Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

‘Ka Ihe Jehova Na-atọ Gị Ụtọ’

‘Ka Ihe Jehova Na-atọ Gị Ụtọ’

‘Ka Ihe Jehova Na-atọ Gị Ụtọ’

“Ka ihe Jehova tọọkwa gị ụtọ; Ọ ga-enyekwa gị ihe nile obi gị na-arịọ.”—ABỤ ỌMA 37:4.

1, 2. Ònye bụ Isi Iyi nke ezi obi ụtọ, oleekwa otú Eze Devid si dọrọ uche gaa n’eziokwu a?

“OBI ụtọ na-adịrị ndị maara mkpa nke ime mmụọ ha, . . . obi ụtọ na-adịrị ndị na-eme ebere, . . . obi ụtọ na-adịrị ndị na-eme udo.” Gụnyere nkọwa isii ndị ọzọ nke ndị nwere obi ụtọ, okwu ndị a bụ mmalite na-akpali akpali nke Ozizi Elu Ugwu Jizọs a ma ama, dị ka onye so dee Oziọma bụ́ Matiu si dekọọ ya. (Matiu 5:3-11) Okwu Jizọs na-emesi anyị obi ike na anyị pụrụ inwe obi ụtọ.

2 Otu abụ dị nsọ nke Eze Devid nke Izrel oge ochie dere na-adọrọ uche gaa n’Isi Iyi nke ezi obi ụtọ, bụ́ Jehova. “Ka ihe Jehova tọọkwa gị ụtọ,” ka Devid kwuru, “Ọ ga-enyekwa gị ihe nile obi gị na-arịọ.” (Abụ Ọma 37:4) Ma gịnị pụrụ ime ka ịmara Jehova na ọtụtụ akụkụ nke àgwà ya bụrụ ihe ‘na-atọ ụtọ’? Olee otú ịtụle ihe ndị o meworo na ihe ndị ọ ka ga-eme n’imezu nzube ya si eme ka i nwee atụmanya nke inweta “ihe nile obi gị na-arịọ”? Ntụle miri emi nke Abụ Ọma nke 37, amaokwu nke 1 ruo nke 11, na-enye azịza ya.

‘Ekwola Ekworo’

3, 4. Dị ka e dekọrọ n’Abụ Ọma 37:1, ndụmọdụ dị aṅaa ka Devid na-enye, n’ihi gịnịkwa ka o ji kwesị ekwesị ịṅa ntị na ya taa?

3 Anyị bi ‘n’oge pụrụ iche nke siri ike obibi,’ ajọ omume bakwara ụba. Anyị ahụwo mmezu nke okwu Pọl onyeozi bụ́: “Ndị ajọ mmadụ na ndị nduhie ga-anọgide na-ajọwanye njọ, na-eduhie ma bụrụ ndị a na-eduhie.” (2 Timoti 3:1, 13) Lee ka o si dị mfe ịbụ onye ihe yiri ka ọ bụ ihe ịga nke ọma na ọganihu nke ndị ajọ omume metụtara! Ihe a nile pụrụ ịdọpụ uche anyị, na-eme ka anya ime mmụọ anyị ghara inwe ebe o lekwasịrị. Rịba ama otú okwu mmalite nke Abụ Ọma nke 37 si eme ka anyị mara ihe a pụrụ ịbụ ihe ize ndụ: “Emela ka iwe gị dị ọkụ n’ihi ndị na-eme ihe ọjọọ. Ekwosola ndị na-eme ajọ omume ekworo.”

4 Usoro mgbasa ozi ụwa na-akọ ọtụtụ akụkọ banyere ikpe na-ezighị ezi kwa ụbọchị. Ndị ọchụ ntá ego na-adịghị akwụwa aka ọtọ na-egwu wayo n’enwetaghị ntaramahụhụ. Ndị omempụ na-erigbu ndị na-adịghị ike. Ndị ogbu mmadụ ka na-emi ala ma ọ bụ ghara inweta ntaramahụhụ. Ihe atụ nile dị otú ahụ nke ikpe na-ezighị ezi pụrụ ịkpasu iwe na ịkpaghasị udo nke obi anyị. Ihe yiri ka ọ bụ ihe ịga nke ọma nke ndị ajọ omume pụrụ ọbụna ime ka anyị na-enwe anyaụfụ. Ma anyị iwe iwe ọ̀ ga-eme ka ọnọdụ ahụ ka mma? Inwe anyaụfụ n’ihi ihe yiri ka ọ bụ uru ndị ajọ omume na-enweta ọ̀ na-agbanwe ihe na-abịara ha? Ọ dịghị ma ọlị! N’ezie, ọ dịghịkwa mkpa anyị ịdị ‘na-ewe iwe dị ọkụ.’ N’ihi gịnị?

