Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Nwa Mgbei A Gbahapụrụ Agbahapụ Achọta Nna Na-ahụ n’Anya

Nwa Mgbei A Gbahapụrụ Agbahapụ Achọta Nna Na-ahụ n’Anya

 Akụkọ Ndụ

Nwa Mgbei A Gbahapụrụ Agbahapụ Achọta Nna Na-ahụ n’Anya

DỊ KA DIMITRIS SIDIROPOULOS SI KỌỌ

Ka otu ọfịsa na-enye m égbè, o tiiri m mkpu, sị: “Ngwa, were égbè a gbaa.” Ejiri m nwayọọ jụ. Oké ụjọ jidere ndị soja na-ekiri ihe na-emenụ ka ha hụrụ ka mgbọ égbè ọfịsa ahụ malitere isi m n’ubu na-efefe. O yiri ka m̀ gawala ịnwụ. N’ụzọ na-enye obi ụtọ, anwụghị m. Ma nke ahụ abụghị nke mbụ ndụ m nọ n’ihe ize ndụ.

EZINỤLỌ M si n’obere agbụrụ bidebere Kayseri, nke dị na Kapadoshia, Turkey. O doro anya na ụfọdụ ndị ebe a nabatara Iso Ụzọ Kraịst na narị afọ mbụ O.A. (Ọrụ 2:9) Otú ọ dị, ka ọ na-erule ná mmalite nke narị afọ nke 20, ihe agbanwewo nke ukwuu.

Site n’Ịbụ Onye Gbara Ọsọ Ndụ Gaa n’Ịbụ Nwa Mgbei

Ọnwa ole na ole ka a mụsịrị m na 1922, esemokwu agbụrụ mere ka ezinụlọ m gbaga ọsọ ndụ na Gris. Ndị mụrụ m bụ́ ndị egwu ji hapụrụ ihe nile ma kpọrọ nanị m bụ́ nwa ha dị ọnwa ole na ole. Mgbe ha gabigasịrị oké ihe isi ike, ha rutere obodo Kiria, nke dị nso na Drama, n’ebe ugwu Gris, dị ka ndị ihe siiri ike.

Mgbe m dị afọ anọ na mgbe a mụsịrị nwanne m nwoke nke m tọrọ, papa m nwụrụ. Ọ dị nanị afọ 27, ma oké nhụjuanya nke oge ọjọọ ndị ahụ emeela ka ike gwụ ya. Mama m tara oké ahụhụ, n’oge na-adịghịkwa anya, ya onwe ya kwa nwụrụ. Mụ na nwanne m nwoke banyere nnọọ n’ụkọ. A kpọgharịrị anyị site n’otu ogige ụmụ mgbei gaa n’ọzọ, mgbe m dịkwa afọ 12, a kpọgara m n’otu ogige ụmụ mgbei dị na Tesalonaịka, bụ́ ebe m nọrọ mụọ ọrụ idozi ụgbọ.

 Ka m nọ na-etolite n’ogige ụmụ mgbei bụ́ ebe a na-enweghị omume enyi, anọ m na-eche ihe mere ụfọdụ mmadụ ji ata oké ahụhụ, a na-emesokwa ha ihe n’ụzọ na-ezighị ezi. Ajụrụ m onwe m ihe mere Chineke ji kwere ka ọnọdụ ọjọọ ndị dị otú ahụ dịrị. Na klas ebe a na-akụziri anyị ihe metụtara okpukpe, a kụziiri anyị na Chineke bụ onye nwere ike ime ihe nile, ma ọ dịghị nkọwa ezi uche dị na ya e nyere banyere ihe mere ihe ọjọọ ji dịrị ma na-agbasa. A na-ekwukarị na Chọọchị Ọtọdọks nke Gris bụ okpukpe kasị mma. Mgbe m jụrụ, sị, “Ya bụrụ na Chọọchị Ọtọdọks bụ okpukpe kasị mma, gịnị mere na mmadụ nile abụghị ndị Ọtọdọks?” enwetaghị m azịza na-eju afọ.

