Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ọmụmụ E Kwesịrị Icheta

Ọmụmụ E Kwesịrị Icheta

Ọmụmụ E Kwesịrị Icheta

‘Taa a mụrụ nye unu Onye nzọpụta, Nke bụ́ Kraịst Onyenwe anyị.’—Luk 2:11, “Bible Nsọ nke Union Version.”

IHE dị ka puku afọ abụọ gara aga, otu nwanyị mụrụ nwa nwoke n’obodo Betlehem. Ọ bụ nanị mmadụ ole na ole ná ndị bi n’ebe ahụ ghọtara ịdị mkpa nke ọmụmụ a. Ma ụfọdụ ndị ọzụzụ atụrụ, bụ́ ndị ha na atụrụ ha nọ n’ọhịa n’abalị ahụ, hụrụ ìgwè ndị mmụọ ozi ma nụ ka ha na-abụ abụ, sị: “Ka otuto dịrị Chineke n’ebe kasị elu, udo adịkwa n’elu ụwa n’etiti ndị a nwapụtaworo.”—Luk 2:8-14.

Ndị ọzụzụ atụrụ ahụ chọtaziri Meri na di ya, bụ́ Josef, n’ụlọ anụ, dị nnọọ ka ndị mmụọ ozi ahụ kwuru. Meri, bụ́ onye kpọrọ nwa ahụ Jizọs, nyiwere ya n’ihe e ji etinyere anụ ụlọ nri n’ụlọ anụ ahụ. (Luk 1:31; 2:12) Ugbu a, ka puku afọ abụọ gasịrị, ihe dị ka otu ụzọ n’ụzọ atọ nke ihe nile a kpọrọ mmadụ na-azọrọ na ha na-eso ụzọ Jizọs Kraịst. Ihe omume ndị metụtara ọmụmụ ya aghọwokwa ebe e si nweta akụkọ ọ pụrụ ịbụ na a kọghachiwo ọtụtụ ugboro karịa akụkọ ọ bụla ọzọ n’akụkọ ihe mere eme nke mmadụ.

Spen, bụ́ mba nke kwenyesiri ike n’omenala Katọlik na nke e ji ememe ọdịnala dị iche iche mara, ewepụtawo ọtụtụ ụzọ isi cheta abalị ahụ pụrụ iche na Betlehem.

Krismas Ndị Spen

Kemgbe narị afọ nke 13, ihe ngosi ọmụmụ Kraịst abụwo otu n’ime akụkụ ndị a kasị mara n’ememe ndị Spen. Ọtụtụ ezinụlọ na-akpụ obere ihe na-anọchi anya ihe e ji etinyere anụ ụlọ nri bụ́ ebe e nyiwere Jizọs. A na-ejikwa ihe ndị e ji ụrọ kpụọ edochi anya ndị ọzụzụ atụrụ ahụ na ndị Magus (ma ọ bụ “ndị eze atọ”) ahụ, tinyere Josef, Meri na Jizọs. A na-eguzobekarị ihe ọkpụkpụ ndị buru ibu na-egosi ọmụmụ Kraịst bụ́ ndị na-afọ nke nta ka ha há ka mmadụ n’akụkụ ụlọ nzukọ obodo n’oge Krismas. O yiri ka ọ̀ bụ Francis nke Assisi malitere omenala a n’Ịtali iji dọrọ uche ndị mmadụ gaa n’ihe ndekọ Oziọma ahụ banyere ọmụmụ Jizọs. Ndị mọnk na-eso ụzọ Francis mesịrị mee ka ọ bụrụ ihe na-ewu ewu na Spen na n’ọtụtụ mba ndị ọzọ.

E ji nnọọ ndị Magus kpọrọ ihe n’ememe Krismas ndị Spen dị nnọọ ka e ji Fada Krismas kpọrọ ná mba ndị ọzọ. E kweere na ndị Magus na-enye ụmụntakịrị Spen onyinye na January 6, bụ́ Día de Reyes (Ụbọchị Ndị Eze), dị nnọọ ka ndị Magus, dị ka ọtụtụ ndị kweere, wetaara nwa ọhụrụ ahụ bụ́ Jizọs onyinye. Otú ọ dị, ọ bụ mmadụ ole na ole maara na ihe ndekọ Oziọma ahụ ekwughị ndị Magus ole letara Jizọs. Kama ịbụ ndị eze, ọ ka zie ezie ịkpọ ha ndị na-agụ kpakpando. * Ọzọkwa, mgbe ndị Magus ahụ lasịrị, Herọd gburu ụmụ okoro nta nile nọ na Betlehem “malite ná ndị dị afọ abụọ gbadaa,” ná mgbalị ya igbu Jizọs. Nke ahụ na-egosi na ha mere nleta ha mgbe oge ụfọdụ gasịrị ka a mụsịrị Jizọs.—Matiu 2:11, 16.