5. N’ihi gịnị ka e ji jiri ndị na-eme ihe ọjọọ tụnyere ahịhịa?

5 Ọbụ abụ ahụ na-aza, sị: “N’ihi na dị ka ahịhịa ka a ga-ebipụ ha ngwa ngwa, dị ka akwụkwọ ahịhịa ndụ ka ha ga-akpọnwụ.” (Abụ Ọma 37:2) Ahịhịa ndụ pupụtara ọhụrụ pụrụ ịma mma, ma n’oge na-adịghị anya, ọ na-akpọnwụ. Otú ahụ ka ọ dịkwa ndị ajọ omume. Ọganihu o yiri ka hà na-enwe adịghị adịgide adịgide. Mgbe ha nwụrụ, uru ha ritere n’ụzọ na-ezighị ezi adịghịzi enyere ha aka. Onye ọ bụla ga-emesị chee ikpe ziri ezi ihu. “Ụgwọ ọrụ nke mmehie na-akwụ bụ ọnwụ,” ka Pọl dere. (Ndị Rom 6:23) Ndị na-eme ihe ọjọọ na ndị ajọ omume nile ga-emesịrịrị nata “ụgwọ ọrụ” ha. Lee ka nke ahụ si bụrụ ụzọ ndụ na-adịghị aba uru!—Abụ Ọma 37:35, 36; 49:16, 17.

6. Gịnị ka anyị pụrụ ịmụta site n’Abụ Ọma 37:1, 2?

6 N’ihi ya, ànyị kwesịrị ikwe ka ọganihu na-adịghị adịgide adịgide nke ndị na-eme ihe ọjọọ na-enwe na-ewute anyị? Ihe mmụta dị n’amaokwu abụọ mbụ nke Abụ Ọma nke 37 bụ nke a: Ekwela ka ihe ịga nke ọma ha mee ka ị dapụ n’ụzọ ndụ ị họọrọ nke ijere Jehova ozi. Kama nke ahụ, lekwasị anya ná ngọzi na ihe mgbaru ọsọ ime mmụọ.—Ilu 23:17.

“Tụkwasị Jehova Obi, Meekwa Ezi Ihe”

7. N’ihi gịnị ka anyị ji kwesị ịtụkwasị Jehova obi?

7 “Tụkwasị Jehova obi, meekwa ezi ihe,” ka ọbụ abụ ahụ na-agba anyị ume. (Abụ Ọma 37:3a) Mgbe anyị nwere oké nchegbu ma ọ bụ ọbụna obi abụọ, ọ dị anyị mkpa ịtụkwasị nnọọ Jehova obi. Ọ bụ ya na-enye nchebe ime mmụọ zuru ezu. “Onye na-ebi n’ebe nzuzo nke Onye kachasị ihe nile elu,” ka Mozis dere, “ọ bụ n’okpuru ndo nke Onye pụrụ ime ihe nile ka ọ na-anọ ọnọdụ abalị.” (Abụ Ọma 91:1) Mgbe mmụba nke mmebi iwu n’usoro ihe a na-ewute anyị, mgbe ahụ ka ọ dị anyị mkpa karị ịdabere na Jehova. Ọ bụrụ na nkwonkwo ụkwụ anyị echịkwapụ, anyị na-enwe obi ụtọ ma enyi anyị nyere anyị aka. N’otu aka ahụ, mgbe anyị na-agbalịsi ike ije ije n’ikwesị ntụkwasị obi, nkwado Jehova dị anyị mkpa.—Aịsaịa 50:10.

8. Olee otú ikere òkè n’ozi Ndị Kraịst si enyere anyị aka izere ịbụ ndị ọganihu nke ndị na-eme ihe ọjọọ na-ewutebiga ókè?