Ka o sina dị, onye nkụzi anyị na-akwanyere Bible ùgwù n’ụzọ miri emi, o mekwara ka anyị mata na ọ bụ akwụkwọ dị nsọ. Onyeisi nke ogige ụmụ mgbei ahụ nwekwara otu àgwà ahụ, ma ọ dịghị onye maara ihe mere o ji ajụ ikere òkè n’ihe omume okpukpe. Mgbe m jụrụ banyere nke a, a gwara m na ya na Ndịàmà Jehova, bụ́ okpukpe m na-amaghị, amụtụla ihe.

Adị m afọ 17 mgbe m gụsịrị akwụkwọ n’ogige ụmụ mgbei dị na Tesalonaịka. Agha Ụwa nke Abụọ amalitela, ndị Nazi bichikwara Gris. Ụmụ mmadụ na-anwụ n’okporo ámá n’ihi agụụ. Iji dịgide ndụ, agbagara m n’ime ime obodo ịga rụọ ọrụ ubi dị ka onye ọrụ e goro ego iji nweta obere ego.

Bible Azaa Ajụjụ M

Mgbe m lọghachiri na Tesalonaịka n’April 1945, nwanne nwanyị nke otu n’ime ndị mụ na ha bụ enyi site na nwata, bụ́ onye mụ na ya nọrọ n’ogige ụmụ mgbei dị iche iche, letara m. Paschalia gwara m na a na-achọ nwanne ya nwoke achọ ma jụọ m ma m̀ maara ebe ọ nọ. Ka anyị nọ na-ekwurịta okwu, ọ gwara m na ya bụ otu n’ime Ndịàmà Jehova ma kwuo mmasị Chineke nwere n’ebe ụmụ mmadụ nọ.

Eji m iwe jụọ ya ọtụtụ ajụjụ. Gịnị mere m ji na-ata ahụhụ kemgbe m bụ nwata? Gịnị mere m ji bụrụ nwa mgbei? Ebee ka Chineke nọ mgbe ọ kasị dịrị anyị mkpa? Ọ zaghachiri, sị, “Ì ji n’aka na ọ bụ Chineke ka ụta dịịrị maka ọnọdụ ndị a?” O ji Bible ya gosi m na Chineke anaghị ata ndị mmadụ ahụhụ. E nyeere m aka ịhụ na Onye Okike hụrụ ụmụ mmadụ n’anya, nakwa na ọ ga-eme ka ihe ka mma n’oge na-adịghị anya. N’iji akụkụ Akwụkwọ Nsọ ndị dị ka Aịsaịa 35:5-7 na Mkpughe 21:3, 4 mee ihe, o gosiri m na n’oge na-adịghị anya, a ga-ewepụ agha, esemokwu, ọrịa na ọnwụ, nakwa na ndị kwesịrị ntụkwasị obi ga-ebi n’ụwa ruo mgbe ebighị ebi.

Ịchọta Ezinụlọ Na-enye Nkwado

Anụrụ m na e gburu nwanne Paschalia n’ọgụ ndị agha okpuru. Eletara m ezinụlọ Paschalia iji kasie ha obi, ma kama nke ahụ, ha ji Akwụkwọ Nsọ kasie m obi. Agaghachiri m n’ụlọ ha iji nwetakwuo okwu nkasi obi sitere na Bible, n’oge na-adịghịkwa anya, esonyeere m otu obere ìgwè nke Ndịàmà Jehova, bụ́ ndị na-ezukọ na nzuzo ịmụ ihe na ife ofufe. N’agbanyeghị na a na-asọ Ndịàmà ahụ oyi, ekpebisiri m ike ịnọgide na-eso ha.

