Onye Africa Dị Umeala n’Obi nke Hụrụ Okwu Chineke n’Anya
Onye Africa Dị Umeala n’Obi nke Hụrụ Okwu Chineke n’Anya
Ọ NA-ATỤKARỊ ndị bịara nleta n’Africa n’anya ịhụ otú o si adị mfe iso ndị Africa kparịta ụka n’isiokwu Bible dị iche iche. Ajụjụ ndị dị ka, “Gịnị bụ Alaeze Chineke?” ma ọ bụ “È nwere ihe ngwọta na-adịgide adịgide nye nsogbu ndị dị ka ụkọ nri, ọrịa, agha na mpụ?” na-adọta ndị mmadụ n’ụzọ dị mfe ige ntị. Ọtụtụ ga-eji mmasị kwere ka onye ha na-amabughị gosi ha azịza ha n’ime Bible. Nke a na-edugakarị n’ọmụmụ Bible na-aga n’ihu. Ka ndị ahụ a na-amụrụ ihe na-enwekwa ọganihu n’ụzọ ime mmụọ, ha na-aghọ Ndị Kraịst e mere baptizim.
Otu n’ime ndị Africa mbụ meghachiri omume n’ụzọ dị otú ahụ bụ onye e kwuru banyere ya na Bible n’Ọrụ 8:26-40. Ọ bụ nwoke Etiopia nke gara Jeruselem iji fee ezi Chineke ahụ, bụ́ Jehova, ofufe.
Dị ka e gosiri n’ihe osise dị n’okpuru ebe a, nwoke Etiopia ahụ ji ụgbọ ịnyịnya ya na-alaghachi obodo ya, na-agụ akwụkwọ mpịakọta ọ sapere. Otu onye ọ na-amabughị jekwuuru ya ma jụọ ya, sị: “Ị̀ maara n’ezie ihe ị na-agụ?” Onye Etiopia ahụ ji obi umeala kwupụta na enyemaka dị ya mkpa ma rịọsie onye ahụ ọ na-amabughị, bụ́ Filip Onye Kraịst na-ezisa ozi ọma, arịrịọ ike ka ọ rịgota n’ụgbọ ịnyịnya ya. Mgbe ahụ ọ rịọrọ Filip ka ọ kọwaa ihe akụkụ Akwụkwọ Nsọ ahụ ọ ka gụpụrụ pụtara. Filip kọwara na ọ bụ amụma na-ekwu banyere ọnwụ na-etebeghị aka nke Mezaịa ahụ, bụ́ Jizọs Kraịst. Filip kọọrọ ya ihe ndị ọzọ metụtara “ozi ọma banyere Jizọs,” obi abụọ adịghịkwa ya na ọ kọkwaara ya banyere mbilite n’ọnwụ Jizọs.
Mgbe ọ nụrụ eziokwu ndị a dị ebube, onye Etiopia ahụ chọrọ ịghọ onye na-eso ụzọ Jizọs ma jụọ, sị: “Gịnị na-egbochi ime m baptizim?” Ka e mesịrị ya baptizim, nwoke Africa a dị umeala n’obi ji obi ụtọ lawa, Bible ekwughịkwa ihe ọzọ banyere ya.
Taa, Ndịàmà Jehova na-enyere ọtụtụ nde mmadụ aka gburugburu ụwa ịnụ otu “ozi ọma” ahụ. E duziwo ihe dị ka nde ọmụmụ Bible ebe obibi isii n’efu na nso nso a.