8 Ihe ngwọta nke ịbụ onye ọganihu nke ndị na-emebi iwu na-ewute bụ ịrụsi ọrụ ike ịchọpụta na inyere ndị yiri atụrụ aka inwe ihe ọmụma ziri ezi nke nzube Jehova. Ka ajọ omume na-aba ụba, ọ dị anyị mkpa ịdị na-arụsi nnọọ ọrụ ike n’inyere ndị ọzọ aka. “Unu echefula ime ihe ọma na iso ndị ọzọ na-ekerịta ihe,” ka Pọl onyeozi kwuru, “n’ihi na àjà ndị dị otú ahụ na-adị Chineke ezi mma.” “Ihe ọma” kasịnụ anyị pụrụ ime bụ iso ndị ọzọ na-ekerịta ozi ọma dị ebube nke Alaeze Chineke. N’ezie, nkwusa anyị na-eme maka ọha bụ “àjà otuto.”—Ndị Hibru 13:15, 16; Ndị Galeshia 6:10.

9. Kọwaa ihe agbamume Devid bụ́ “biri n’ụwa” pụtara.

9 “Biri n’ụwa,” ka Devid gara n’ihu ikwu, “meekwa ihe n’ikwesị ntụkwasị obi.” (Abụ Ọma 37:3b, NW) ‘Ụwa’ nke oge Devid bụ ókèala Jehova nyere ndị Izrel, Ala Nkwa ahụ. N’oge ọchịchị Solomọn, ókèala ya sitere na Dan n’ebe ugwu ruo Bia-sheba n’ebe ndịda. Nke a bụ ebe obibi Izrel. (1 Ndị Eze 4:25) Taa, n’ebe ọ bụla anyị bi n’ụwa, anyị na-atụ anya oge ahụ mgbe mbara ala dum ga-aghọ paradaịs n’ime ụwa ọhụrụ nke ezi omume. Ka ọ dịgodị, anyị bi ná nchebe ime mmụọ.—Aịsaịa 65:13, 14.

10. Gịnị na-esi na ya apụta mgbe anyị ‘na-eme ihe n’ikwesị ntụkwasị obi’?

10 Gịnị ga-esi na ya apụta mgbe anyị ‘na-eme ihe n’ikwesị ntụkwasị obi’? Ilu e dekọrọ n’ike mmụọ nsọ na-echetara anyị, sị: “Onye ọ bụla nke kwesịrị ntụkwasị obi ga-enwe ọtụtụ ngọzi.” (Ilu 28:20) Anyị iji ikwesị ntụkwasị obi na-anọgidesi ike n’ikwusa ozi ọma ahụ n’ebe ọ bụla anyị bi na nye onye ọ bụla anyị nwere ike na-eweta ụgwọ ọrụ n’ezie site n’aka Jehova. Dị ka ihe atụ, Frank na nwunye ya, bụ́ Rose, malitere ọrụ ọsụ ụzọ afọ 40 gara aga n’otu obodo dị n’ebe ugwu Scotland. Mmadụ ole na ole ndị gosiburu mmasị n’eziokwu ahụ n’ebe ahụ daghachiri azụ. N’adaghị mbà, di na nwunye a bụ́ ndị ọsụ ụzọ malitere ọrụ ime nkwusa na nke ime ndị na-eso ụzọ. Ugbu a e nwere ọgbakọ na-eme nke ọma n’obodo ahụ. Ikwesị ntụkwasị obi nke di na nwunye a ewetawo ngọzi Jehova n’ezie. “Ngọzi kasịnụ,” ka Frank ji ịdị umeala n’obi na-akọwa, “bụ nnọọ na anyị ka nọ n’eziokwu ahụ ma na-abara Jehova uru.” Ee, mgbe anyị ‘na-eme ihe n’ikwesị ntụkwasị obi,’ anyị na-enweta ọtụtụ ngọzi ma na-egosi ekele maka ha.

‘Ka Ihe Jehova Na-atọ Gị Ụtọ’

11, 12. (a) Olee otú ‘ihe Jehova pụrụ isi na-atọ anyị ụtọ’? (b) Ihe mgbaru ọsọ dị aṅaa ka anyị pụrụ isetịpụ banyere ọmụmụ ihe onwe onye, gịnịkwa pụrụ isi na ya pụta?