Ìgwè Ndị Kraịst ahụ dị umeala n’obi ghọọrọ m ezinụlọ nwere obi ụtọ na ịhụnanya, bụ́ ihe funahụrụ m. Ha nyere m nkwado ime mmụọ na enyemaka dị m nnọọ mkpa. N’etiti ha, achọtara m ndị enyi na-adịghị achọ ọdịmma onwe ha nanị na ndị na-echebara ndị ọzọ echiche, bụ́ ndị dị njikere inyere m aka na ịkasi m obi. (2 Ndị Kọrint 7:5-7) Nke ka mkpa, e nyeere m aka ịbịarukwu Jehova nso, bụ́ onye m wereziiri dị ka Nna m nke eluigwe na-ahụ n’anya. Àgwà ya nke ịhụnanya, ọmịiko na nchegbu miri emi na-akpali nnọọ mmasị. (Abụ Ọma 23:1-6) Emesịala m chọta ezinụlọ ime mmụọ na Nna na-ahụ n’anya! Nke a metụrụ m n’obi. N’oge na-adịghị anya, a kpaliri m ịrara onwe m nye Jehova, e mekwara m baptizim na September 1945.

Ọ bụghị nanị na ịga nzukọ Ndị Kraịst mere ka ihe ọmụma m mụbaa, kama o mekwara ka okwukwe m siwanye ike. Ebe ọ bụ na o nweghịzi otú ọzọ e si eme njem, ọtụtụ n’ime anyị na-ejikarị ụkwụ aga kilomita ise site  n’obodo anyị ruo n’ebe anyị na-enwe nzukọ, na-enwe nkwurịta okwu ime mmụọ ndị m na-agaghị echefu echefu. Ná ngwụsị nke afọ 1945, mgbe m nụrụ banyere ohere nke ikere òkè n’ọrụ nkwusa oge nile, amalitere m ịsụ ụzọ. Ọ dị oké mkpa ka mụ na Jehova nwee mmekọrịta siri ike ebe ọ bụ na a ga-ele okwukwe na iguzosi ike n’ezi ihe m ule siri ike n’oge na-adịghị anya.

Mmegide Arụpụta Ihe Dị Mma

Ndị uwe ojii na-ejikarị égbè awakpo anyị n’ebe anyị na-amụ ihe. Mba ahụ nọ n’okpuru iwu ndị agha ebe ọ bụ na a na-alụ agha obodo na Gris n’oge ahụ. Òtù ndị na-emegide ibe ha ji oké ịkpọasị wakwasị onwe ha. N’iji nke ahụ eme ihe, ndị ndú okpukpe mere ka ndị ọchịchị kweta na anyị bụ ndị Kọmunist na iji obi ọjọọ kpagbuo anyị.

N’ime afọ abụọ, e jidere anyị ọtụtụ ugboro, ugboro isii kwa, a mara anyị ikpe ịga mkpọrọ ihe ruru ọnwa anọ. Otú ọ dị, ndị a tụrụ mkpọrọ n’ihi ndọrọ ndọrọ ọchịchị ejularị n’ụlọ mkpọrọ ndị ahụ, ya mere, a hapụrụ anyị. Anyị ji nnwere onwe ahụ anyị na-atụghị anya ya gaa n’ihu n’ikwusa ozi ọma ahụ, ma ka obere oge gasịrị, e jideghachiri anyị—ugboro atọ n’otu izu. Anyị maara na e zigala ọtụtụ n’ime ụmụnna anyị n’agwaetiti ndị ọ na-enweghị ndị bi na ha. Okwukwe m ò siruru ike ime ka m nagidelie ule dị otú ahụ?

Ihe bịara sie nnọọ ike mgbe ndị uwe ojii malitere inyo m enyo. Ka ha wee na-ahụ ihe ọ bụla m na-eme, ndị ọchịchị zigara m Evosmos, obodo dịdebere Tesalonaịka, bụ́ ebe e nwere ụlọ ọrụ ndị uwe ojii. Achọtara m ụlọ n’akụkụ ebe ahụ, ijikwa na-akwado onwe m, amalitere m ịrụ ọrụ dị ka onye ọrụ aka na-agagharị agagharị, na-anụchara ndị mmadụ ite ọla ha. Ka m nọ na-arụ ọrụ ọsụ ụzọ na gburugburu obodo ndị ahụ, ọrụ a mere ka ọ dịrị m mfe ịdị na-aga n’ụlọ ndị mmadụ n’emeghị ka ndị uwe ojii chee na m na-aga izi ozi ọma. N’ihi ya, ọtụtụ ndị nụrụ ozi ọma ahụ, ha meghachikwara omume n’ụzọ dị mma. Ihe karịrị iri n’ime ha mechara ghọọ ndị raara onwe ha nye Jehova, bụ́ ndị na-efe ya ofufe.

