Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ihe Mere Ha Ji Aga Chọọchị

Ihe Mere Ha Ji Aga Chọọchị

Ihe Mere Ha Ji Aga Chọọchị

“REPUBLIC of Korea nwere ugbu a ndị chọọchị Presbyterian fọrọ nke nta ka ha bụrụ okpukpu anọ nke ndị nke America.” Ihe ahụ e kwuru na magazin Newsweek pụrụ ijuwo ọtụtụ ndị na-agụ ya anya, ebe ọ bụ na ihe ka n’ọnụ ọgụgụ mmadụ na-ele Korea anya dị ka mba na-ekpe okpukpe Confucius na Buddha. Taa, onye gara ebe ahụ ga-achọta ọtụtụ chọọchị “Ndị Kraịst,” bụ́ ndị a na-ejikarị obe ndị na-acha uhie uhie na-enwu ọkụ amata. Na Sunday, a na-ahụkarị ndị mmadụ abụọ abụọ na atọ atọ ka ha jicha Bible n’aka na-aga chọọchị. Dị ka otu nnyocha e mere na 1998 si kwuo, ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ pasent 30 nke ndị Korea na-aga chọọchị Katọlik ma ọ bụ nke Protestant, bụ́ ihe karịrị ọnụ ọgụgụ ndị na-azọrọ na ha bụ ndị okpukpe Buddha.

N’ụbọchị ndị a, a dịghị ahụkarị pasent dị elu otú ahụ nke ndị mmadụ ka ha na-agachi chọọchị anya n’ebe ọ bụla. Ma, nke ahụ na-eme ọ bụghị nanị na Korea kamakwa ná mba ndị ọzọ dị n’Eshia, tinyekwara n’Africa na Latin America. N’ihi gịnị ka ọtụtụ ndị ha otú ahụ ji ka na-ekwu na ha kwere na Chineke ebe enweghị mmasị n’okpukpe yiri ka ọ̀ na-amụba n’ụwa? Gịnị mere ha ji aga chọọchị?

Otu njụta echiche e mere na-ekpughe na ihe karịrị ọkara nke ndị na-aga chọọchị na Korea na-achọ udo nke obi; ihe dị ka otu ụzọ n’ụzọ atọ na-enwe olileanya nke ịdị ndụ ebighị ebi mgbe ha nwụsịrị; 1 onye n’ime mmadụ 10 ọ bụla na-achọkwa ahụ́ ike, akụ̀ na ụba, na ihe ịga nke ọma.

Ọtụtụ ndị na China na-enuga na chọọchị dị iche iche n’olileanya nke ịchọta ihe ha ga-eji mejuo ịtọgbọ chakoo ime mmụọ ha nweworo ka atụmatụ ndị dabeere n’usoro nke akụ̀ na ụba ịdị n’aka ndị nkịtị ji nke nta nke nta na-anọchi echiche ọchịchị Kọmunist. Kwa afọ, a na-ebipụta ma na-ekesa ọtụtụ nde Bible na China, o yiri ka ndị mmadụ hà na-agụ ya dị ka ha si gụọ obere akwụkwọ Mao na-acha uhie uhie.

Ụfọdụ ndị Katọlik na Brazil, karịsịa ndị na-eto eto, adịghị enwe afọ ojuju ná nkwa nke obi ụtọ ná ndụ nke ka na-abịa—ha chọrọ ka nke ahụ mezuo ugbu a. Magazin akụkọ bụ́ Tudo na-akọ, sị: “Ọ bụrụ na ọ bụ nkà mmụta okpukpe maka nnwere onwe kpaliri obi na uche ndị mmadụ n’afọ ndị 1970, ọ bụ nkà mmụta okpukpe maka ọganihu na-akpali ndị nke taa.” Otu nnyocha e mere na Britain jụrụ ndị na-aga chọọchị n’ebe ahụ ka ha kwuo ihe kasị amasị ha banyere chọọchị ha. Ọtụtụ n’ime ha kwuru na ọ bụ mkpakọrịta.

Ihe a nile na-egosi na ọ bụ ezie na ọnụ ọgụgụ mmadụ butụrụ ibu ka kwere na Chineke, ihe ka n’ọnụ ọgụgụ na-eche banyere ihe ha pụrụ inweta ugbu a karịa ka ha si eche banyere ihe ha ga-enweta n’ọdịnihu—ma ọ bụ ọbụna banyere Chineke n’onwe ya. Gịnị ka i chere bụ́ ebumnobi ziri ezi maka ikwere na Chineke? Gịnị ka Bible nwere ikwu n’okwu ahụ? Ị ga-achọta azịza ya n’isiokwu na-esonụ.