11 Iji mee ka mmekọrịta anyị na Jehova sikwuo ike na iji nọgide na-atụkwasị ya obi, ‘ihe Jehova aghaghị ịdị na-atọ anyị ụtọ.’ (Abụ Ọma 37:4a) Olee otú anyị ga-esi mee nke ahụ? Kama ịdị na-echegbu onwe anyị banyere ọnọdụ anyị, ọ bụ ezie na ihe pụrụ ịdị na-esiri anyị ike, anyị ga na-eche banyere Jehova. Otu ụzọ anyị pụrụ isi na-eme nke a bụ iwepụta oge iji na-agụ Okwu ya. (Abụ Ọma 1:1, 2) Ọgụgụ Bible gị ọ̀ na-atọ gị ụtọ? Ọ ga na-atọ gị ụtọ mgbe ị na-agụ ya ná nzube nke ịmụtakwu banyere Jehova. Gịnị ma ị kwụsịtụ mgbe ị gụsịrị otu akụkụ Akwụkwọ Nsọ ma jụọ onwe gị, sị, ‘Gịnị ka ebe a na-akụziri m banyere Jehova?’ Ị pụrụ ịhụ ya dị ka ihe na-enye aka mgbe i ji akwụkwọ ma ọ bụ mpempe akwụkwọ na-eme ihe mgbe ị na-agụ Bible. Mgbe ọ bụla ị kwụsịrị iji tụgharịa uche n’ihe ihe ị na-agụ pụtara, detuo ahịrịokwu nke na-echetara gị otu n’ime àgwà Chineke ndị na-adọrọ mmasị. N’abụ ọzọ, Devid bụrụ, sị: “Ka okwu nile nke ọnụ m na ntụgharị nke obi m bụrụ ihe na-atọ ụtọ n’ihu Gị, Jehova, bụ́ oké nkume m, na onye mgbapụta m.” (Abụ Ọma 19:14) Anyị itinye nnọọ uche otú a n’Okwu Chineke ‘ga-atọ Jehova ụtọ,’ ọ na-atọkwa anyị ụtọ.

12 Olee otú anyị pụrụ isi nweta obi ụtọ site n’ọmụmụ ihe na ntụgharị uche anyị? Anyị pụrụ ime ka ọ bụrụ ihe mgbaru ọsọ anyị ịmụta ihe nile anyị nwere ike ịmụta banyere Jehova na ụzọ ya. Akwụkwọ ndị dị ka Nwoke Kasị Ukwuu nke Dịworo Ndụ na Bịaruo Jehova Nso * na-enye ọtụtụ ihe ọmụma anyị pụrụ iji ekele na-atụgharị uche na ha. Devid na-emesi onye ezi omume obi ike na Jehova n’aka nke ya ‘ga-enye gị ihe nile obi gị na-arịọ.’ (Abụ Ọma 37:4b) Ọ ghaghị ịbụ ụdị obi ike a kpaliri Jọn onyeozi idetu okwu ndị a: “Nke a bụkwa obi ike nke anyị nwere n’ebe ọ nọ, na, n’agbanyeghị ihe ọ bụ nke anyị na-arịọ dị ka uche ya si dị, ọ na-anụ olu anyị. Ọzọkwa, ọ bụrụ na anyị maara na ọ na-anụ olu anyị n’ihe banyere ihe ọ bụla anyị na-arịọ, anyị maara na anyị gaje inwe ihe ndị anyị rịọrọ ebe anyị rịọworo ha n’aka ya.”—1 Jọn 5:14, 15.