Afọ Iri, Ụlọ Mkpọrọ Asatọ

Ndị uwe ojii nọgidere na-esogharị m ruo ná ngwụsị nke 1949, alaghachiziri m Tesalonaịka, dịrị njikere ịga n’ihu n’ozi oge nile. Kpọmkwem mgbe m chere na ule m agwụla, na 1950, e nyere m iwu mberede ka m gaa agha. N’ihi nnọpụiche m dị ka Onye Kraịst, ekpebisiri m ike ịghara ‘ịmụ agha.’ (Aịsaịa 2:4) Otú ahụ ka m si malite ogologo njem na-egbu mgbu nke ga-eduga m n’ụfọdụ n’ime ụlọ mkpọrọ ndị kasị nwee aha ọjọọ na Gris.

Ọ malitere n’obodo Drama. N’izu ndị mbụ m nọrọ n’ụlọ mkpọrọ n’ebe ahụ, ndị soja ọhụrụ malitere ọzụzụ ịgba égbè ha. Otu ụbọchị, a kpọgara m n’ebe ha na-amụ ịgba égbè. Otu n’ime ndị ọfịsa ha nyere m égbè ma nye m iwu ịgba ya. Mgbe m jụrụ, ọ malitere ịgba m égbè. Mgbe ndị ọfịsa ndị ọzọ hụrụ na m gaghị eme ihe o kwuru, ha malitere ịkụ m ọkpọ aghara aghara. Ha mụnyere siga ma menyụọ ha n’ọbụ aka m. Mgbe nke ahụ gasịrị, ha tinyere m n’ụlọ mkpọrọ nanị otu onye na-anọ. Ha kpasoro m àgwà otú a ruo ụbọchị atọ. Ọkụ siga ndị ahụ fụrụ m ụfụ nke ukwuu, àpà ya dịgidekwara m n’aka ruo ọtụtụ afọ.

Tupu e kpee m ikpe n’ụlọikpe ndị agha, e bufere m n’ogige ndị agha dị na Iráklion, Krit. Ná mgbalị ha imebi iguzosi ike n’ihe m, ha  tiri m ihe nke ukwuu n’ebe ahụ. N’ihi ụjọ na-atụ m na m nwere ike ime ihe ha kwuru, ekpesiri m ekpere ike, na-arịọ Nna m nke eluigwe ka o wusie m ike. Okwu Jeremaịa nke dị na Jeremaịa 1:19 gbatara m n’obi: “Ha ga-ebusokwa gị agha; ma ha agaghị enwe ike imegide gị: n’ihi na gị ka M nọnyeere, ọ bụ ihe si n’ọnụ Jehova pụta, ịnapụta gị.” “Udo nke Chineke” nke na-akụjụ obi wetaara m ahụ́ iru ala na obi dị jụụ. Aghọtara m na amamihe dị n’ịtụkwasị Jehova obi kpamkpam.—Ndị Filipaị 4:6, 7; Ilu 3:5.

N’ikpe nke sochirinụ, a tụrụ m nga mkpụrụ ọka. E weere Ndịàmà Jehova dị ka “ndị iro ọchịchị” kasịnụ e nwere. Nga mkpụrụ ọka ahụ malitere n’ụlọ mkpọrọ ndị omekome dị n’Itsedin, ná mpụga Canea, bụ́ ebe e tinyere m n’ụlọ mkpọrọ nanị otu onye na-anọ. Itsedin bụ ụlọ ochie ndị agha bibu na ya, òké jupụtakwara n’ọnụ ụlọ mkpọrọ m. Ana m eji otu nkịrịka blanket merela ochie ekpuchi onwe m site n’isi ruo n’ụkwụ ka òké ndị ahụ ghara imetụ m n’ahụ́ nkịtị mgbe ha ga na-arịgharị m n’ahụ́ nile. Oyi bara m n’ahụ́. Dọkịta sịkwara na aghaghị m ịnọ n’anwụ, nke ahụ mere ka m nwee ike iso ọtụtụ ndị mkpọrọ nọ n’ogige ahụ kwurịta okwu. Otú ọ dị, ọnọdụ m kara njọ, mgbe ọtụtụ ọbara gbasịkwara m n’akpa ume, a kpọgara m n’ụlọ ọgwụ Iráklion.