Kemgbe narị afọ nke 12, ụfọdụ obodo dị na Spen emewo ihe ngosi nke ọmụmụ Jizọs, gụnyere nleta nke ndị ọzụzụ atụrụ ahụ na, mgbe e mesịrị, ndị Magus letara Betlehem. N’oge a, ihe ka ọtụtụ n’obodo ndị dị na Spen na-eme ememe cabalgata, ma ọ bụ ememe ịkwụ n’ahịrị na January 5 ọ bụla, bụ́ mgbe “ndị eze atọ” ahụ na-eji ụgbọala ndị a chọrọ nnọọ mma agafe n’etiti obodo, na-enye ndị na-ekiri ha ihe nracha. A na-eji ihe ịchọ mma ndị a na-ejikarị eme ihe n’oge Krismas na villancicos (ukwe Krismas) eme ka ememe ahụ kpoo ọkụ.

Ọ na-amasị ihe ka ọtụtụ n’ezinụlọ ndị Spen iri nri abalị pụrụ iche ná Mgbede Ụbọchị Bu Krismas Ụzọ (December 24). Nri ọdịnala a na-eri ná mgbede ahụ na-agụnye ihe ndị dị ka turrón (swiit ndị e ji almọnd na mmanụ aṅụ mee), keeki almọnd, mkpụrụ osisi ndị a mịkpọrọ amịkpọ, anụ atụrụ a hụrụ ahụ na ihe ndị e si n’osimiri nweta. Ndị òtù ezinụlọ, ọbụna ndị bi n’ebe dị anya, na-eme mgbalị pụrụ iche iji bịakọta ọnụ maka ememe a. N’oge nri ọdịnala ọzọ, na January 6, ezinụlọ na-eri roscón de reyes, bụ́ keeki “Ndị Eze” nke nwere ọdịdị mgbaaka, nke e zoro sorpresa (ntakịrị ihe) n’ime ya. Omenala yiri nke ahụ n’oge ndị Rom na-eme ka ohu nke e kenyere akụkụ nwere ihe ahụ e zoro ezo bụrụ “eze” ruo otu ụbọchị.

“Oge Kasị Enye Obi Ụtọ na nke A Kasị Eji Ọrụ n’Aka na Ya n’Afọ”

N’agbanyeghị omenala ndị a maliteworo ime n’ebe dị iche iche, Krismas aghọwo ugbu a ememe bụ́ isi ụwa na-eme. The World Book Encyclopedia na-akọwa Krismas dị ka “oge kasị enye obi ụtọ na nke a kasị eji ọrụ n’aka na ya n’afọ nye ọtụtụ nde Ndị Kraịst na ụfọdụ ndị na-abụghị Ndị Kraịst n’ụwa nile.” Nke ahụ ọ̀ bụ ezi ihe?

N’ụzọ doro anya, ọmụmụ Kraịst bụ ihe omume mere ihe akụkọ. Eziokwu ahụ bụ́ na ndị mmụọ ozi mara ọkwa ya dị ka ihe ga-eweta “udo . . . n’etiti ndị a nwapụtaworo” na-egosi n’ụzọ doro anya na ọ bụ ihe dị mkpa.

Ka o sina dị, “ná mmalite nke Iso Ụzọ Kraịst, e meghị Ọmụmụ Kraịst dị ka ememe,” ka odeakụkọ bụ́ onye Spen nke aha ya bụ Juan Arias na-eme ka ọ pụta ìhè. Ya bụrụ otú ahụ, olee ebe ememe Krismas si malite? Olee ụzọ kasị mma isi cheta ọmụmụ na ndụ Jizọs? N’isiokwu na-esonụ, ị ga-achọta azịza nye ajụjụ ndị a.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 8 La Sagrada Escritura—Texto y comentario por profesores de la Compañía de Jesús (Akwụkwọ Nsọ—Ihe Odide na Nkọwa nke Ndị Prọfesọ nke Òtù Jizọs Dere) na-akọwa na “n’etiti ndị Peasia, Midia na ndị Kaldia, ndị Magus ghọrọ òtù nke ndị ndu okpukpe bụ́ ndị na-akwalite nkà mmụta anwansi, ịgụ kpakpando na nkà ọgwụ na ahụ́ ike.” Otú o sina dị, ka ọ na-erule n’agbata 500 na 1500 O.A., e chiwo ndị Magus ahụ, bụ́ ndị gara ịhụ nwa ahụ bụ́ Jizọs, ndị senti ma nye ha aha ndị bụ́ Melchior, Gaspar, na Balthasar. E kwuru na e debere ozu ha na katidral Cologne, Germany.