13. N’afọ ndị na-adịbeghị anya, mgbasawanye dị aṅaa nke ọrụ nkwusa Alaeze ahụ ka a hụworo n’ọtụtụ ala?

13 Dị ka ndị na-eguzosi ike n’ihe, ihe kasị atọ anyị ụtọ bụ ịhụ mgbe a ga-egosipụta oruru o ruuru Jehova ịbụ eze. (Ilu 27:11) Obi ọ́ dịghị ejupụta anyị n’ọṅụ mgbe anyị na-anụ banyere ọrụ nkwusa dị ukwuu ụmụnna anyị na-arụ n’ala ndị nọbu n’okpuru ọchịchị aka ike? Anyị na-atụsi anya ike ịhụ nnwere onwe a pụrụ inwekwu tupu ọgwụgwụ nke usoro ihe a. Ọtụtụ ndị ohu Jehova bụ́ ndị bi ná mba ndị dị n’ebe ọdịda anyanwụ ụwa na-arụsi ọrụ ike n’ikwusara ụmụ akwụkwọ, ndị gbara ọsọ ndụ, na ndị ọzọ na-anọ nwa oge n’ebe ahụ ma nwere onwe ha ife ofufe, ozi ọma. Ọ bụ ọchịchọ anyị siri ike na ka ndị a na-alaghachi n’obodo ha, na ha ga-anọgide na-ekwe ka ìhè nke eziokwu ahụ na-enwubanye ọbụna n’ebe o doro anya na oké ọchịchịrị gbachiri.—Matiu 5:14-16.

“Kpọree Ụzọ Gị Ruo Jehova Ahụ́”

14. Ihe àmà dị aṅaa ka e nwere na anyị pụrụ ịdabere na Jehova?

14 Lee ka o si bụrụ ihe na-enye ahụ́ efe ịmara na a pụrụ iwepụ nchegbu anyị na ihe ndị pụrụ iyi anyị oké ibu arọ! N’ụzọ dị aṅaa? “Kpọree ụzọ gị ruo Jehova ahụ́; tụkwasịkwa Ya obi,” ka Devid na-ekwu, ọ na-agbakwụnye, sị “Ya onwe ya ga-emekwa ya.” (Abụ Ọma 37:5) N’ọgbakọ anyị, anyị nwere ihe àmà zuru ezu na-egosi na anyị pụrụ ịdabere n’ebe Jehova nọ maka nkwado. (Abụ Ọma 55:22) Ndị nọ n’ozi oge nile, ma hà bụ ndị ọsụ ụzọ, ndị nlekọta na-ejegharị ejegharị, ndị ozi ala ọzọ, ma ọ bụ ndị ọrụ afọ ofufo na-eje ozi na Betel, pụrụ ịgba akaebe na nlekọta Jehova bụ ihe a pụrụ ịdabere na ya. Gịnị ma i soro ndị ị maara n’ime ha kwurịta okwu ma jụọ ha otú Jehova siworo nyere ha aka? Ihe ịrụ ụka adịghị ya na ị ga-anụ ọtụtụ ahụmahụ na-egosi na ọbụna n’oge ihe isi ike, aka Jehova adịghị mkpụmkpụ. Ọ na-enye ihe ndị dị mkpa ná ndụ mgbe nile.—Abụ Ọma 37:25; Matiu 6:25-34.

15. Olee otú ezi omume nke ndị Chineke si na-enwupụ enwupụ?

15 Mgbe anyị mere Jehova obi ike anyị ma tụkwasị ya obi kpam kpam, anyị pụrụ ịhụ mmezu nke okwu ọzọ nke ọbụ abụ ahụ: “Ọ ga-emekwa ka ezi omume gị pụta ìhè, ikpe gị kwa dị ka etiti ehihie.” (Abụ Ọma 37:6) Dị ka Ndịàmà Jehova, a na-aghọtahiekarị anyị. Ma Jehova na-emeghe anya ndị nwere obi eziokwu iji nyere ha aka ịghọta na ọ bụ ịhụnanya maka Jehova na ndị agbata obi na-akpali anyị ije ozi anyị na-eje maka ọha. N’otu oge ahụ, àgwà anyị ziri ezi, ọ bụ ezie na ọtụtụ ndị na-akọwahie ya, na-apụta ìhè. Jehova na-akwagide anyị mgbe anyị na-enwe ụdị mmegide na mkpagbu ọ bụla. N’ihi ya, ezi omume nke ndị Chineke na-enwupụ dị ka anyanwụ n’etiti ehihie.—1 Pita 2:12.

“Nọrọ Duu . . . Werekwa Ntachi Obi Na-echere”

16, 17. N’ikwekọ n’Abụ Ọma 37:7, gịnị ka ugbu a bụ oge ya, ọ̀ bụkwa n’ihi gịnị?