Ọzọkwa, ezinụlọ ime mmụọ m nke Ndị Kraịst ibe m nyeere m aka mgbe enyemaka ha dị m mkpa. (Ndị Kọlọsi 4:11) Ụmụnna nọ n’Iráklion letara m mgbe mgbe, na-akasị m obi ma na-agba m ume. Agwara m ha na akwụkwọ dị m mkpa iji gbaara ndị nwere mmasị àmà. Ha buteere m igbe nwere oghere nzuzo n’ime ya bụ́ ebe m nwere ike izo akwụkwọ ndị ahụ. Lee obi ụtọ m nwere na n’oge ndị m ji nọọ n’ụlọ mkpọrọ ndị ahụ, e nyeere ya dịkarịa ala ndị mkpọrọ isii ibe m aka ịghọ ezi Ndị Kraịst!

Ka ọ dịgodị, agha obodo ahụ biri, e gbubilatakwara oge m ga-anọ n’ụlọ mkpọrọ ịbụzi afọ iri. Anọchaziri m oge fọdụụrụ m n’ụlọ mkpọrọ ndị dị na Rethimno, Genti Koule na Cassandra. Mgbe m nọsịrị ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ afọ iri n’ụlọ mkpọrọ asatọ, a tọhapụrụ m, alaghachikwara m Tesalonaịka, bụ́ ebe ụmụnna m Ndị Kraịst m hụrụ n’anya nabatara m n’ụzọ na-ekpo ọkụ.

Inwe Ọganihu n’Òtù Ụmụnna Anyị

Ka ọ dị mgbe ahụ, Ndịàmà nọ na Gris enwetụrụla onwe ha ife ofufe. Eji m ohere ahụ mee ihe ozugbo iji gaa n’ihu n’ozi oge nile. N’oge na-adịghị anya, a tụkwasịịrị m  ngọzi ọzọ mgbe m bịara mata otu nwanna nwanyị kwesịrị ntụkwasị obi nke aha ya bụ Katina, bụ́ onye hụrụ Jehova n’anya ma na-arụsi nnọọ ọrụ nkwusa ahụ ike. Anyị lụrụ n’October 1959. Ọmụmụ nke nwa anyị nwanyị bụ́ Agape, na inweta ezinụlọ Ndị Kraịst nke aka m mekwuru ka ọnyá m nke ịbụ nwa mgbei laa. Karịsịa, ezinụlọ anyị nwere afọ ojuju ije ozi n’okpuru nlekọta nke Nna anyị nke eluigwe na-ahụ n’anya, bụ́ Jehova.—Abụ Ọma 5:11.

N’ihi ọnọdụ m na-apụghị izere ezere, aghaghị m ịkwụsị ọrụ ọsụ ụzọ, ma akwadoro m nwunye ka ọ na-aga n’ihu n’ozi oge nile ya. Ihe omume pụrụ iche mere ná ndụ m dị ka Onye Kraịst na 1969 bụ́ mgbe e nwere mgbakọ mba nile nke Ndịàmà Jehova na Nuremberg, Germany. Ka m na-akwado ịga ya, etinyere m akwụkwọ maka inweta akwụkwọ ikike ngafe. Mgbe nwunye m gara n’ụlọ ọrụ ndị uwe ojii ịjụ ha ihe mere ha na-ejibeghị nye m akwụkwọ ikike ngafe kemgbe ọnwa abụọ m tinyere akwụkwọ maka ya, otu ọfịsa wepụtara faịlụ ya ma kwuo, sị: “Ị̀ na-arịọ ka e nye onye a akwụkwọ ikike ngafe ka ọ gaa tọghatawa ndị mmadụ na Germany? A naghị eme ya eme! Ọ bụ onye ọjọọ.”

