ezie na ha ekwesịghị ntụkwasị obi. Ezi uche dị na ya ikwubi otú ahụ ebe ọ bụ na “a gaje inwe mbilite n’ọnwụ nke ma ndị ezi omume ma ndị ajọ omume.” (Ọrụ 24:15) N’ezie, ọ bụ nanị mgbe a kpọlitesịrị “ndị nile nọ n’ili ncheta” ka anyị ga-amara ndị a kpọlitere n’ọnwụ. (Jọn 5:28, 29) Ya mere, kama ikwubi onye a ga-akpọlite ma ọ bụ onye a na-agaghị akpọlite n’ime ndị nwụrụ n’oge ochie, anyị ga-echere, na-enwe obi ike na Jehova ga-eme mkpebi zuru okè.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 4 Lee peeji nke 30-31 nke Ụlọ Nche August 15, 1988.