16 Okwu ọzọ ọbụ abụ ahụ kwuru bụ: “Nọrọ duu n’ihu Jehova, werekwa ntachi obi na-echere Ya: emela ka iwe gị dị ọkụ n’ihi onye ọ na-agara nke ọma n’ụzọ ya, n’ihi mmadụ nke na-eme ajọ ihe nzube dị iche iche.” (Abụ Ọma 37:7) N’ebe a, Devid mesiri ike mkpa ọ dị iji ndidi na-echere ka Jehova mee ihe. Ọ bụ ezie na ọgwụgwụ nke usoro ihe a abịabeghị, nke a abụghị ihe mere a ga-eji na-eme mkpesa. Ọ̀ bụ na anyị ahụbeghị na ebere na ndidi Jehova dị nnọọ ukwuu karịa ka anyị chere na mbụ? Ànyị pụrụ ugbu a igosi na anyị onwe anyị jikwa ndidi na-echere ka anyị na-arụsi ọrụ ike n’ikwusa ozi ọma ahụ tupu ọgwụgwụ abịa? (Mak 13:10) Ugbu a bụ oge izere ime ihe ọkụ ọkụ nke pụrụ ịnapụ anyị ọṅụ na nchebe ime mmụọ anyị. Ugbu a bụ oge iguzogidesi mmetụta na-emerụ emerụ nke ụwa Setan ike karịa mgbe ọ bụla ọzọ. Ugbu a kwa bụ oge ịnọgide na-adị ọcha n’omume ma ghara imebi aha ọma anyị n’ebe Jehova nọ. Ka anyị nọgide na-ewepụ echiche ndị rụrụ arụ n’uche anyị ma na-ezere imeso ndị na-abụghị nwoke ma ọ bụ nwanyị ibe anyị ma ọ bụ ọbụna ndị bụ nwoke ma ọ bụ nwanyị ibe anyị omume ndị na-ekwesịghị ekwesị.—Ndị Kọlọsi 3:5.

17 “Haa aka iwe iwe, hapụkwa ọnụma,” ka Devid na-adụ anyị n’ọdụ. “Emela ka iwe gị dị ọkụ, ọ na-eduba nanị n’ime ihe ọjọọ. N’ihi na a ga-ebipụ ndị na-eme ihe ọjọọ: ma ndị na-ele anya Jehova, ndị ahụ ga-enweta ala.” (Abụ Ọma 37:8, 9) Ee, anyị pụrụ iji obi ike na-atụ anya oge ahụ—nke dị ezi nso ugbu a—mgbe Jehova ga-ekpochapụ ajọ omume nile na ndị nile na-eme ha.

“Ọ Fọdụrụ Nwa Mgbe”

18, 19. Agbamume dị aṅaa ka ị na-enweta site n’Abụ Ọma 37:10?

18 “Ọ fọdụrụ nwa mgbe, onye na-emebi iwu agaghị adịkwa: ị ga-elekwasịkwa ọnọdụ ya anya, ma ọ gaghị anọ.” (Abụ Ọma 37:10) Lee ka okwu ndị a si agba anyị ume ka anyị na-eru nso ọgwụgwụ nke usoro ihe a na njedebe nke nnwere onwe pụọ n’ebe Jehova nọ bụ́ nke nọworo na-akpata ọdachi! Ụdị ọchịchị ma ọ bụ ịchịisi nile ụmụ mmadụ chepụtaworo akụwo afọ n’ala. Ugbu a kwa, anyị eruwela nso mweghachi nke ọchịchị Chineke, Alaeze Jehova nke dị n’aka Jizọs Kraịst. Ọ ga-achị ụwa nile ma wepụ ndị nile na-emegide Alaeze Chineke.—Daniel 2:44.