Site n’enyemaka Jehova na nke ụmụnna ụfọdụ, esonyere m n’ìgwè e nwetaara akwụkwọ ikike ngafe, m sikwa otú a nwee ike ịga mgbakọ ahụ magburu onwe ya. Ọnụ ọgụgụ kasị elu nke ndị bịara mgbakọ ahụ karịrị otu narị puku mmadụ na iri puku ise, apụkwara m ịhụ mmụọ Jehova nke ọma ka ọ na-eduzi ma na-ejikọ ezinụlọ ime mmụọ a zuru ụwa ọnụ. Mgbe oge gatụkwuru ná ndụ m, m ga-aghọtakwu uru nke òtù ụmụnna Ndị Kraịst anyị bara.

Na 1977, nwunye m m hụrụ n’anya, nke kwesịkwara ntụkwasị obi, nwụrụ. Agbalịsiri m ike iji ụkpụrụ Bible zụlite ada m nwanyị, ma enwetara m enyemaka. Ọzọkwa, ezinụlọ ime mmụọ m gbataara m ọsọ enyemaka. M ga-anọgide na-enwe obi ekele maka nkwado nke ụmụnna ndị ahụ n’oge ihe isi ike ahụ. Ọbụna ụfọdụ n’ime ha na-abịa anọ n’ụlọ anyị ruo nwa oge iji lekọta ada m nwanyị. Agatụghị m echefu ịhụnanya ịchụ onwe onye n’àjà ha.—Jọn 13:34, 35.

Agape tolitere ma lụọ otu nwanna nwoke aha ya bụ Elias. Ha mụtara ụmụ nwoke anọ, ha nile nọchakwa n’eziokwu ahụ. N’afọ ndị na-adịbeghị anya, arịara m ọrịa strok ọtụtụ ugboro, ọnọdụ ahụ́ ike m akakwala njọ. Nwa m nwanyị na ezinụlọ ya na-elekọtakwa m nke ọma. N’agbanyeghị ọnọdụ ahụ́ ike m, aka m nwere ọtụtụ ihe mere m ga-eji na-aṅụrị ọṅụ. Ana m echeta mgbe e nwere nanị ihe dị ka otu narị ụmụnna na Tesalonaịka nile, ha ana-ezukọkwa na nzuzo n’ụlọ ndị mmadụ. Ugbu a, e nwere ihe dị ka puku Ndịàmà ise na-anụ ọkụ n’obi n’ebe ahụ. (Aịsaịa 60:22) Ná mgbakọ, ụmụnna na-eto eto na-abịakwute m ma na-ajụ m, sị: “Ì chetara mgbe ị na-eweta magazin n’ụlọ anyị?” Ọ pụrụ ịbụ na ndị mụrụ ha agụghị magazin ndị ahụ, ha gụrụ ha, ha nwekwara ọganihu ime mmụọ!

Ka m na-ahụ ka nzukọ Jehova na-eto, ana m eche na o kwesịrị ule nile m diri. Ana m agwa ụmụ ụmụ m na ndị ọzọ na-eto eto mgbe nile ka ha cheta Nna ha nke eluigwe n’oge ha ka bụ ndị ntorobịa, ọ dịghịkwa mgbe ọ ga-agbahapụ ha. (Eklisiastis 12:1) Jehova mezuru nkwa ya, na-aghọrọ m “nna nke ụmụ mgbei.” (Abụ Ọma 68:5) Ọ bụ ezie na abụ m nwa mgbei a gbahapụrụ agbahapụ n’oge m bụ nwata, emesịrị m chọta Nna nke na-ahụ n’anya!

[Foto dị na peeji nke 22]

Arụrụ m ọrụ dị ka osi nri n’ụlọ mkpọrọ obodo Drama

[Foto dị na peeji nke 23]

Mụ na Katina n’ụbọchị agbamakwụkwọ anyị, 1959

[Foto dị na peeji nke 23]

Mgbakọ e nwere n’otu oké ọhịa dịdebere Tesalonaịka ná ngwụsị nke afọ ndị 1960

[Foto dị na peeji nke 24]

Anyị na nwa anyị nwanyị, 1967