19 N’ụwa ọhụrụ ahụ n’okpuru Alaeze Chineke, otú ọ sọrọ gị siri chọọ “onye na-emebi iwu,” ị gaghị ahụ ya. N’ezie, a ga-ewepụ onye ọ bụla nke nupụụrụ Jehova isi ngwa ngwa. Ọ dịghị onye ọ bụla nke na-emegide ọbụbụeze ya ma ọ bụ onye na-ajụ ido onwe ya n’okpuru ịchịisi Chineke ga-anọ n’ebe ahụ. Ndị agbata obi gị nile ga-abụcha ndị chọrọ ime ihe na-atọ Jehova ụtọ. Lee nchebe nke ahụ ga-eweta—a gaghị enwe ugodi, a gaghị enwe ígwè e ji gbaa ụlọ gburugburu, a gaghị enwe ihe ọ bụla nke ga-emebi ntụkwasị obi na obi ụtọ zuru ezu!—Aịsaịa 65:20; Maịka 4:4; 2 Pita 3:13.

20, 21. (a) Ole ndị bụ “ndị dị umeala n’obi” e kwuru okwu ha n’Abụ Ọma 37:11, ebeekwa ka ha na-enweta “ịba ụba nke udo”? (b) Olee ngọzi ndị ga-abụ nke anyị ma ọ bụrụ na anyị eṅomie Devid ahụ Ka Ukwuu?

20 Mgbe ahụ, “ndị dị umeala n’obi ga-enweta ala.” (Abụ Ọma 37:11a) Ma ole ndị bụ ndị a “dị umeala n’obi”? Okwu a sụgharịrị ịbụ “ịdị umeala n’obi” sitere n’okwu pụtara n’ụzọ bụ́ isi “mekpaa ahụ́, wedaa n’ala.” Ee, “ndị dị umeala n’obi” bụ ndị ji obi umeala na-echere Jehova imezi mmejọ na mmegbu ndị a na-emeso ha. “Ịba ụba nke udo ga-atọkwa ha ụtọ.” (Abụ Ọma 37:11b) Ọbụna ugbu a, anyị na-ahụ udo bara ụba na paradaịs ime mmụọ nke e jikọtara ya na ezi ọgbakọ Ndị Kraịst.

21 Ọ bụ ezie na anyị enwerebeghị onwe anyị pụọ n’ahụhụ, anyị na-enyerịtara ibe anyị aka ma na-agụgụ ndị dara mbà n’obi. N’ihi ya, a na-enwe ezi afọ ojuju n’etiti ndị Jehova. Ụmụnna ndị a họpụtara dị ka ndị ọzụzụ atụrụ na-eji ịhụnanya na-egbo mkpa ime mmụọ anyị—mgbe ụfọdụkwa ọbụna nke anụ ahụ́—na-enyere anyị aka idi nhụjuanya n’ihi ezi omume. (1 Ndị Tesalonaịka 2:7, 11; 1 Pita 5:2, 3) Lee ka udo a si bụrụ ihe onwunwe bara uru! Anyị nwekwara olileanya nke ndụ ebighị ebi na Paradaịs udo nke dị nso. N’ihi ya, ka anyị na-eṅomi Devid ahụ Ka Ukwuu, bụ́ Kraịst Jizọs, onye ịnụ ọkụ n’obi ya maka ozi Jehova kpaliri iji ikwesị ntụkwasị obi jee ozi ruo ná ngwụsị. (1 Pita 2:21) Site n’ime otú ahụ, anyị ga-anọgide na-enwe obi ụtọ, na-eto onye ahụ ihe ya na-atọ anyị ụtọ, bụ́ Chineke anyị, bụ́ Jehova.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 12 Ndị Ndịàmà Jehova bipụtara.

Ị̀ Pụrụ Ịza?

• Olee ihe ndị ị mụtara site n’Abụ Ọma 37:1, 2?

• Olee otú ‘ihe Jehova pụrụ isi na-atọ gị ụtọ’?

• Ihe àmà dị aṅaa ka e nwere na anyị pụrụ ịdabere na Jehova?

[Ajụjụ Nke Paragraf Ndị a Na-amụ Amụ]

[Foto dị na peeji nke 9]

Ndị Kraịst adịghị ‘ekwoso ndị na-eme ajọ omume ekworo’

[Foto dị na peeji nke 10]

“Tụkwasị Jehova obi, meekwa ezi ihe”

[Foto dị na peeji nke 11]

Mee ka ihe Jehova na-atọ gị ụtọ site n’ịmụta ihe nile ị pụrụ ịmụta banyere ya

[Foto dị na peeji nke 12]

“Ndị dị umeala n’obi ga-enweta ala”